Job
2 Ọ na-apụta ka okooko osisi, mechaa kpọnwụọ.*+
Ọ na-agafe ọsọ ọsọ ka onyinyo ma pụọ n’anya.+
4 È nwere onye na-adịghị ọcha ga-amụtali onye dị ọcha?+
E nweghị.
5 Ọ bụrụ na e kpebiela ụbọchị ole ọ ga-adị ndụ,
Ọnwa ole ọ ga-adị ndụ dị gị n’aka.
I kpebiela oge ọ ga-anọru ka ọ ghara ịgafe ya.+
6 Wepụ anya gị n’ebe ọ nọ ka o zuru ike,
Ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu, otú onye ọrụ e goro ego si arụcha ọrụ ya n’ụbọchị.+
7 N’ihi na osisi nwedịrị olileanya.
Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ,
Ome ya ka ga na-etokwa.
8 Ọ bụrụ na mgbọrọgwụ ya emee ochie n’ime ala,
Ọ bụrụkwa na úkwù ya anwụọ n’ime ájá,
9 Ọ ga-epulite ma mmiri metụ ya.
Ọ ga-awakwa alaka ka osisi puru ọhụrụ.
10 Ma mmadụ na-anwụ, tọgbọrọ n’enweghị ike.
Mmadụ kubie ume, olee ebe ọ nọ?+
11 Mmiri na-ata n’oké osimiri,
Mmiri na-asọpụcha n’osimiri, osimiri ataa.
12 Mmadụ na-edinakwa ala ma ghara ibili.+
Ọ gaghị ebili ruo mgbe eluigwe na-adịghịzi,
A gaghịkwa akpọte ya n’ụra.+
13 A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili,*+
Na ị ga-ezo m ruo mgbe iwe gị dajụrụ,
Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, gị echeta m.+
14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?+
M ga-echere n’oge niile a manyere m ichere,
Ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.+
15 Ị ga-akpọ òkù, m ga-azakwa gị.+
Agụụ ọrụ aka gị ga na-agụsi gị ike.
16 Ma ka ọ dị ugbu a, ị na-agụ ije ụkwụ m niile ọnụ.
Ị na-ele anya ka ị hụ naanị mmehie m.
17 I kechiela ihe ọjọọ m mere n’akpa,
I jikwa mgbá nyachie ya ka mmehie m dịrị na ya.
18 Otú ahụ ugwu na-ada, kụrisịa,
E bupụkwa oké nkume n’ebe ọ dị,
19 Otú ahụ mmiri na-erichasị nkume,
Idei mmiri ebupụkwa ájá dị n’ala,
Otú ahụ ka ị na-eme ka olileanya mmadụ efu laa n’iyi.
20 Ị na-emerigide ya ruo mgbe ọ lara n’iyi.+
Ị na-agbanwe otú ọ dị, ị na-ezipụkwa ya.
21 A na-akwanyere ụmụ ya ùgwù, ma ọ naghị ama.
Ọ naghị ama mgbe a na-ejighịzi ha kpọrọ ihe.+
22 Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ihe na-afụ ya ụfụ.
Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ọ na-eru uju.”