Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Esaf.+
75 Anyị na-ekele gị, Chineke. Anyị na-ekele gị.
2 Ị sịrị: “M kpebie oge m ga-ekpe ikpe,
M na-ekpe ikpe ziri ezi.
3 Mgbe ụwa na ndị niile bi n’ime ya mara jijiji,*
Ọ bụ m mere ka ogidi ya dị iche iche kwụsie ike.” (Sila)
4 M gwara ndị na-etu ọnụ, sị: “Unu etula ọnụ,”
Gwakwa ndị ajọ omume, sị: “Unu etola onwe unu na unu dị ike.*
6 N’ihi na ọ bụghị n’ebe ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n’ebe ọdịda anyanwụ ma ọ bụkwanụ n’ebe ndịda
Ka onye na-eme ka mmadụ bụrụ onye ukwu si abịa.
7 N’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe.+
Ọ na-eweda otu onye ala, bulie onye ọzọ elu.+
8 N’ihi na e nwere iko Jehova bu n’aka.+
Mmanya nke dị n’ime ya na-agbọ ụfụfụ, a gwakwara ya nke ọma.
Ọ ga-awụpụrịrị ya.
Ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa ga-aṅụkwa ya, ṅụchaa ya.”+
9 Ma m ga-akọsa ya ruo mgbe ebighị ebi.
M ga-abụku Chineke Jekọb abụ otuto.
10 N’ihi na ọ na-asị: “M ga-anapụ ndị ajọ omume ike.”*
Ma, m ga-eme ka onye ezi omume nwekwuo ike.*