Ozi Ọma Jọn Dere
2 N’ụbọchị nke atọ, e nwere oriri alụmdi na nwunye na Kena nke dị na Galili, nne Jizọs nọkwa n’ebe ahụ. 2 A kpọkwara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa oriri alụmdi na nwunye ahụ.
3 Mgbe mmanya gwụwara, nne Jizọs sịrị ya: “Ha enweghị mmanya.” 4 Ma Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, olee otú o si gbasa mụ na gị?* Oge m erubeghị.” 5 Nne ya wee sị ndị na-eje ozi: “Meenụ ihe ọ bụla ọ gwara unu.” 6 E nwere ite nkume isii e ji agbanye mmiri a dọsara n’ebe ahụ n’ihi iwu ndị Juu tiri banyere ịdị ọcha.+ Nke ọ bụla n’ime ha ga-abali ihe dị ka lita mmiri iri anọ na anọ ma ọ bụ lita iri isii na isii.* 7 Jizọs sịrị ha: “Gbajuonụ ite ndị ahụ mmiri.” Ha wee gbajuo ha n’ọnụ. 8 Ọ sịziri ha: “Kurunụ ya bugara onye na-ahazi oriri a.” Ha wee kuru ya bugara ya. 9 Mgbe onye na-ahazi oriri ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, ebe ọ na-amaghị ebe o si (ọ bụ eziokwu na ndị na-eje ozi bụ́ ndị kupụtara mmiri ahụ ma), ọ kpọrọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, 10 sị ya: “Ndị ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma. Mgbe mmanya gbuwere ndị mmadụ, e bupụtazie nke na-adịchaghị mma. Ma, ị hapụrụ mmanya dị mma ruo ugbu a.” 11 Jizọs mere ihe a na Kena nke dị na Galili. Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ.* O si otú a mee ka ebube ya pụta ìhè.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.
12 Mgbe e mechara, ya na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ na ndị na-eso ụzọ ya gbadara Kapaniọm.+ Ma ha anọghị ọtụtụ ụbọchị n’ebe ahụ.
13 Ememme Ngabiga+ ndị Juu ruwere nso, Jizọs wee gbagoo Jeruselem. 14 Ọ hụrụ ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru,+ nakwa ndị na-agbanwe ego ka ha nọ n’oche ha. 15 O ji ụdọ mere ụtarị wee jiri ya chụpụ ndị niile chị atụrụ na ehi bịa n’ụlọ nsọ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.+ 16 Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru: “Wepụsịanụ ihe ndị a ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”+ 17 Ndị na-eso ụzọ ya wee cheta na e dere, sị: “Ihe gbasara ụlọ gị ga na-anụ m ọkụ n’obi.”+
18 N’ihi ya, ndị Juu sịrị ya: “Olee ihe àmà ị ga-emere anyị+ iji gosi na i nwere ikike ime ihe ndị a ị na-eme?” 19 Jizọs zara ha, sị: “Kụtuonụ ụlọ nsọ a. M ga-arụ ya n’ụbọchị atọ.”+ 20 Ndị Juu ahụ wee sị ya: “E ji afọ iri anọ na isii rụọ ụlọ nsọ a. Ị̀ ga-arụ ya n’ụbọchị atọ?” 21 Ma ụlọ nsọ ọ na-ekwu bụ ahụ́ ya.+ 22 Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ọ na-ekwu ihe a.+ Ha wee kwere ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ihe Jizọs kwuru.
23 Ma, mgbe ọ nọ na Jeruselem n’oge Ememme Ngabiga, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’aha ya mgbe ha hụrụ ihe àmà ndị ọ na-eme. 24 Ma Jizọs atụkwasịchaghị ha obi n’ihi na ọ ghọtara ha niile, 25 ọ dịghịkwa ya mkpa ka onye ọ bụla kọwaara ya ihe ọ bụla banyere mmadụ, n’ihi na ọ ma ihe dị mmadụ n’obi.+