Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Kọrịnt 1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Kọrịnt nke Mbụ

      • Ekele (1-3)

      • Pọl kelere Chineke maka ndị Kọrịnt (4-9)

      • Pọl gbara ndị Kọrịnt ume ka ha dịrị n’otu (10-17)

      • Kraịst gosiri ike na amamihe Chineke (18-25)

      • Jiri naanị Jehova na-anya isi (26-31)

1 Ndị Kọrịnt 1:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:15

1 Ndị Kọrịnt 1:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 18:1
  • +1Kọ 6:11; Hib 9:13, 14
  • +Mt 12:18, 21; Ọrụ 4:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/1994, p. 24-25

1 Ndị Kọrịnt 1:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Kọl 1:9

1 Ndị Kọrịnt 1:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 18:5

1 Ndị Kọrịnt 1:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Lu 17:29, 30; 2Te 1:7; 1Pi 1:7

1 Ndị Kọrịnt 1:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 4:5; 5:5; Mkp 1:10

1 Ndị Kọrịnt 1:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “na-arụkọ ọrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 7:9

1 Ndị Kọrịnt 1:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 16:17
  • +Ro 15:5, 6; 2Kọ 13:11; Efe 4:1, 3; Fil 2:2

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Teta!,

    5/8/2003, p. 24-25

1 Ndị Kọrịnt 1:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/15/1997, p. 28-29

1 Ndị Kọrịnt 1:12

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Aha ya ọzọ bụ Pita.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 18:24; 1Kọ 3:4, 5, 21-23

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    10/1/1996, p. 21-22

1 Ndị Kọrịnt 1:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 18:8
  • +Ro 16:23

1 Ndị Kọrịnt 1:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 16:15

1 Ndị Kọrịnt 1:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “onye oké amamihe.”

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:15

1 Ndị Kọrịnt 1:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 17:18; 1Kọ 2:14
  • +Ro 1:16

1 Ndị Kọrịnt 1:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 29:14

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/1992, p. 21-24

1 Ndị Kọrịnt 1:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”

  • *

    Ya bụ, onye ma Iwu Mosis nke ọma.

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/1992, p. 19-20

1 Ndị Kọrịnt 1:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Lu 10:21
  • +Kọl 2:8
  • +1Kọ 2:14; 3:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    7/15/2008, p. 26

    9/15/1992, p. 19-24

1 Ndị Kọrịnt 1:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 12:38; Lu 11:29

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/1992, p. 22-23

1 Ndị Kọrịnt 1:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 17:32

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    5/1/2012, p. 23

    8/15/2010, p. 4

    6/15/2003, p. 6

    6/15/1999, p. 29-30

1 Ndị Kọrịnt 1:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Kọl 2:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Bịaruo Jehova Nso, p. 87-96

    Ụlọ Nche,

    6/15/2015, p. 3-7

    10/1/1990, p. 20

1 Ndị Kọrịnt 1:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Kọ 13:4

1 Ndị Kọrịnt 1:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 4:13
  • +Jn 7:48; Jes 2:5

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/15/1994, p. 12-13

1 Ndị Kọrịnt 1:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 11:25

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/2014, p. 24

    8/15/1994, p. 12-13

1 Ndị Kọrịnt 1:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 2:6

1 Ndị Kọrịnt 1:29

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Grik, “anụ ahụ́.”

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/1992, p. 22

1 Ndị Kọrịnt 1:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 10:4; 2Kọ 5:21
  • +Jn 17:19; Hib 10:10
  • +Ro 3:24; Kọl 1:13, 14

1 Ndị Kọrịnt 1:31

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ A5.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 9:24; 2Kọ 10:17

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/15/2005, p. 13

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Kọr. 1:1Ọrụ 9:15
1 Kọr. 1:2Ọrụ 18:1
1 Kọr. 1:21Kọ 6:11; Hib 9:13, 14
1 Kọr. 1:2Mt 12:18, 21; Ọrụ 4:12
1 Kọr. 1:5Kọl 1:9
1 Kọr. 1:6Ọrụ 18:5
1 Kọr. 1:7Lu 17:29, 30; 2Te 1:7; 1Pi 1:7
1 Kọr. 1:81Kọ 4:5; 5:5; Mkp 1:10
1 Kọr. 1:9Di 7:9
1 Kọr. 1:10Ro 15:5, 6; 2Kọ 13:11; Efe 4:1, 3; Fil 2:2
1 Kọr. 1:10Ro 16:17
1 Kọr. 1:12Ọrụ 18:24; 1Kọ 3:4, 5, 21-23
1 Kọr. 1:14Ọrụ 18:8
1 Kọr. 1:14Ro 16:23
1 Kọr. 1:161Kọ 16:15
1 Kọr. 1:17Ọrụ 9:15
1 Kọr. 1:18Ọrụ 17:18; 1Kọ 2:14
1 Kọr. 1:18Ro 1:16
1 Kọr. 1:19Aịz 29:14
1 Kọr. 1:21Lu 10:21
1 Kọr. 1:21Kọl 2:8
1 Kọr. 1:211Kọ 2:14; 3:18
1 Kọr. 1:22Mt 12:38; Lu 11:29
1 Kọr. 1:23Ọrụ 17:32
1 Kọr. 1:24Kọl 2:3
1 Kọr. 1:252Kọ 13:4
1 Kọr. 1:26Ọrụ 4:13
1 Kọr. 1:26Jn 7:48; Jes 2:5
1 Kọr. 1:27Mt 11:25
1 Kọr. 1:281Kọ 2:6
1 Kọr. 1:30Ro 10:4; 2Kọ 5:21
1 Kọr. 1:30Jn 17:19; Hib 10:10
1 Kọr. 1:30Ro 3:24; Kọl 1:13, 14
1 Kọr. 1:31Jer 9:24; 2Kọ 10:17
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Kọrịnt 1:1-31

Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Kọrịnt

1 Ọ bụ Pọl, onye Kraịst Jizọs kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi+ otú Chineke si chọọ, na Sọstenis nwanna anyị, 2 na-edetara ọgbakọ Chineke dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi a.+ Chineke doro unu nsọ ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.+ Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ ndị dị nsọ, unu na ndị niile nọ ebe ọ bụla na-akpọ aha Onyenwe anyị niile, bụ́ Jizọs Kraịst.+

3 Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

4 Ana m ekele Chineke maka unu mgbe niile n’ihi amara o si n’aka Kraịst Jizọs meere unu. 5 Ọ bụ maka na unu na Jizọs dị ná mma mere unu ji nweta ihe niile. Ọ bụ ya mere unu ji nwee ike ịma okwu Chineke nke ọma, nweekwa ike ikwusa ya nke ọma.+ 6 Ozi ọma unu na-ezi banyere Kraịst+ emeela ka unu sie ezigbo ike, 7 nke na unu nwere onyinye niile, ka unu na-echesi ike ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gosi ike ya.+ 8 Chineke ga-emekwa ka unu nọsie ike ruo ọgwụgwụ, ka a ghara inwe ihe onye ọ bụla ga-eji maka ya bo unu ebubo n’ụbọchị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-abịa.+ 9 Chineke na-emezu ihe o kwuru.+ Ọ bụ ya kpọrọ unu ka unu na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst Onyenwe anyị dịrị ná mma.*

10 Ụmụnna m, m ji aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-agba unu ume ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka unu gharakwa ịna-akpa iche iche,+ kama ka unu nwee otu obi, ka ihe unu na-eche bụrụkwa otu.+ 11 Ụmụnna m, ndị ụlọ Kloi gwara m banyere unu. Ha kwuru na unu na-ese okwu. 12 Ihe m na-ekwu bụ na olu unu na-ada iche iche. Otu onye na-asị: “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs,”+ onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Sifas,”* onye ọzọ ana-asịkwa, “Ana m eso ụzọ Kraịst.” 13 È kewara Kraịst ekewa? Ọ̀ bụ Pọl ka e gburu n’elu osisi n’ihi unu? Ka è mere unu baptizim n’aha Pọl? 14 Ana m ekele Chineke na o nweghị onye n’ime unu m mere baptizim ma e wezụga Krispọs+ na Gayọs.+ 15 N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị na unu mere baptizim n’aha m. 16 Emekwara m ezinụlọ Stefanas baptizim.+ E wezụga ndị a, echetaghị m onye ọzọ m mere baptizim. 17 N’ihi na Kraịst zipụrụ m ka m na-ezisa ozi ọma,+ ọ bụghị ka m na-eme ndị mmadụ baptizim. O zipụghịkwa m ka m na-ekwu okwu ka onye gụrụ oké akwụkwọ,* ka ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* ghara ifu ọhịa.

18 N’ihi na okwu gbasara ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* bụ okwu nzuzu n’anya ndị a na-aga ibibi ebibi,+ ma n’anya anyịnwa bụ́ ndị a na-aga ịzọpụta, ọ na-egosi ike Chineke.+ 19 N’ihi na e dere, sị: “M ga-eme ka amamihe nke ndị ma ihe laa n’iyi, agaghịkwa m eji amamihe ndị ọkachamara mee ihe ọ bụla.”+ 20 N’oge a,* olee ebe onye amamihe, odeakwụkwọ,* na ọ̀rụ́ ụka nọ? Ọ̀ bụ na Chineke emebeghị ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu? 21 Ndị ụwa amaghị Chineke+ n’ihi na ha tụkwasịrị amamihe ha obi.+ Ha weere na ihe anyị na-ekwusa abaghị uru. Ma, Chineke ji ozi a azọpụta ndị nabatara ya.+ E sikwa otú a na-egosi amamihe Chineke.

22 Ndị Juu na-achọ ka a rụọrọ ha ọrụ ebube,+ ndị Grik na-achọkwa amamihe. 23 Ma anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, onye e gburu n’elu osisi. Ihe a anyị na-ekwusa na-esiri ndị Juu ike ịnabata. Ndị mba ọzọ wekwaara ya ka ihe nzuzu.+ 24 Ma, ndị Chineke kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, weere Kraịst ka onye e si n’aka ya egosi ike Chineke na amamihe Chineke.+ 25 N’ihi na ihe si n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na ọ maghị ihe, ma ihe karịa ha. Ihe sikwa n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na o sighị ike, siri ike karịa ha.+

26 Ụmụnna m, mgbe Chineke kpọrọ unu, ndị mmadụ anaghị ele ọtụtụ n’ime unu anya ka ndị ma ihe ma ọ bụ ndị siri ike.+ Ọtụtụ n’ime unu esighịkwa n’ezinụlọ ndị ukwu.+ 27 Ma, Chineke họọrọ ndị ụwa weere na ha amaghị ihe iji menye ndị amamihe ihere. Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha esighị ike iji menye ndị siri ike ihere.+ 28 Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha abaghị uru, ndị ha na-eleda anya, na ndị ha weere na ha adịghị adị. Ọ họọrọ ha iji gosi na ndị ụwa weere na ha bara uru abaghị uru ọ bụla,+ 29 ka onye* ọ bụla wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke. 30 Ma, ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu. Ọ bụ Jizọs mere ka anyị mata amamihe na ezi omume Chineke.+ Ọ bụkwa ya mere ka anyị dịrị nsọ.+ Ọnwụ ọ nwụrụ iji gbapụta anyị ga-emekwa ka anyị gharazie ịbụ ndị mmehie.+ 31 Ọ bụ ya mere ihe a e dere ji kwesị ekwesị: “Onye na-anya isi, ya jiri Jehova* nyaa isi.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya