Jona
2 Jona nọ n’afọ azụ̀ ahụ kpee ekpere gwa Jehova bụ́ Chineke ya okwu.+ 2 Ọ sịrị:
“M nọ n’ahụhụ kpọọ Jehova, ya aza m.+
M nọ n’ala ala ili* rịọ ka i nyere m aka.+
Ị nụrụ olu m.
Oké ebili mmiri gị niile gafere n’elu isi m.+
4 M sịrị, ‘A chụpụla m n’ihu gị.
Olee otú m ga-esi ahụ ụlọ nsọ gị ọzọ?’
Ahịhịa konyejuru m n’isi.
6 M mikpuru n’ala ala ugwu.
Ụwa mechibidoro m ọnụ ụzọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i si n’olulu kpọpụta m ná ndụ, Jehova bụ́ Chineke m.+
7 Mgbe m* nọ n’ọnụ ọnwụ, echetara m Jehova.+
Ekpere m wee ruo gị ntị, n’ụlọ nsọ gị.+
8 Ndị na-efe arụsị na-abaghị uru na-ahapụ onye hụrụ ha n’anya.*
9 Ma m ga-eji olu ekele chụọrọ gị àjà.
M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+
Nzọpụta si n’aka Jehova.”+
10 Ka oge na-aga, Jehova nyere azụ̀ ahụ iwu, ya agbọpụta Jona n’elu ala.