AKWỤKWỌ OZI NKE ABỤỌ E DEGAARA NDỊ TESALONAỊKA
1 Pọl, Silvenọs,* na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, ndị ha na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu, akwụkwọ ozi:
2 Ka Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
3 Ụmụnna anyị, anyị agaghị akwụsị ịna-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu. O kwesịrị ekwesị n’ihi na okwukwe unu na-esikwu ezigbo ike, unu niile n’otu n’otu na-ahụkwa ibe unu n’anya karịa otú unu na-emebu.+ 4 N’ihi ya, anyị ji unu akpa nganga+ n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi otú unu si atachi obi ma nwee okwukwe n’agbanyeghị mkpagbu niile a na-akpagbu unu na ahụhụ niile unu na-ata.*+ 5 Ihe a na-egosi na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke mere e ji were unu ka ndị ruru eru inweta Alaeze Chineke, bụ́ nke unu na-atara ahụhụ.+
6 Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye ezi omume, ọ ga-ata ndị na-akpagbu unu ahụhụ.+ 7 Ma, a ga-eme ka unu ndị a na-akpagbu na anyịnwa nwere onwe anyị mgbe a ga-esi n’eluigwe kpughee Onyenwe anyị Jizọs,+ ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike+ 8 n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ ga-abọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.+ 9 A ga-ama ndị a ikpe. Ikpe a ga-ama ha bụ mbibi ebighị ebi a ga-ebibi ha,+ ka ha pụọ n’ihu Onyenwe anyị, ka ọ gharakwa iji ike ya dị ebube nyere ha aka. 10 Ihe a ga-eme n’oge Onyenwe anyị ga-abịa ka e mee ka ya na ndị nsọ ya dị ebube. N’ụbọchị ahụ, ndị niile nwere okwukwe na ya ga-akwanyere ya ùgwù. Unu ga-esokwa ha ebe ọ bụ na unu nwere okwukwe n’àmà anyị gbaara unu.
11 Ọ bụ ya mere anyị ji na-ekpere unu ekpere mgbe niile ka Chineke anyị were unu ka ndị ruru eru ịbụ ndị ọ kpọrọ,+ ka o jirikwa ike ya mezuo ihe ọma niile dị ya mma ma mee ka ọrụ niile unu ji okwukwe na-arụ gaa nke ọma. 12 Ọ bụ ka e wee si n’aka unu too aha Onyenwe anyị Jizọs, e tookwa unu maka na unu na ya dị n’otu, n’ihi amara Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
2 Ụmụnna anyị, banyere ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa mkpọkọta a ga-akpọkọta anyị n’ebe ọ nọ,+ anyị na-arịọ unu 2 ka unu ghara ikwe ka e jiri okwu yiri ka ò si n’aka Chineke*+ ma ọ bụ ozi e ji ọnụ zie ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ozi yiri ka ò si n’aka anyị megharịa unu anya ma ọ bụ mee ka unu chewe na ụbọchị Jehova*+ abịala.
3 Unu ekwela ka onye ọ bụla duhie* unu n’ihi na tupu ụbọchị ahụ abịa, a ga-enwe ndị ga-akwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ,+ e kpugheekwa onye mmebi iwu ahụ,+ bụ́ nwa mbibi.+ 4 Ọ bụ onye mmegide, ọ na-ebulikwa onwe ya elu karịa ihe ọ bụla a na-akpọ chi ma ọ bụ ihe ọ bụla a na-efe ofufe.* Ọ bụ ya mere o ji nọrọ ọdụ n’ụlọ nsọ Chineke na-egosi onwe ya n’ihu ọha na ya bụ chi. 5 Ọ̀ bụ na unu echetaghị na m na-agwa unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ?
6 Ugbu a, unu ma ihe na-egbochi onye mmebi iwu ahụ, ka e wee kpughee onye ahụ mgbe oge ya ruru. 7 N’eziokwu, ihe ọjọọ ọ na-eme, nke bụ́ ihe zoro ezo, akpawala ike,+ ma ọ ka ga-abụ ihe zoro ezo ruo mgbe onye ahụ na-egbochi ya na-anọghịzi. 8 Mgbe ahụ, a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ, onye Onyenwe anyị Jizọs ga-eji ume* si ya n’ọnụ+ bibie ma laa ya n’iyi n’oge a ga-eme ka ọnụnọ Onyenwe anyị pụta ìhè.+ 9 Ma, ọ bụ ike Setan na-akpa+ mere onye mmebi iwu ahụ ji nọrọ ma na-arụ ọrụ ebube ọ bụla, na-eme ihe àmà ụgha na ihe ịtụnanya dị iche iche,+ 10 na-emekwa ụdị ajọ omume ọ bụla ka o duhie+ ndị na-ala n’iyi, ka o wee bụrụ ụgwọ ọrụ ha maka na ha anabataghị eziokwu, ha ejighịkwa ya kpọrọ ihe ka e wee zọpụta ha. 11 Ọ bụ ya mere Chineke ji kwe ka e jiri ozizi ụgha na-eduhie ha, ka ha wee na-ekwere okwu ụgha,+ 12 ka e wee maa ha niile ikpe n’ihi na ha ekwereghị eziokwu, kama ọ bụ ajọ omume na-atọ ha ụtọ.
13 Ma, ụmụnna anyị Jehova* hụrụ n’anya, anyị agaghị akwụsị ịna-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu maka na Chineke si ná mmalite họrọ unu+ ka a zọpụta unu. Otú o si mee ya bụ na o ji mmụọ nsọ ya na okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ mee ka unu dị nsọ.+ 14 O si n’ozi ọma anyị na-ezisa kpọọ unu ka a zọpụta unu, ka unu wee nweta ebube Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 15 N’ihi ya, ụmụnna anyị, kwụsienụ ike,+ na-emekwanụ ihe niile a kụziiri unu,+ ma ùnu nụrụ ya n’ozi anyị ji ọnụ zie unu ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi anyị detaara unu. 16 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya,+ onye si n’amara ya kasie anyị obi ruo mgbe ebighị ebi ma mee ka anyị nwee ezigbo olileanya,+ 17 kasie unu obi ma mee ka unu kwụsie ike* ka unu wee na-eme ihe ọma ma na-ekwu okwu ọma mgbe niile.
3 N’ikpeazụ, ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere+ ka okwu Jehova* na-agbasa n’ike n’ike+ ma bụrụ nke a na-anabata na nke e ji kpọrọ ihe otú unu na-eme 2 nakwa ka Chineke napụta anyị n’aka ndị ọjọọ na ndị obi fere azụ,+ n’ihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.+ 3 Ma Onyenwe anyị na-emezu ihe o kwuru. Ọ ga-agba unu ume ma napụta unu n’aka ajọ onye ahụ. 4 Ebe ọ bụ na anyị na Onyenwe anyị dị n’otu, obi siri anyị ike na unu na-eme ihe anyị gwara unu nakwa na unu ga na-eme ya. 5 Ka Onyenwe anyị na-eduzi obi unu otú dị mma, ka unu wee hụ Chineke n’anya+ ma na-atachi obi+ n’ihi Kraịst.
6 Ụmụnna anyị, anyị na-agwa unu n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu na-eze nwanna ọ bụla na-enupụ isi eze,+ bụ́ onye na-anaghị eso omenala* anyị kụziiri unu.*+ 7 N’ihi na unu ma otú unu ga-esi na-eme ka* anyị,+ n’ihi na anyị akpaghị àgwà na-adịghị mma mgbe anyị na unu nọ, 8 anyị erighịkwa nri onye ọ bụla n’efu.*+ Kama anyị gbara ezigbo mbọ ma rụsie ọrụ ike ehihie na abalị ka anyị ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu ibu dị arọ.+ 9 Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ime otú ahụ,+ kama anyị chọrọ ka unu mụta ihe n’aka anyị, ka unu wee na-eme ka* anyị.+ 10 N’eziokwu, mgbe anyị na unu nọ, anyị na-enye unu iwu, sị: “Onye ọ bụla na-achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.”+ 11 N’ihi na anyị na-anụ na e nwere ụfọdụ n’ime unu na-enupụ isi,+ ha anaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla, kama ha na-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ha.+ 12 Anyị na-enye ndị ahụ iwu, na-adụkwa ha ọdụ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ka ha medaa obi na-arụ ọrụ ma na-eri ihe hanwa rụtara.+
13 Ma ununwa, ụmụnna anyị, ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ unu. 14 Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-achọghị irube isi n’ihe anyị kwuru n’akwụkwọ ozi a, hụwanụ onye ahụ ama, unu na ya kwụsịkwa ịkpa,+ ka ihere wee mee ya. 15 Ma unu ewerela ya ka onye iro, kama na-adụnụ ya ọdụ+ ka nwanna.
16 Ka Onyenwe anyị, onye na-enye udo,* mee ka udo dịrị unu mgbe niile n’ihe niile.+ Ka Onyenwe anyị nọnyere unu niile.
17 Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede+ ekele a otú m na-eme n’akwụkwọ ozi ọ bụla ka ọ bụrụ ihe àmà; otú a ka m si ede ihe.
18 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu niile amara.
A na-akpọkwa ya Saịlas.
Ma ọ bụ “na-edi.”
Ma ọ bụ “n’aka mmụọ.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mmụọ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “rafuo.”
Ma ọ bụ “a na-asọpụrụ.”
Na Grik, “mmụọ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “gbaa unu ume.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
O nwere ike ịbụ, “ha.”
Ma ọ bụ “na-eṅomi.”
Ma ọ bụ “n’akwụghị ụgwọ.”
Ma ọ bụ “na-eṅomi.”
Na Grik, “Onyenwe udo.”