Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt 2 Jọn 1-13
  • 2 Jọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2 Jọn
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Jọn

JỌN NKE ABỤỌ

1 Nwaanyị a họọrọ, mụnwa bụ́ okenye* na-edetara gị akwụkwọ ozi, gị na ụmụ gị, ndị m hụrụ n’anya n’eziokwu. Ọ bụghị naanị m, kama ndị niile matarala eziokwu hụkwara unu n’anya, 2 n’ihi eziokwu nke na-adịgide n’obi anyị, nke ga-adịgidekwa n’obi anyị ruo mgbe ebighị ebi. 3 Chineke Nna na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-akụziri anyị eziokwu ma hụ anyị n’anya. Ha ga-emere anyị amara, meere anyị ebere, meekwa ka udo dịrị anyị.

4 M na-aṅụrị nnukwu ọṅụ n’ihi na achọpụtala m na ụfọdụ ụmụ gị na-eje ije n’eziokwu ahụ,+ otú Nna anyị nyere anyị n’iwu. 5 N’ihi ya, m na-arịọ gị, nwaanyị, ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. (Ihe a m na-edetara gị abụghị iwu ọhụrụ, kama ọ bụ iwu e nyere anyị ná mmalite.)+ 6 Ịhụnanya pụtara anyị ịna-ebi ndụ otú o nyere n’iwu.+ Ihe a bụ ihe o nyere n’iwu, otú unu nụrụ ya ná mmalite, na unu kwesịrị ịna-ahụ ibe unu n’anya. 7 N’ihi na ọtụtụ ndị nduhie abanyela n’ụwa,+ ndị na-anaghị ekweta na Jizọs Kraịst bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa.*+ Ọ bụ onye a bụ onye nduhie na onye na-emegide Kraịst.+

8 Lezienụ anya ka unu ghara imebi ihe ndị anyị gbara mbọ rụọ, kama ka unu nweta ụgwọ ọrụ zuru ezu.+ 9 Onye ọ bụla nke na-ahapụ ihe Kraịst kụziri ma na-akụzi ihe dị iche, onye ahụ na Chineke adịghị n’otu.+ Ma, ọ bụ onye nọgidere n’ihe Kraịst kụziri ka ya na Nna anyị na Ọkpara ya na-adị n’otu.+ 10 Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu, ma ọ naghị akụzi ihe Kraịst kụziri, unu anabatala ya n’ụlọ unu,+ unu ekelekwala ya. 11 N’ihi na onye kelere ya na-akwado ajọ ọrụ ya.

12 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịgwa unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na ịnk dee ha, kama m nwere olileanya na m ga-abịa ịhụ unu ka mụ na unu kwuo okwu ihu na ihu, ka ọṅụ unu wee zuo ezuo.

13 Ụmụ nwanne gị nwaanyị, bụ́ onye a họọrọ, na-ekele gị.

Ma ọ bụ “agadi nwoke.”

Na Grik, “Kraịst bịara n’anụ ahụ́.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya