Ekpere Maka Udo n’Etiti Ihe Ncheta nke Agha
NA November 1994, Popu John Paul nke Abụọ dokwara otu nzukọ ọtụtụ òtù okpukpe mejupụtara na Vatican. E ji ekpere maka udo ụwa kaa ihe omume ahụ akara. “N’agbanyeghị ọgba aghara ndị gaworo aga na ọbụna ndị dị ugbu a,” ka popu kwuru n’okwu mmeghe ya, “ọ bụ ọrụ na ibu ọrụ dịịrị anyị nile ime ka a mata nke ọma karị mmekọrịta dị n’etiti okpukpe na udo.”
N’ụzọ na-agba gharịị, okpukpe nke ụwa a nwere aha ọjọọ n’ihe banyere nke a. William Vendley, odeakwụkwọ ukwu nke nzukọ ahụ, kwenyere na “okpukpe dị iche iche tinyemiri onwe ha n’ọgba aghara ndị e nwere n’akụkụ dị iche iche nke ụwa.” Tụlee oké mgbukpọ ndị e nwere na Rwanda, ala nke akụkụ ka ukwuu n’ime ya bụ Roman Katọlik.
Na May 1994, Popu John Paul nke Abụọ kwenyere na ọdachi Rwanda bụ “mgbukpọ agbụrụ doro anya nke, n’ụzọ dị mwute, ọ bụ ọbụna ndị Katọlik kpatara.” Òkè Katọlik keere ò metụtawo nkweta ndị mmadụ nwere na chọọchị ahụ? “Oké mgbukpọ ahụ emewo ka okwukwe nke ọtụtụ ndị maa jijiji,” ka André Bouillot, onye Jesuit sitere Belgium kwuru. E nwekwra ezi ihe kpatara ya.
Dị ka akụkọ ndị mgbasa ozi bụ́ Reuters nke e depụtara n’akwụkwọ akụkọ Miami bụ́ The Herald si dị, “ndị ụkọchukwu, ndị pastọ, na ndị nọn so n’ime 40,000 ndị mkpọrọ Hutu nọ na-eche ka e kpee ha ikpe maka ihe omume mgbukpọ nke agbụrụ.” Akwụkwọ akụkọ The New York Times kọrọ, sị: “Ọtụtụ ndị Rwanda na-ekwu na ndị bishọp na ndị achịbishọp akatọghị oké mgbukpọ ahụ ngwa ngwa ma ọ bụ n’ụzọ siri nnọọ ike, na ha na Ọchịchị Habyarimana na-akpachi anya, bụ́ nke nyere aka ịzụ ìgwè ndị agha na-egbu mmadụ. Ọ dịkarịa ala Ọchịchị nke ndị Tutsi mejupụtara ejidewo otu onye ụkọchukwu n’ebubo nke ijikọ aka n’oké mgbukpọ ndị ahụ.” N’ụzọ na-adịghị eju anya, “Ọchịchị ọhụrụ ahụ,” ka Times ahụ na-agbakwụnye, “na-ekwu na ya achọghị ka Chọọchị Katọlik nwee ike dị ka o nwere na mbụ, ndị soja emenyewokwa ndị ụkọchukwu egwu, ọbụna yiekwa egwu ijide ndị nwere oké nkwuwa okwu na ndị nọọrọ onwe ha.”
Olee otú Jehova Chineke si ele ekpere maka udo nke ndị okpukpe ikpe ọbara mara na-ekpe? Aịsaịa 1:15 na-aza, sị: “Mgbe unu na-agbasa ọbọ aka unu abụọ, M ga-ezonarị unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.”
Ka ọ dị ugbu a, ezi ndị ohu Jehova nọgidere na-abụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa’ na ọgba aghara ya nile. N’oge ndị ahụ nke oké mgbukpọ na Rwanda, Ndịàmà Jehova nke agbụrụ nke ọ bụla chebere Ndịàmà a na-eyi egwu bụ ndị sitere n’agbụrụ nke ọzọ n’ebe obibi ha, wee si otú ahụ na-echebe ha n’ihe ize ndụ nke ndụ ha onwe ha. “Oké ìgwè mmadụ” ahụ nke Ndịàmà, ndị e si ná nzụlite agbụrụ ọ bụla n’ụwa nile nweta, na-ekpe ekpere ma na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya e nwere maka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.—Jọn 17:14; Mkpughe 7:9; Matiu 6:9, 10; 24:14.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Luc Delahaye/Sipa Press