Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 1/8 p. 30-31
  • Meri Ọ̀ Bụ “Nne nke Chukwu”?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Meri Ọ̀ Bụ “Nne nke Chukwu”?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Meri—Onye Chineke “Meere Amara Dị Ukwuu”
  • ‘Fee Ofufe n’Ụzọ Kwesịrị Ndị Na-eche Echiche’
  • Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọ̀ Dịwo Mgbe Ọ Bụla Ị Jụrụ?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 1/8 p. 30-31

Echiche nke Bible

Meri Ọ̀ Bụ “Nne nke Chukwu”?

“ANYỊ NA-ACHỌ NCHEBE N’OKPURU EBERE GỊ, GỊ NNE NKE CHUKWU; AJỤLA ARỊRỊỌ ANYỊ NA-ARỊỌ N’IHI MKPA KAMA ZỌPỤTA ANYỊ PỤỌ N’ỊLA N’IYI, GỊ ONYE NANỊ YA BỤ ONYE A GỌZIRI AGỌZI.”

EKPERE dị otú ahụ na-achịkọta mmetụta nke ọtụtụ nde ndị ikom na ndị inyom na-efe Meri, nne Jisọs Kraịst ofufe. N’anya ha, ọ bụ ihe nnọchianya nke nne nwere obi ọma onye pụrụ ịrịọchitere ha arịrịọ n’aka Chineke, n’ụzọ ụfọdụkwa belata ikpe ha n’ebe ha nọ.

Otú ọ dị, Meri ọ̀ bụ n’ezie “Nne nke Chukwu”?

Meri—Onye Chineke “Meere Amara Dị Ukwuu”

Obi abụọ adịghị ya na Meri bụ onye “e meere amara dị ukwuu”—n’ezie, onye e meere amara karịa nwanyị ọ bụla dịworo ndụ mgbe ọ bụla. (Luk 1:28, The Jerusalem Bible) Mmụọ ozi bụ́ Gebriel jekwuuru ya ma kọwaa kpọmkwem otú ọ ga-esi nwee ihe ùgwù. “Gee ntị!” ka ọ sịrị. “Ị gaje ịtụrụ ime ma mụọ nwa nwoke, ị ghaghị ịkpọ aha ya Jisọs. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Ihe Nile Elu.” Olee otú ọrụ ebube nke a siri kwe omume? Gebriel gara n’ihu, sị: “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, . . . ike nke Onye Kasị Ihe Nile Elu ga-eji onyinyo ya kpuchie gị. N’ihi ya kwa nwa ahụ ga-adị nsọ, a ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.”—Luk 1:31, 32, 35, JB.

“‘Abụ m odibo nwanyị nke Onyenwe anyị,’ ka Meri kwuru, ‘ka e meere m ihe i kwuworo.’” (Luk 1:38, JB) Meri si otú a jiri ịdị umeala n’obi nakwere ntụzi Chineke ma mesịa mụọ Jisọs.

Otú ọ dị, n’ime ọtụtụ narị afọ ndị sochirinụ, ndị na-efe ya ofufe buliri ya elu site n’ịbụ “odibo nwanyị nke Onyenwe anyị” gaa n’ọnọdụ nke “nne eze nwanyị” nke nwere mmetụta dị ukwuu n’eluigwe. Ndị ndú chọọchị kpọsara ya dị ka “Nne nke Chukwu” na 431 O.A. na Kansụl nke Efesọs. Gịnị kpalitere mgbanwe nke a? Popu John Paul nke Abụọ na-akọwa otu ihe merenụ: “Ife Nne nke Chukwu ezi ofufe . . . gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’Ihe Omimi nke Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi.”—Crossing the Threshold of Hope.

Ya mere, ịnakwere Meri dị ka “Nne nke Chukwu” na-adabere n’ikwere n’Atọ n’Ime Otu. Otú ọ dị, Atọ n’Ime Otu ọ̀ bụ ozizi Bible?a Biko, nyochaa ihe Pita onyeozi dere na Bible. Ọ dọrọ aka ná ntị na “ndị ozizi ụgha . . . ga-eji aghụghọ webata ịjụ okwukwe [ma] gbalịakwa iji arụmụka ụgha ha rigbuo unu.” (2 Pita 2:1, 3, The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips dere) Otu ịjụ okwukwe dị otú ahụ bụ ozizi Atọ n’Ime Otu. Ozugbo a nakweere nke ahụ, echiche bụ na Meri bụ “Nne nke Chukwu” (Grik: Theotokos, nke pụtara “onye mụrụ Chineke”) bụ ihe dabara nnọọ adaba. N’akwụkwọ ya bụ́ The Virgin, Geoffrey Ashe na-ekwu na “ọ bụrụ na Kraịst bụ Chineke, Onye nke Abụọ nke Atọ n’Ime Otu,” dị ka ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu chere, “mgbe ahụ nne ya n’ọbịbịa mmadụ ya bụ Nne nke Chukwu.”

Ọ bụrụ na Jisọs bụ “Chineke n’ụzọ nile,” dị ka akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Catechism of the Catholic Church na-ekwu, mgbe ahụ a pụrụ ịkpọ Meri n’ụzọ kwesịrị ekwesị “Nne nke Chukwu.” Otú ọ dị, a ghaghị ikwu na o siiri ọtụtụ ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu na mbụ ike ịnakwere ozizi a mgbe mbụ e wepụtara ya—dị ka ọ na-esiri ndị Na-emegide Atọ n’Ime Otu taa ike ịnakwere. A kpọwo ya “ihe mgbagwoju anya nke ofufe, ‘onye eluigwe nile na-apụghị ịnagide bụ onye akpa nwa ya nagidere.’” (The Virgin)—Tụlee 1 Ndị Eze 8:27.

Ma Jisọs Kraịst ọ̀ bụ n’ezie “Chineke n’ụzọ nile”? Ee e, ọ dịghị mgbe ọ zọọrọ nke ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-anakwere mgbe nile ọnọdụ ya dị ala n’ebe Nna ya nọ.—Lee Matiu 26:39; Mak 13:32; Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrint 15:27, 28.

‘Fee Ofufe n’Ụzọ Kwesịrị Ndị Na-eche Echiche’

Otú ọ dị, Bible na-agba ndị Kraịst ume iji ike iche echiche ha mee ihe n’ofufe. A dịghị agwa anyị inwe okwukwe n’ajụghị ase n’ihe e nyere ọdịdị na-eduhie eduhie dị ka ihe omimi. Kama nke ahụ, Pọl onyeozi na-ekwu na anyị kwesịrị ‘ife ofufe n’ụzọ kwesịrị ndị na-eche echiche.’—Ndị Rom 12:1, JB.

“Ọ dịghị mgbe a gbara anyị ume iche echiche banyere ya,” ka Anne, onye a zụlitere dị ka onye Katọlik na-ekwu. “Ọ dịbeghị mgbe anyị rụrụ ụka ya. Anyị kwenyere nnọọ na Jisọs bụ Chineke, ya mere Meri bụ ‘Nne nke Chukwu’—ọ bụ ihe kasị na-eju anya!” Cheta, akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church na-ekwu na onye òtù ọ bụla nke “Ịdị n’Otu Chineke” ahụ bụ “Chineke n’ụzọ nile.” Ọ na-ekwu na e nweghị chi atọ dịgasị iche iche. Mgbe ahụ ànyị kwesịrị ikwere na ka mkpụrụ ndụ dị ndụ n’ime akpa nwa Meri kewara ma kewaakwa ọzọ, “Chineke n’ụzọ nile” dị n’ime nwa ahụ nọ n’afọ nke na n’ime ọnwa mbụ nke afọ ime ya toruru ihe na-erughị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke otu inch n’ogologo, ma nwee nanị anya na ntị ndị na-emepeghị emepe?

Cheta na na mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara Meri na a gaje ịkpọ nwa ya “Ọkpara nke Onye Kasị Ihe Nile Elu” na “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị “Chineke bụ́ Ọkpara.” Ọ bụrụ n’ezie na Jisọs bụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, n’ihi gịnị ka mmụọ ozi bụ́ Gebriel jiri ghara iji okwu ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu ji eme ihe taa mee ihe—“Chineke bụ́ Ọkpara”? Gebriel ejighị okwu ahụ mee ihe n’ihi na a hụghị ozizi ahụ n’ime Bible.

N’eziokwu, a kpaara nghọta anyị nke ọrụ nile nke Chineke ókè. Ma nghọta ziri ezi nke Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ikwere na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Okike nke ndụ nile, nwere ike itinye ndụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst, n’ụzọ ọrụ ebube n’ime akpa nwa Meri, mgbe ahụkwa ichebe ntolite ya site n’ike ọrụ Ya, ma ọ bụ mmụọ nsọ, ruo mgbe Meri ghọrọ nne Jisọs—Ọkpara Chineke.

Ee, Meri bụ onye a gọziri agọzi n’ụzọ dị ukwuu dị ka nne nke onye ghọrọ Kraịst. Ọ bụghị akwanyereghị ya ùgwù ịnakwere na ozizi ahụ doro anya nke Bible—tinyere ihe ndekọ nke ịdị umeala n’obi nke Meri n’onwe ya—na-akachapụ inye ya utu aha bụ́ “Nne nke Chukwu.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Biko lee Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Museo del Prado, Madrid

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya