Ònye Mepụtara Taị Olu?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GERMANY
N’ỤWA nile ihe dị ka 600 nde ndị ikom na-eyi ha mgbe nile. Onye ikom ọ bụla na-abaghị oké ọgaranya na Germany nwere ihe dị ka 20 taị olu. Ọtụtụ ndị ikom ejiriwo mgbakasị ahụ jụọ ajụjụ, mgbe ha na-eyiri taị olu, sị, ‘Ònye chepụtadịrị nke a?’ Olee ebe taị malitere?
Steenkerke, otu obodo ukwu dị na Belgium, na-azọrọ nsọpụrụ nke ịbụ ndị “mepụtara” taị olu. Na 1692, usuu ndị agha sitere England wakwasịrị ndị agha France nọ n’ebe ahụ na mberede. Dị ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Frankfurter Allgemeine Sonntagszeitung si kọọ, “ndị agha [France] ahụ enweghị oge ọ bụla iji jizie ejiji. Ma n’egbughị oge, ha ji iberibe ákwà uwe agha ha kee n’olu n’ụzọ na-esighị ike ma fanye ọdụdụ iberibe ákwà ahụ n’oghere mkpọchi uwe nke jaket ha. Leenụ, e mepụtawo taị olu n’ụdị mbụ ya.”
Otú ọ dị, ụzọ ejiji ọhụrụ nke ndị agha ahụ abụchaghị nke mbụ ya. Ndị ọkachamara n’akụkọ ihe mere eme nke taị olu na-arụtụ aka na ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ndị na-alụrụ Cheng (Shih Huang Ti), bụ́ onye ọchịchị alaeze ukwu nke China agha yiri ákwà yiri iberibe ákwà a tụhiere n’olu, bụ nke na-egosi ọkwá ha.
Otú ọ dị, nke bụ ma eleghị anya nke a kasị mara bụ iberibe ákwà ndị Croatia lụụrụ Eze Louis nke Iri na Anọ na France agha yiri. N’oge ememe mmeri ịkwụ n’ahịrị n’ahịrị na Paris, iberibe ákwà ndị Croatia dọọrọ mmasị ndị France nke ukwuu nke na ha kpọrọ ha ndị cravate, site na Cravate, onye Croatia, ha onwe ha malitekwara iyi iberibe ákwà. “Site na mgbe ahụ gaa n’ihu,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ e buru ụzọ hota na-ekwu, “iji taị olu eji ejiji gara n’ihu, ọ bụ ezie na ndị agha nọ na Steenkerke bụ ndị mbụ kere iberibe ákwà ahụ ka ọ bụrụ taị nwere akpụ.”
N’oge Oké Mgbanwe nke France (1789-1799), mmadụ na-egosi echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya site n’àgwà “croat,” ma ọ bụ iberibe ákwà, dị gburugburu olu ya. Na narị afọ nke 19, ọha mmadụ Europe na-agbaso ụzọ ọgbara ọhụrụ “chọpụtara” ụdị iji ejiji a. Ọ bụ mgbe ahụ ka e buliri taị olu elu site n’ihe omume ndị agha na nke ọchịchị, o wee baa n’ebe nkowe ákwà nke ndị ikom. Taa ọ bụghị nanị na a na-anakwere taị olu n’ọtụtụ ọha mmadụ n’ụwa nile; n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụ ọbụna iwu.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Historic Costume in Pictures/Dover Publications, Inc., New York