Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 5/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ́ Bụghị Mmehie “Ịdị Ndụ n’Ime Mmehie”?
  • Enwekwaghị Ike Ịgụ na Ide Ihe
  • Ṅụọ Ka I Wee Na-eche Echiche
  • Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ọgwụ Ahụhụ
  • Ihe Omume TV Maka Ụmụaka—Na-egosi Ime Ihe Ike Gabiga Ókè
  • Osisi Dị Ịtụnanya
  • Ọ̀ Bụ Ịdị Oké Gịrịgịrị?
  • Agwọ Ịta Mmadụ —Ihe A Na-agaghị Eme
  • Ịdọ Aka ná Ntị Maka Ndị Na-agba Bọl
  • Ezi Mmụmụ Ọnụ Ọchị Na-efe Efe
  • Ndị Na-agụ Kpakpando Adaa
  • Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jisọs na Ndị Na-agụ Kpakpando
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ike nke Mmụmụ Ọnụ Ọchị
    Teta!—2003
  • Ònye Zitere “Kpakpando” Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 5/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Ọ́ Bụghị Mmehie “Ịdị Ndụ n’Ime Mmehie”?

Òtù Ibu Ọrụ Dịịrị Ọha Mmadụ nke Church of England gwara chọọchị ahụ n’oge na-adịbeghị anya na “ịdị ndụ n’ime mmehie” abụkwaghị ime mmehie, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Guardian Weekly na-ekwu. A kọrọ na òtù ahụ gwara chọọchị ahụ na “ọgbakọ dị iche iche pụrụ ịmụta ihe site n’aka mmadụ abụọ na-alụghị di na nwunye, tinyere ndị ikom na-edina ndị ikom na ndị inyom na-edina ndị inyom, ha kwesịkwara ịnagide ọnwụnwa nke ileghachi anya azụ ‘n’oge obi ụtọ nke ezinụlọ.’” Guardian ahụ na-ehota onye ụkọchukwu bụ́ Philip Hacking dị ka onye na-azaghachi, sị: “Nke a na-eme ka Chọọchị bụrụ ihe e ji eme ihe ọchị, na-akpatakwara ọtụtụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi oké nhụjuanya.”

Enwekwaghị Ike Ịgụ na Ide Ihe

Ihe dị ka nde mmadụ atọ na Germany enwekwaghị ike ịgụ na ide ihe nke ọma n’ihi adịkwaghị agụ ma na-ede ihe. Johannes Ring, bụ́ odeakwụkwọ nke Òtù Ịgụ Ihe, kọwara na ọganihu nke usoro mgbasa ozi n’ígwè nweworo na-eme ka nsogbu ahụ dịwanye njọ. Ná Nzukọ Ụwa n’Ịlụso Amaghị Akwụkwọ Ọgụ, Ring kwuru na ịrị elu n’ụdị a nke amaghị akwụkwọ bụ n’otu akụkụ n’ihi mgbasa nke iji telivishọn, kọmputa, na egwuregwu vidio eme ihe, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung na-akọ.

Ṅụọ Ka I Wee Na-eche Echiche

Ị̀ na-enwe nsogbu ịtụkwasị uche n’ihe? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị gị mkpa ịdị na-aṅụkwu mmiri, ka magazin bụ́ Asiaweek na-atụ aro ya. Magazin ahụ na-akọ na a gwara ndị nkụzi na ndị nne na nna nke ụmụ akwụkwọ ụfọdụ na Hong Kong n’oge na-adịbeghị anya na ịṅụ mmiri dị ukwuu na-enyere nwa akwụkwọ aka ịlụso ọnọdụ enweghị mkpali ọgụ. Ụmụaka kwesịrị ịṅụ iko mmiri 8 ruo 15 kwa ụbọchị, ka a gwara ndị nne na nna. N’izo aka n’akwụkwọ bụ́ The Learning Brain, akụkọ ahụ na-arụtụ aka ná nnyocha ndị na-egosi na enweghị mmiri zuru ezu n’ime ahụ pụrụ iduje n’amụtaghị ihe nke ọma. Ịṅụ mmiri dị ọcha ma dị mma ọṅụṅụ dị mma karịa ịṅụ ihe ọṅụṅụ ọtọ bịrị bịrị, kọfị, tii, ma ọ bụ ọbụna mmiri mkpụrụ osisi, bụ́ ndị pụrụ n’ezie ịkpali ahụ iwepụ mmiri, ka Asiaweek na-ekwu.

Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ọgwụ Ahụhụ

A na-ekpughe ndị America n’ụzọ ka ukwuu nye ọgwụ ahụhụ site n’ihe ndị dị n’ụlọ karịa site ná mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri e fesara ọgwụ, dị ka ndị na-eme nnyocha na Mahadum California dị na Berkeley kwuru. Ọgwụ ọgbụgba ndị e ji egbu ụchicha, ihe a na-ekowe n’elu nke e ji egbu ijiji, ọgwụ e ji egbu ígwú, ọgwụ e ji achụ nla, na n’ihe ndị yiri ha nwere ọgwụ ndị na-egbu egbu. E wezụga ịkpata ọtụtụ mmerụ ahụ kwa afọ, ọtụtụ na-eweta ihe ize ndụ ahụ ike ndị na-adịte anya. Akwụkwọ ozi bụ́ UC Berkeley Wellness Letter na-atụ aro ihe ndị ọzọ na-adịchaghị ize ndụ: Dozie ma ọ bụ tinye ibó ụzọ e ji agbụ mee ma techie ebe ala ụlọ na ahụ ájá gbawara agbawa iji gbochie ahụhụ ịbata; kechie ihe oriri na ihe mkpofu n’ime akpa; jiri ihe e ji egbu ahụhụ mee ihe; zapụsịa irighiri nri; jiri uzu ọkụ hichaa rug; na-ehicha ihe ndị e ji ajị́ anụ mee mgbe mgbe ma debe ha n’ime akpa e mechiri emechi. Ọ bụrụ na ụchịcha adịgide, gbalịa iji ọnyà na-anyakụdo ihe mee ihe ma ọ bụ ifesa ọgwụ boric acid n’azụ kọbọd, ma chebe ụmụaka na anụmanụ e nwere n’ụlọ pụọ n’ebe ihe ndị a dị, ka Wellness Letter ahụ na-atụ aro ya.

Ihe Omume TV Maka Ụmụaka—Na-egosi Ime Ihe Ike Gabiga Ókè

Otu nnyocha e mere banyere usoro telivishọn America ekwubiwo na e nwere “ajọ ime ihe ike nke ịlụ ọgụ” n’ọtụtụ ihe omume ndị e bu ụmụaka n’uche na-eme. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal si kọọ, nnyocha ahụ e mere na Mahadum California dị na Los Angeles gosipụtara ọtụtụ usoro ihe osise a ma ama dị ka ndị nwere “ime ihe ike nanị ka e wee gosi ime ihe ike.” A na-egosikarị ihe nkiri ndị ahụ n’ụtụtụ Saturday, mgbe ụmụaka na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ, mgbe ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ ha ebilitebeghị n’ụra. Ọ bụ ezie na ụdị ihe omume a adịghị ọhụrụ, nnyocha ahụ chọpụtara na “ihe ọjọọ ndị ha na-egosi na ọtụtụ ọgụ a na-alụ n’akwụsịghị akwụsị n’ihe nkiri ndị a bụ ọnọdụ dịtụ ọhụrụ nke ime ihe ike nke yiri ka ọ na-arị elu.”

Osisi Dị Ịtụnanya

Ndị ọkà mmụta sayensị na Britain achọpụtawo mkpụrụ osisi ndị pụrụ ime ka mmiri ọṅụṅụ dị ọcha n’ejighị ọgwụ ndị dị oké ọnụ ahịa mee ihe. Mkpụrụ e gwepịara egwepịa nke osisi Moringa oleifera nke ebe ugwu India na-adọrọ ma na-arapara n’ahụ nje dị iche iche, bụ́ ndị a pụziri iwepụ n’elu mmiri ma ọ bụ bụrụ ndị e jidere n’ime ihe e ji azacha mmiri, ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Times na-akọ. A pụkwara iji mkpụrụ osisi ahụ e ji eme ọtụtụ ihe mee mmanụ e ji esi nri, ncha, ude, mmanụ ọkụ, na ude maka ọrịa akpụkpọ ahụ. Ịzụlite osisi ahụ dị mfe, ọ na-anagide oké ọkọchị, ọ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ihe na-egbochi ifufe, a na-ejikwa ya ọbụna eme ihe dị ka nkụ na ihe e ji eme akwụkwọ. N’ihi nke a, ndị na-eme nnyocha na-atụ aro ka a kụọ osisi ndị a iji mepụta mkpụrụ ndị ga-enye aka igbochi ọnwụ ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ bụ́ nke mmiri e metọrọ emetọ na-akpata.

Ọ̀ Bụ Ịdị Oké Gịrịgịrị?

N’ọha mmadụ nke ọdịdị onwe onye na-agba ara, ọtụtụ ndị chere na o kwetụghị nnọọ omume ịdị oké gịrịgịrị. Otu ihe ọmụmụ e mere n’oge na-adịbeghị anya nke na-akwado nsogbu ahụ ike nke ibu oké ibu pụrụ iyi ka ọ na-akwado echiche a ọha mmadụ nwere, ma onye haziri ihe ọmụmụ ahụ, bụ́ JoAnn Manson nke Mahadum Harvard, chọrọ ka a mara na ịdị oké gịrịgịrị bụkwa nsogbu ahụ ike. “Ekwetara m na ị pụrụ ịdị oké gịrịgịrị n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ zuru ezu, inwe mmega ahụ gabiga ókè, ma ọ bụ ise siga,” ka e hotara na o kwuru na The Wall Street Journal. N’izo aka n’ọtụtụ ndị dọkịta ndị na-akatọ ihe ize ndụ nke iribiga ihe ókè, Journal ahụ depụtara ihe ize ndụ ụfọdụ nke ịdị oké gịrịgịrị, eleghị anya iji 20 pasent dị ala n’ịdị arọ nke ahụ mmadụ. Ndị a bụ enweghị ike iri ihe, ọrịa ọkpụkpụ, mgbochi nke mmiri ahụ bụ́ hormone, ịda ada, mgbawa nke ọkpụkpụ, na ọnyá alaghị ngwa ngwa.

Agwọ Ịta Mmadụ —Ihe A Na-agaghị Eme

Mgbe a bịara n’ihe banyere ịgwọ ndị agwọ tara, ndị ọkachamara adịghị ekwenye n’otu ihe mgbe nile. Otú ọ dị, dị ka magazin bụ́ FDA Consumer si kọọ, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ọgwụ na ahụ ike na United States “fọrọ nke nta ka ha nwekọọ otu echiche banyere ihe a na-agaghị eme.” Ọ bụrụ na ị nọ n’ebe ga-ewe 30 ruo 40 nkeji ịga n’ebe nlekọta ahụ ike, ndụmọdụ bụ: Atụkwasịla ice n’ebe ahụ agwọ tara gị, ejila bandeji ma ọ bụ ọdịdọ eletrik mee ihe, egbuwakwala ọnyá ahụ. Otu aro a na-anakwere n’ebe nile bụ ma agwọ ahụ ò yiri nke na-egbu mmadụ ma ọ bụ na o yighị, e kwesịrị imeso arụ agwọ nile dị ka ọnọdụ mberede ọgwụ na ahụ ike, e kwesịkwara ịkpọga onye ọ tara n’ụlọ ọgwụ ozugbo. Ụzọ mgbochi kasị mma bụ “ịhapụ agwọ aka. Agwọ na-ata ọtụtụ ndị n’ihi na ha na-agbalị igbu ya ma ọ bụ ileru ya anya,” ka FDA Consumer na-ekwu.

Ịdọ Aka ná Ntị Maka Ndị Na-agba Bọl

N’ịgba bọl, bụ́ egwuregwu kasị ewu ewu n’ụwa, ndị na-agba ya pụrụ iji isi ha bie bọl. Otú ọ dị, nke a pụrụ ịkpata mmebi nke ụbụrụ ma ọ bụrụ na a na-emekarị ya mgbe mgbe, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal do Brasil na-akọ. Dị ka otu ihe ọmụmụ e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri, ndị na-agba bọl pụrụ inwe nsogbu icheta ihe, belatakwa ịdị irè nke ụbụrụ n’ihi iji isi ebi bọl. Ọ bụ ezie na ọ dịghị egbu oké mgbu, mmerụ ahụ ya na-eyi nke ndị na-eti ọkpọ na-enwe, bụ́ ndị a na-akụ ọkpọ n’isi mgbe mgbe. Onye ọkà n’ọrịa akwara ahụ bụ́ Paulo Niemeyer Filho na-atụ aro na ndị na-agba bọl kwesịrị izere iji isi ha na-ebi bọl mgbe o si n’ebe dị oké elu na-ada n’ike ma ọ bụ mgbe mmiri dị ya n’ahụ, bụ́ nke na-eme ka bọl ahụ dị arọ karị. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwere na iji isi ebi bọl n’ụzọ gabigara ókè pụkwara imebi ịhụ ụzọ nke onye ahụ na-agba bọl.

Ezi Mmụmụ Ọnụ Ọchị Na-efe Efe

E nwere ụdị abụọ nke mmụmụ ọnụ ọchị, dị ka ndị Finland na-eme nnyocha bụ́ Dr. Jari Hietanen na Mahadum Tampere na Dr. Veikko Surakka nke Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ Ahụ Ike na Mahadum Helsinki si kwuo. Ndị ọkachamara maara otu ụdị mmụmụ ọnụ ọchị dị ka mmụmụ ọnụ ọchị nkịtị. A na-amụmụ nke a site nanị n’echiche nke ibu ọrụ, ọ na-emetụtakwa nanị uru anụ nke ntì. Ezi mmụmụ ọnụ ọchị, n’aka nke ọzọ, na-egosipụta mmetụta bụ ezie nke ihe ụtọ ma na-akpali, ọ bụghị nanị uru anụ nke ntì, kamakwa uru anụ ndị dị gburugburu anya. Otu nnyocha sitere Finland n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu na ezi mmụmụ ọnụ ọchị na-efe efe. Site n’ịchọpụta ma gbakọọ mmegharị nke uru anụ ndị kasị nta, ndị na-eme nnyocha chọpụtara na ọ bụ nanị ile anya na foto onye na-amụmụ ezi ọnụ ọchị kpaliri ndị ha jiri mee nnyocha ịmụmụ ọnụ ọchị. A hụghị mmeghachi omume a mgbe ndị ahụ e jiri mee nnyocha ahụ lere anya na foto nke ndị na-amụmụ ọnụ ọchị nkịtị.

Ndị Na-agụ Kpakpando Adaa

Dị ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Die Zeit si kọọ, 44 ndị na-agụ kpakpando na Netherlands wepụtara onwe ha n’oge na-adịbeghị anya maka otu nnwale nke Òtù Ndị Arụmụka nke Netherlands kwadebere. E nyere ndị ahụ na-agụ kpakpando ndepụta abụọ. Otu nwere ebe na ụbọchị ọmụmụ nke mmadụ asaa. Nke abụọ nyere ihe ọmụma onwe onye dị ukwuu banyere nke ọ bụla n’ime mmadụ asaa ahụ. A gwara ndị ahụ na-agụ kpakpando ka ha jikọta onye nke ọ bụla nọ n’ihe ndepụta nke mbụ ná nkọwa kwekọrọ ekwekọ n’ihe ndepụta nke abụọ site n’iji nkà a sịrị na ha nwere n’ịgụ kpakpando mee ihe. Ihe ịga nke ọma hà aṅaa ka ha nwere? Ọkara nke ndị ahụ na-agụ kpakpando enwetaghị ọbụna otu azịza ziri ezi, ọ dịghịkwa nke ọ bụla nwere ike ijikọta ihe karịrị atọ n’ụzọ ziri ezi. Nnwale ndị e mebuworo gosiri ihe yiri nke ahụ, ma ndị ahụ na-agụ kpakpando na-ekwu na e nyewo ha ihe ọmụma na-ezighị ezi. Otú ọ dị, n’ọnọdụ a, ọ bụ ndị ahụ na-agụ kpakpando n’onwe ha tụpụtara ụkpụrụ a gbasoro ná nnwale ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya