Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 31
  • A Kwanyere Ikike Ndị Ọrịa Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kwanyere Ikike Ndị Ọrịa Ùgwù
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
    Teta!—2003
  • Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 31

A Kwanyere Ikike Ndị Ọrịa Ùgwù

‘O nweghị ụzọ m pụrụ isi waa ahụ a n’ejighị ọbara. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka a waa gị ahụ a, ị ghaghị ikwenye n’ụzọ m si agwọ ọrịa. Ma ọ bụghị otú ahụ, ị ga-achọrọ dọkịta ọzọ.’

OKWU onye dọkịta ahụ akwaghị okwukwe nke Cheng Sae Joo, otu n’ime Ndịàmà Jehova bi na Thailand aka. N’ịbụ onye a chọpụtara ọrịa meningioma n’ahụ ya, otu ụdị nke akpụ ụbụrụ, ọ dịsi mkpa ike ka a waa Cheng ahụ. Ma o kpebisiri ike irubere iwu Bible isi: “Unu hapụ . . . ọbara.”—Ọrụ 15:28, 29.

Cheng gara ụlọ ọgwụ abụọ ọzọ, na-ahọrọ ịbụ onye a gwọrọ ná mba nke ya onwe ya ma o kwe mee. N’ịbụ ihe ọ na-atụghị anya ya, ndị dọkịta nọ n’ebe ahụ jụkwara ịwa ahụ n’ejighị ọbara. N’ikpeazụ, Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ (HIS) dị na Thailand dokwara ka o jekwuru Ụlọ Ọgwụ Maka Ọrịa Ụbụrụ na Akwara nke Kọleji Ụmụ Nwanyị Maka Ahụ Ike na Ọgwụ na Tokyo. Ụlọ ọgwụ ahụ agwọwo ihe karịrị 200 ndị nwere ọrịa akpụ ụbụrụ na-eji mma ụzarị ọkụ na-eme ihe, otu n’ime ihe ndị pụtara ọhụrụ n’usoro iji ụzarị ọkụ agwọ ọrịa.

E mere ndokwa ka Cheng binyere Ndịàmà bụ́ ndị Japan bi nso n’ụlọ ọgwụ ahụ. Otu ìgwè zutere ya n’ọdụ ụgbọ elu, tinyere Ndịàmà Jehova abụọ na-asụ asụsụ Thai na otu onye nnọchianya HIS. Mgbe ihe dị ka otu izu nke ile ya ahụ gasịrị, e nyere Cheng àkwà n’ụlọ ọgwụ bụ́ ebe e ji mma ụzarị ọkụ ahụ na-agwọ ya. Ihe omume ahụ were nanị ihe dị ka otu hour. Mgbe o si n’ụlọ ọgwụ ahụ pụta n’echi ya, Cheng nọ n’ụzọ ịlaghachi Thailand n’ụbọchị na-eso ya.

“Ọ dịghị mgbe m chere na a pụrụ isite ná ndokwa a nye enyemaka dị ukwuu dị otú a,” ka Cheng kwuru. “Obi tọrọ m nnọọ ụtọ n’ịhụnanya e gosiri nakwa ná nkwado nke ndị nile tinyere aka ha.”

Mgbe ọ na-akọ akụkọ a, akwụkwọ akụkọ Japan bụ́ Mainichi Shimbun kwuru, sị: “Ruo ugbu a, e mewo ka ịjụ mmịnye ọbara n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe pụta ìhè. Otú ọ dị, mmịnye ọbara nwere ihe ọjọọ ọ na-arụpụta dị ka ọrịa AIDS, ihe ize ndụ nke ibute ọrịa ndị nje virus na-akpata dị ka ịba ọcha n’anya nke C, na nsogbu ihe ndị ahụ na-anabataghị. N’ihi nke a e nwere ndị ọrịa na-adịghị achọ mmịnye ọbara n’agbanyeghị nkwenkwe okpukpe ha.”

Akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “A manyewo ọtụtụ ndị ọrịa jụrụ mmịnye ọbara ịgbanwe ụlọ ọgwụ, ma e nwere mkpa ka e nwee mgbanwe n’akụkụ nke ndị ọrụ ọgwụ n’ịkwanyere ọchịchọ nke onye ọrịa ùgwù. A chọrọ nkweta site n’ihe a maara (onye ọrịa inweta nkọwa zuru ezu nke ihe ndị ọ gụnyere, mgbe ahụzi ikwenye n’ọgwụgwọ ahụ), a gụpụghịkwa okwu ndị metụtara mmịnye ọbara. E kwesịrị ịmara na nke a abụghị okwu metụtara nanị otu okpukpe.”

Dị ka Cheng Sae Joo, ọtụtụ ndị bụ́ ndị họọrọ ọgwụgwọ n’ejighị ọbara aghaghị ịgafe n’ụlọ ọgwụ ndị ọzọ. Otú o sina dị, ha na-enwe ekele maka mgbalị nke ndị dọkịta dị njikere ịkwanyere ikike ha dị ka ndị ọrịa ùgwù.

Ndịàmà Jehova nọ n’alaka dị iche iche nke Watch Tower Society guzobere Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ iji nweta nkwado nke ndị dibịa na-akwanyere nkwenkwe ha ùgwù. N’ụwa nile, HIS na-ewulite ịrụkọ ọrụ ọnụ nke ha na ụlọ ọgwụ, ndị dibịa, ndị ọrụ nlekọta ahụ ike, ndị ọkàiwu, na ndị ọkàikpe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya