Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ihe Ike Na-akawanye Njọ
  • Ibu Ọrụ Ka Ukwuu Nye Ndị Inyom
  • Okpukpe ‘n’Usoro Nzirịta Ozi’
  • Okooko Osisi Buru Nnọọ Ibu, Nwere Nnọọ Ísìsì Ọjọọ
  • Ọ̀ Bụ Lourdes nke Itali?
  • “Agha Nsọ” nke Brazil
  • Igbu Mmadụ nke Ndị Òtù Nchebe
  • Nsogbu nke Inwe Nnụnụ Condor Ndị Nọ n’Oge Uto
  • Nchepụta Ihe Omimi nke Ọwa Mmiri
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jerusalem n’Oge Bible—Gịnị Ka Nkà Mmụta Ihe Ochie Na-ekpughe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Teta!—1996
g96 6/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Ime Ihe Ike Na-akawanye Njọ

Nye ndị na-eche na ihe omume egwuregwu ndị dị ka asọmpi ịkụ ọkpọ ma ọ bụ iji aka efu alụ ọgụ abụchaghị ime ihe ike, ndị nkwalite na United States ewepụtawo ụzọ ime ihe ọzọ nke a na-akpọ “ịlụ ọgụ gabigara ókè,” ma ọ bụ “ịlụ ọgụ kasịnụ.” Dị ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times si kwuo, otú e si eme ya dị mfe: “Ndị ikom abụọ ahụ na-eti onwe ha ihe ruo mgbe otu onye chiliri aka elu ma ọ bụ bụrụ onye a kụrụ ihe nke na ọ makwaghị onwe ya.” Ha adịghị agbanye ihe n’aka iji mee ka ọkpọ ahụ dịtụ nro; e nweghị oge nkebi ma ọ bụ oge nkwụsịtụ; e nwere ụkpụrụ nduzi ole na ole e wezụga mgbochi megide ịta arụ ma ọ bụ ịghụpụ anya. Ndị na-eme ya na-eji ụzọ ime ihe nke ịkụ ọkpọ, igwu aka, kareti, ịgba mgba, ma ọ bụ ịlụ ọgụ okporo ámá eme ihe—ọtụtụ mgbe a na-enwe mwụfu ọbara. A na-alụ ọgụ ahụ n’ihu ìgwè ndị nkwado na-anụbigara ihe ọkụ n’obi ókè, bụ́ ndị na-akwụ ihe ruru $200 maka tiketi; ọgụ ndị ahụ bụkwa ihe a ma ama na cable TV na dị ka kaseti vidio a na-anara n’ibe. Otú ọ dị, ọtụtụ steti amachibidowo ihe omume ndị a iwu.

Ibu Ọrụ Ka Ukwuu Nye Ndị Inyom

Ndị ikom na ndị inyom hà na-ekerịta ọrụ n’ụzọ hà nhata n’ebe obibi? Ee e, dị ka nnyocha Ọfịs Etiti Na-ahụ Maka Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ na Germany mere si kwuo. Ndị ọkachamara n’okwu akụ̀ na ụba bụ́ Norbert Schwarz na Dieter Schäfer gwara 7,200 ezinụlọ ka ha hazie ma gbakọọ oge ha na-etinye n’ịrụ ọrụ n’ebe obibi. Nnyocha ahụ gụnyere ọrụ ndị dị ka ịsa arịa nri, ịzụta ihe n’ahịa, ilekọta ndị ikwu na-arịa ọrịa, na ịrụzi ụgbọ ala. “N’agbanyeghị ma hà nwere ọrụ ma ọ bụ na ha enweghị, ndị inyom na-etinye ihe dị ka okpukpu abụọ nke oge ndị ikom na-eji arụ ọrụ n’ịrụ ọrụ ndị a na-adịghị akwụ ụgwọ maka ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung na-akọ.

Okpukpe ‘n’Usoro Nzirịta Ozi’

Ndị na-eji kọmputa achọpụta “usoro nzirịta ozi,” ọtụtụ usoro njikọ nchịkọta ihe ọmụma maka kọmputa, nwere nhọrọ okpukpe ka ukwuu ime taa. Usoro Njikọ Ụwa ahụ nwere Peji Meri ugbu a, ebe onye nwere oké ọchịchọ ịmata ihe pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ iri a kasị ajụ banyere Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke, dị ka ihe mere e ji ese ya mgbe nile dị ka onye yi uwe na-achatụ anụnụ anụnụ. A na-eji akụkụ a na-akpọ Jụọ Ndị Amish gosipụta ndị Amish, bụ́ ndị na-anabataghị nkà na ụzụ ndị dị ka ọkụ eletrik. A na-egosi ha ajụjụ ndị e bipụtara ebipụta, ha na-aza site n’iji aka ede ihe, a na-ejikwa kọmputa eziga azịza ndị ahụ—site n’ígwè ọrụ ọzọ. Magazin bụ́ The Christian Century na-ekwu na e nwere “nchịkọta ihe ọmụma kọmputa” ugbu a ná Njikọ Dị n’Ime a na-akpọ Ụlọ Ikwuu Nkwupụta, bụ́ ebe ígwè ọrụ bụ onye ụkọchukwu na-ajụ sị, “Gịnịkwa bụ njọ ị chọrọ ikwupụta?” Ahịrị nke na-esonụ bụ ọtụtụ azịza a na-esi na ha ahọrọ. “Emere m mmehie ndị na-esonụ: (Igbu Mmadụ) (Ịkwa Iko) (Enweghị Mmasị n’Ihe Ime Mmụọ) (Ọchịchọ Ọjọọ) (Ọchịchọ Gabigara Ókè n’Ihe Onwunwe) (Nrafu) (Nribiga Ihe Ókè) (Nganga) (Iwe) (Anyaukwu) (Idebe Ihe Ndị Na-ekwesịghị Ekwesị n’Ọnọdụ Mbụ).”

Okooko Osisi Buru Nnọọ Ibu, Nwere Nnọọ Ísìsì Ọjọọ

Okooko osisi kasị ukwuu n’ụwa bụ ihe okike pụrụ iche n’ezie. A na-akpọ ya rafflesia, ọ hà nnọọ ka taya bọs, na-ewekwa ogologo oge ọ na-ewe mmadụ iji tolite site ná ntụrụ ime ruo ọmụmụ iji gbawaa okooko. Ókè ọ hà abụghị nanị ihe mere okooko osisi a ga-eji ghara ịdị mma ikekọta ya n’úkwù. Ọ na-esi ajọ ìsì. Iji dọta ijiji dị ya mkpa iji fesa ya ntụ okooko osisi, rafflesia na-esi dị ka anụ rere ere. N’oge gara aga, ndị bi n’ime obodo Malaysia bụ́ ndị bi n’ọhịa nnukwu mmiri ozuzo ebe rafflesia na-eto akpọwo ya efere ekwensu, gbutusịakwa ya ma a hụ ya. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ South China Morning Post si kwuo, ogige gọọmenti Malaysia bụ́ Kinabalu emewo ihe iji chebe okooko osisi a dị ụkọ, ka ndị ọkà mmụta sayensị wee nwee ike ịmụkwu ihe banyere ya. Ndị bi n’ime ime obodo na-enwetakwu ego ugbu a site n’iduru ndị na-eme njem nleta gaa n’ime oké ọhịa ahụ ka ha see rafflesia foto. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ na-anọ n’ebe dị anya site n’ebe ọ dị.

Ọ̀ Bụ Lourdes nke Itali?

N’obodo Itali bụ́ Civitavecchia, e kwuru n’oge na-adịbeghị anya na ihe a kpụrụ akpụ nke Madonna ebepụtawo ọbara, na-akpata nnubata nke ọtụtụ iri puku nke ndị nkiri nwere ọchịchọ ịmata ihe na ndị na-eme njem ala nsọ. N’ihi nke a, onye isi obodo, bụ́ Pietro Tidei, bụ́ onye na-akpọ onwe ya onye na-ekweghị ekwe, sooro otu onye isi ndị Katọlik gaa France. Ha letara obodo ahụ a ma ama bụ́ Lourdes, nke a maara n’ihi ebe nsọ Katọlik ya nke a na-eche na “ọrụ ebube” na-eme na ya. Nleta ahụ abụghị nleta ala nsọ. Kama, ebumnuche ya bụ ịmụ banyere “ọrụ ebube ọnọdụ akụ̀ na ụba” nke Lourdes, dị ka ihe àmà na-egosi, iji nweta echiche nke otú a ga-esi hazie ma jiri Civitavecchia mee ihe dị ka Mecca na-enye ego maka ndị na-eme njem nleta na ndị na-eme njem ala nsọ.

“Agha Nsọ” nke Brazil

Otu pastọ Pentecostal na Brazil malitere na nso nso a ihe ụlọ ọrụ mgbasa ozi mba ahụ kpọworo agha nsọ. N’otu mgbasa ozi TV nke zuru mba ahụ, pastọ ahụ, bụ́ Sergio von Helde, katọrọ ofufe ihe oyiyi nke Chọọchị Katọlik. Iji mee ka a ghọta ihe ọ na-ekwu, o gosipụtara otu ihe oyiyi nke Our Lady of Aparecida, bụ́ Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke dị ojii nke na-eje ozi dị ka sentị ntụzi nye ndị Katọlik Brazil dị 110,000,000. Von Helde kpọrọ ihe oyiyi ahụ “ihe ihere e ji egwuri egwu, nke dị oké njọ” ka ọ na-eti ya aka ma na-agba ya ụkwụ ugboro ugboro. Ọtụtụ puku ndị Katọlik emewo mkpesa, na-eburu ihe oyiyi nke sentị ntụzi ahụ na-agagharị n’okporo ámá. Ìgwè ndị na-eme ihe ike na-eti mkpu, na-atụ nkume agbawo ụlọ nsọ ụfọdụ nke òtù Pentecostal nke Von Helde, bụ́ nke a na-akpọ Universal Church of the Kingdom of God gburugburu. Von Helde, nke onye isi chọọchị a napụworo ọkwá ya kemgbe, na-ata usoro mgbasa ozi ụta maka ịnọgide na-egosi ihe nkiri nke mwakpo ya. “TV Globo [usoro njikọ telivishọn kasị ukwuu nke mba ahụ] emewo ka m ghọọ ajọ mmadụ,” ka pastọ ahụ na-azọrọ.

Igbu Mmadụ nke Ndị Òtù Nchebe

Na South Africa, otu ìgwè na-eme ihe ike iwe ji buuru otu ìgwè a na-enyo enyo dị ka ndị na-apụnara ụgbọ ala, site n’ebe obibi ha, gbujasịa ha, ma were ágbá kpugide ha. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Saturday Star kwuru na ịrị elu e nwere n’ihe omume ndị dị otú ahụ bụ “ihe mgbaàmà nke ọha mmadụ na-atụkwasịkwaghị ndị uwe ojii ya obi, na nke na-echegbu onwe ya ma na-egosipụta oké mkpali banyere ime mpụ.” Ọ bụ ezie na ha adịghị akwado akparamàgwà dị otú ahụ, ndị ọkachamara n’ihe banyere mpụ na-ele omume nke ite ndị e jidere ágbá mgbe e gbusịrị ha anya dị ka ihe nwere ihe ọ pụtara. E mere ya dị ka ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị ọzọ pụrụ ịghọ ndị ome mpụ. Otu ọkachamara n’ihe banyere mpụ kwuru, sị: “Ihe àmà nile bụ na ọnọdụ ahụ bụ nnọọ nke a na-apụghị ịchịkwa achịkwa, nakwa na ọha mmadụ enwekwaghị ike ịnakwere echiche ahụ bụ́ na ndị ome mpụ ji ha eji.”

Nsogbu nke Inwe Nnụnụ Condor Ndị Nọ n’Oge Uto

Nnụnụ condor nke California—nnukwu nnụnụ na-eri anụ nwụrụ anwụ, bụ́ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe pụworo n’anya na narị afọ a—na-ewetara ndị ọkà n’ichebe ihe e kere eke, bụ́ ndị na-anwa ịtọhapụ nnụnụ condor a zulitere n’ebe e ji ha eji ka ha banye n’ọhịa, ihe ịma aka pụrụ iche. Nnụnụ ndị a tọhapụrụ mgbe ha ka nọ n’oge uto, nọ “n’agba ha nke ịchọpụta ihe, afọ iri na ụma, ịnwapụta ihe nile,” ka otu onye ọkà n’ichebe ihe e kere eke nke e hotara na magazin bụ́ New Scientist na-ekwu. Enweghị ụjọ maka ụmụ mmadụ ma ọ bụ nke eriri eletrik emewo ka ọtụtụ tụfuo ndụ ma ọ bụ nnwere onwe ha. Ya mere ndị ọkà n’ichebe ihe e kere eke emepụtawo ụzọ ọhụrụ nke isi zụlite ụmụ nnụnụ condor. Ha na-eji ikike ndọrọ dị nro eme ihe iji kụziere ụmụ nnụnụ ahụ izere ebe e nwere eriri eletrik. Iji kụziere ha izere ndị mmadụ, ha na-apụ n’ebe nnụnụ condor ndị ahụ ga-ahụ ha, e wezụga oge mgbe ọtụtụ ndị mmadụ na-achụso nnụnụ ahụ, jide ya, ma jigide ya n’azụ ya. “Nnụnụ condor adịghị enwe mmasị na nke a,” ka New Scientist na-ekwu, n’ihi ya kwa ha na-amụta izere ndị mmadụ. Ruo ugbu a, ụzọ ime ihe ahụ enwewo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma.

Nchepụta Ihe Omimi nke Ọwa Mmiri

Ọ dịwo anya ndị ọkà mmụta ihe ndị e gwupụtara n’ala na-enwe ihe ijuanya banyere ihe mere ụzọ mmiri Hezekaia, nke e gwuru na narị afọ nke asatọ T.O.A. iji jide n’aka na e nwere mmiri na Jerusalem mgbe usuu ndị agha Asiria gbara ya gburugburu, ji gbagọọ agbagọ n’ụzọ dị otú ahụ. Ụzọ na-agbagọghị agbagọ, nke ka mma gaara ewe nanị igwu ala dị 320 mita, kama 533 mita ọwa mmiri ahụ were. A hụrụ ihe odide, nke e dere n’asụsụ Hibru ochie ná mgbidi nke ọwa mmiri ahụ na 1880. Ọ kọwara otú ìgwè ndị ọrụ abụọ si malite n’isi abụọ nke ọwa mmiri ahụ a wara n’ime nkume ma zute n’etiti. Nke a welitekwuru ajụjụ banyere otú ha si nwee ike ime otú ahụ, n’iburu ụzọ gbagọrọ agbagọ nke ọwa mmiri ahụ n’uche. Ndị ọkà mmụta ọdịdị ala chere ugbu a na ha nwere azịza ya. Dị ka Dan Gill nke Òtù Nnyocha Ọdịdị Ala nke Israel si kwuo, ndị ọrụ ahụ gbasoro ma gbasawanye ụzọ ndị sitere n’okike nke mmiri ndị na-esi na nkume agbapụta mere n’ebe e nwere mgbawa ala n’okpuru nrụgide nke ala ọma jijiji ma ọ bụ ebe mkpo dị iche iche nke ala zutere. Mgbe oge na-aga, ndị a pụrụ nnọọ ịsa mbara n’ọtụtụ ebe, nke pụrụ ịkọwa ihe mere ịdị elu nke ọwa mmiri ahụ ji dịgasị iche iche site na 1.7 mita ruo ihe dị ka 5 mita, nakwa otú ndị ọrụ ahụ, bụ́ ndị ji oriọna a na-etinye mmanụ eme ihe, si nwee ike inweta ikuku zuru ezu. Ndị ọrụ ahụ nwekwara nkà, n’ihi na ihe ịga nke ọma nke ọwa mmiri ahụ dabeere n’inwetụ mkpọda—nanị 31.75 sentimita n’ebe ụzọ ahụ nile dị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya