Ewo, Ka M Kurutụ Ikuku Dị Ọcha!
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN
MGBE i kuuru ume, ị̀ na-ekuru ikuku dị ọcha? Mmetọ ikuku ụbọchị anyị a bụ “onye iro dị ukwuu karịa ise siga,” ka otu dọkịta e hotara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-azọrọ. N’England na Wales, ikuku e metọrọ emetọ na-egbu ndị mmadụ e mere atụmatụ ya ịbụ 10,000 kwa afọ. N’ụwa nile, karịsịa n’obodo ukwu dị iche iche, ọnọdụ ahụ dị njọ.
Ọtụtụ ndị na-ata ụlọ ọrụ na-emepụta ụgbọ ala ụta maka imetọ mbara ikuku. Iji belata nkupụ anwụrụ dị ize ndụ, ụgbọ ala ndị ọhụrụ n’ọtụtụ mba ugbu a na-ebu catalytic converter, bụ́ nke na-ebelata mmetọ. Hydrocarbon ndị dị na gas e kupụrụ ekupụ adalatawo ruo pasent 12 nke ọ̀tụ̀tụ̀ e nwere na 1970, na-enwekwa ndalata yiri nke ahụ na nitrogen oxide na carbon monoxide. Obere ụmụaka ndị e bu n’ihe e ji akwagharị ụmụaka bụ ndị a na-ekpughe nye ihe na-emerụ ahụ karịsịa n’ihi na a na-akwagharị ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu ebe ụgbọ ala si akwụpụ anwụrụ. Ma mmetọ ikuku na-eyikwa ndị nọ n’ime ụgbọ ala egwu. A na-akọ na mmetọ ahụ ji okpukpu atọ dị elu n’ime ụgbọ ala karịa n’èzí. Ihe ize ndụ ndị ọzọ na-abịa site n’ikuru anwụrụ bụ́ benzene nke na-esite na mmanụ ụgbọ ala ka ị na-agbanye mmanụ na tank ụgbọ ala gị.
Ugbu a ụdị kasị zuo ebe nile nke mmetọ ikuku n’ụwa nile bụ “Iberibe Ihe Ndị Na-ese n’Elu,” ka akụkọ ndekọ ọnụ ọgụgụ gburugburu ebe obibi 1993-1994 nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu. N’ụzọ doro anya, ụmụ iberibe anwụrụ nwere ikike ịbami n’ime akpa ume ma tinye ọgwụ ndị na-emerụ ahụ n’ebe ahụ.
Ụlọ ọrụ ndị na-agbasa akụkọ ekwuwo ọtụtụ ihe banyere mmebi nke ihe mkpuchi ozone n’elu mbara ụwa. Otú ọ dị, na mbara ala, ìhè anyanwụ na-emetụta nitrogen oxide na ihe ndị na-ekupụ oké ngwa ngwa nke mmetọ ikuku iji mepụta ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu nke ozone. Ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a adịwo okpukpu abụọ na Britain n’ime narị afọ a. Gas ndị a na-emebi ágbá na ihe ndị ọzọ e ji ewu ụlọ, na-akpata ọrịa osisi, osisi nta, na ihe ọkụkụ, yiekwa ka ọ na-akpatara ụfọdụ ndị nsogbu iku ume. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime mmetọ ozone na-ewere ọnọdụ n’obodo ndị mepere emepe, n’ụzọ na-eju anya ọ bụ ime obodo dị iche iche na-enwe mmetụta ndị kasị njọ. N’obodo ndị mepere emepe, nitrogen oxide na-amịkọrọ ozone ndị fọrọ afọ, ma n’ebe oxide ndị a na-adịghị ọtụtụ, ozone na-enwere onwe ya ịkpata ọdachi.
Ọzọkwa, mmetọ ikuku ji “ihe ruru 70 ugboro dị elu n’ime ebe obibi karịa n’èzí,” ka The Times na-akọ. N’ebe a anwụrụ ndị sitere n’ihe ndị na-eme ka ikuku na-esi ìsì ụtọ, ọgwụ e ji egbu nla, na ọbụna ákwà ndị e ji ọgwụ sụọ na-emetọ ikuku. Anwụrụ ọkụ siga na-etinyekwa ihe n’ihe ize ndụ ahụ ike n’ime ụlọ.
Mgbe ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji chebe ezinụlọ gị? The Times nke London na-atụ aro ndị na-esonụ.
• Belata ojiji i ji ụgbọ ala eme ihe. Ọ bụrụ na o kwere omume, soro ndị ọzọ na-eme njem. Jiri nwayọọ na-anya ụgbọ ala. Ọ bụrụ na ị dabaa n’ebe e nwere agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọ ala ma ọ bụ kwụrụ otu ebe ruo ihe karịrị minit abụọ, gbanyụọ injin. Ọ bụrụ na o kwere omume, dọba ụgbọ ala gị na ndò n’ụbọchị oké anwụ iji belata mmetọ nke mmanụ ụgbọ ala na-ekupụ ekupụ na-akpata.
• Họrọ inwe mmega ahụ n’isi ụtụtụ mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ ozone ndị dị n’èzí na-adịkarị ala.
• Maa iwu ka a ghara ise siga n’ebe obibi.
• Mepetụ window ọnụ ụlọ ihi ụra n’abalị iji belata okpomọkụ ma mee ka ihe ndị na-akpata allergy pụọ n’ezí.
Obi abụọ adịghị ya na i kwenyere: Ewo, ka m kurutụ ikuku dị ọcha!