Okpukpe Ụwa Hà Nọ Nso Ọgwụgwụ Ha?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SWEDEN
ISIOKWU a ọ̀ na-eme ka ị jụọ, sị: ‘Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Ọ̀ bụ na okpukpe ụwa enweghị ume ma na-akpa ike n’ụwa nile taa?’
Ee, n’agbanyeghị na ha nọ n’ọtụtụ nsogbu, ha yiri ka ha na-akpa ike. Na narị afọ nke 20 nke a, e nwewo obi abụọ n’ebe okpukpe dị, e kpughewokwa ya karịa ka e metụworo n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. Ndị na-enyocha mbara igwe ejiriwo nnukwu enyo ha ji ahụ ihe dị anya nyochaa mbara igwe na ala dum, ndị na-eme njem mbara ikuku agawokwa igwe ihu na azụ; dịkwa ka otu onye Soviet na-eme njem mbara ikuku si kwuo ya, ha ‘ahụghị Chineke ma ọ bụ ndị mmụọ ozi.’ Ndị ọkà n’ihe ọmụmụ physics agbariwo matter gaa n’iberibe dị nnọọ nta n’achọpụtaghị ikike ọ bụla nke Chineke n’ebe ndụ si bido. Ndị ọkà ná mmụta ihe dị ndụ na ndị ọkà mmụta n’ihe ndị dị ndụ n’oge gara aga na-azọrọ na ha emezigharịwo ogologo njikọ nnwogha nke ndụ, malite n’amoeba gaa na mmadụ, n’ahụghị njikọ kasị nta nke ike ihe n’ebe ọ bụla ná njikọ ahụ.
Otú ọ dị, amamihe ụwa na nkà ihe ọmụma ịhụ ihe onwunwe n’anya adawo n’ihichapụ echiche okpukpe na mbara ụwa a, ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekweghị na Chineke na nkà ihe ọmụma enwebeghịkwa ihe ịga nke ọma karịa ha. Eri ihe karịrị afọ 70, ọchịchị aka ike na ekweghị na Chineke nke ndị Kọmunist asịwo na okpukpe bụ nkwenkwe ụgha na “ọgwụ mmegharị anya nke ọha mmadụ,” wepụ ndị ndú okpukpe n’ọkwá ma machibido ọrụ ha iwu, bibie ma ọ bụ bukọrọ ngwongwo dị na chọọchị na ụlọ nsọ dị iche iche, tigharịa ndị na-efe ofufe anya ma gbuo ha. Ma omume ndị dị otú ahụ ewepụghị echiche okpukpe. Ozugbo ọchịchị ndị ahụ dara, okpukpe si n’ọnọdụ mweda n’ala bilie, na-enwe ike yiri ka e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ. N’ala bụbu nke ọchịchị ndị Kọmunist, ndị mmadụ na-agbaghachi n’ụlọ nsọ ochie ha, na-egbu ikpere n’ala n’ofufe nsọpụrụ ha dị ka ndị nna nna ha mere tupu ha.
Echiche okpukpe ka sikwara ike n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Kwa afọ, obodo ukwu bụ́ Mecca, dị na Saudi Arabia, na-anabata ọtụtụ nde ndị Alakụba na-eme njem ala nsọ site na gburugburu ụwa. Ndị okpukpe Katọlik chọrọ iji anya gwuru popu ma na-atụ anya inweta ngọzi ya na-ejupụta mgbe nile na St. Peter’s Square dị na Vatican. Ọtụtụ nde ndị okpukpe Hindu na-anọgide na-enuba n’ọtụtụ narị ebe njem ala nsọ n’ụsọ osimiri “nsọ” ndị dị n’India. Ndị Juu na-efe ofufe na-enuga n’ìgwè ná Mgbidi Ákwá dị na Jerusalem ikpe ekpere, na-ahapụkwa ekpere ha e dere ede n’oghere ndị dị ná mgbidi ahụ.
Ee, o yiri ihe na-apụghị ikwe omume ikpochapụ okpukpe n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. “Mmadụ site n’otú e si kee ya bụ anụmanụ na-enwe mmasị n’okpukpe,” ka nwa amaala ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị Ireland bụ́ Edmund Burke kwuru. N’ụzọ ndekọ ọnụ ọgụgụ, mmadụ 5 n’ime 6 n’elu ụwa na-ekpe okpukpe ụfọdụ ruo n’ókè ụfọdụ. Dị ka ọnụ ọgụgụ ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya si dị, e nwere ihe dị ka 4.9 ijeri ndị nkwado okpukpe e guzobere eguzobe n’ụwa, ebe e nwere nanị ihe dị ka nde 842 na-enweghị mmasị n’okpukpe.a
N’iburu nke a n’uche, ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na okpukpe ụwa na-eru nso ọgwụgwụ ha? Ọ bụrụkwa na ha na-eru, olee mgbe, oleekwa ụzọ ha ga-esi gwụ? À ga-enwe okpukpe ga-afọdụ? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a n’isiokwu abụọ na-esonụ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe” na-agụnye: “Ndị na-enweghị okpukpe ha na-asị na ha na-ekpe, ndị na-ekweghị ekwe, ndị na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị, ndị na-adabere n’echiche nke aka ha, ndị jụrụ okpukpe na-enweghị mmasị n’okpukpe ọ bụla.”
[Foto dị na peeji nke 3]
St. Peter’s Square, Vatican City