Ilekọta Onye ahụ Na-enye Nlekọta—Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka
“MỤ NA Lawrie alụwo di na nwunye ruo afọ 55—ogologo oge—leekwa afọ obi ụtọ ha bụ! A sị nnọọ na m nwere ike ilekọtaworị ya n’ụlọ, m gaara eme ya. Ma ahụ ike m malitere ịdakpọ. N’ikpeazụ, aghaghị m ime ndokwa ka a kpọga ya n’ebe a na-elekọta ndị ahụ na-adịghị ike. Ihe mgbu mmetụta uche nke ịkọ ihe a fọrọ nke nta ka o sibigara m ike ókè. Ahụrụ m ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ụzọ dị omimi ma na-aga eleta ya ọtụtụ ugboro dị ka m nwere ike. N’ụzọ anụ ahụ, apụghị m imekwu ihe.”—Anna, nwanyị dị afọ 78 nke lekọtaworo di ya na-arịa Alzheimer’s disease ruo ihe karịrị afọ 10, o lekọtawokwa nwa ha nwanyị na-arịa ọrịa Down’s syndrome kemgbe afọ 40 gara aga.a
Ọnọdụ Anna abụghị ma ọlị ihe a na-adịghị ahụkebe. Otu nnyocha e mere na British Isles kpughere na “n’ime ọgbọ ụfọdụ (afọ ndị 40 na 50) ihe ruru otu n’ime ụmụ nwanyị abụọ ọ bụla bụ onye nlekọta.” Dị ka a tụlere na mbụ, oké ọgba aghara mmetụta uche na nsogbu nke ndị na-enye nlekọta na-eche ihu pụrụ iyi ihe a na-apụghị ịnagide mgbe ụfọdụ.
“Echere m na ọ dịkarịa ala 50% nke ndị na-enye nlekọta na-enwe ịda mbà n’obi n’ime afọ mbụ nke inye nlekọta,” ka Dr. Fredrick Sherman, nke Òtù Maka Ime Agadi nke America na-ekwu. Nye ndị meworo agadi dị ka Anna, ume nke ha na-ebelata ebelata na ahụ ike na-adakpọ adakpọ pụrụ ime ka ọnọdụ ahụ sikwuo nnọọ ike ịnagide.
Iji nyere ndị na-enye nlekọta aka ịrụ ọrụ ha, ọ dị anyị mkpa ịmata mkpa ha. Gịnị bụ mkpa ndị ahụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ihe banyere ha?
Ikwurịta Okwu Dị Ndị Na-enye Nlekọta Mkpa
“Ọ dị m mkpa ibotu onwe m ibu arọ,” ka otu nwanyị nke nyere aka lekọta enyi ya na-anwụ anwụ kwuru. Dị ka e gosiri n’isiokwu bu ụzọ, ọ na-akakarị mfe iche nsogbu ihu na ịnagide ha mgbe a pụrụ isoro enyi nwere nghọta kwurịta ha. Ọtụtụ ndị na-enye nlekọta bụ́ ndị na-eche na ha tọrọ atọ n’ọnọdụ ha na-achọpụta na ikwurịta banyere ọnọdụ ha na-enyere ha aka ime ka mmetụta ha doo anya na ibelata nrụgide ndị dị n’ime.
“Ọ masịrị m mgbe ndị enyi chọpụtara na nkwado uche dị anyị abụọ mkpa,” ka Jeanny na-echeta banyere oge ọ nọ na-elekọta di ya. Ọ na-akọwa na ndị na-enye nlekọta chọrọ agbamume na, mgbe ụfọdụ, onye ga-aṅa ha ntị. Hjalmar, onye nyere aka lekọta ọgọ ya nwoke, na-ekweta, sị: “Achọrọ m onye ga-ege ntị n’egwu m na nsogbu m ma ghọta otú ọ dị m.” Banyere otu ezigbo enyi ya, Hjalmar na-ekwukwasị: “Ọ dị nnọọ mma ije leta ya, ọ bụrụgodị nanị ọkara hour. Ọ ga-ege m ntị. Ọ na-eche banyere m n’ezie. M na-enweta ume ọhụrụ mgbe nke ahụ gasịrị.”
Ndị na-enye nlekọta pụrụ inweta agbamume dị ukwuu site n’onye na-ege ntị nke nwere nghọta. “Bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu,” ka Bible ji amamihe na-adụ n’ọdụ. (Jemes 1:19) Otu akụkọ dị na The Journals of Gerontology kpughere na “ọtụtụ mgbe nanị ịma na e nwere nkwado ezuola iweta ahụ efe dị ukwuu.”
Otú ọ dị, e wezụga onye na-ege ntị na nkwado uche, gịnị ọzọ dị ndị na-enye nlekọta mkpa?
Inye Enyemaka Bara Uru
“Onye ọrịa na ndị ezinụlọ na-erite uru site n’ụzọ ọ bụla a pụrụ isi gosipụta ịhụnanya na agbamume,” ka Dr. Ernest Rosenbaum na-ekwu. Nke mbụ, a pụrụ igosipụta ụdị “ịhụnanya na agbamume” ahụ n’oge nleta onwe onye, n’oge a na-akpọ na fon, ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi dị mkpirikpi (ikekwe nke ya na okooko osisi ma ọ bụ onyinye ọzọ so).
“Ọ bụ ihe na-akasi obi mgbe ndị enyi anyị bịara nleta dị mkpirikpi,” ka Sue na-echeta banyere nkwado nke ezinụlọ ya nwetara mgbe nna ya na-anwụ n’ihi ọrịa Hodgkin’s disease. “Otu n’ime ndị enyi m,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “zara fon ma nye aka n’ịsa na idere anyị nile ákwà.”
Inye ndị na-enye nlekọta nkwado pụrụ, o kwesịkwara, ịgụnye enyemaka doro anya, nke gbara ọkpụrụkpụ. Elsa na-echeta, sị: “Achọpụtara m na ọ na-enye aka mgbe ndị enyi nyere aka bara uru. Ha ekwughị nanị: ‘Ọ dị nnọọ ihe ọ bụla m pụrụ ime, mee ka m mara.’ Kama nke ahụ, ha sịrị: ‘M na-aga ịzụta ihe. Gịnị ka m pụrụ ịzụtara gị?’ ‘Ka m lekọtaranụ gị ubi gị?’ ‘Anọ m ya ịnọnyere onye ọrịa ahụ na ịgụrụ ya ihe.’ Ihe ọzọ anyị chọpụtara na-enye aka bụ ime ndokwa ka ndị ọbịa detuo ozi ha n’akwụkwọ mgbe ike gwụrụ enyi m na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe ọ na-ehi ụra. Nke ahụ wetaara anyị nile oké obi ụtọ.”
Ihe ndị e kwuru ka e nye aka na ha kpọmkwem pụrụ ịgụnye nke ọ bụla n’ọtụtụ ọrụ ụlọ. Rose na-akọwa, sị: “Enwere m mmasị n’enyemaka e nyere n’idozi àkwà, idere onye ọrịa ahụ akwụkwọ ozi ya, ilekọta ndị ọbịa nke onye ọrịa ahụ, inweta ọgwụ, ịsa na idozi isi, ịsa efere.” Ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi pụkwara inyere onye ahụ na-enye nlekọta aka site n’isi nri onye sie ibe ya esie.
N’ebe o kwesịrị ekwesị, ọ pụkwara ịba uru inye aka n’akụkụ ndị bụ isi ná nlekọta ndị ọrịa. Dị ka ihe atụ, onye ahụ na-enye nlekọta nwere ike ịchọ enyemaka n’inye onye ọrịa ahụ nri ma ọ bụ ịsa ya ahụ.
Ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi o metụrụ n’ahụ pụrụ inye aka bara uru ná mmalite nke ọrịa ahụ, ma gịnị ma ọ bụrụ na ọrịa ahụ na-adịte anya? N’ịbụ ndị usoro ihe omume anyị juru eju rikpuru, anyị pụrụ n’ụzọ dị mfe ileghara nrụgide na-aga n’ihu—na ikekwe nke na-arị elu—nke ndị na-enye nlekọta na-eche ihu anya. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mwute ma ọ bụrụ na nkwado ahụ dị oké mkpa amalite ịdalata!
Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ka onye ahụ na-enye nlekọta kpọọ nzukọ ezinụlọ iji tụlee nlekọta nke onye ọrịa ahụ. Ọtụtụ mgbe ọ na-ekwe omume inweta enyemaka ndị enyi na ndị ikwu ndị kwupụtaworo ịdị njikere inye aka. Nke a bụ ihe Sue na ezinụlọ ya mere. “Mgbe mkpa bilitere,” ka ọ na-akọ, “anyị chetara ndị kwetaworo inye aka ma kpọọ ha na fon. Anyị chere na anyị pụrụ ịrịọ ha maka enyemaka.”
Nyetụ Ha Ohere
“Ọ dị oké mkpa,” ka akwụkwọ bụ́ The 36-Hour Day na-ekwu, “nye ma gị [onye na-enye nlekọta] ma [onye ọrịa gị]—na ị na-enwe oge mgbe mgbe ‘ịpụ’ n’inye onye na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala nlekọta iri hour abụọ na anọ. . . . Iwere oge ezumike, pụọ ná nlekọta nke [onye ọrịa] ahụ, bụ otu n’ime otu mkpụrụ ihe ndị kasị mkpa ị pụrụ ime iji mee ka o kwe gị mee ịnọgide na-elekọta mmadụ.” Ndị na-enye nlekọta hà kwere?
“Ee n’ezie,” ka Maria na-aza, bụ́ onye nyere aka lekọta otu ezigbo enyi ya na-anwụ n’ihi ọrịa cancer. “Site n’oge ruo n’oge, ọ dị m mkpa ‘izurutụ ike’ nakwa ime ka onye ọzọ weghara nlekọta ahụ ruo nwa oge.” Joan, onye na-elekọta di ya na-arịa ọrịa Alzheimer’s disease nwekwara otu echiche ahụ. “Otu n’ime ihe ndị kasị anyị mkpa,” ka ọ na-ekwu, “bụ inwe oge ezumike site n’oge ruo n’oge.”
Otú ọ dị, olee otú ha pụrụ isi nweta oge ezumike pụọ ná nrụgide nke ibu ọrụ ha? Jennifer, onye nyere aka lekọta nne na nna ya meworo agadi, na-egosi otú o si nweta ahụ efe: “Otu enyi ezinụlọ anyị na-akpọrọ mama m mgbe ụfọdụ ruo otu ụbọchị ka anyị wee zurutụ ike.”
Ị pụrụ inwe ike inyetụ onye ahụ na-enye nlekọta ohere site n’ikwu ka ị kpọrọ onye ọrịa ahụ pụọ ruo nwa oge, ma ọ bụrụ na a pụrụ ime otú ahụ. Joan na-ekwu, sị: “Achọpụtara m na ọ na-enye ume ọhụrụ mgbe mmadụ kpọọrọ di m pụọ ka m wee nwee ike ịnọ nanị m site n’oge ruo n’oge.” N’aka nke ọzọ, ị pụrụ inwe ike isoro onye ọrịa ahụ nọrọ n’ebe obibi ya. N’ọnọdụ nke ọ bụla, mee ka o kwe onye ahụ na-enye nlekọta omume inweta ntụsara ahụ ahụ dị oké mkpa.
Otú ọ dị, buru n’uche na ọ naghị adịcha mfe mgbe nile ka ndị na-enye nlekọta zurutụ ike. Ha pụrụ inwe obi amamikpe banyere ịhapụ onye ha hụrụ n’anya puọ. “Ọ dịghị mfe isi n’ọnọdụ ahụ pụọ ma nwee ntụrụndụ ma ọ bụ ezumike,” ka Hjalmar na-ekweta. “Ọ dị m ka m chọrọ ịnọ ebe ahụ mgbe nile.” Ma o nwetara udo nke uche ka ukwuu n’izurutụ ike mgbe ọgọ ya nwoke na-achọkebeghị nlekọta. Ndị ọzọ emewo ndokwa ka a na-elekọta onye ha hụrụ n’anya n’ebe a na-elekọta ndị toworo eto n’ehihie ruo hour ole na ole.
Ọgwụgwụ nke Ọrịa Nile
N’ezie, ilekọta onye a hụrụ n’anya nke na-arịasi ọrịa ike bụ ibu ọrụ dị ukwuu. Ka o sina dị, ilekọta onye a hụrụ n’anya pụrụ ịbụ ihe obi ụtọ ma na-enye afọ ojuju. Ndị na-eme nchọpụta tinyere ndị na-enye nlekọta na-ezo aka ná mmekọrịta ndị e wusiwanyere ike nke ha na ezinụlọ na ndị enyi. N’aghaghị agha, ndị na-enye nlekọta na-amụta àgwà na ikike ndị ọhụrụ. Ọtụtụ na-enwetakwa uru ime mmụọ.
Nke kasị mkpa, Bible na-egosi na Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ ndị na-enye nlekọta kasị nwee ọmịiko. Amụma Bible na-emesi anyị obi ike na ọgwụgwụ nke ọrịa nile, ahụhụ, na ọnwụ dị nso. N’isi nso, Onye Okike mmadụ nke na-eche banyere ya ga-eji ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ahụ ike zuru okè—nke “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa”—wee kwụghachi ndị ezi omume bi n’ụwa ụgwọ ọrụ.—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
Ahụ ike nke onye ahụ na-arịa ọrịa dabeere kpọmkwem n’ahụ ike gị
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
Nkwado nke ezi ndị enyi ga-eme ihe dị ukwuu ime ka ị nagide oge ndị sikarịsiri ike
[Igbe dị na peeji nke 12]
Inye Nlekọta Pụrụ Ịdị Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
‘INYEGHACHI ụgwọ ọrụ?’ ka ụfọdụ pụrụ iche. ‘Olee otú ọ pụrụ isi mee?’ Biko rịba ama ihe ndị na-enye nlekọta na-esonụ gwara Teta!:
“Mmadụ ịhapụ nchụso na ọchịchọ nke ya apụtaghị inwe obi ụtọ dị ala. ‘Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.’ (Ọrụ 20:35) Ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye nnọọ afọ ojuju ilekọta onye ị hụrụ n’anya.”—Joan.
“Enwere m ekele na m pụrụ inyere nwanne m nwanyị na ọgọ m nwoke aka n’oge e nwere mkpa n’ezie—nke ha na-enweghị ike ịkwụghachi m. O mere ka anyị chie anya karị. Enwere m olileanya na otu ụbọchị m ga-enwe ike iji ahụmahụ m nwetaworo nyere onye ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ aka.”—Hjalmar.
“Dị ka m gwara enyi m ahụ na-adịghị bụ́ Betty ugboro ugboro, enwetara m ihe karịrị nnọọ ihe m nyere. Amụtara m mmetụta ọmịiko na ndidi. Amụtara m na o kwere omume ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi n’ọnọdụ ndị kasị sie ike.”—Elsa.
“Aghọrọ m onye siri ike karị. Abịara m mara n’ụzọ zuru ezu karị otú ọ na-adị bụ ịdabere n’ebe Jehova Chineke nọ kwa ụbọchị na ikwe ka o gboo mkpa m.”—Jeanny.
[Igbe dị na peeji nke 13]
Mgbe I Jere Ileta Onye Na-enye Nlekọta
• Jiri mmetụta ọmịiko gee ntị
• Nye ịja mma sitere n’obi
• Nye aka n’otu ihe kpọmkwem
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Kwadoo ndị na-enye nlekọta site n’ije zụtara ha ihe na isiri ha nri, ma ọ bụ site n’inyere ha aka ilekọta onye ọrịa ahụ