Chi Dị Nnọọ Ọtụtụ, Ruo Mgbe M Chọtara nke Ezigbo Ya
A MỤRỤ m na Croydon, England, na 1921, nwa agbọghọ nke tọchara n’ime ụmụ agbọghọ atọ na ụmụ nwoke abụọ. Mgbe m dị afọ atọ, ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ụmụaka rịawara ọrịa diphtheria. E nyere m àkwà n’ụlọ ọgwụ. Nwanne m nwoke bụ́ Johnnie nwụrụ, ma n’ihi na e meghị ya baptism, Chọọchị Anglịkan ekweghị eme ememe olili ozu. Nke a kpasuru papa m iwe, o wee rịọ otu n’ime ndị ụkọchukwu ma ọ̀ ga-ekpe ekpere mgbe ha ga-ebuda igbe ozu Johnnie n’ime ala. Ọ jụrụ.
Mama m kwuru na nke a wepụrụ papa m n’okpukpe kpam kpam. Ọ tụrụ oké ụjọ na ihe pụrụ ime m ma ọ bụ ụmụnne m ndị nwanyị nke na n’emeghị ka papa m mara, ọ kpọgara anyị na chọọchị, e wee mee anyị baptism. Papa m ghọrọ onye òtù Kọmunist na-anụ ọkụ n’obi ma gbaa anyị ume ịgụ ihe metụtara nkà nchepụta ihe ndị a na-ahụ anya, gụnyere akwụkwọ ndị Huxley, Lenin, na Marx dere. A kpọtụghị Chineke aha ma ọlị n’ụlọ e wezụga mgbe papa m ga-ekwu na Chineke adịghị.
Na 1931, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, ana m agbada n’okporo ámá mgbe ụfọdụ ịhụ nne na nna m ochie. Ndị ọzọ na-akatọkarị nna m ochie, ma anya ọma ya na-acha anụnụ anụnụ na-egbuke egbuke, ọ na-enwekwa obi ụtọ mgbe nile. Ọ na-enyekarị m ihe nracha ụfọdụ na ihe m ga-agụ ka m na-ala n’ụlọ. Ana m aracha ihe nracha ahụ ma tụfuo ihe ọgụgụ ahụ. Aghọtaghị m mgbe ahụ ihe mere ndị ọzọ ji na-ekwu ihe na-adịghị mma banyere ya.
Mgbe m nọ n’afọ iri na ụma m, esonyere m Òtù Ndị Kọmunist Na-eto Eto, ka oge na-agakwa ghọọ odeakwụkwọ ha. Enyere m okwu dị iche iche n’ụlọ ezumezu obodo, jirikwa akwụkwọ akụkọ bụ́ Challenge rụọ ọrụ okporo ámá, na-enye ya onye ọ bụla ga-ege ntị. N’oge ahụ, otu ìgwè ndị Fascist a kpọrọ Blackshirts na-arụsi ọrụ ike, ha na-emegidekwa echiche ndị Kọmunist nke ọjọọ ya. Echetara m na ka m guzo n’ebe ndị ụkwụ si aga na-enyefe Challenge ahụ, ndị òtù Blackshirts ga-abịa ma kwusara m okwu, na-akpọ m Sunshine, utu aha ha nyeworo m. Ndị ka nọtee aka n’òtù Kọmunist m nọ na ya chọpụtara na ndị Fascist na-eme atụmatụ iji ígwè a na-agba n’aka kụọ m ihe, ya mere ha malitere na-edunyere m onye nchebe.
N’otu oge, anyị chọpụtara na ndị Fascist na-aga ịzọ ije gafere Ngwụsị Ọwụwa Anyanwụ nke London (nke ihe ka ọtụtụ bi n’ime ya n’oge ahụ bụ ndị Juu). A gwara anyị ka anyị chechie ha ma were ma anyị gawa ọtụtụ akpa marble, bụ́ ndị anyị ga-atụnye n’okpuru ụkwụ ịnyịnya ndị uwe ojii ka ha na-etinye isi ikewa akụkụ abụọ ahụ na-emegide onwe ha. E jidere ọtụtụ n’ụbọchị ahụ, ma ọ dabara nke ọma na esoghị m ha, ebe m kpebiworo ịghara ije.
Akọ na Uche M Amalite Ịrụ Ọrụ
N’oge ọzọ, a gwara m ka m kwuo otu ihe ná nzukọ ọha na eze bụ́ nke m maara na-abụghị eziokwu. Ajụrụ m, e wee jụọ m, “Olee ọdịiche dị ya ma anyị kwupụtahaala isi ihe ahụ?” Ọ bụ n’oge a ná ndụ m ka akọ na uche m malitere isogbu m, amalitekwara m na-eche banyere ọtụtụ ihe.
Otu oge ná mmalite afọ iri na ụma m, mama m gbara m ume ịga ihe omume chọọchị, nanị ịhụ ihe ọ dị ka ya. Echetara m na a gwara m gaa n’elu ọlta ịga kwupụta mmehie m. Ka m nọ ebe ahụ, achọpụtara m na ihe a kpara n’elu ihe mkpuchi ọlta ahụ nwere mgbaaka atọ a gakọrọ ọnụ. Ajụrụ m maka ihe ha pụtara, e wee gwa m na ha nọchiri anya “Atọ n’Ime Otu Dị Nsọ—Chukwu Nna, Chukwu Nwa, na Chukwu Mmụọ Nsọ.” Echere m, ‘Nke a dị mgbagwoju anya. Ha kweere na chi atọ, ma papa m kwuru na ọbụnadị otu adịghị!’ Mgbe m jụkwuru ajụjụ, a kọwara na àkwá nwere akụkụ atọ ma bụrụ n’ezie nanị otu àkwá. Nke a ejughịkwa m afọ. Mgbe ahụ ka a gwara m na m na-ajụ oké ajụjụ. Alara m ụlọ ma gwa mama m na achọghị m ịga chọọchị ọzọ, agaghịkwa m!
N’oge Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, anọsighịkwa m ike n’Òtù Ndị Kọmunist Na-eto Eto. Alụrụ m onye Canada nọ n’ọrụ soja, anyị mụtakwara otu nwa nwoke. A tụrụ ebe obibi mbụ anyị na London bọmbụ. Mgbọ ogbunìgwè V-1 dara n’ihu ụlọ anyị mgbe mụ na nwa m nwoke nọ n’ụlọ. Ihe onwunwe anyị nile funahụrụ anyị. Ihe ndị ahụ dakasịrị adakasị dakwasịrị anyị ma ọ dabaara anyị nnọọ nke ọma iji ndụ anyị n’aka gbapụ. Di m nọ na Normandy, France, n’oge ahụ.
Na nso oge ahụ, echetara m na m kwusaara ndị inyom abụọ na-eto eto okwu, na-ajụkwa ha, “Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere o ji hapụ ahụhụ a nile?” O nwere ihe ha kwuru banyere Setan ịbụ chi nke ụwa a. “Oo,” ka m chere, “chi ọzọ ọ na-adịghị ihe m maara banyere ya!” E mesịa, otu nwa okorobịa bịara. Ajụkasịrị m ya ajụjụ ahụ, o wee kwuo na ọ na-achọ atụrụ, ọ bụghị ewu. N’amaghị ilu Jisọs, ajụrụ m ya ma ọ bụ onye ozi ka ọ bụ onye ọrụ ubi. Afọ ole na ole ọzọ gafere, Agha Ụwa nke Abụọ bịakwara ná ngwụsị. Di m lọtara n’ụlọ mgbe ọ hụsịrị ka e kpochapụrụ 95 pasent nke Ndị Agha Ụkwụ Saskatoon bụ́ nke ọ nọrọ na ya n’agha. Anyị biweziri n’ụlọ ọzọ na Croydon.
Ndịàmà Abịa
Otu Sunday, Ndịàmà Jehova abụọ bịara, wee pịa mgbịrịgba ụzọ anyị. Di m mepere ụzọ ahụ ma soro ha nwee ogologo nkwurịta okwu. Iwe ejuwo ya obi megide okpukpe nile n’ihi ihu abụọ ọ hụworo n’oge agha. Eziokwu bụ na Ndịàmà ahụ anọpụwo iche masịrị ya. Ọ gwara m na ya gwara ha bịaghachi maka nkwurịta okwu Bible. Enwere m oké nchegbu ma jụọ papa m ihe m kwesịrị ime. O kwuru na m kwesịghị itinye ọnụ nakwa na ọ bụrụ na di m ekwesie olu ike n’okpukpe isi mmebi a, na ọ kaara m mma itinye akwụkwọ maka ịgba alụkwaghịm.
Ekpebiri m ịnọnye n’otu n’ime nkwurịta okwu ndị ahụ ịhụ ihe ọ dị ka ya. Anyị nile nọdụrụ ala gburugburu table, Onyeàmà ahụ kwukwara, sị: “Otu n’ime ụbọchị ndị a ị ga-enwe ike ikonye ọdụm aka dị nnọọ ka ị pụrụ ime nkịta.” ‘Oo, isi mebiri ha,’ ka m chere. Uche m apụghị ịdị n’ihe ọ bụla ọzọ e kwuru ná mgbede ahụ. Mgbe e mesịrị, agwara m di m na achọghị m ka ha bịa ọzọ. Anya mmiri gbara anyị nke ukwuu, anyị kwurịtakwara okwu ịgba alụkwaghịm.
Obere oge nke a gasịrị, Onyeàmà ọzọ bịara. Anyị mesịrị chọpụta na ọ bụ onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ dị n’ebe ahụ, wee nụ banyere anyị. Echetara m ya nke ọma. O nwere anya na-acha anụnụ anụnụ ma bụrụ onye obiọma, nke nwere ndidi. O chetaara m banyere nna m ochie. Adọpụtara m ihe ndepụta nke ajụjụ 32 m detụworo. “Anyị ga-atụle ha otu otu,” ka o kwuru, anyị wee malite ime otú ahụ. O nyeere m aka ịmata na iji ghọta n’ụzọ zuru ezu ihe Bible na-ekwu, ọ dị m mkpa ịgụ na ịmụ ya. Ọ tụrụ aro na mmadụ ga na-eleta anyị mgbe mgbe iji mụọrọ anyị Bible. Asịrị m ya ngwanụ.
Ka m jiri nwayọọ nwayọọ malite ịghọta banyere Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, anya mmiri gbara m. Echetara m na m bara n’ime ụlọ ihi ụra na-ekpegara Jehova ekpere ka o biko gbaghara m ma nyere m aka ịghọta Bible na nzube ya dị iche iche. E mere di m, nwa m nwoke, na mụ baptism na 1951. Ọ gbawara papa m obi ịnụ banyere nke a, o wee kwuo na ọ kaara ya mma ịhụ m ka m nwụrụ anwụ kama ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu
Di m kpebiri ịlaghachi Canada, na 1952 anyị kwafekwara na Vancouver, British Columbia. Papa m jụrụ ịsị anyị gaa nke ọma, ahụghịkwa m ya ma ọ bụ nata ozi ya ọzọ. Mgbe anyị bịaworo na-ebi ọtụtụ afọ na Vancouver, a kpọrọ òkù ịga ebe e nwere mkpa ka ukwuu, karịsịa n’ógbè ndị dị ka Quebec, ebe Praịm Minista Duplessis nwere àgwà yiri nke Hitler n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.
Na 1958 anyị kwabara ihe onwunwe nile anyị nwere n’ụwa n’ime ụgbọala anyị ma kwọpụ gaa mgbakọ mba nile na New York. Site n’ebe ahụ anyị kwọgara na Montreal, Quebec, bụ́ ebe e kenyere anyị n’otu ọgbakọ French na Ville de Jacques-Cartier. Anyị nwere ọtụtụ ahụmahụ na-atọ ụtọ ka anyị na-ejere Jehova ozi na Quebec. Otu oge, e kpuru ụgbọala anyị ihu, a tụrụ anyị okwute, otu nwanyị jiri paịpụ mmiri gbazuo anyị mmiri ahụ. Ebe a bụ ebe a kpọrọ Megọg.
Oge ọzọ, mụ na onye mụ na ya so na-agafe otu chọọchị kpọmkwem mgbe ndị mmadụ na-apụtasị. Otu onye matara anyị, wee tie mkpu, sị: “Témoins de Jéhovah!” (“Ndịàmà Jehova!”) Ịchụ ọsọ malitere, nke ụkọchukwu nọ n’isi ya, ma anyị gbanahụrụ ìgwè ahụ. A nwụchiri anyị ọtụtụ ugbo. Otú ọ dị, enwere m obi ụtọ nke inyere mmadụ ole na ole butụrụ ibu aka ịmụta banyere Jehova, ọtụtụ n’ime ha ka na-arụsi ọrụ ike n’ijere ya ozi.
Ná mmalite afọ ndị 1960, onye di m na-arụrụ ọrụ zifere ya Los Angeles, anyị jekwara ozi n’otu ọgbakọ n’ebe ahụ ruo ihe karịrị afọ 30. Lee ihe oké obi ụtọ ọ bụụrụ anyị ịgwa ndị kwafeteworo Los Angeles site n’akụkụ nile nke ụwa banyere eziokwu ahụ! Enwere m ihe ùgwù nke ịmụrụ ndị si Lebanọn, Ijipt, China, Japan, France, na Itali ihe, ịkpọtụ nanị ole na ole aha. Echetara m izute otu nwa agbọghọ na-adịghị asụ Bekee ma otu—ọ dabara nke ọma na di ya na-asụ. Ya mere mụ na di m soro ha mụkọọ ihe. Emesịrị m mụọrọ ya ihe iche. Ejiri m akwụkwọ bụ́ Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu nke Bekee, ọ ga-elekwa akụkụ akwụkwọ nsọ na Bible Chinese ya, zaakwa ajụjụ n’asụsụ Chinese. Mgbe ahụ, aga m ekwu azịza ya na Bekee, ọ ga-ekwughachikwa ya na Bekee. N’ikpeazụ, okwu gawara ya were were na Bekee, ọ bụ ezie na ọ na-asụ ya n’olu ndị Britain. Enwere m obi ụtọ ikwu na ma ya ma di ya bụ ugbu a ndị ohu Jehova rarawooro onwe ha nye.
Na nso nso a anyị kwagara Tucson, Arizona, wee nwekwuo ihe ùgwù nke ịhụ ndị òtù ezinụlọ anyị dum ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, tinyere ụmụ ụmụ ụmụ anyị, bụ́ ndị a na-akụziri banyere Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova.
Ehee, enwere m obi ụtọ ịmata site n’ọnụ ụmụnna nọ na Croydon na nna m ochie nwere anya na-egbuke egbuke na-acha anụnụ anụnụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.—Dị ka Cassie Bright si kọọ.