Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Chineke Ọ̀ Ga-anọgide Bụrụ Enyi M?
EZE DEVID bụ nwoke soro Chineke bụrụ enyi. Ma n’otu mgbe ọ sịrị: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara.” Devid nọ na-ata ahụhụ ọ bụghị nanị n’ihi mmeso ọjọọ ndị ọzọ mesoro ya kamakwa n’ihi ajọ omume nke aka ya. Ọ malitere iche na ọbụna Chineke ajụwo ya, o wee kpee ekpere, sị: “Chee m ihu, meekwara m amara; n’ihi na onye nanị ya nọ na onye e wedara n’ala ka m bụ.”—Abụ Ọma 25:11, 16-19.
Ikekwe ị na-enwekwa mmetụta ịbụ onye nọ n’ahụhụ. Ma eleghị anya n’ebe obibi ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ị nọ n’ajọ ọnọdụ karịrị nnọọ akarị. Ọzọkwa, ị pụrụ inwe ajọ nsogbu ahụ ike ma ọ bụ hụ onwe gị dị ka onye a kụdara aka n’ihi adịghị ike ụfọdụ cheworo gị ihu. Ihe ọ bụla ọ bụ, ọ dịghị mkpa gị ịta ahụhụ nanị gị; Chineke ji afọ ọma na-enye ọbụbụenyi na nkwado ya.a Ọ bụrụ na ị maliteworị na-azụlite mmekọrịta gị na ya, ọ ga-akasi gị obi ịmata na ọ dịghị ahapụ ndị enyi ya mgbe ihe na-esiri ha ike. N’agbanyeghị nke a, mgbe nsogbu wakporo gị, ị pụrụ iche na Chineke nọ ebe dị anya. Ọ pụrụ ọbụna iyi gị ka ọ dịghị enyere gị aka ma ọlị. Ma ọ̀ dị otú ahụ n’ezie?
“Ogwu n’Anụ Ahụ”
Biko buru ụzọ gụọ 2 Ndị Kọrint 12:7-10. N’ebe ahụ Pọl onyeozi kọrọ banyere otú o si taa ahụhụ ihe ọ kpọrọ “ogwu n’anụ ahụ.” Dị ka o yiri, “ogwu” ahụ bụ otu ụdị nrịanrịa anụ ahụ, ikekwe nke na-emetụta ọhụhụ ụzọ ya. Ihe ọ bụla ọ bụ, ọ nọgidere “na-eti” ya aka n’ụzọ mmetụta uche. N’agbanyeghị arịrịọ atọ sitere n’obi ka Chineke wepụ ya, “ogwu” ahụ nọgidere.
Jehova ọ̀ nọ na-eleghara ekpere Pọl anya? Ọ dịghị ma ọlị! Chineke gwara ya, sị: “Amara m ezuworo gị: n’ihi na e mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Ọ bụ ezie na Jehova họọrọ ịghara ịkpapụ “ogwu” ahụ, ọ gbahapụghị Pọl. Site n’amara Chineke, Pọl soro ya nwee ọbụbụenyi chiri anya. Nke ahụ ‘zuru’ iji nyere Pọl aka ịnagide nrịanrịa ya. Ka Pọl na-agba mgba ime otú ahụ, ọ ga-abịakwa nwee mmetụta nke ike nkwagide nke Chineke n’ụzọ ọhụrụ na n’ụzọ onwe onye.
Enyemaka n’Ịnagide Ihe Isi Ike
Dị ka Pọl, ị pụrụ inwe otu “ogwu,” ma ọ bụ nsogbu, nke na-adụ gị, na-akpata enweghị nchekwube na nkụda aka. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Pọl, Chineke pụrụ nnọọ ịhapụ nsogbu ahụ ka ọ dịgide. Nke ahụ apụtaghị na ọ bụghịkwa Enyi gị. Chineke gwara Pọl onyeozi, sị: “E mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụrụ na ị dabere n’ike Chineke, ọ bụghịkwa na nke gị, ị pụrụ ịnagide. Ị pụrụ ọbụna ịchọpụta na site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, i nwere ike imezu ihe ndị ị na-echetụbeghị na ha kwere omume. Pọl kwuru, sị: “Adịghị ike nile . . . dị m ezi mma: n’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Robinb chọpụtara nke a ịbụ eziokwu. N’afọ 14 ọ kwụsịrị ịhụ ụzọ n’ihi ọrịa glaucoma. N’otu afọ ahụ mama ya nwụrụ na mberede. “Ọ bụ nanị Jehova ka m nwere ugbu a,” ka Robin na-ekwu banyere ịmalite ịgbaso “ogwu” ndị a na-egbu mgbu mgba. “Amaara m na ọ bụrụ na ihe ga-agaziri m, aghaghị m ịraparasi ike n’ebe ọ nọ.” Robin mere nnọọ nke ahụ, n’ikpeazụ na-eje ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Ọ na-ekwu, sị: “Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka n’ihe nile. O mere ya n’ezie.”
Ọtụtụ ndị ntorobịa achọpụtawo na inweta ule dị iche iche na-enyere ha aka n’ezie ịbịaru Chineke nso karị. Tụlee Jeff na-eto eto. Nna ya gbahapụrụ ezinụlọ ya, na-ahapụ mama Jeff ilekọta ụmụaka asaa. “Agụụ nna gụsiri m ike,” ka Jeff kwetara, onye dị nanị afọ 12 n’oge ahụ. “Ọ gụsiri m ike ka mmadụ mechie oghere m na-enwe mmetụta ya kwa ụbọchị.” Gịnị ka Jeff mere? “Ekpegaara m Jehova ekpere inyere m aka imeju mkpa ahụ.” Jeff rụrụ ọrụ kwekọrọ n’ekpere ya ma mikpuo onwe ya n’ọrụ ime mmụọ. Ka oge na-aga, ọ pụrụ inwe mmetụta aka nkwado Jehova—nke a na-enye site na mmụọ nsọ ya na-enye ume na site n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Tụlee Abụ Ọma 27:10.) Ugbu a n’afọ 27 Jeff na-echeta, sị: “Ọ dịghị onye m nwere m pụrụ ilegara anya maka nchebe, ya mere agara m Jehova ezi nso.” Ọ na-akpọ mmekọrịta ahụ chiri anya “ngọzi dị oké ọnụ ahịa si n’ule a pụta.”
Ụzọ Isi Nweta Enyemaka Chineke
Enyi gị nke bi n’eluigwe ga-enyere gị aka n’otu aka ahụ ịgafe ihe isi ike gị. Ma gịnị ka ị na-aghaghị ime? Ka ọbụbụenyi ọ bụla nwee ọganihu, a ghaghị inwe nkwurịta okwu. Ekpere bụ ụzọ anyị si esoro Chineke ekwurịta okwu. Site na ya anyị na-eme ka ọ mara na anyị nwere mkpa enyemaka ya. Ma, ekpere abaghị ezi uru ma ọ bụrụ na ọ jụrụ oyi ma ọ bụ bụrụ nke ọnụ efu. Dị ka ndị ntorobịa a kpọtụrụ aha n’elu, ị ghaghị ‘ịwụsị obi gị’ nye Chineke! (Abụ Ọma 62:8) Ọ pụrụ ọbụna ịdị gị mkpa ịrịọ arịrịọ. (Ndị Filipaị 4:6) Arịrịọ bụ ekpere ndị kasị n’ịdị omimi na isi n’obi.
Ka e were na i nwere nsogbu ịchịkwa echiche gị ma ọ bụ na-enwe ihe isi ike imeri otu àgwà ọjọọ. Rịọ Jehova arịrịọ! Rịọ maka enyemaka ya n’oge ọnwụnwa. Ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị adị mfe mgbe nile. “Mgbe m nwere mkpali siri ike ime ihe dị njọ, ana m amanye onwe m ikpe ekpere,” ka Gary kwetara. “Mgbe ụfọdụ ana m eche, ‘Olee otú m ga-esi jekwuru Jehova?’ Ma, otú o sina dị ana m arịọ ya maka enyemaka. Ọ na-enye m ume dị m mkpa iji nọgide.” Ọ bụrụgodị na o siri ike na mbụ, nọgide na-emepere Chineke obi gị.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ na-eyi ka a dịghị aza ekpere gị? Dị ka ihe atụ, Lora nọ na-agba mgba imeri àgwà ọjọọ nke imetọ ahụ onwe onye. “Aga m eji obi eziokwu gwa Jehova banyere nsogbu ahụ,” ka ọ na-akọwa, “ma o yiri ka m pụghị nnọọ ịkwụsị.” Mgbe ụfọdụ Chineke pụrụ ịhapụ ka anyị gosi otú arịrịọ anyị dịruru anyị mkpa. (Tụlee Abụ Ọma 88:13, 14.) Ya mere anyị aghaghị ịnọgidesi ike n’ekpere! (Matiu 7:7; Ndị Rom 12:12) Lora mere nnọọ nke ahụ. N’otu mgbe ahụ, ọ malitere itinye n’ọrụ aro ndị pụtara n’ihe odide e dere n’isiokwu ahụ ná mbipụta Watch Tower Society.c Ka oge na-aga, ọ malitere na-ahụ ihe ndị ọ rụpụtara. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe ọ bụla m guzogidere ọnwụnwa nke ọma, m ga-ekele Jehova n’ihi na amaara m na ọ nọnyeere m.” N’eziokwu, ị pụrụ inwe ndaghachi azụ ka ị na-agbalị ịchịkwa nsogbu gị. Ma ọ bụrụhaala na ị na-alụ ọgụ, na-abụghịkwa ịmara ụma na-adaba n’adịghị ike gị, ‘ịnụ ọkụ n’obi’ gị ga-eme Chineke obi ụtọ, ọ ga-anọgidekwa na-abụ Enyi gị.—2 Pita 1:5.
Iso Chineke Na-arụkọ Ọrụ
Ụzọ ọzọ ị ga-esi nweta enyemaka Chineke bụ ịnakwere òkù ya ịbụ otu n’ime ndị ‘ha na ya na-arụkọ ọrụ.’ (1 Ndị Kọrint 3:9) Nke a na-agụnye ikere òkè n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke. (Matiu 28:19, 20) Mgbe i nwere mmetụta ịbụ onye nọ n’ahụhụ ma ọ bụ onye a kụdara aka, echiche ikere òkè n’ụdị ọrụ ọ bụla pụrụ iyi ihe na-adịghị adọrọ adọrọ. Otú ọ dị, ‘ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè’ pụrụ inyere gị aka n’ezie. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, ị ga-ewepụ uche gị n’ebe nsogbu gị dị. (Tụlee Ilu 18:1.) Robin, onye e hotara na mbụ, na-ekwu banyere oge ihe isi ike ya, sị: “Ihe mere ka m nọgide na-aga bụ ọrụ m na-arụrụ Jehova!”
Iso Chineke na-arụkọ ọrụ pụkwara inyere gị aka imeri echiche ọ bụla ka fọrọ afọ na Chineke ahapụwo gị. Mgbe mmadụ abụọ na-arụkọ ọrụ dị ka òtù maka otu ihe mgbaru ọsọ, ọ̀ bụ na ha adịghị abịakarị nso dị ka ndị enyi? Ka ị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa, ị na-eche ihe ịma aka ihu mgbe mgbe. Ị na-ahụ onwe gị ka ị na-echigharịkwuru Chineke maka enyemaka. Ka Chineke na-agọzikwa ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ, ọbụbụenyi ya na-apụtawanye ìhè. Ị na-amalite ịghọta ntụkwasị obi nke Chineke nwere n’ebe ị nọ dị ka onye ya na ya na-arụkọ ọrụ. Nke a pụrụ ịbụ ezi ihe nkwalite nye obi ike onwe onye gị.
Dị ka ihe atụ, Carol anọghị ná ntụkwasị obi ma ọlị. Mama ya egbuwo onwe ya, papa ya na-akpọ iyi na-ewetukarịkwa ya ala. Ma mgbe ọ dị afọ 17 ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma were ọrụ ime nkwusa. Ugbu a ka afọ iri dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile gasịrị, ọ na-asị: “Ọrụ a enyeworo m aka nke ukwuu n’ihi na ahụwo m ngọzi Jehova n’ahụ m. Ana m agwa onwe m, ‘Ọ bụrụ na Chineke hụrụ m n’anya, abụghị m onye na-abaghị uru.’ Jehova iji m na-akpọsa aha ya emewo ka m nọrọ ná ntụkwasị obi karị.”
“Detụnụ Ire, Hụ na Jehova Dị Mma”
“[Chineke] wee napụta m n’ụjọ m nile,” ka Eze Devid dere mgbe o jisiworo ike gbapụ n’ọnọdụ ọjọọ na-eyi ndụ egwu. (Abụ Ọma 34:4, 6, ihe e dekwasịrị n’elu; 1 Samuel 21:10-12) N’ihi ya Devid pụrụ ikwu site n’ahụmahụ, sị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma: onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime Ya.”—Abụ Ọma 34:8.
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ndụ gị agaghị abanye ma ọlị n’ihe ize ndụ dị ka nke Devid bara, i ji n’aka na ị ga-enwe nchekasị na ndọlị, n’oge ụfọdụ. Mgbe ‘ahụhụ nile nke obi gị sara mbara,’ rịọ Chineke arịrịọ. (Abụ Ọma 25:17) Atụla egwu na Chineke ga-ewereghachi ọbụbụenyi ya. Ka i ji ndidi na-anagide ma na-enwe nkwado na nlekọta Jehova n’onwe gị, ị ‘ga-edetụ ire ma hụ’ n’onwe gị na “Jehova dị mma.” Ọ ga-anọgidekwa na-abụ Enyi gị ruo ebighị ebi.—Jemes 4:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto eto Na-ajụ Sị . . . Apụrụ M n’Ezie Ịbụ Enyi Chineke?” ná mbipụta anyị nke July 22, 1995 (Bekee).
b A gbanwewo aha ụfọdụ.
c Lee isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 29]
Chineke ọ̀ na-agbahapụ ndị enyi ya n’oge ihe isi ike?