Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 25-27
  • “Ihe Ọkụkọ Bu Mmiri Na-achụ...”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ihe Ọkụkọ Bu Mmiri Na-achụ...”
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ịma Aka Gbara Ọkpụrụkpụ
  • Ndị Na-ege Ntị Nwere Mmasị
  • Obi Dị M Ụtọ Itinyekwu Mgbalị
    Teta!—2005
  • Ihe Isi Ike nke Oge Agha Kwadebere M Maka Ndụ
    Teta!—2004
  • Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Afọ Ojuju Chineke Na-enye Akwagidewo M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Teta!—1997
g97 6/8 p. 25-27

“Ihe Ọkụkọ Bu Mmiri Na-achụ...”

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Nigeria

MGBE obere ọgbakọ anyị dị n’ebe ndịda Nigeria natara traktị Akụkọ Alaeze nke 34 nke ya, bụ́ nke e kesara n’ebe nile n’ụwa, ọ dị anyị ọkụ n’obi iwega ọtụtụ n’akụkụ nile nke ókèala anyị. Nke ahụ abụghị ọrụ dị mfe. N’ime ókèala anyị e nwere ógbè ndị ọrụ ubi, ebe a na-akọ akpụ, ji, na nri ndị ọzọ. Ógbè ndị a dị n’ime ime ọhịa nnukwu mmiri ozuzo nke ebe okpomọkụ. Iru ha ga-esi ike ma ọ bụghị ihe a na-apụghị ime eme. E kwuwerị, ọ bụ uche Chineke na ozi ọma ruru ụdị ndị nile dị iche iche, ọbụna ndị ọrụ ubi n’oké ọhịa.—1 Timoti 2:3, 4.

Ya mere, n’October 16, 1995, anyị mmadụ 18 zọpụrụ ije na 7:30 ụtụtụ ịga ógbè ndị ọrụ ubi aha ya bụ Abomgbada, dị ihe dị ka kilomita 3.5 n’ịdị anya. N’ụzọ, anyị aghaghị iji ụkwụ gafere otu iyi. Mmiri ahụ ruru anyị n’úkwù.

Iji ruo ógbè ọzọ n’otu ụbọchị ahụ, anyị aghaghị iji ụkwụ gafere otu iyi ka ukwuu. N’oge a, ọ bụ nanị ụmụnna ndị nwoke anọ na otu nwanna nwanyị gafere ya. Ndị ọzọ so n’ìgwè anyị hapụrụ ije.

Anyị nwetara ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ụbọchị ahụ. Ihe tinyekwuru ihe n’ọṅụ anyị bụ ihe anyị kpọrọ onyinye si n’ọhịa. Ka anyị na-aga, anyị ghọọrọ ma rie mkpụrụ osisi ụfọdụ mịrị n’ọhịa. Anyị zutere ndị ọrụ ubi na-ele ọbịa nke ọma bụ́ ndị nwere mmasị maka mgbalị anyị irute ha; ha nyere anyị oroma iji gboo agụụ mmiri na-agụ anyị. Anyị kpọtụụrụ mmadụ 250, na-ekesa traktị nile anyị ji.

Ihe Ịma Aka Gbara Ọkpụrụkpụ

Nke bụ ihe ịma aka bịara n’ụbọchị abụọ mgbe e mesịrị. Ose Anasi dị kilomita 12 n’ihu, ógbè a na-erutụbeghị ma eleghị anya site ná nkwusa a haziri ahazi. Ụfọdụ nwere obi abụọ banyere ije ebe ahụ. Ịgafe Osimiri Urasi dị ize ndụ, ọtụtụ n’ime anyị apụghịkwa igwu mmiri. Iji ụkwụ gafere pụrụ ịdị ize ndụ n’ihi ogwe osisi ndị ọnụ ha pịrị apị. Ebe apịtị dịgasị ga na-amị amị, ịda ada pụrụ ịkpata mmerụ ahụ. Ụfọdụ àkwà mmiri e ji aka rụọ esighị ike. E nwere agwọ, agụiyi, na iyi ndị etu juru.

Mmadụ 16 n’ime anyị kpebiri ịga n’agbanyeghị nke ahụ. Anyị ji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita 1.5 tupu na-abanye ụgbọ epeepe iji gafee Osimiri Urasi na-ekwo ekwo, dịkwa ize ndụ. Iji ruo ebe ụgbọ epeepe ahụ dị, anyị aghaghị ịgbada otu ugwu kpọdara akpọda. Ọ bụ oge udu mmiri, osimiri ahụ tojukwara etoju. Ebe ahụ nile nwere ájá ụrọ; n’oge udu mmiri kwa, ọ na-amị nnọọ amị. Mgbe anyị pụtara n’ụgbọ epeepe ahụ, anyị chọpụtara na ebe e ji ụkwụ aga aghọwo iyi dị otu mita n’omimi n’ebe ụfọdụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka nke bụ nsogbu anyị malitere.

Anyị jiri ụkwụ gaa n’ụzọ iyi a ruo ihe dị ka minit 30. Ala na-amị nnọọ amị nke na ọtụtụ n’ime anyị dabara n’ime mmiri ahụ dị apịtị apịtị, na-ede Bible, magazin, na traktị anyị mmiri. Obi dị anyị mma, ya mere na mgbe mmadụ ọ bụla dara, anyị nile ga-achị nnọọ ọchị, tinyere onye ahụ daranụ.

Ka anyị na-agafe otu obere iyi, etu tapaara anyị n’ụkwụ. Otu nwanna nwanyị na-eto eto etu tapaara n’ụkwụ tiri oké mkpu. Ọ ka na-eti mkpu mgbe e wepụsịrị etu ahụ. Anyị wekwaara ya n’ihe ọchị dị ka akụkụ nke ahụmahụ ahụ, anyị wee gaa n’ihu n’ije anyị.

N’ịgafe iyi ọzọ, otu nwanna nwoke kpebiri ịghara iji ụkwụ gafere dị ka ndị ọzọ mere kama nke ahụ ịwụfe awụfe. Ọ wụfere mmiri ahụ ma ọ wụfeghị apịtị ahụ. Ọ mịrị ya, o wee daruo nnọọ ala n’apịtị ahụ. O biliri, nyochaa onwe ya, chọpụta na o nweghị mmerụ ahụ, wee sị: “Nsogbu adịghị; o socha n’ahụmahụ ahụ.” Anyị chetara na Pọl onyeozi zutekwara ‘ize ndụ site n’osimiri,’ ikekwe ndị ka nnọọ ndị nke anyị chere ihu ukwuu.—2 Ndị Kọrint 11:26.

Anyị gafere otu àkwà mmiri e ji aka rụọ, bụ́ nke yiri ihe dị ize ndụ, ma anyị nile jisiri ike gafere ya. Mgbe nke ahụ gasịrị ebe ahụ bịara na-amị amị karị, nke mere na ịda ada karịziri akarị.

Otu onye ọsụ ụzọ oge nile ọ fọrọ nke nta ka ọ gbaa afọ 70 so anyị. N’ụtụtụ ahụ ọ bịararị ịsị anyị gaa nke ọma na njem anyị. Ma mgbe anyị kpesịrị ekpere maka ngọzi Jehova, ọ jụrụ, sị: “Olee otú m ga-esi nọrọ n’ụlọ ebe unu pụrụ na-eme nkwusa?” O siri ọnwụ iso anyị, ọ dịghịkwa ihe onye ọ bụla kwuru ga-eme ya ịnọrọ n’ụlọ. O kwuru na Jehova ga-anọnyere ya. Ya mere o sonyere.

Mgbe o ji azụ daruo nnọọ ala n’ala ahụ na-amị amị, a nụghị ụda ọchị. Ná nchegbu, anyị jụrụ ma ò merụrụ ahụ. Ọ zaghachiri: “Mba. Eji m nwayọọ daa ka m wee ghara imerụ ala ahụ.” Anyị jiri ahụ efe chịa ọchị ma cheta Aịsaịa 40:31, nke na-asị na “ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha.”

Ndị Na-ege Ntị Nwere Mmasị

N’ikpeazụ anyị ruru ebe anyị na-aga. Mmeghachi omume nke ndị ahụ kasị agba ume. Ụjọ tụrụ otu nwoke mgbe ọ hụrụ ka anyị na-abịaru ụlọ akịrịka ya nso, ma n’ịmata ndị anyị bụ, ọ sịrị: “O siiri m ike ikweta na unu mere njem ahụ siri ike nanị iji zie anyị ozi ọma. Ọ masịrị anyị.” Anyị jiri ilu obodo anyị zaghachi: “Ihe ọkụkọ bu mmiri na-achụ dị ya mkpa.” Nwoke ahụ ghọtara.

Onye ọrụ ubi ọzọ sịrị: “Ọ bụrụ na izi ozi ọma eruwo ebe a, nke ahụ pụtara na nzọpụta erutewo anyị.” Ọtụtụ nwegasịrị ajụjụ, bụ́ ndị anyị zara. Ha gwara anyị ka anyị bịa ọzọ, anyị kwekwara nkwa ime otú ahụ.

N’Ose Anasi anyị tinyere ihe dị ka traktị 112—ole nile anyị nwere. Ná ngụkọta, anyị gbaara ihe dị ka mmadụ 220 àmà.

Mgbe anyị na-ala, anyị furu ụzọ. Ịlaghachi n’ógbè ahụ gaara ewe otu hour na ọkara, chi na-ejikwa n’ike n’ike. Anyị kpegaara Jehova ekpere n’ime obi ma kpebie ịga n’ihu, ọ bụ ezie na nke ahụ pụtara iji ụkwụ gafere iyi na-eyi egwu nke ruru anyị n’úkwù.

Mgbe anyị gafesịrị, anyị chọtara ụzọ anyị ma chọpụta n’ụzọ tụrụ anyị n’anya na anyị agaala ụzọ anọ n’ime ụzọ ise nke njem ụla ahụ. Anyị ifu ụzọ atụgharịwo wee bụrụ ụzọ dị nkenke nke ji ma ọ dịkarịa ala otu hour belata njem anyị! N’ezie, anyị nile nwere obi ụtọ ma kelee Jehova. Ka anyanwụ na-ada, anyị rutere ụlọ—ike gwụsịrị anyị, agụụ jikwa anyị ma anyị nwere oké obi ụtọ.

Mgbe e mesịrị, ka anyị na-akọ banyere ahụmahụ ụbọchị ahụ, otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Anụwo m akụkọ banyere ebe ahụ, ya mere amaara m na m ga-ada. Asị na ọ bụghị n’ihi ozi ọma, agaraghị m aga ebe a, e bunyegodị m ego nile dị n’ụwa a!” Otu nwanna nwoke tiri ná mkpu: “N’ikpeazụ ozi ọma eruwo Ose Anasi!”

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ịgafe otu àkwà mmiri obodo ahụ

Anyị gafere ọtụtụ iyi etu juru

N’ala ala nke ụzọ a dị ize ndụ, anyị banyere ụgbọ epeepe iji gafee Osimiri Urasi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya