Ọnụma Okporo Ụzọ—Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nagide Ya?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN
IWE iwe na ime ihe ike na-esi na ya apụta na-apụtawanye n’akụkọ mgbasa ozi ụwa. Tụkwasị n’ọnụma trolley (nke ndị bịara ịzụrụ ihe bu trolley, ma ọ bụ ígwè e ji ebu ihe oriri, na-ewesorịta ibe ha iwe ná nnukwu ụlọ ahịa) na ọnụma telifon (nke nkà na ụzụ nke na-eme ka onye ị kpọrọ nwee ike ịnapụ gị okwu n’ọnụ iji zaa onye ọzọ kpọrọnụ kpalitere), ọ bụ ọnụma okporo ụzọ bụ nke dọrọwooro uche ndị mmadụ na Britain.
Ọnụma okporo ụzọ gbasara nnọọ ọtụtụ ebe nke na otu akụkọ e nwetara na 1996 banyere àgwà ịkwọ ụgbọala zọọrọ na na Britain o “ruwo ọ̀tụ̀tụ̀ gbasapụrụ agbasapụ, ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị ọkwọ ụgbọala nile nwetara otu ụdị nke mwakpo ma ọ bụ arụrụala n’afọ gara aga”! Nnyocha nke Òtù Na-ahụ Maka Ụgbọala mere gakwudịrị n’ihu wee kọọ na “itoolu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala iri na-azọrọ na ha bụ ndị ọnụma okporo ụzọ metụtaworo.” N’ụzọ na-akpali mmasị, otu njụta echiche ahụ rịbara ama na “nanị isii n’ime [ndị ọkwọ ụgbọala] iri kwetara na ha ewewo iwe ka ha na-akwọ ụgbọala.”
Gịnị na-akpalite ọnụma okporo ụzọ? Ọ bụrụ na ị bụ onye o metụtara, gịnị ka ị pụrụ ime iji chebe onwe gị? Ọ bụrụ na ụzọ onye ọzọ si akwọ ụgbọala na-akpasu gị iwe, gịnị ka i kwesịrị ime? N’ezie, ka ọnụma okporo ụzọ na-amụba gburugburu ụwa, olee otú ị pụrụ isi nagide ya?
Ihe Na-akpata Ya na Mmetụta Ọ Na-enwe
Ndị na-eji iwe akwọ ụgbọala abụghị ihe ọhụrụ. Otu onye oge gboo mere ya bụ onye England na-ede uri bụ́ Lord Byron. Na 1817 o dere otu akwụkwọ ozi ebe ọ kọrọ otu esemokwu o nwere n’okporo ụzọ. Dị ka e si kọọ, onye ọzọ na-agbafe n’ụzọ ‘mesoro ịnyịnya Byron omume ọjọọ.’ N’ihi ya, onye ahụ na-ede uri kụrụ nwoke nke ọzọ ahụ ọkpọ ná ntị.
N’ihe ka n’ọtụtụ mba, ka ọnụ ọgụgụ ụgbọala na-amụba, obi nkoropụ nke ndị ọkwọ ụgbọala na-arị elu. Ọ bụ n’afọ ndị 1980 ka akwụkwọ akụkọ ndị dị na United States kọwara ihe kpalitere omume ịkwọ ụgbọala ara ara dị ka “ọnụma okporo ụzọ.” Ọ bụ ezie na ọ bụghị mpụ, ọnụma okporo ụzọ na-akọwa nke ọma mmetụta uche ndị na-akpata ọtụtụ ime ihe ike nke ndị ọkwọ ụgbọala bụ́ ndị ụzọ ịkwọ ụgbọala nke ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ kpasuru iwe.
Àgwà mụ onwe m godị jupụtara okporo ụzọ anyị ugbu a. Ndị na-eme nnyocha n’àgwà ịkwọ ụgbọala na-ekwubi na “ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ omume obi ilu fọrọ nke nta ka ha na-ekwere mgbe nile na ha bụ ndị aka ha dị ọcha bụ́ ndị onye ọzọ gosiri ajọ akparamàgwà nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya,” ka The Times nke London na-arịba ama. N’agbanyeghị otú onye ọkwọ ụgbọala si na-akwọ ụgbọ ya ara ara, ọ na-eche na ya ziri ezi. Ma mgbe ọkwọ ụgbọala ọzọ dara obere iwu nke inye nkwanye ùgwù okporo ụzọ, ọnụma okporo ụzọ na-arị ibe ya elu.
Ịrị elu nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ, nke gbasara nke ukwuu n’etiti ndị na-eto eto, na-atụnyekwa ụtụ n’ọnụma okporo ụzọ. Ịṅụ cocaine, dị ka otu ọkachamara ụlọ ọgwụ si kwuo, ‘dị ka ịṅụ mmanya wee na-akwọ ụgbọala.’ Ndị ọkwọ ụgbọala bụ́ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ na-enwekarị echiche gabigara ókè banyere ikike ha. N’ihi ya, ụfọdụ na-eji ụgbọ ha efe ọsọ n’ụzọ dị ize ndụ. Ndị ọzọ na-akwọ ụgbọala ha ara ara, nghọta ha bụ nke e mebiri emebi.
Tụleekwa mmetụta nrụgide na-enwe n’ebe ọkwọ ụgbọala nọ. Prọfesọ Cary Cooper nke Mahadum Manchester na-ata nrụgide na ejighị ihe n’aka nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị n’afọ ndị 1990 ụta maka ọtụtụ ọnụma okporo ụzọ. “Ndị ọkwọ ụgbọala na-enwekwu nrụgide, ọnụ ọgụgụ nke ajọ mwakpo na-arịkwa elu,” ka ọnụ na-ekwuru Òtù Royal Automobile na-ekwu. Otu onye ntụzi mmekọrịta ọha na eze nke na-eji ọrụ n’aka mgbe nile bụ́ onye na-etinye ọtụtụ hour ugbu a n’ịkwọ ụgbọala gaa ma lọta ọrụ kwetara na ya adịghị edi ihe otú ya si edibu. “Ugbu a ana m adị ngwa ịgbọja na iwe iwe maka ụmụ obere ihe bụ́ ndị m na-agaghị esogbu onwe m maka ha na mbụ,” ka The Sunday Times na-akọ na o kwuru. Ikekwe ị na-enwe otu mmetụta ahụ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime?
Zere Ịkpalite Ọnụma Okporo Ụzọ
Mata na ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ ezughị okè. Ha ga-ada iwu site na mgbe ruo na mgbe. Mee ohere maka nke a n’ịkwọ ụgbọala gị. Na-eche banyere ihe pụrụ ime. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịkwọ ụgbọala n’ahịrị ụzọ nke a na-adịghị efe oké ọsọ na ya n’okporo ụzọ awara awara nwere ọtụtụ ụzọ. Ma mgbe ahụ i rute ebe ụzọ zutere bụ́ ebe ụzọ mbanye na-enye ụgbọala ohere ịbanye okporo ụzọ awara awara ahụ. N’ilepụ anya, i wee hụ otu obere ụgbọala si n’ụzọ mbanye ahụ na-abata n’okporo ụzọ awara awara ahụ. Ị̀ na-eche sị na i bu ụzọ rute ebe ahụ, na i nwere ikike ịkwọ ụgbọala n’ahịrị ụzọ nke gị? N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nyere ụgbọala ahụ na-apụtanụ ohere? N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji banye n’ahịrị ụzọ ọzọ, ma ọ bụrụ na ohere dị na ya, iji nyere ọkwọ ụgbọala nke ọzọ ohere ịbanye n’ụzọ awara awara ahụ? Ma chee echiche, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na i sie ọnwụ ịnọgide n’ahịrị ụzọ gị na ijigide ife ọsọ gị? Ikekwe ọkwọ ụgbọala ahụ na-abanye n’ụzọ awara awara ahụ pụrụ iche echiche n’ụzọ yiri nke ahụ. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, otu onye aghaghị inye ohere; ma ọ bụghị ya, ọdachi ga-ada.
N’ụzọ amamihe, ọkwọ ụgbọala chọrọ izere ịkpalite ọnụma okporo ụzọ na-elepụ anya n’ihu ma na-eji nchebara echiche na-akwọ ụgbọala. Ọ na-enye ohere mgbe ọ pụrụ, ọ dịghịkwa ewe iwe mgbe ọkwọ ụgbọala nke ọzọ na-egosighị ekele maka nkwanye ùgwù e gosiri ya. Onye nnọchiteanya nke Ụlọ Ọrụ Ndị Aka Ochie n’Ịkwọ Ụgbọala na Britain na-eme atụmatụ na 1 n’ime ndị ọkwọ ụgbọala 3 ọ bụla nwere nsogbu àgwà dị ize ndụ. Ọ bụ ezie na ndị ọkwọ ụgbọala ndị a pụrụ iji nkà na-akwọ ụgbọ ha, ha enweghị nkwanye ùgwù. Ọ na-akpọ ha “ezi ndị ọkwọ ụgbọala ma bụrụ ndị na-enweghị ezi àgwà.”
Ihe ka ukwuu ná ndị ọkwọ ụgbọala na-eleghara ndị ọzọ na-eji ụzọ eme ihe anya. Ma nke ahụ adịghị enye ihe ngọpụ maka gị ime otú ahụ. Tụlee ihe ndị pụrụ isi na ya pụta. N’ezie ị gaghị achọ ka isi ike gị kpalite inwe nsụkọta isi. Ekwela ka mmetụta uche gị chịkwaa gị. Otu ọkachamara n’ịkwọ ụgbọala na-adụ ọdụ, sị: “Ya adịla mgbe ị ga-emeghachi omume ma ọ bụ zaghachi mwakpo n’okporo ụzọ.” Jụ isonyere òtù ndị ọnụma okporo ụzọ!
Ị̀ Bụ Onye O Metụtara?
Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọkwọ ụgbọala ọ bụla abụrụwo onye ọnụma okporo ụzọ metụtara n’otu oge. Aka ọkpọ e weliri elu, ịkpọ iyi, ịkwọ ụgbọala ara ara, ha nile pụrụ ma na-emenyekwa ụjọ. Nchebe kasị mma bụ n’ezie izere esemokwu. Otu onye o metụtara nwere mmetụta ịbụ onye e menyere ụjọ mgbe otu ọkwọ ụgbọala ibe ya chọrọ ịgbafere ya. N’ikpeazụ, ọkwọ ụgbọala ahụ iwe ji gbafere ya, gbabichie ya ihu, ma kwụsịlata nke ukwuu nke na onye ahụ o metụtara tụrụ ụjọ na obere ụgbọala ha ga-akụkọta. Nke a gara n’ihu ruo ebe dịtụ anya ma bịa ná njedebe nanị mgbe onye ahụ o metụtara banyere n’ụzọ ọzọ.
Ọ bụrụ na ị hụ na ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ chọrọ ịgbafere gị, mee ike gị nile inye ha ohere. Zere isi ọnwụ n’ihe ruuru gị ịnọrọ n’ebe ị nọ n’okporo ụzọ. Ọ bụrụ na ị marala ụma kpasuo ndị ọzọ iwe, rịọ arịrịọ. Fee aka iji gosi na o wutere gị maka ọbụna amaghị ụma kpata mmejọ. Cheta na okwu dị nro pụrụ ime ka ọnụma jụrụ.
Ma ọ bụrụ na n’ihi ihe ọ bụla, ị bụ onye mwakpo ọnụma okporo ụzọ metụtara, ghara imegwara. “Emegwarala,” ka magazin bụ́ Focus na-adụ n’ọdụ. “Ebula ihe ndị a pụrụ iji mee ihe dị ka ngwá ọgụ dị ize ndụ n’obere ụgbọala gị.” Aro ndị ọzọ: Kpọchie ọnụ ụzọ na window ụgbọala gị. Zere ile onye na-eme mwakpo anya n’anya.
Aro ndị dị n’elu banyere ụzọ a pụrụ isi nagide ọnụma okporo ụzọ abụghị ihe ọhụrụ. Ha kwekọrọ n’okwu ndụmọdụ nke Eze Devid nke Israel nyere ogologo oge gara aga: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ,” ka ọ dụrụ n’ọdụ. “Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo. Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.”—Abụ Ọma 37:1, 8.
Ọ bụ ezie na ọnụma okporo ụzọ na-arị elu, ekwela ka o tolite n’ime gị!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]
Ịchịkwa Ọnụma Okporo Ụzọ
Òtù Na-ahụ Maka Ụgbọala rịbara ama na mgbe a bịara n’ikpochapụ ọnụma okporo ụzọ, “ịgbanwe àgwà dị mkpa dịkwa ka imepụta usoro mgbochi dị iche iche.” Iji ezi echiche tụlee nkà ịkwọ ụgbọala nke gị na nke ndị ọzọ na-eji okporo ụzọ eme ihe dị mkpa iji nagide ọnụma okporo ụzọ. Ọ bụ ezie na ị na-ahụ ihie ụzọ ndị ọzọ nke ọma, elegharala mmejọ ịkwọ ụgbọala nke gị anya. Nakwere eziokwu ahụ bụ́ na e nwere ndị ọkwọ ụgbọala ndị na-ada iwu okporo ụzọ. Mgbe ị na-akwọ ụgbọala, jide n’aka na ị mụ anya nke ọma. Ike ọgwụgwụ na-atụnye ụtụ ná nrụgide. Etinyeghị uche n’ihe nwa mgbe nta pụrụ ịkpata ọnwụ.
Tụleekwa okwu ndụmọdụ na-esonụ, ma rịba ama otú o si metụta ilu nke Eze Solomọn maara ihe.
• Ndị i bu hà na-achọpụta iwe gị? Ikekwe ha na-atụ aro ka i wetuo obi. Ajụla nnọọ okwu ndụmọdụ ha ma kwuo na ha bụ ndị ọnọ n’azụ akwọ ụgbọala. Cheta, àgwà ịdị jụụ ka mma maka ahụ ike, ọ pụkwara n’ụzọ nkịtị inyere gị aka ịdịkwu ogologo ndụ! “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.”—Ilu 14:30.
• Chee echiche banyere ọkwọ ụgbọala nke ọzọ, ma zere nsogbu. “Onye maara ihe na-atụ egwu, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya: ma onye nzuzu na-ewebiga iwe ókè, wee na-atụkwasị obi.”—Ilu 14:16.
• Mee ka iwe dajụọ site n’ife aka ma ọ bụ ikwu okwu arịrịọ. “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.
• Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-enwekarị ọnụma okporo ụzọ, ma ọ dịghị mkpa ka i ṅomie ha. “Gị na onye iwe abụla enyi.”—Ilu 22:24.
• Zere isonye n’esemokwu nke ndị ọzọ. “Tutu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.”—Ilu 17:14.