Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 3/8 p. 14-17
  • Ịghọta Egwu nke Ịsụ Nsụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọta Egwu nke Ịsụ Nsụ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Ndị Pụrụ Ịkpali Egwu
  • Mgbe A Na-agbalị Inye Aka
  • Ime Ka Ibu Ha Ka Mfe
  • Onye Okike Anyị Na-aghọta
  • Otú Ị Ga-esi Akwụsịlata Ịsụ Nsụ
    Teta!—2010
  • Otú M Si Anagide Ịsụ Nsụ
    Teta!—1998
  • Nnwere Onwe Pụọ n’Ịsụ Nsụ!
    Teta!—1998
  • Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 3/8 p. 14-17

Ịghọta Egwu nke Ịsụ Nsụ

Ị̀ PỤRỤ ikwu ọdịiche dị n’etiti onye na-ekwu okwu were were na onye na-atụ egwu ịsụ nsụ? ‘Ee,’ ka ị pụrụ ịza. Ma tụlee ihe Peter Louw dere n’akwụkwọ o dere n’asụsụ Afrikaans bụ́ Hhhakkel (Nnnsụ): “Maka onye ọ bụla na-asụ nsụ ‘a ma ama,’ ikekwe e nwere iri ndị chọrọ ka a ghara ịchọpụta ha dị ka o kwere omume, ndị na-ezochikwa nsogbu ikwu okwu ha n’ụzọ dị iche iche.” Zochie nsogbu ikwu okwu ha? Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume?

Ndị nsụ ụfọdụ na-ejisi ike ezobe nsogbu ha site n’ịtụ anya okwu ndị kpatawooro ha nsogbu n’oge gara aga. Mgbe ahụ, kama ịkpọ okwu ahụ, ha ekwugharịa ahịrịokwu ahụ n’ụzọ ọzọ ma ọ bụ jiri okwu ọzọ pụtara otu ihe ahụ mee ihe. Otu di zochiri nsụ ya ruo afọ 19 nke ọlụlụ ha. Mgbe nwunye ya matara ihe bụ eziokwu, ọ jụrụ dibịa nsogbu ikwu okwu, sị: “Ì chere na ọ bụ ya kpatara o ji eme ka ọ bụrụ m na-akpọ òkù fon, na ihe o ji na-abụ m na-akpọ nri n’ụlọ nri, na ihe mere ọ na-adịghị mgbe ọ na-ekwu okwu ná . . . nzukọ?”

Tụleekwa Gerard na Maria, bụ́ di na nwunye na-enwe obi ụtọ sitere South Africa.a Ọtụtụ mgbe, Maria gbalịrị ịkọwara di ya na ya adịghị aza ajụjụ ná nzukọ ọmụmụ Bible n’ihi egwu ọ na-atụ ịsụ nsụ. “Akụkọ,” ka ọ na-ekwusikarị ike, “ị bụghị onye nsụ.” Nkwubi okwu Gerard dabeere n’ọdịdị ekwurekwu sitere n’okike nke nwunye ya. Nanị ọnọdụ ụfọdụ nke ikwu okwu na-akpatara ya ịtụ egwu ịsụ nsụ. Na nke mbụ ya, ka afọ ise gasịrị n’ọlụlụ ha, Gerard matara nke a ma kweta: “Amaghị m, echebaghịkwara m ya echiche.” Ugbu a, kama ịkọcha ya, ọ na-aja ya mma maka oge ndị ọ na-enwe obi ike ikwu okwu n’ihu ọtụtụ ndị na-ege ntị.

N’ụzọ a pụrụ ịghọta, “egwu . . . mgbe ụfọdụ ndị na-adịgide adịgide, mgbe ụfọdụ ndị siri ike,” na-eti ndị nsụ ihe otiti ka onye nsụ bụ́ David Compton na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Stammering. “N’oge ọ pụrụ imetụta ya karịsịa, oge kasị mkpa ná mmekọrịta ya na ndị mmadụ ibe ya, mgbe ọ na-ekwusara ha okwu, ma ọ̀ bụ n’ihe nkịtị ma ọ bụ n’ihe onwe onye, n’oge ndị dị otú ahụ onye nsụ pụrụ ịtụ anya ịbụ onye e mejọrọ, mee ihe ọchị . . . Ọbụna ndị ọ kasị agara nke ọma ịnagide ya ka na-ekweta na egwu ha akpụgharịwo ha, na ọ dịghị ahapụchakwa ha aka ma ọlị.”

Ọnọdụ Ndị Pụrụ Ịkpali Egwu

Mgbe a kpọlitere onye nsụ ka ọ zaa ajụjụ n’ihu ndị na-ege ntị, n’ihe dị ka na klas ụlọ akwụkwọ, ná nzukọ achụmnta ego, ma ọ bụ ná mgbakọta okpukpe, ọ pụrụ iweta nchegbu nke na-ebute ajọ nsụ. “Ọ̀ dị mgbe ị na-eche na ọ ka nnọọ mfe ịgba nkịtị?” ka a jụrụ onye nsụ gbara afọ 15 bụ́ onye South Africa aha ya bụ Rosanne n’ajụjụ ọnụ redio. Ọ zaghachiri, “Ọtụtụ mgbe, dị ka ihe atụ, n’ime klas mgbe m nwere azịza dị mma nke m maara na ọ ga-enye m akara dị elu ma amaara m na ọ bụ ọgụ na mgba ikwu okwu n’ezie.”

A gbakwara onye ọchụ ntá ego aha ya bụ Simon ajụjụ ọnụ n’ihe omume redio ahụ a kpọtụrụ aha n’elu. Dị ka Rosanne, Simon enwewo ọganihu site n’enyemaka nke usoro ọgwụgwọ nsogbu ikwu okwu. Ma mgbe ụfọdụ ọ ka na-enwe oge ịsụ nsụ nke ọjọọ. Nke a pụrụ ịka njọ n’ihi àgwà nke ndị na-ege ya ntị. “Ọ bụrụ na ị nọ ná nzukọ òtù bọọdụ ebe ị ga-ekwu okwu nke ukwuu ma na-enwe nsogbu, ndị nọ ná nzukọ ahụ ghara nnọọ inwe ndidi,” ka ọ na-akọwa.

E kwesịghị ịghọtahie egwu nke onye nsụ na-atụ na egwu nke onye na-eme ihere pụrụ ịtụ ịgwa ndị ọ na-amaghị okwu. Tụlee Lisa, onye nọworo na-aga nzukọ Ndịàmà Jehova eri afọ abụọ gara aga. Ná mkparịta ụka nkịtị nke ya na ndị enyi, ọ na-ejisikarị ike ekwu okwu were were. Ọ na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma nke chọrọ ijekwuru ndị a na-amaghị ama n’abụghị onye a kpọrọ òkù. Ma o nwere egwu nke na-atụkarị ọtụtụ ndị na-asụ nsụ—ikwu okwu n’ihu ọtụtụ ndị na-ege ntị. “Ná nzukọ anyị,” ka Lisa na-akọwa, “ọ na-esi ike mụ iweli aka zaa ajụjụ. Ọ bụrụ na m zaarị ajụjụ, o hikarịa nne ọ bụrụ otu okwu ma ọ bụ otu nkenke ahịrịokwu. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị obere, ọ bụ ike m nile. Ọtụtụ mgbe, azịza ndị ahụ na-adị m n’isi na n’egbugbere ọnụ n’ihi na m na-akwado tupu oge eruo. Ma ire m na-ajụ nnọọ ikwenyere m.”

Ahụmahụ ka njọ nye ndị nsụ ụfọdụ bụ ịgụ ihe n’olu dara ụda. Nke a na-amanye ha iji okwu ndị ha na-ezerekarị eme ihe. “N’otu n’ime nzukọ anyị,” ka Lisa na-aga n’ihu na-ekwu, “a na-agwa anyị mgbe ụfọdụ ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-atụle onye gụọ ibe ya agụọ. N’oge ndị dị otú ahụ ana m anọdụ ala n’egwu, na-ama jijiji, na-echere ka o ruo m, n’amaghị ma m ga-agụli akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ ma ọ bụ na m gaghị agụli ya. Mgbe ụfọdụ m na-agụ ma apụghị m ịkpọpụta otu okwu kpọmkwem. Mgbe ahụ amafee m ya gụrụ na-aga.”

N’ụzọ doro anya, ọ dị mkpa iji nlezianya chee echiche tupu a gbaa onye nsụ ume ịgụ ihe n’olu dara ụda. “Agbamume” dị otú ahụ pụrụ ime ka onye nsụ nwee mmetụta ọjọọ karị. Kama nke ahụ, e kwesịrị ịja onye dị otú ahụ mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ maka ime ike ya nile.

Mgbe A Na-agbalị Inye Aka

Ịsụ nsụ bụ nsogbu dị nnọọ mgbagwoju anya. Ihe dị irè maka otu onye nwere ike ghara ịdị irè maka onye ọzọ. N’ezie, ọtụtụ ndị nsụ nwere oge a “gwọrọ” ha na-emesịa daghachi azụ. E mewo nnyocha n’ịsụ nsụ karịa ka e meworo banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nsogbu ikwu okwu ọ bụla ọzọ. Ma, ndị ọkachamara achọpụtabeghị ihe na-akpata ya kpọmkwem. N’ezie, ihe ka n’ọtụtụ kwere na ọtụtụ ihe pụrụ iso kpata ịsụ nsụ. Otu nchepụta echiche, dị ka ihe ọmụmụ ndị na-adịbeghị anya na-egosi, bụ na ọ na-esite ná nhazi na-ekwekọghị ekwekọ nke mkpụrụ ndụ ụbụrụ ná mbido ndụ onye nsụ. Dị ka Dọkịta Theodore J. Peters na Dọkịta Barry Guitar si kwuo n’akwụkwọ ọgụgụ ha bụ́ Stuttering—An Integrated Approach to Its Nature and Treatment, echiche ndị e nwere ugbu a banyere ihe ndị na-akpata ya “ga-abụ ndị oge ha gafeworo ka ihe ọmụmụ ndị ọzọ na-emejụ nnukwu oghere ndị dị n’ihe anyị maara banyere ịsụ nsụ.”

Ebe ọ bụ na mmadụ maara ihe dị nnọọ nta banyere ịsụ nsụ, ịkpachapụ anya dị mkpa mgbe a na-atụ aro maka otu n’ime ọtụtụ usoro ọgwụgwọ maka ndị nsogbu a na-eti ihe otiti. “Ihe ka n’ọtụtụ ndị na-asụ oké nsụ,” ka akwụkwọ ọgụgụ dị n’elu na-agbakwụnye, “ga-agbake nanị nke nta. Ha ga-amụta ikwu okwu nwayọọ nwayọọ karị ma ọ bụ ịsụ nsụ n’ụzọ dị mfe karị, kwụsịtụkwa ichegbu onwe ha n’ihi ya. . . . N’ihi ihe ndị anyị na-aghọtaghị, ndị nsụ ole na ole adịghị nnọọ agbanwe n’ụzọ pụtara ìhè mgbe a na-agwọ ha.”b

Mgbe ọgwụgwọ na-arụghị ọrụ, ndị dibịa ụfọdụ atawo onye nsụ ụta na ọ gbalịsighị ike. Otu kwuru, sị: “Nanị ihe yiri ka ọ ga-ebute ọdịda bụ omume obi abụọ n’akụkụ onye nsụ ahụ.” Banyere nzọrọ ndị dị otú ahụ, onye na-ede akwụkwọ bụ́ David Compton kwuru, sị: “Enweghị m okwu ndị m ga-eji kwupụta iwe okwu dị otú a pụrụ ịkpasu ndị nsụ. Nke mbụ, n’ihi na ọ bụ ụgha gba ọtọ. Ọ dịghị otu usoro ọgwụgwọ ọ bụla ga-adị mma maka ndị nsụ nile, ọbụnakwa nke dị mma maka otu onye nsụ kpọmkwem agaghị abụ ma ọlị nke e ji n’aka na ọ ga-arụrịrị ọrụ. Nke abụọ, n’ihi na ndị nsụ na-enwe ọdịda . . . Ihe ọ bụla na-eme ka [ọdịda ha] rịa elu n’ụzọ na-adịghị mkpa, n’ụzọ na-ezighị ezi, bụ arụ.”

Ime Ka Ibu Ha Ka Mfe

Ndị nsụ adịghị achọkarị ka e mewere ha ebere. Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe a pụrụ ime iji mee ka ibu ha ka mfe. Mgbe ha na-asụ nsụ, elefula anya n’ihere. Kama ile ha anya n’ọnụ, lee ha anya n’anya. Mmegharị ahụ nke ndị na-ege ha ntị na-emetụtakarị ha. Ọ bụrụ na o yie ka ị nọ nwayọọ, ọ ga-enye aka belata egwu ha. “Gosi onye ahụ na ị dị njikere ige ya ntị dị ka ị ga-adị njikere ige onye ọ bụla ntị,” ka otu dibịa na-agwọ nsogbu ikwu okwu kwuru.

Ndị nkụzi nwere onye nsụ n’etiti ụmụ akwụkwọ ha pụrụ ime ihe buru ibu iji belata egwu onye ahụ. N’akwụkwọ mmụta South Africa bụ́, Die Unie, e nyere ndị nkụzi okwu ndụmọdụ a sonụ: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụ na-asụ nsụ dị ala karị mgbe ha maara na onye na-ege ha ntị adịghị atụ ha anya ikwu okwu were were.”

Dị ka akwụkwọ ahụ e hotara n’elu na-ekwu, ọ dịkwa mkpa ka onye nkụzi mara mmetụta nwata akwụkwọ ahụ. Kama izere ụmụ akwụkwọ dị otú ahụ n’ihi mmechuihu, a na-adụ ndị nkụzi ọdụ ịgwa ha okwu na ịgba ha ume ikwupụta mmetụta ha banyere nsogbu ahụ. N’ụzọ dị otú a onye nkụzi ahụ pụrụ ịchọpụta ọnọdụ ikwu okwu nwata akwụkwọ ahụ na-atụ egwu karịsịa. “Ikwu okwu were were ya dabeere pasent 80 n’ebe ị nọ,” ka akwụkwọ ahụ na-akọ. Ikwu okwu were were ya ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ maara na a na-anakwere ya n’agbanyeghị nsogbu ahụ. Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Ọnọdụ dị ntụsara ahụ, nke kwesịrị ịmụ ihe na klas ga-abara ọ bụghị nanị onye nsụ ahụ uru kamakwa ndị ọzọ nọ na klas ahụ.”

N’ezie, a pụrụ ime ka aro ndị a daba nke ọma n’ọnọdụ izi ihe metụtara ndị toworo eto.

Onye Okike Anyị Na-aghọta

Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-aghọtazu ezughị okè mmadụ. O nyere Mosis ọrụ ịbụ ọnụ na-ekwuru ya n’idupụta ụmụ Israel n’Ijipt. O mere nke a n’agbanyeghị na ọ maara nke ọma na Mosis nwere nsogbu ikwu okwu nke mere ka o siere ya ike ikwurịta okwu. Chineke makwaara na nwanne Mosis, bụ́ Erọn, n’ụzọ dị iche bụ onye na-ekwu okwu were were. “Amawo m na ya onwe ya na-ekwu okwu nke ọma,” ka Chineke kwuru. (Ọpụpụ 4:14) Otú ọ dị, Mosis nwere àgwà ndị ọzọ dị oké mkpa karị, ndị dị ka iguzosi ike n’ihe, obiọma, okwukwe, na eweghị iwe ọkụ. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3; Ndị Hibru 11:24, 25) N’agbanyeghị ọjụjụ Mosis jụrụ, Chineke nọsiri ike ná nhọrọ ọ họọrọ Mosis ịbụ onye ndú nke ndị Ya. N’otu mgbe ahụ, Chineke mere ihe banyere egwu Mosis site n’ịhọpụta Erọn dị ka ọnụ na-ekwuru Mosis.—Ọpụpụ 4:10-17.

Anyị pụrụ iṅomi Chineke site n’igosi nghọta. Kwanyere ndị nsụ ùgwù, ekwekwala ka nsogbu ikwu okwu gbochie gị ịhụ uru onye ahụ bara n’ezie. Ihe na-egosipụta nke a bụ ahụmahụ nke otu nwatakịrị nwanyị na nna ya na-asụ nsụ. Nna ya mụtara ụzọ isi gụọ ihe were were karị. Otu abalị ọ nwalere ya n’ebe nwa ya nwanyị gbara afọ isii nọ site n’ịgụrụ ya otu akụkọ, o nwekwara nnukwu obi ụtọ maka otú o si gụọ ihe were were.

“Kwuo okwu nke ọma, Papa,” ka o kwuru mgbe nna ya gụsịworo.

“Ana m ekwu nnọọ okwu nke ọma,” ka o ji iwe zaghachi.

“Ee e,” ka nwa ya siri ọnwụ, “kwuo okwu ka i si ekwubu.”

Ee, nwatakịrị nwanyị a hụrụ nna ya n’anya n’ihi onye ọ bụ, ọbụna n’agbanyeghị nsogbu ikwu okwu ya. Ya mere mgbe ọzọ gị na onye na-asụ nsụ mekọrọ ihe, cheta na onye ahụ pụrụ inwe echiche dị nnọọ mma na àgwà ndị a na-achọsi ike. O doro anya na o nwere mmetụta. Nwee ndidi ma gosi ya nghọta.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.

b E nwere atụmanya maka mgbake ka ukwuu nye ụmụaka karịa ndị okenye. Dibịa nwere ahụmahụ na-agwọ nsogbu ikwu okwu bụ́ Ann Irwin na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Stammering in Young Children, sị: “Atọ n’ime ụmụaka anọ na-etofe nnọọ nsụ ha. Ọ bụrụ na nwa gị bụ otu n’ime pasent 25 na-etofeghị ya n’onwe ha, e nwere ohere buru nnọọ ibu na ọ ga-etofe ya n’iji Usoro Ọgwụgwọ Mgbochi eme ihe.”

[Foto dị na peeji nke 25]

Onye nsụ pụrụ ịtụ ụjọ ikwu okwu n’ihu ọha

[Foto dị na peeji nke 26]

Nwee ndidi ma ọ bụrụ na onye nsụ na-enwe ihe isi ike ịgwa gị okwu

[Foto dị na peeji nke 27]

Ndị nsụ n’ozuzu ha na-atụ telifon egwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya