Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 12/8 p. 3-5
  • Gịnị Kasị Mma Maka Nwa Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Kasị Mma Maka Nwa Ahụ?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nhọrọ Ndị E Nwere n’Ikike Ịkpọrọ Nwa
  • Ajụjụ Ndị A Pụrụ Iche Ihu
  • Ikike Ịkpọrọ Nwa—Echiche Ziri Ezi
    Teta!—1997
  • Ikike Ịkpọrọ Nwa—Okpukpe na Iwu
    Teta!—1997
  • Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—2010
  • Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 12/8 p. 3-5

Gịnị Kasị Mma Maka Nwa Ahụ?

ỊGBA alụkwaghịm ka ọ̀ bụ ịghara ịgba? Nke ahụ bụ nnukwu ajụjụ na-adị n’uche ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye na-enweghị obi ụtọ. Ọtụtụ afọ gara aga a dịghị ele ịgba alụkwaghịm anya ọma, ma ọ bụrụ na a katọghị ya, n’ihi ihe ndị metụtara omume ọma na okpukpe. Nne na nna ọ bụla lụrụ di na nwunye na-enweghị obi ụtọ na-ebikọtakarịkwa ọnụ n’ihi ụmụ ha. Otú ọ dị, ụkpụrụ nke ụwa a agbanwewo n’ụzọ gabigara ókè na nso nso a karị. Taa, a na-anabata ịgba alụkwaghịm n’ọtụtụ ebe.

Ma, n’agbanyeghị nnabata nke ịgba alụkwaghịm, ọtụtụ ndị nne na nna, ndị ọkàikpe, ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze ka ukwuu, na ndị ọzọ na-ekwupụta nchegbu banyere ajọ mmetụta nke ịgba alụkwaghịm na-enwe n’ebe ụmụaka nọ. A na-anụkwu olu ịdọ aka ná ntị ugbu a. Ihe àmà na-arị elu na-egosi na ịgba alụkwaghịm pụrụ inwe mmetụta na-emebi ihe n’ebe nwata nọ. A na-agba ndị nne na nna ume iche echiche banyere ihe ịgba alụkwaghịm ga-arụpụtara ha na ụmụ ha. Ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Sara McLanahan, nke Mahadum Princeton, na-ekwu na “n’agbata ụzọ abụọ n’ime atọ na ụzọ atọ n’ime anọ nke ezinụlọ ndị gbara alụkwaghịm kwesịrị ma eleghị anya inyekwu ya oge na ichekwu echiche ma ha na-eme ihe ziri ezi.”

Ihe ọmụmụ ndị e mere na nso nso a na-egosi na ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm nọ n’ihe ize ndụ ka ukwuu nke ịtụrụ ime n’afọ iri na ụma, ịpụ n’ụlọ akwụkwọ, ịda mbà n’obi, ịgba alụkwaghịm n’alụmdi na nwunye nke ha, na isonye ná ndị na-anata ihe enyemaka. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa, ịgba alụkwaghịm na-emetụta 1 n’ime ụmụaka 6. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Mary Ann Mason, n’akwụkwọ ya banyere ikike ịkpọrọ nwa na United States, kwuru, sị: “Nwa a mụrụ na 1990 nwere ihe dị ka ohere 50 pasent nke ịdaba n’okpuru ikike nke ụlọikpe n’okwu ikpe na-emetụta ebe na onye ya na nwatakịrị ga-ebi.”

N’ụzọ dị mwute, ịgba alụkwaghịm adịghị abụ njedebe nke ibu iro mgbe nile, ebe nne na nna pụrụ ịnọgide na-alụ ọgụ n’ụlọikpe maka ikike ịkpọrọ nwa na ime nleta, na-akpatakwuru ụmụ ha nchekasị. Ọgụ ndị a jupụtara ná mmetụta uche a na-alụ n’ọnọdụ ịma aka nke ụlọikpe na-ele iguzosi ike n’ihe nke ụmụaka nye nne na nna ha ule, na-emekwa mgbe mgbe ka ha nwee mmetụta nke enweghị ike ime ihe ọ bụla na ịtụ egwu.

Otu onye ndụmọdụ ezinụlọ kwuru, sị: “Ịgba alụkwaghịm adịghị anapụta ụmụaka. Mgbe ụfọdụ ọ na-anapụta ndị toworo eto.” Nke bụ ezie bụ na site n’ịgba alụkwaghịm, nne na nna pụrụ idozi nsogbu nke ha, ma n’otu oge ahụ, ha pụrụ imerụ ụmụ ha ahụ, bụ́ ndị pụrụ itinye oge ndụ ha fọrọ afọ n’ịnwa ịkwụ ụgwọ maka mmerụ ahụ ahụ.

Nhọrọ Ndị E Nwere n’Ikike Ịkpọrọ Nwa

N’ọnọdụ ibu iro na nrụgide mmetụta uche nke nkewa alụmdi na nwunye, ọ na-esibiga ike ókè ikwurịta maka onye ga-akpọrọ ụmụaka n’ọdịnihu n’ụzọ dị jụụ, nke ezi uche dịkwa na ya. Iji belata nkwata nke ndị nne na nna ma zere ịgba akwụkwọ nke ịma aka, ógbè ụfọdụ na-enye ụzọ ọzọ isi na-edozi esemokwu, dị ka ndozi a na-emeghị n’ụlọikpe.

Mgbe e mere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ndozi na-enye nne na nna ohere inwe nkwekọrịta kama ịhapụrụ ọkàikpe mkpebi maka onye ga-akpọrọ ụmụaka. Ọ bụrụ na ndozi ekweghị omume, nne na nna pụrụ isite n’aka ndị ọkàiwu ha mee ndokwa maka ikike ịkpọrọ nwa na ime nleta. Ozugbo nne na nna kwekọrịtara ma dee ya ede, ọkàikpe pụrụ ịbịanye aka n’iwu nke ọchịchọ ha dị na ya.

Mgbe nne na nna na-apụghị ikwekọrịta ná ndokwa ikike ịkpọrọ nwa, usoro iwu n’ihe ka n’ọtụtụ ala ga-ewepụta ụzọ isi gbalịa ijide n’aka na e chebere ọdịmma kasịnụ nke ụmụaka. Nchegbu kasịnụ nke ọkàikpe ga-abụ ụmụaka, ọ bụghị nne na nna. Ọkàikpe ga-atụle ọtụtụ ihe ndị dị mkpa, dị ka ọchịchọ nke nne na nna, mmekọrịta nke nwatakịrị nwere n’ebe nne ma ọ bụ nna nọ, ihe ndị na-amasị nwatakịrị, na ikike nne ma ọ bụ nna nwere inye nlekọta kwa ụbọchị. Mgbe ahụ ọkàikpe ga-ekpebi ebe na onye ya na nwatakịrị ga-ebi tinyekwara otú nne na nna ga-esi ruo mkpebi ndị dị mkpa banyere ọdịnihu nke nwatakịrị.

Ná ndokwa nke otu onye inwe ikike ịkpọrọ nwa, nne ma ọ bụ nna pụrụ inwe ikike ime mkpebi. Ná ndokwa nke inwekọ ikike ịkpọrọ nwa, ma nne ma nna aghaghị ikwekọrịta ná mkpebi ndị dị mkpa, dị ka nlekọta ahụ ike na agụmakwụkwọ nke nwatakịrị.

Ajụjụ Ndị A Pụrụ Iche Ihu

Mgbe ha chere ịgba akwụkwọ maka ikike ịkpọrọ nwa ihu, nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova aghaghịkwa ịtụle ọdịmma kasịnụ nke ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụaka. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna nke na-abụghị Onyeàmà na-emegide ọzụzụ ọ bụla dabeere na Bible maka ụmụaka? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na a chụpụwo nne ma ọ bụ nna nke na-abụghị Onyeàmà n’ọgbakọ ndị Kraịst?

Ọnọdụ ndị a pụrụ ime ka ime mkpebi takwuo akpụ nye nne na nna bụ́ ndị Kraịst. Ha kwesịrị ime ihe n’ụzọ amamihe na nke ezi uche dị na ya, ha kwesịkwara ijigide ezi akọ na uche n’ihu Jehova ka ha ji ekpere na-atụle ọdịmma kasịnụ nke ụmụaka.

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị dị ka ndị a: Mgbe a na-enye ikike ịkpọrọ ụmụaka, olee otú iwu si ele okpukpe anya? Olee otú m pụrụ isi mee ihe banyere ihe ịma aka nke okwu ikike ịkpọrọ nwa n’ụzọ gara nke ọma? Olee otú m ga-esi nagide ikike ịkpọrọ ụmụ m ifunahụ m? Olee otú m ga-esi ele nkwekọrịta inwekọ ikike ịkpọrọ nwa nke mụ na nne ma ọ bụ nna a chụpụrụ achụpụ anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya