Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 5/8 p. 17-21
  • Ọdụ́—Olee Ókè Ọ Baruru Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdụ́—Olee Ókè Ọ Baruru Uru?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ịchụ Ntá n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị
  • Mmachibido Iwu Zuru Ụwa Ọnụ
  • Enyí nke Ebe Ndịda Africa
  • Ntụkọba Ọdụ́
  • Nchegbu Ka Dị
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Enyí?
  • Nchekwa Megide Mkpochapụ
    Teta!—1996
  • Njem Ileta Ụmụ Anụmanụ na Ghana
    Teta!—2001
Teta!—1998
g98 5/8 p. 17-21

Ọdụ́—Olee Ókè Ọ Baruru Uru?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA KENYA

Ná nnọkọ nkwurịta okwu mba nile e nwere na Harare, Zimbabwe, na June 1997, ndị si mba 138 bịa nnọkọ ahụ kwekọrịtara ibelata mmachibido iwu zuru ụwa ọnụ were afọ asaa n’ịzụ ahịa ọdụ́. Mkpebi ahụ, nke sochiri nrụrịta ụka kpụ ọkụ n’ọnụ, nyere mba atọ dị na ndịda Africa—Botswana, Namibia, na Zimbabwe—ohere iresị otu mba, bụ́ Japan, ọdụ́ n’ọnọdụ ụfọdụ. Ndị nnọchiteanya si ndịda Africa ṅụrịrị ọṅụ n’ihi mkpebi ahụ, na-etiwapụ n’abụ. Ndị ọzọ bịaranụ nwere nchegbu banyere ihe nke a ga-apụtara enyí Africa.

MGBE Hannibal mara usuu ndị agha Rom aka na narị afọ nke atọ T.O.A., ọ chị ìgwè enyí Africa a zụrụ azụ. N’oge ahụ ikekwe enyí Africa ruru ọtụtụ iri nde n’ọnụ ọgụgụ, jupụtakwa site na Cape ruo Cairo.

Ihe gbanwere. Otu onye na-ekiri ihe na-emenụ kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị nta nke ụmụ mmadụ n’etiti ìgwè enyí gbanwere n’ụzọ na-arị elu gaa n’ọnụ ọgụgụ dị nta nke enyí n’etiti ìgwè mmadụ.” Ka ụmụ mmadụ na-amụba n’ọnụ ọgụgụ, asọmpi maka ala mere ka enyí gbara aka. Ihe ọzọ kpatara mbelata nke enyí bụ mgbasa nke Ọzara Sahara gaa n’ebe ndịda.

Otú ọ dị, nke ka kpata ihe ndị a bụ ọchịchọ a na-achọ ọdụ́. N’adịghị ka ọkpụkpụ agụ na mpi enyí ọhịa, e jikọtaghị ọdụ́ na echiche ụgha ọ bụla nke ịba uru dị ka ọgwụ. Ka o sina dị, ọ bụ ihe okomoko, maa mma, na-anọte aka, dịkwa mfe ịpị. Site n’oge ochie, a gụnyekọtawo ọdụ́ sitere n’ezé enyí n’etiti ihe ndị dị oké ọnụ ahịa, ndị a na-achọsikwa ike.

Narị afọ anọ mgbe Hannibal nwụsịrị, Alaeze Ukwu Rom gburu ihe dị ukwuu n’enyí dị n’ebe ugwu Africa iji mejuo ọchịchọ maka ọdụ́. Ọchịchọ ahụ agawo n’ihu kemgbe ahụ karịsịa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ná mmalite narị afọ a, ọchịchọ a na-achọ ya esiwo ike—ọ bụchaghị maka ọrụ nkà na ihe oyiyi okpukpe dị ka ọ bụbu kama maka imepụta keyboard ngwá egwú bụ́ piano. Dị ka akwụkwọ bụ́ Battle for the Elephants si kwuo, n’afọ 1910 nanị, e jiri ihe dị ka ton 700 nke ọdụ́ (na-anọchi anya enyí 13,000 e gburu egbu) mee keyboard 350,000 na United States.

Oké Ịchụ Ntá n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị

Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ọchịchọ a na-achọ ọdụ́ belatara, e tiri iwu ọhụrụ maka nchekwa nke anụ ndị bi n’ọhịa, enyí malitekwara ịmụba n’ọnụ ọgụgụ. Otú ọ dị, ka ọ na-erule mmalite afọ ndị 1970, ogbugbu buru ibu bidoro n’isi. Ugbu a òkù inweta ọdụ́ bịara site ná mba ndị malitere inwe ọganihu ọhụrụ n’Esia.

Ugbu a, ihe abụọ na-agba àmà ọdachi maka enyí dị n’Africa. Nke mbụ bụ inwe ike karị inweta ngwá ọgụ ndị na-adịghị arọ, bụ́ ọkpọka. Na mberede ọ dị mfe ọ bụghị nanị ịgbagbu enyí otu otu kamakwa ìgwè ya dum. Nke abụọ, ngwá ọrụ eletrik ndị e ji apị ihe pụtara na a pụrụ ịkpụgharị ọdụ́ ọhụrụ ngwa ngwa ịghọ ihe ndị a kwadebere maka orire. N’oge gara aga, onye Japan na-atụ ihe pụrụ itinyeworị otu afọ n’ịtụ otu ezé enyí. Otú ọ dị, n’iji ngwá ọrụ eletrik, n’ime otu izu nanị, ụlọ mmepụta ihe nke nwere mmadụ asatọ na-eme ọla na hanko (ihe ndị e ji akanye aha a ma ama na Japan) pụrụ iji ezé enyí 300 rụọ ọrụ. Ọchịchọ na-arị elu maka ọdụ́ mere ka ọnụ ahịa ya rịa elu. Otú ọ dị, ego buru ibu agaraghị ndị ahụ na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị kama ọ gaara ndị na-agba mgbere ya, ndị ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị bara ọgaranya nke ukwuu.

Ọnụ ọgụgụ enyí nwụrụnụ na-atụ ụjọ. N’ime ihe dị ka iri afọ abụọ, karịsịa ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị gburu pasent 80 nke enyí Tanzania. E gburu pasent 85 nke enyí Kenya. E gburu pasent 95 nke Uganda. Ná mmalite, ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị na-agbagbukarị oké enyí, n’ihi na ha nwere ezé ndị kasị ibu. Ma ka enyí ndị katara ahụ karị dịwara ole na ole karị, ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị malitere ịgbagbu ọbụna ndị obere maka ntakịrị ezé ha. N’oge ahụ, ọ pụrụ ịbụ na e gburu ihe karịrị otu nde enyí maka ọdụ́ ha, na-ebelata ọnụ ọgụgụ enyí Africa ruo 625,000.

Mmachibido Iwu Zuru Ụwa Ọnụ

Mgbalị e mere ịchịkwa azụmahịa ọdụ́ na ịkwụsị oké ogbugbu ahụ kụrụ afọ n’ala. N’ikpeazụ, n’October 1989, ná nnọkọ nkwurịta okwu e nwere na Switzerland, Mgbakọ Maka Azụmahịa Mba Nile n’Ụdị Ihe Ọkụkụ na Anụmanụ Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ (CITES) machibidoro azụmahịa ọdụ́ nile n’etiti mba ndị so n’òtù ahụ iwu. E ji ego buru ibu kwadoo mmachibido iwu ahụ iji chebe enyí ndị dị n’ọhịa.

Ụfọdụ buru amụma na ịmachibido ọdụ́ iwu ga-akpata ọnụ ahịa ka elu n’ahịa nzuzo nakwa na ịchụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị ga-amụba. Ihe megidere nke ahụ mere. Ọnụ ahịa dara, ahịa na-enyebu ego pịachikwara. Dị ka ihe atụ, n’India, ịtụ mgbere ọdụ́ ji pasent 85 daa, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eji ọdụ́ atụ ihe nke mba ahụ aghaghịkwa ịchọ ọrụ ọzọ. Ịchụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị belatara n’ụzọ dị ịtụnanya. Tupu mmachibido iwu ahụ, ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị na Kenya gburu ma ọ dịkarịa ala enyí 2,000 n’otu afọ. Ka ọ na-erule 1995, ọnụ ọgụgụ ahụ adalataruwo 35. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ enyí Kenya mụbara site na 19,000 na 1989 ruo ihe dị ka 26,000 taa.

N’ihi ihe ndị a, Ụlọ Ọrụ Nnyocha Gburugburu Ebe Obibi, dị na London, toro mmachibido iwu n’azụmahịa ọdụ́ dị ka “otu n’ime ihe ịga nke ọma kachasị n’akụkọ nke nchekwa n’oge a.” Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nwere ịnụ ọkụ n’obi a, karịsịa n’ebe ndịda Africa.

Enyí nke Ebe Ndịda Africa

Mba ndị dị n’ebe ndịda Africa nwere ihe karịrị enyí 200,000, ma ọ bụ ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ọnụ ọgụgụ nke enyí Africa nile. Nke a bụtụ n’ihi ụkpụrụ nchekwa ndị dị mma, bụrụkwa n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na mba ndị a gbanahụrụ ndị agha nkịtị bujuru ngwá agha nke gburu ìgwè anụ nke ebe Ọwụwa Anyanwụ na Etiti Africa.

Otú ọ dị, ka ọnụ ọgụgụ enyí na-amụba, a na-enwekarị ọgụ n’agbata enyí na ndị bi n’ime ime obodo. E kwuwerị, enyí katara ahụ na-eri oké nri, o nwekwara ike ịta ihe ruru kilogram 300 ihe ọkụkụ n’otu ụbọchị. Ọ bụrụ na enyí bi nso n’ógbè unu, ị ga-ama.

Òtù Na-echekwa Ebe E Si Enweta Akụ̀ Africa, dị na Zimbabwe, na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ime obodo Africa na-eji egwu, obi abụọ na ibu iro na-ele enyí anya. N’ime hour ole na ole, enyí pụrụ imebi ihe ndị mmadụ ji ebi ndụ site n’ịta ihe ọkụkụ ha ma ọ bụ ịzọgbu anụ ụlọ ha. Ha na-emebikwa ebe obibi na ụlọ akwụkwọ, ogige ehi, osisi ndị na-amị mkpụrụ, ihe mgbochi mmiri na ọdịdị ala. Kwa ụbọchị akwụkwọ akụkọ ógbè na-ebu akụkọ ihe enyí mebiri.”

Mba ndị dị n’ebe ndịda Africa na-akpa nganga n’ihi ihe ịga nke ọma ha nwere n’ịnọgide na-enwe ọnụ ọgụgụ enyí buru ibu. Ma nchekwa na-eri ego, ha adịghịkwa ekweta na e kwesịrị ịta ha ahụhụ maka nsogbu nke mba ndị ọzọ dị n’Africa. Ịzụ ahịa ọdụ́ a chịkwara achịkwa, ka ha na-eche, ga-enye ohere ikponyeghachi ego ná mgbalị ndị a na-eme maka nchekwa, ọ ga-enyekwa aka iti ndị ọrụ ugbo ime obodo aka n’obi n’ihi mfu ha.

Ntụkọba Ọdụ́

Ná mba ebe enyí na-awagharị, ọdụ́ na-amụba. Ọ na-esite n’enyí ndị e gburu iji belata ọnụ ọgụgụ ha, site n’enyí ndị nwụọrọ onwe ha, sitekwa ná ndị e bukọbara n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ndị e jichiworo. Gịnị ka e mere ọdụ́ a?

Kenya na-akpọ ọdụ́ ha ọkụ. Kemgbe July 1989, Kenya amụnyewo ọdụ́ a na-apịghị apị ọnụ ego ya ruru ọtụtụ nde dollar ọkụ n’ihu ọha, na-enweghị iti aka n’obi si n’ebe ndị ọzọ. Na 1992, Zambia kpọkwara ntụkọba ọdụ́ ha ọkụ. Ozi ahụ doro anya: Kenya na Zambia achọghị ikere òkè n’ịzụ ahịa ọdụ́.

Mba ndị ọzọ ahapụwo ntụkọba nke ha dị ka atụmatụ achụmnta ego n’ọdịnihu. TRAFFIC, bụ́ òtù kasị ibu n’ụwa na-eleru anụ ndị dị n’ọhịa anya, na-eme atụmatụ na ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ọdụ́ a tụkọbara ugbu a ná mba ndị dị n’Africa bụ ma ọ dịkarịa ala ton 462, ọnụ ego ya ruru nde dollar 46. Botswana, Namibia, na Zimbabwe, bụ́ mba atọ ahụ e kwere ka ha na Japan zụkọrịta ahịa ugbu a, nwere ọdụ́ dị ton 120. Ya mere, ọtụtụ ndị na-ajụ, ‘N’ógbè ebe ndị mmadụ na-adọlị n’ụzọ akụ̀ na ụba, n’ihi gịnị ka a ga-eji kwe ka ọdụ́ nọrọ n’ụlọ nkwakọba ihe na-ekpo ntụ? N’ihi gịnị ka a na-agaghị ere ya ma tinyeghachi ego ahụ ná nchekwa?’

Nchegbu Ka Dị

Ka ụfọdụ mba Africa na-arụ ụka na iwelata aka ná mmachibido iwu ọdụ́ ga-enye aka ná nchekwa enyí, ndị ọzọ kwenyesiri ike na mmachibido iwu kpam kpam n’azụmahịa ya bụ nanị nzọụkwụ ga-egbochi oké ịchụ ntá ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Nchegbu na-elekwasị anya n’ókè a na-achịkwaru ịzụ ahịa ahụ. Usoro azụmahịa ọ̀ pụrụ imepụta ohere ebe ọdụ́ e nwetara site n’ịchụ nta n’ụzọ iwu na-akwadoghị pụrụ isi banye n’azụmahịa nke iwu kwadoro? Ọzọkwa, gịnị banyere ịchụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị nke a na-eme atụmatụ ya? Iwelata aka ná mmachibido iwu ahụ ọ̀ pụtara na a ga-egbu enyí, ndị ahụ na-ele anya na a pụrụ iwelatakwu aka ná mmachibido iwu ahụ n’ọdịnihu atụkọbakwa ọdụ́?

Tụkwasị ná nchegbu ndị a bụ eziokwu ahụ nke bụ na égbè abakwuola ụba n’Africa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Agha obodo dị n’ebe a emewo ka égbè ndị na-awụ mgbọ banye n’aka ndị mmadụ bụ́ ndị, n’ịbụ ndị ọnọdụ akụ̀ na ụba siri ike kpaliri, dị njikere iji ha kpaa ego. Nehemiah Rotich, bụ́ onye nduzi nke Òtù Maka Anụ Ọhịa nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, dere, sị: “Ebe ọdụ́ gawara ahịa [n’ihi ịmaliteghachi azụmahịa], obi abụọ adịghị ya na a ga-eji égbè ndị a na-agba enyí—e kwuwerị ọ dị nnọọ mfe karị ịgbagbu enyí nọ n’ime ogige buru ibu karịa ka ọ dị izu ohi n’ụlọ akụ̀ obodo ukwu.”

Nsogbu ọzọ bụ na ihe ndị a na-eme iji gbochie ịchụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị abụghị nanị na ọ dị oké ọnụ kamakwa o siri ike. Iche nche n’ime ógbè ndị buru ibu ebe enyí na-awagharị chọrọ ego buru ibu. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, ihe ndị a siri ike inweta.

Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Enyí?

A ka ga-ahụ ihe ndị ga-esi ná mkpebi iwelata aka ná mmachibido iwu nke ịzụ ahịa ọdụ́ pụta. Ma, ọ bụrụgodị na ihe nile gaa nke ọma, iyi enyí egwu agaghị akwụsị. Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-aba ụba bụ́ ndị chọrọ ala maka ịrụ ọrụ ugbo na maka ihe ndị ọzọ na-eyikwa enyí egwu. N’ebe ndịda Africa nanị, ndị mmadụ na-egbukpọsị ọhịa, karịsịa maka ọrụ ugbo, ihe dị ka hekta 850,000 nke ala kwa afọ—ebe há ka ọkara Israel. Ka ìgwè mmadụ na-abawanye ụba, o doro anya na ọnụ ọgụgụ dị nta nke enyí ga na-adị ala karị.

Magazin bụ́ World Watch na-ekwu, sị: “E nwere otu isi ihe nke onye ọ bụla mụworo nsogbu ahụ na-ekweta: enyí Africa na-eche ọdịnihu siri ike ihu. Nsogbu nke ebe obibi [n’ihi ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-aba ụba] ga-apụtarịrị na ọtụtụ enyí ga-anwụchu ọnwụ, n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ. Ọ bụrụ na ndị na-achụ ntá nwere akwụkwọ ikike ma ọ bụ ọrụ igbu anụmanụ iji belata ọnụ ọgụgụ ha egbughị ha—ma ọ bụ bụrụ ndị ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị gburu—agụụ ga-agụgbukwu ọtụtụ na-akpata ndalata n’ọnụ ọgụgụ.”

Atụmanya a gbara ọchịchịrị adịghị atụle echiche ma ọ bụ nzube nke Onye Okike enyí, bụ́ Jehova Chineke. Mmetụta Chineke maka ihe ndị o kere eke pụtara ìhè site n’okwu Jisọs Kraịst, bụ́ onye kwuru, sị: “À dịghị ere egwele ise na penny abụọ? Ma a dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke.” (Luk 12:6) Ọ bụrụ na Chineke adịghị echezọ ntakịrị egwele, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ dịghị eleghara ọnọdụ enyí buru ibu anya.

[Igbe dị na peeji nke 18]

Banyere Ọdụ́

“Obi abụọ adịghị ya na ọdụ́ bụ ihe mara mma. Ọ na-egbuke egbuke n’adịghị ka ihe ọzọ e ji eme ihe ịchọ mma ma ọ bụ ihe a kpụrụ akpụ. Ma m na-eche mgbe nile na ndị mmadụ na-echefu na ọdụ́ bụ ezé enyí. N’uche anyị okwu ahụ bụ́ ọdụ́ na-ewepụ ya n’echiche nke enyí. Mmadụ pụrụ ịdị na-agụnyekọta ya na nkume jade, osisi teak, osisi ebony, amber, ọbụna ọlaedo na ọlaọcha, ma e nwere ọdịiche gbara ọkpụrụkpụ: Ihe ndị ọzọ ahụ esiteghị n’anụmanụ; ọdụ́ bụ ezé ihu enyí e doziri edozi. Mgbe mmadụ ji mgba aka ma ọ bụ ihe a pịrị apị mara mma e ji ọdụ́ mee n’aka ya, ọ na-achọkwu nghọta iji mata na ọdụ́ ahụ sitere n’enyí nke na-agagharịbu na-eji ezé ya na-eri nri, na-egwu ala, na-achọgharị ihe oriri, na-egwu egwu ma na-alụ ọgụ, ọzọkwa na enyí ahụ aghaghị ịnwụ ka mmadụ wee jide ọdụ́ ahụ n’aka ya.”—Elephant Memories, nke Cynthia Moss dere.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Banyere Enyí

Enyí siri ike nke ukwuu, mgbe ha wekwara iwe, ala na-ama jijiji. Enyí pụrụ iji imi ya jide gị ma tụlie gị elu dị ka nkume. Ma, enyí pụkwara iji imi ya metụ gị n’ahụ n’ụzọ mmetụta ma ọ bụ jiri nwayọọ were nri n’aka gị. Enyí nwere ọgụgụ isi, sie ike nghọta, na-emekwa ihe ọchị. Ha na-enwe nguzosi ike n’ihe n’ìgwè ha, na-elebarakwa ọnyá dị n’ahụ ibe ha anya, na-elekọta ndị ibe ha na-arịa ọrịa, na-emeghachikwa omume n’ọnwụ nke otu n’ime ìgwè ha. Ọ bụ ezie na ha na-eleghara ozu anụmanụ ndị ọzọ anya, ha na-amata ọkpụkpụ enyí ndị ọzọ ma na-emeghachi omume site n’ịkpasa ma ọ bụ ili ha n’ala.

[Foto dị na peeji nke 20]

Mba abụọ akpọwo ọdụ́ ha ọkụ; ndị ọzọ ahapụwo ntụkọba nke ha dị ka atụmatụ achụmnta ego

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya