Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 8/8 p. 7-8
  • Nchekwa Megide Mkpochapụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nchekwa Megide Mkpochapụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enyemaka Mba Nile
  • Ntinye Aka Ụmụ Mmadụ
  • Ọ̀ Gawo nke Ọma Gabiga Ókè?
  • Atụmanya Dị Obi Abụọ
  • Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Ọ̀tụ̀tụ̀ nke Nsogbu Ahụ
    Teta!—1996
  • Ihe Mere Ụdị Ihe Dị Iche Iche Ji Nọrọ n’Ihe Ize Ndụ
    Teta!—1996
  • Ọdụ́—Olee Ókè Ọ Baruru Uru?
    Teta!—1998
  • Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Otú O Si Emetụta gị
    Teta!—1996
Teta!—1996
g96 8/8 p. 7-8

Nchekwa Megide Mkpochapụ

ỌGỤ dị n’etiti nchekwa na mkpochapụ na-aga n’ihu. Ọtụtụ òtù ọrụ ebere na-arụgide gọọmenti iguzobe iwu nchekwa ndị ka sie ike iji chebe ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ.

Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, ìgwè dị iche iche sooro ndị isi ọrụ China zukọọ ma nweta nkwado ha ná mgbalị iji wepụ kpam kpam mmata a na-amata anụ ọhịa bear ojii nke Esia n’ọnyà. E jidewo anụmanụ ndị a n’ihi òlùlù na akpa òlùlù ha, bụ́ ndị e ji eme ihe n’ọgwụ ọdịnala Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Enyemaka Mba Nile

Ichebe otu ụdị anụ n’otu mba ma na-egbuchapụ ya n’ebe ọzọ adịghị eme ka nchekwa ya na-aga nke ọma. N’ihi nke a, nkwekọrịta mba nile aghọwo ihe bịara n’oge ya—ha dịkwa ọtụtụ. Mgbakọ Banyere Ndịrịta Iche Ihe Ndị Dị Ndụ, bụ́ Nkwekọrịta Rio ahụ, malitere ịrụ ọrụ ná ngwụsị nke 1993, bụ́ nke Nkwekọrịta Banyere Nchekwa nke Ụsụ na Europe sochiri. Òtù Ọrụ Mba Nile Maka Whale wepụtara ebe nchebe azụ whale nke Oké Osimiri Ebe Ndịda tụkwasị n’Oké Osimiri India ná mgbalị iji chebe azụ whale nnukwu na nke minke. Ma ikekwe, nkwekọrịta kasị ike bụ Mgbakọ n’Azụmahịa Mba Nile Maka Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ.—Lee igbe.

Mmadụ ka nwere ihe dị ukwuu ọ ga-amụta banyere mmekọrịta ihe e kere eke nwere, otu n’ebe ibe ya nọ. Ndị ọkụ azụ sitere Ọwụwa Anyanwụ Africa bụ́ ndị tinyere nnukwu azụ perch nke Naịl n’Ọdọ Mmiri Victoria iji mee ka e nwekwuo ihe oriri, mere ka e nwee ihe onye ọkà n’ilekọta anụmanụ bụ́ Colin Tudge kpọrọ “ọdachi gburugburu ebe obibi kasị ukwuu nke narị afọ a.” Ihe dị ka ụdị azụ 200 n’ime 300 ndị a zụlitere n’ọdọ mmiri ahụ pụrụ n’anya. Ọ bụ ezie na ihe àmà oge a na-egosi na ọ bụ nrichapụ elu ala kpatara mgbanwe n’ọnọdụ nke ụdị ihe dị iche iche, gọọmenti nke mba atọ ahụ ọdọ mmiri ahụ dị n’ókèala ha eguzobewo otu òtù iji kpebie ụdị azụ a pụrụ iwebata n’etinyeghị ndị a zụlitere n’ebe ahụ n’ihe ize ndụ.

Ntinye Aka Ụmụ Mmadụ

Otu akụkụ nke na-enwe ihe ịga nke ọma bụ usoro ọmụmụ nke ụmụ anụmanụ e ji eji nke ọtụtụ ogige a na-edebe anụ ọhịa na-ahụ maka ya. “Ọ bụrụ na ogige nile a na-edebe anụ ọhịa n’ụwa akwado usoro ọmụmụ ụmụ anụmanụ e ji eji n’ezie, ọ bụrụkwa na ọha mmadụ akwado ogige a na-edebe anụ ọhịa, mgbe ahụ ha pụrụ ijikọ aka zọpụta ụdị anụ nile nwere ọkpụkpụ azụ bụ́ ndị o yikarịrị ka usoro ọmụmụ ụmụ anụmanụ e ji eji ga-adị mkpa n’ọdịnihu dị nso.”—Last Animals at the Zoo.

Ogige a na-edebe anụ ọhịa nke dị n’obere àgwàetiti Britain bụ́ Jersey na-azụlite anụmanụ ndị a na-adịghị ahụkebe, na-eburu n’obi itinyeghachi ha n’ime ọhịa ma e mesịa. Na 1975, nanị icheoku 100 nke St. Lucia fọdụrụ n’ebe obibi ha na Carribean. A chịịrị asaa n’ime nnụnụ ndị a gaa Jersey. Ka ọ na-erule 1989, ogige ahụ a na-edebe anụ ọhịa azụlitewo 14 ndị ọzọ wee weghachikwa ụfọdụ n’ime ndị a na St. Lucia. A kọrọ na ihe karịrị 300 chọrọ àgwàetiti ahụ mma ugbu a.

Atụmatụ ndị yiri nke ahụ n’ebe ndị ọzọ agawo nke ọma. Magazin bụ́ National Geographic na-akọ na anụ wolf uhie uhie 17 fọdụrụ n’Ebe Ugwu America mụrụ ọtụtụ ụmụ n’ebe e ji ha eji nke na a chịghachiwo 60 ugbu a n’ime ọhịa.

Ọ̀ Gawo nke Ọma Gabiga Ókè?

A dịchaghị eyi ụmụ anụmanụ nọ n’ihe ize ndụ egwu nke mkpochapụ mgbe nile. Dị ka akwụkwọ bụ́ Endangered Species—Elephants (Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Enyi) si kwuo, n’agbata 1979 na 1989, ọnụ ọgụgụ enyi Africa dalatara site na 1,300,000 ruo 609,000—ụfọdụ n’ime ndị a bụ n’ihi ahịa ọdụ enyi a machibidoro iwu. Mgbe ahụ e nwere oké nrụgide ọha na eze ka a machie ahịa ọdụ enyi iwu. Ma, mmegide nye ịmachibido ọdụ enyi iwu ghọrọ nke e ji oké iti mkpu mara. N’ihi gịnị?

Ma na Zimbabwe na South Africa, ụkpụrụ nchekwa agawo nke ọma nke na ogige na ebe nchekwa anụ ndị bi n’ọhịa mba ha nwere enyi dị ọtụtụ gabiga ókè. New Scientist kọrọ na ọ dị Zimbabwe mkpa ịchịpụ enyi 5,000 n’Ogige Mba bụ́ Hwange. Ìgwè nkwado dị iche iche tụrụ aro ịchịga ha ebe ọzọ. Ndị ọrụ nke ogige ahụ chịpụtara ụfọ enyi ndị ahụ ka e ree ha, ma tụọ aro ka ụlọ ọrụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ndị na-emegide ime mgbubilata “debe ego ha n’ebe ọnụ ha dị ma chịga ha ebe ọzọ.”

Atụmanya Dị Obi Abụọ

Ka o sina dị, ọdịda na-ewere ọnọdụ. Ọtụtụ ndị na-ekwupụta nchegbu banyere ọnọdụ ọjọọ nke ụdị anụ ndị e tinyeghachiri n’ime ọhịa. Agụ Siberia na-alanarị nke ọma n’ebe e ji ya eji, ma n’ime ọhịa ihe dị ka square kilomita 260 nke oké ọhịa, ebe a na-enweghị ndị na-egbu anụmanụ n’ụzọ megidere iwu, dị ya mkpa. Ọzọkwa, “tinyeghachi agụ a zụlitere n’ogige a na-edebe anụ ọhịa na gburugburu ebe obibi nke a kpọmkwem,” ka magazin bụ́ The Independent on Sunday na-ekwu, “ọ ga-afọkwa nke nta ka agụụ gụgbuo ya.” Ọ bụ nnọọ atụmanya gbara ọchịchịrị!

N’ikwu eziokwu, ọ bụghị ụdị ihe nile nwere ìgwè pụrụ iche nke ndị inyeaka nke ya. Ọ bụghịkwa nanị ụkọ ndị ọrụ na-eme ka nsogbu ahụ sikwuo ike. N’agbanyeghị ókè ndị na-echekwa anụ ndị bi n’ọhịa tụkwasịruru uche ha n’ọrụ, mgbe ịkpa àgwà na-ezighị ezi nke ndị ọrụ, anyaukwu, na enweghị mmasị, tinyere agha na ọbụna iyi egwu nke ọnwụ chere ha ihu, olileanya dị aṅaa ka ha nwere maka ihe ịga nke ọma? Mgbe ahụ, gịnị bụ ihe ngwọta nye nsogbu nke ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ? Oleekwa otú o si emetụta gị?

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ngwá Agha Mba Nile

Mgbakọ n’Azụmahịa Mba Nile Maka Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ bụ ngwá agha dị ike n’ọgụ a na-alụso ịtụ mgbere megidere iwu nke ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ. Akpụkpọ ahụ agụ owuru, ọdụ enyi, ọkpụkpụ agụ, mpi enyi ọhịa, na mbekwu so n’ime ngwá ahịa ndị a machibidoro iwu ugbu a. Nkwekọrịta ahụ na-agbasa ịgụnye osisi na ụdị azụ ndị nọ n’ihe ize ndụ.

Otú ọ dị, Time dọrọ aka ná ntị: “Ọ gwụla ma mba ndị so n’òtù ahụ pụrụ ịchọta ụzọ isi mee ka ụkpụrụ nduzi ahụ dịgide, . . . ha pụrụ ịchọpụta na anụmanụ ndị ha na-agbalị ichebe adịkwaghị adị.”

[Foto dị na peeji nke 8]

Mgbalị nchekwa ụfọdụ e meworo hà agawo nke ọma gabiga ókè?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Clive Kihn

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya