Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Ọ̀tụ̀tụ̀ nke Nsogbu Ahụ
NNỤNỤ dodo aghọwo ihe nnọchianya nke mkpochapụ. Nke ikpeazụ ná nnụnụ ndị a na-adịghị efe efe nwụrụ n’ihe dị ka na 1680 n’àgwàetiti bụ́ Mauritius. Ọtụtụ n’ime ụdị ha ndị nọ n’ihe ize ndụ ugbu a bikwa n’àgwàetiti dị iche iche. N’ime afọ 400 gara aga, ụdị nnụnụ 85 n’ime 94 a matara dị ka ndị pụworo n’anya abụrụwo nnụnụ àgwàetiti.
Anụmanụ ndị nọ na kọntinent ndị sara mbara nọkwa n’ihe ize ndụ nke mkpochapụ. Chee echiche banyere agụ ndị wagharịrị na Russia nile n’otu oge. Ugbu a, nanị ụdị yitewere ya bi n’Amur ka fọrọ na Siberia, ọnụ ọgụgụ ya ejiriwokwa nwayọọ nwayọọ dalata ruo agbata 180 na 200. A na-akọ na agụ nke ebe ndịda China dị nanị 30 ruo 80 n’ọnụ ọgụgụ. N’Indochina, anụmanụ ndị a na-eche mkpochapụ ihu “n’ime afọ iri,” ka The Times nke London na-akọ. N’India, n’otu aka ahụ, bụ́ ebe ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke agụ ndị dị n’ụwa bi, ndị ọkachamara na-eme atụmatụ na ihe okike ndị a mara mma pụrụ ịghọ ihe e kpochapụrụ n’ime afọ iri.
Enyi ọhịa na agụ owuru na-adịwanye ole na ole. Na China, nnukwu anụ panda na-awagharị n’ìgwè nke ndị na-akarịghị iri. Ọ fọrọ nke nta ka e kpochapụ osisi pine marten na Wales, ọsá uhie uhie ‘pụkwara ịpụ n’anya n’elu ala England na Wales n’ime afọ iri ruo 20 na-abịanụ,’ ka The Times na-azọrọ. N’ofe ọzọ nke Atlantic n’ime United States, ụsụ bụ anụ elu ala na-enye nwa ara nke kasị nọrọ n’ihe ize ndụ.
Atụmanya e nwere maka oké osimiri ụwa na-akụdakwa mmụọ. Akwụkwọ bụ́ The Atlas of Endangered Species na-akọwa mbekwu mmiri dị ka “ma eleghị anya ìgwè kasị nọrọ n’ihe ize ndụ” n’anụ mmiri nile. O yiri ka ihe ọ̀ ka mma nye anụ ndị na-ebi ma ná mmiri ma n’ala; otú ọ dị, dị ka magazin bụ́ New Scientist si kọọ, ụdị anụ 89 ndị na-ebi ma ná mmiri ma n’ala aghọwo ndị “nọ n’ihe ize ndụ nke mkpochapụ” n’ime afọ 25 gara aga. Ihe dị ka pasent 11 nke ụdị nnụnụ ndị nọ n’ụwa na-echekwa mkpochapụ ihu.a
Ma gịnị banyere ihe okike ndị ka nta, dị ka urukurubụba? Ọnọdụ ha yikwara nke ahụ. Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụdị 400 urukurubụba dị na Europe nọ n’ihe ize ndụ—19 abụrụ ndị mkpochapụ dị nso na-eyi egwu. Na 1993, nnukwu urukurubụba yiri azụ mbekwu nke e nwere na Britain sonyeere nnụnụ dodo ná ndepụta nke ụdị ihe ndị pụworo n’anya.
Nchegbu Na-arị Elu
Ụdị ihe e kere eke ole na-aghọ ndị pụworo n’anya kwa afọ? Azịza ya na-adabere n’ọkachamara nke ị jụrụ. Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta sayensị ekwekọrịtaghị, ha nile nakweere eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ụdị ihe nọ n’ihe ize ndụ nke ịghọ ihe pụworo n’anya. Onye ọkà n’ihe ọmụmụ gburugburu ebe obibi bụ́ Stuart Pimm na-ekwu, sị: “Arụmụka banyere otú [ọtụtụ ụdị ihe] si efunahụ anyị ngwa ngwa bụ n’ụzọ bụ isi nrụrịta ụka banyere ọdịnihu anyị.” O kwukwara, sị: “N’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, anyị amụbawo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụdị ihe dị iche iche ji apụ n’anya gafee ọ̀tụ̀tụ̀ o kwesịrị ịdị. N’ihi ya ọdịnihu anyị ka njọ.”
Mbara ala anyị, bụ́ Ụwa, yiri ụlọ. Ụfọdụ ndị nwere nchegbu banyere ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ na-amụ nkà mmụta gburugburu ebe obibi, bụ́ okwu e si n’okwu Grik bụ́ oikos, “ụlọ,” nweta n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke 19. Ngalaba ihe ọmụmụ a na-elekwasị anya ná mmekọrịta dị n’etiti ihe ndị dị ndụ na gburugburu ebe obibi ha. E nwere mmasị na-arị elu ná nchekwa na narị afọ nke 19, bụ́ nke o doro anya na ọ bụ akụkọ mkpochapụ mere ka ọ rịa elu. Na United States, nke a dugara n’iguzobe ogige dị iche iche nke mba na ebe ndị e chebere echebe bụ́ ebe na-enye ihe ndị e kere eke nchebe. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ihe dị ka 8,000 ebe a matara ná mba nile dị ka ebe a na-echebe anụ ndị bi n’ọhịa n’ụwa nile. Gụnyere 40,000 ebe ndị ọzọ na-enye aka n’ime ka a nọgide na-enwe ebe obibi, ọ fọrọ nke nta ka ha bụrụ ngụkọta nke pasent 10 nke ebe bụ ala n’ụwa.
Ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu na-akwadozi ihe ahụ a na-akpọkarị ụkpụrụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, site n’òtù ndị na-akpọsa iyi egwu nke mkpochapụ ma ọ bụ ndị na-akụziri nnọọ ndị mmadụ ihe banyere otú ndụ si na-adabere n’ibe ha. Kemgbe Nzukọ Ụwa ahụ e mere na Rio na 1992, nghọta ka ukwuu nke ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi na-adịkarị n’echiche gọọmenti.
Nsogbu nke ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ zuru ụwa ọnụ, na-arịkwa elu. Ma n’ihi gịnị? Mgbalị ọ bụla a na-eme iji gbochie mkpochapụ nke ụdị ihe dị iche iche hà na-aga nke ọma ugbu a? Gịnịkwanụ banyere ọdịnihu? Olee otú o si emetụta gị? Isiokwu anyị ndị na-esonụ na-enye azịza.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-akọwa ụdị ihe ndị pụworo n’anya dị ka nke a na-ahụghị n’ime ọhịa ruo afọ 50, ebe ụdị ndị nọ n’ihe ize ndụ na-ezo aka ná ndị nọ n’ihe ize ndụ nke mkpochapụ ma ọ bụrụ na e nweghị mgbanwe n’ọnọdụ ndị ha nọ na ya ugbu a.