Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Otú O Si Emetụta gị
AGỤ, mbekwu, enyi ọhịa, urukurubụba—leenụ, ndepụta nke ụdị ihe ndị a na-eyi egwu yiri ka o nweghị njedebe! Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekwere na a ghaghị ịta ụmụ mmadụ ụta dị ukwuu. Ma olee otú nke a si gbasa gị?
N’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba ụwa, ezi uche ọ̀ dị na ya ịtụ anya na ndị mmadụ na-echegbu onwe ha banyere ọdịmma nke aka ha ga-akwado atụmatụ nchekwa, n’agbanyeghị otú ha si dị mma? “Ọ dịghị mfe ma ọlị ịkwado atụmatụ a n’ebe ka ukwuu ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara, ebe ọtụtụ nde ụmụ mmadụ na-eche nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agha agbụrụ, ụnwụ nri na ọrịa zuru ebe nile ihu,” ka Time na-ekwu. Otu ihe ahụ bụ eziokwu n’ebe ndị ọzọ.
Mgbanwe ndị pụtara ìhè dị mkpa ma ọ bụrụ na a ga-agwọta nsogbu nke ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ. Dị ka The Atlas of Endangered Species si kwuo, mgbanwe ndị a dị “nnọọ ukwuu nke na ọ bụ nanị gọọmenti dị iche iche ga-eme ha.” Mgbe ahụ ọ na-atụ aro, sị: “N’ebe a na-ahọpụta ndị ọchịchị ahọpụta, ọ bụ ibu ọrụ dịịrị onye ọ bụla n’otu n’otu ijide n’aka na ka ọ na-erule afọ 2000, nanị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-echegbu onwe ha banyere gburugburu ebe obibi ka a ga-ahọpụta.”
Nke a ọ̀ bụ atụmanya kwere omume? N’iji akaebe nke akụkọ ihe mere eme tụọ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, anyị aghaghị ikwubi na “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya”—nakwa anụ ndị bi n’ọhịa n’otu aka ahụ. (Eklisiastis 8:9) N’ezie, ọtụtụ ndị ọkà ná nchekwa kwenyere na ihe ọkụkụ na anụmanụ nke ụwa na-eje ozi dị ka mgbaàmà nke gburugburu ebe obibi. Mgbe e mere ka ndị a nọrọ n’ihe ize ndụ, anyị bụ ụmụ mmadụ na-anọkwa n’ihe ize ndụ. Ma nke a abụghị nke mbụ e yiworo ndụ nile dị n’ụwa egwu mkpochapụ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ.
Nke kasị ochie n’akwụkwọ akụkọ ihe mere eme nile na-edekọ okwu ndị bụ: “Lee, ana m eme ka iju mmiri bịakwasị ụwa, ibibi anụ ahụ nile, nke ume nke ndụ dị n’ime ya, ka ọ pụọ n’okpuru eluigwe; ihe nile nke dị n’ụwa ga-ekubi ume.” (Jenesis 6:17) Ka o sina dị, ma mmadụ nile ma ụdị ọ bụla ọzọ nke ndụ anwụghị, n’ihi na Chineke dokwara ụzọ nlanarị.
Otu Ụgbọ Maka Nlanarị
Ndị ọkà mmụta sayensị kwenyere na ihe ngwọta kasị mma nye nsogbu nke ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ taa na-agụnye ichekwa ebe obibi ha. N’ụzọ na-akpali mmasị, New Scientist na-akọ akụkọ banyere nke a, na-ezokwa aka n’ojiji ndị nchekwa ji “okwu ihe atụ nke Ụgbọ Noa” eme ihe. Ụgbọ Noa bụ kpọmkwem ụzọ ụmụ mmadụ na anụmanụ si lanarị Iju Mmiri nke ụbọchị Noa.
Chineke nyere Noa ụkpụrụ nke ụgbọ ahụ, otu nnukwu igbe osisi, bụ́ nke gaje ise n’elu mmiri nke iju mmiri ahụ. Nke a chekwara ndụ Noa, nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom atọ, na ndị nwunye ndị ikom ahụ, tinyere ndị nnọchiteanya nke ụdị anụmanụ dị iche iche, ma ndị bi n’ọhịa ma ndị bi n’ụlọ—n’ezie, “anụ ahụ nile nke ume ndụ dị n’ime ya.” (Jenesis 7:15) Ụba nke ụdị ndụ dị iche iche dị taa na-anwapụta otú ụgbọ ahụ si rụzuo nzube ya nke ọma.
Otú ọ dị, rịba ama na nlanarị adabereghị kpam kpam ná mgbalị ụmụ mmadụ. Noa na ezinụlọ ya aghaghị irubere Chineke isi, bụ́ onye nwere ike ichebe ha ndụ. Ọ bụ Chineke kwụsịrị esemokwu, ime ihe ike, na anyaukwu ndị e ji mara ụwa ahụ nke bu Iju Mmiri ahụ ụzọ.—2 Pita 3:5, 6.
Anụmanụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Jehova Chineke ekwewo nkwa na nrubeisi nye iwu ya pụrụ ịgbanwe ụmụ mmadụ pụọ n’ịdị ka ajọ ndị mwakpo yiri anụ ọhịa, gaa n’ịdị ka anụmanụ dị nro ma dị umeala n’obi. (Aịsaịa 11:6-9; 65:25) Ọbụna ugbu a, ihe àmà nke a bara ụba. Jee nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị gị nso, hụkwa n’onwe gị. Ọ bụrụ na Jehova pụrụ ịrụzu oké mgbanwe ndị dị otú ahụ n’etiti ụmụ mmadụ, ọ́ pụghị n’otu aka ahụ ime ndokwa ka anụ ọhịa nile biri n’otu n’udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, ọbụna ọ bụrụ na nke a pụtara ịgbanwe njimara ndị ha nwere ugbu a? N’ezie, ọ na-ekwe nkwa, sị: ‘N’ụbọchị ahụ Mụ na anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ nke ala ga-agba ndụ: M ga-eme ka ha dina ala ná ntụkwasị obi.’—Hosea 2:18.
Pita onyeozi dere banyere “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” n’ọdịnihu. (2 Pita 3:7) Ntinye aka a chịkwara achịkwa nke Chineke ga-ebibi nanị ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Chineke ‘ga-emebi ndị na-emebi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
Cheedị echiche ọṅụ ọ ga-abụ ibi n’ime ụwa ebe ihe e kere eke na-anọkwaghị n’okpuru iyi egwu. Lee ọtụtụ ihe a gaje ịmụta site n’anụ ndị bi n’ọhịa bụ́ ndị ga-agba anyị gburugburu mgbe ahụ! Ee, agụ, ọdụm, enyi, ga-awagharị n’enweghị mgbochi. Anụ ndị bi n’ime mmiri ga-aba ụba, dị nnọọ ka anụ ndị na-akpụ akpụ, ụmụ ahụhụ, na ụdị nnụnụ dị iche iche, tinyere nnụnụ macaw—ha nile n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. N’ihi iweghachi ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè mmadụ n’okpuru Alaeze Mesaịa, usoro gburugburu ebe obibi zuru okè ga-adị n’ebe nile.