Ihe Mere Ụdị Ihe Dị Iche Iche Ji Nọrọ n’Ihe Ize Ndụ
ỤDỊ ihe dị iche iche na-apụ n’anya n’ihi ihe dịgasị iche iche. Tụlee ihe atọ na-akpatakarị ya. Ọ bụghị ụmụ mmadụ kpọmkwem na-akpata abụọ n’ime ha, ha na-akpatakwa nke ọzọ kpọmkwem.
Mbibi nke Ebe Obibi
Mbibi nke ebe obibi na-atụnye ụtụ buru ibu n’ịdịwanye ole na ole nke ụdị ihe dị iche iche. The Atlas of Endangered Species na-akpọ nke a “iyi egwu kasị pụta ìhè” bụrụkwa “nke kasị sie ike igbochi.” Ụba mmadụ na-arịwanye elu n’ụwa na-amanye ụmụ mmadụ itinyekwu aka n’ala bụbu ebe obibi nke anụ ndị bi n’ọhịa. A na-enweta otu ihe atụ pụtara ìhè na nke a site n’oké ọhịa mmiri ozuzo nke ụwa.
‘N’ime afọ 40, ọ dịghị oké ọhịa mmiri ozuzo ga-afọdụ’ bụ atụmatụ na-emenye ụjọ nke na-elekwasị anya n’ihe ọtụtụ na-ewere dị ka mfu jọgburu onwe ya nke ihe ndị bara uru. N’eziokwu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ọgwụ nile Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa maara esitewo n’ihe ọkụkụ ndị dị n’oké ọhịa mmiri ozuzo nke ebe okpomọkụ. Ọ bụ ezie na oké ọhịa mmiri ozuzo na-ekpuchi ebe e mere atụmatụ ya ịbụ pasent 7 nke mbara ala nke ụwa, ụzọ anọ n’ime ụzọ ise nke ihe ọkụkụ ụwa ndị na-eto n’elu ala dị na ha.
Igbutu osisi na ịgbanwe ụkpụrụ ọrụ ugbo na-anapụ oké ọhịa mmiri ozuzo nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa ihe nketa ya bara ụba bụ́ osisi dị iche iche. Igbukpọsị oké ọhịa ná ntakịrị kọntinent ahụ bụ́ India agbanwewo ọbụna ihu igwe, na-ebelata mmiri ozuzo n’ebe ụfọdụ ma na-akpata idei mmiri n’ebe ndị ọzọ.
Ka mmadụ na-egbutusị osisi iji sụchaa ala maka ọrụ ugbo, ihe ọkụkụ, anụmanụ, nnụnụ, anụ na-akpụ akpụ, na ụmụ ahụhụ na-anwụpụsị. Prọfesọ nke Harvard bụ́ Edward Wilson na-eme atụmatụ na ngụkọta nke igbukpọsị oké ọhịa na-abụ 1 pasent kwa afọ, nke a na-etinyekwa ọtụtụ puku ụdị ihe n’ihe ize ndụ nke imesị bụrụ ndị e kpochapụrụ. A na-atụ egwu na ọtụtụ ụdị ihe ga-apụ n’anya ọbụna tupu e nye ha aha sayensị.
Ọnọdụ ahụ yiri nke ahụ n’ala mmiri mmiri nke ụwa, bụ́ ebe obibi ọzọ a na-eyi egwu. Ndị mmepe na-amịpụ mmiri n’ógbè ndị a ka ha wee nwee ike iwu ụlọ, ma ọ bụ ndị ọrụ ugbo na-agbanwe ha ịghọ ala ha pụrụ ịkwadebe maka ịkụ ihe. N’ime afọ 100 gara aga, e weghaworo ihe ruru 90 pasent nke ala akọrọ nwere ahịhịa nke Europe maka ọrụ ugbo. Ụkọ ala ahịhịa na Britain n’ime afọ 20 gara aga emewo ka e nwee ndalata dị 64 pasent n’ọnụ ọgụgụ nnụnụ song thrush.
Ọ bụ ezie na magazin bụ́ Time na-akpọ àgwàetiti bụ́ Madagascar “ala ụgbọ Noa,” ụdị dị iche iche nke anụ ndị bi n’ọhịa ya nọ n’ihe ize ndụ. Mgbe ụba mmadụ na-arị elu na ka ụgwọ e ji mba ndị ọzọ na-amụba, nrụgide na-adịkwasị ndị bi n’àgwàetiti ahụ ịgbanwe oké ọhịa ka ha ghọọ ubi osikapa na-arị elu. N’ihi na ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ebe obibi anụ golden bamboo lemur apụwo n’anya n’ime afọ 20 gara aga, nanị 400 n’ime anụmanụ ndị a fọdụrụ.
O doro anya na oké mgbanwe nke ụzọ mmadụ si eji ala eme ihe na-ebelata ọnụ ọgụgụ nke anụ ndị bi n’ọhịa n’ógbè dị iche iche. Dị ka ihe atụ ọzọ, tụlee ndị Polynesia, bụ́ ndị rutere na Hawaii afọ 1,600 gara aga. N’ihi ọrụ ha, ụdị nnụnụ 35 pụrụ n’anya.
Ndị mbụ biri n’ebe ahụ bụ́ ndị bịara Australia na New Zealand bubatara ụmụ nwambá ụlọ, ndị ụfọdụ n’ime ha ghọrọ nke ọhịa. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kọọ, nwambá ọhịa ndị a jizi ụdị 64 nke anụ ndị na-enye ụmụ ara n’Australia mere anụ oriri. Tinyere nkịta ọhịa ọbara ọbara ndị e si Europe bubata, ha na-awakpo ọnụ ọgụgụ fọdụrụnụ n’ụdị ihe ndị a na-eyi egwu.
Mwakpo Kpọmkwem
Ịchụ nta abụghị ihe ọhụrụ. Ihe ndekọ Bible dị na Jenesis na-akọ banyere onye nnupụisi ahụ bụ́ Nimrọd, otu dinta dịrị ndụ n’ihe karịrị afọ 4,000 gara aga. Ọ bụ ezie na e kwughị na o kpochapụrụ otu ụdị ihe, ka o sina dị, ọ bụ ihe atụ na-atụ ụjọ nke ịchụ nta.—Jenesis 10:9.
N’ime ọtụtụ narị afọ, ndị dinta ekpochapụwo ọdụm site na Gris na Mesọpọtemia, enyi mmiri site na Nubia, enyi site n’Ugwu Africa, anụ ọhịa bear na òké beaver site na Britain, na oké ehi ọhịa site n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. “N’ime afọ ndị 1870 na 1880, ndị dinta gburu otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde enyi n’Ọwụwa Anyanwụ Africa nanị,” ka magazin ndepụta nke BBC bụ́ Radio Times na-ekwu. Ruo ọkara otu narị afọ, ụda égbè nke ndị a maara aha ha, ndị bara ọgaranya, na ndị nọ n’ọkwá dị elu na-agbapụ jupụtara Africa, na-agbagbusi enyi, enyi ọhịa, anịgọ, anụ ndị yiri nwambá na ihe ọ bụla ha ji anya gwuru. . . . Ihe yiri nnọọ ka ọ na-awụ akpata oyi taa bụ akparamàgwà ndị a na-anakwere n’ozuzu ya mgbe ahụ.”
Laghachi n’ọnọdụ nke oké agụ ahụ. Ngụkọ ọnụ ọgụgụ ndị e mere n’afọ ndị 1980 gosiri na mgbalị ndị e mere ichekwa ha enwewo ihe ịga nke ọma. “Otú o sina dị, ihe adịghị otú o yiri ka ha dị,” ka akwụkwọ bụ́ 1995 Britannica Book of the Year na-ekwu. “Ngụkọ e ji nlezianya ka ukwuu mee kpughere na ndị ọrụ ngụkọ, bụ́ ndị ha na ndị na-egbu anụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị jikọrọ aka ma ọ bụ bụrụ ndị chọrọ nnọọ ime ihe ga-amasị ndị isi ha, mere ka ngụkọ ọnụ ọgụgụ ndị e meburu buo ibu karịa otú ọ dị n’ezie. . . . Ahịa nzuzo nke akụkụ ahụ dị iche iche nke agụ gara nnọọ n’ihu n’ebe nile ka ọnụ ọgụgụ ndị a na-enweta nke na-adalata buliri ọnụ ahịa karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” N’ihi ya, na 1995, atụmatụ nke ọnụ ahịa agụ Siberia dị malite na $9,400 ruo $24,000—ee e, ọ bụghị nanị n’ihi akpụkpọ ahụ ya dị oké ọnụ ahịa kamakwa n’ihi ọkpụkpụ ya, anya, ajịọnụ, ezé, akụkụ ahụ ime ahụ ya, na akụkụ ahụ ha ji enwe mmekọahụ, bụ́ ihe ndị e ji kpọrọ oké ihe n’ọgwụ ọdịnala Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
Ahịa mpi enyi, mpi enyi ọhịa, akpụkpọ ahụ agụ, na akụkụ ahụ anụmanụ ndị ọzọ bụzi azụmahịa nzuzo na-enye ọtụtụ ijeri dollar, bụ́ nke na-esote ahịa nzuzo nke ọgwụ ọjọọ, ka Time na-ekwu. Ọ bụghịkwa nanị n’ihe banyere nnukwu anụ ndị na-enye ụmụ ara. Na 1994 ọgwụ ọdịnala ndị China ripịara ọnụ ọgụgụ na-anwụ ibobo n’ahụ bụ́ nde ịnyịnya mmiri 20, na-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị e jidere jiri ihe e nyere akụkọ ya ịbụ 60 pasent daa n’afọ abụọ n’akụkụ ụfọdụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke Ndịda Esia.
O sighị ike ịmata onye a ga-ata ụta mgbe a chụrụ nta otu ụdị anụ ruo mgbe ha na-adịkwaghị. Mgbe ahụ, gịnị banyere ndị na-azụrụ ha? Otu nnụnụ macaw nọ n’ihe ize ndụ, bụ́ golden conure, ka a kọrọ na ọ na-enye onye na-azụ ahịa nzuzo na Brazil $500. Ma mgbe o rere ya n’ofesi, ọ na-erite ihe karịrị okpukpu atọ na ọkara nke ọnụ ego ahụ n’uru.
Agha na ihe ndị ha na-akpata, ọtụtụ ìgwè na-arị elu nke ndị gbara ọsọ ndụ, tinyere ọ̀tụ̀tụ̀ ọmụmụ na-arị elu, mmetọ na-amụba amụba, na ọbụna ime njem nleta, na-eyi ụdị ihe ndị nọ n’ihe ize ndụ egwu. Ndị nkiri ji ụgbọ epeepe nwere injin na-emerụ anụ dolphin ndị ha gbakọtara n’ìgwè ikiri ahụ, ụzụ okpuru mmiri sitere n’ụgbọ epeepe pụkwara imetụta usoro ịnụ ụda dị nro nke anụ dolphin.
Mgbe ị gụsịrị ndepụta nke a dị mwute nke mbibi ụmụ mmadụ na-akpata, ị pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi, sị, ‘Gịnị ka ndị ọkà ná nchekwa na-eme iji chebe ụdị ihe ndị a na-eyi egwu, oleekwa otú ha si enwe ihe ịga nke ọma?’
[Foto dị na peeji nke 6]
Ihe ọkụkụ, anụmanụ, nnụnụ, anụ ndị na-akpụ akpụ, na ụmụ ahụhụ na-anwụchapụ ka ụmụ mmadụ na-egbutusị osisi