Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 4/8 p. 3-6
  • Ịkpa Ókè Megide Ndị Inyom

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpa Ókè Megide Ndị Inyom
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Òkè Ka Nta
  • Ndị Nne na Ndị Na-akpata Nri
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Nsogbu Na-arịwanye Elu?
    Teta!—2003
  • Inwe Ekele Maka Ndị Inyom na Ọrụ Ha
    Teta!—1998
  • Nsogbu Ndị Ụmụ Nwaanyị Na-enwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ole Ndị Bụ Ndị Ohu Taa?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 4/8 p. 3-6

Ịkpa Ókè Megide Ndị Inyom

N’EBE Ọdịda Anyanwụ Africa otu onye ọchụ ntá ego zụrụ otu nwatakịrị dị afọ itoolu. N’Esia e liri otu nwa a mụrụ ọhụrụ ná ndụ n’ájá dị n’ọzara. N’otu mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, agụụ gụgburu otu nwa na-amụ ije n’ogige ụmụ mgbei—a chọghị ya, e lekọtaghịkwa ya. Otu ihe jikọtara ọdachi ndị a: Ndị nile o metụtara bụ ụmụaka nwanyị. Ha ịbụ ndị inyom pụtara na e weere ha dị ka ndị na-adịghị mkpa.

Ihe ndị a abụghị ihe na-adịghị emekebe. N’Africa a na-erenye ọtụtụ puku ụmụaka nwanyị na ụmụ agbọghọ n’ịbụ ohu, ụfọdụ n’ọnụ ahịa dị ala nke $15. A kọkwara na kwa afọ a na-erenye ma ọ bụ manye ọtụtụ narị puku ụmụ agbọghọ n’ịgba akwụna, karịsịa n’Esia. Nke ka njọ, ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’ọtụtụ mba na-egosi na ihe ruru nde ụmụaka nwanyị 100 “na-efu efu.” Ihe àmà na-egosi na nke a bụ n’ihi nsikwopụ afọ ime, igbu ụmụ ọhụrụ, ma ọ bụ ileghara ndị inyom anya kpam kpam.

Ruo ogologo oge—ọtụtụ narị afọ—e lewo ndị inyom anya n’ụzọ dị otú a n’ọtụtụ mba. N’ebe ụfọdụ a ka na-elekwa ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ná mba ndị dị otú ahụ, a na-ewere ụmụaka nwoke ịbụ ndị bara uru karị. N’ebe ahụ, a na-ekwenye na nwa nwoke pụrụ ime ka usoro ọmụmụ ezinụlọ dịgide, iketa ihe onwunwe, ma lekọta ndị mụrụ ya mgbe ha mere agadi, ebe mba ndị a na-adịghị enwekarị ụgwọ ezumike nká ọ bụla nke gọọmenti maka ndị agadi. Otu ilu ndị Esia na-ekwu na “ịzụlite nwata nwanyị dị ka ịgba ihe ọkụkụ dị n’ubi onye agbata obi gị mmiri.” Mgbe o tolitere, ọ ga-apụ ịlụ di ma ọ bụ e nwedịrị ike renye ya n’ịgba akwụna ma si otú a bụrụ ihe enyemaka dị nta ma ọ bụ ghara ịbụ n’ilekọta ndị mụrụ ya meworo agadi.

Òkè Ka Nta

Ná mba ndị ịda ogbenye tiri ihe otiti, omume a na-eme ka e nwee nri dị ala karị, nlekọta ahụ ike dị ala karị, na agụmakwụkwọ dị ala karị maka ụmụaka nwanyị nke ezinụlọ ahụ. Ndị nchọpụta n’otu mba dị n’Esia chọpụtara na pasent 14 nke ụmụaka nwanyị erighị nri na-edozi ahụ, ma e jiri ha tụnyere nanị pasent 5 nke ụmụaka nwoke. Ná mba ụfọdụ a na-akpọta ọnụ ọgụgụ ụmụaka nwoke ji okpukpu abụọ karịa ụmụaka nwanyị n’ụlọ ọrụ ahụ ike, ka otu akụkọ sitere n’aka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na-akọwa. Ihe karịkwara pasent 40 nke ụmụ agbọghọ n’Africa nakwa n’ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Esia bụ iti. “E nwere ịkpa ókè na-atụ ụjọ nke ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-aga n’ihu ná mba ndị na-emepe emepe,” ka Audrey Hepburn nwụworo anwụ kwara arịrị ya, bụ́ onye bụbu onye nnọchianya UNICEF.

“Ịkpa ókè nke ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị” nke a adịghị akwụsị mgbe ụmụaka nwanyị toruru ogo mmadụ. Ịda ogbenye, ime ihe ike, na ndọlị na-adịghị akwụsị akwụsị na-abụkarị òkè nke onye bụ nwanyị, kpọmkwem n’ihi na ọ bụ nwanyị. President nke Ụlọ Akụ̀ Ụwa kọwara, sị: “Ndị inyom na-arụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ọrụ dị n’ụwa. . . . N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-erite nanị otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ego dị n’ụwa ma na-enwe ihe na-erughị otu pasent nke ihe onwunwe dị n’ụwa. Ha so ná ndị kasị daa ogbenye n’ime ndị ogbenye bi n’ụwa.”

Dị ka otu akụkọ nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ihe karịrị pasent 70 nke ijeri 1.3 ndị bi n’ụwa bụ́ ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ bụ ndị inyom. “Ọ na-akawanyekwa njọ,” ka akụkọ ahụ gbakwụnyere. “Ọnụ ọgụgụ ndị inyom bi n’ime obodo bụ́ ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 50% rịa elu n’ime iri afọ abụọ gara aga. N’ụzọ na-arị elu, ndị inyom na-adakarịsị ogbenye.”

Ọbụna nke kasị akpasasị uche karịa oké ịda ogbenye bụ ime ihe ike nke na-ebibi ndụ nke ọtụtụ ndị inyom. Ihe a gụkọrọ na ọ bụ otu narị nde ụmụaka nwanyị, karịsịa n’Africa, atawo ahụhụ mbekasị nke akụkụ ahụ e ji bụrụ nwanyị. Ndina n’ike bụ mmetọ zuru ebe nile nke nọgidere na-abụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-enweghị ndekọ ya n’ebe ụfọdụ, ọ bụ ezie na ihe ọmụmụ na-egosi na ná mba ụfọdụ a na-edina 1 nwanyị n’ime 6 n’ike n’oge ndụ ya. Agha na-eti ndị ikom na ndị inyom ihe otiti n’otu ụzọ ahụ, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị gbara ọsọ ndụ a manyere isi n’ebe obibi ha gbapụ bụ ndị inyom na ụmụaka.

Ndị Nne na Ndị Na-akpata Nri

Ibu arọ nke ilekọta ezinụlọ na-adaberekarị n’ụzọ dị ukwuu n’ebe nne nọ. O yiri ka ọ na-arụ ọrụ ogologo hour, o nwekwara ike bụrụ onye na-akpata nri e nwere nanị ya. N’ime ime obodo ụfọdụ nke Africa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ọtụtụ ezinụlọ bụ ndị inyom na-eduzi ha. N’ógbè ụfọdụ ná mba Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ọtụtụ ezinụlọ bụ nwanyị na-eduzi ha.

Ọzọkwa, karịsịa ná mba ndị ka na-emepe emepe, ndị inyom n’ụzọ ọdịnala na-arụ ụfọdụ n’ime ọrụ ndị kasị sie ike, dị ka ichute mmiri na ịkpata nkụ. Igbukpọsị oké ọhịa na anụmanụ ịtabiga ahịhịa ókè emewo ka ọrụ ndị a sikwuo ike. N’ụfọdụ mba ndị ụkọ mmiri ozuzo tiri ihe otiti, ndị inyom na-etinye hour atọ ma ọ bụ karị kwa ụbọchị ịchọ nkụ na hour anọ n’ụbọchị ichute mmiri. Nanị mgbe a rụsịrị ọrụ a na-agwụ ike ka ha pụrụ ịmalite ịrụ ọrụ a tụrụ anya n’aka ha n’ụlọ ma ọ bụ n’ubi.

N’ụzọ doro anya, ma ndị ikom ma ndị inyom na-ata ahụhụ ná mba ebe ịda ogbenye, agụụ, ma ọ bụ esemokwu na-adị kwa ụbọchị. Ma ndị inyom na-ata ahụhụ n’ụzọ karịrị akarị. Ọ̀ dị mgbe ọnọdụ a ga-agbanwe? È nwere ezi atụmanya ọ bụla na otu ụbọchị a ga-eji nkwanye ùgwù na nchebara echiche na-emeso ndị inyom n’ebe nile ihe? È nwere ihe ọ bụla ndị inyom pụrụ ime ugbu a iji meziwanye òkè ha?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ụmụaka Nwanyị Na-agba Akwụna—Ònye Ka A Ga-ata Ụta?

Kwa afọ a na-amanye ma ọ bụ na-erenye ihe a gụkọrọ ịbụ otu nde ụmụaka—karịsịa ụmụaka nwanyị—n’ịgba akwụna. Araya,a bụ́ onye sitere n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, na-echeta ihe mere ụfọdụ n’ime ụmụ klas ibe ya. “Kulvadee ghọrọ akwụna mgbe ọ dị nanị afọ 13. Ọ bụ ezigbo nwata nwanyị, ma nne ya na-aṅụbigakarị mmanya ókè ma na-azụ Poka, n’ihi ya o nweghị ohere ilekọta nwa ya nwanyị. Nne Kulvadee gbara ya ume ịkpata ego site n’isoro ndị ikom na-akpapụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ gbawara akwụna.”

“Sivun, bụ́ nwa akwụkwọ ọzọ mụ na ya nọ na klas, si n’ebe ugwu nke mba ahụ. Ọ dị nanị afọ 12 mgbe ndị mụrụ ya zigara ya n’isi obodo ịrụ ọrụ dị ka akwụna. Ọ ghaghị ịrụ ọrụ ruo afọ abụọ iji kwụchaa ụgwọ nkwekọrịta nke ndị mụrụ ya bịanyere aka na ya. Ọnọdụ Sivun na Kulvadee abụghị ihe a na-adịghị ahụkebe—5 n’ime ụmụaka nwanyị 15 mụ na ha nọ na klas ghọrọ ndị akwụna.”

E nwere ọtụtụ nde ndị na-eto eto yiri Sivun na Kulvadee. “Ịgba mgbere mmekọahụ bụ nnukwu ahịa nwere nkwali nke ya,” ka Wassyla Tamzali, nke UNESCO (Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu) na-akwa n’arịrị. “Ire nwata nwanyị dị afọ 14 aghọwo ihe a na-ahụkarị, ọ bụghị ihe ọhụrụ.” Ozugbo e renyekwara ụmụaka nwanyị ndị a n’ohu mmekọahụ, ịkwụcha ego e ji zụta ha pụrụ ịfọdụ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-apụghị ikwe omume. Manju, bụ́ onye nna ya rere mgbe ọ dị afọ 12, ka ji ụgwọ $300 (U.S.) ka afọ asaa nke ịgba akwụna gasịrị. “Ọ dịghị ihe m pụrụ ime—e jichiri m ejichi,” ka ọ na-akọwa.

Izere AIDS pụrụ ịfọdụ nke nta ka o siere ụmụaka nwanyị ahụ ike dị ka izere ndị ahụ na-akpọrọ akwụna ndị ahịa bụ́ ndị gbara ha n’ohu. Otu nnyocha e mere n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia gosiri na pasent 33 nke ụmụaka ndị a na-agba akwụna butere nje AIDS. Ọ bụrụhaala na ịgba mgbere mmekọahụ nke na-enye ijeri dollar ise na-aga n’ihu, o yiri ka ụmụaka nwanyị ndị a ga-anọgide na-ata ahụhụ.

Ònye ka a ga-ata ụta maka omume a jọgburu onwe ya? O doro anya na ọ bụ ndị ahụ na-azụrụ ma ọ bụ na-erenye ụmụaka nwanyị n’ịgba akwụna ka a ga-ata ụta dị ukwuu. Ma ndị a ga-akatọkwa bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe bụ́ ndị na-eji ụmụaka nwanyị ndị ahụ egbo agụụ mmekọahụ. N’ihi na ma e nweghị ndị dị otú ahụ na-eme omume rụrụ arụ, ịgba akwụna nke ụmụaka nwanyị ndị a agaghị adị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ha.

[Foto]

Kwa afọ a na-amanye ihe dị ka otu nde ụmụaka nwanyị ịgba akwụna

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ọrụ Ụbọchị Otu Nwanyị n’Etiti Africa

Nwanyị ahụ na-ebili n’elekere anya isii wee sie nri ụtụtụ maka ezinụlọ na maka ya onwe ya, bụ́ nke ha ga-eri mgbe chi bọchara. Mgbe o chutechara mmiri site n’osimiri dị nso, ọ na-etinye isi n’ugbo—ọ pụrụ iwe ịga ije otu hour site n’ebe ahụ.

Ruo n’ihe dị ka elekere anya anọ nke ehihie, ọ na-akọ ala, na-abọcha ahịhịa, ma ọ bụ na-agba ala ahụ mmiri, na-akwụsịtụ nanị nwa oge iji rie nri ọ bụla o ji gaa. Ọ na-eji hour abụọ fọdụrụnụ n’ụbọchị egburu nkụ na ịbụrụ akpụ ma ọ bụ ịkpara akwụkwọ nri ndị ọzọ maka ezinụlọ ya—ha nile ka ọ na-ebula ụlọ.

Dị ka ọ na-emekarị, ọ na-alọrute ụlọ ka anwụ na-ada. Ugbu a e nwere ọrụ a ga-arụ n’isi nri abalị, bụ́ ọrụ ga-ewe hour abụọ ma ọ bụ karị. Ọ na-eji ụbọchị Sunday asa ákwà n’osimiri dị n’ógbè ma dezie ha ede, ozugbo ákwà ndị ahụ kọrọ.

Ọ na-esiri di ya ike inwe ekele maka ịrụsi ọrụ ike a ma ọ bụ na-aṅa ntị n’aro ya. Ọ dịghị ya ka ihe ọ bụla igbutu osisi ma ọ bụ ịkpọ ahịhịa ndị dị n’oké ọhịa ọkụ ka nwunye ya wee nwee ike ịkwadebe ala maka ịkụ ihe ọkụkụ, ma o nweghị oké ihe ọzọ ọ na-eme. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akpọrọ ụmụaka gaa n’osimiri ka ha saa ahụ, o nwekwara ike gaa ịgbatụ ntá na igbu azụ̀. Ma ọ na-eji ihe ka ukwuu n’ụbọchị ya esoro ndị ikom ndị ọzọ bi n’obodo na-akpa nkata.

Ọ bụrụ na di ya pụrụ imeli ya, afọ ole na ole gasịa, ọ ga-akpọbata nwunye ọhụrụ, nke ka bụrụ agbọghọ, bụ́ onye ga-aghọ obi di ya. Otú ọ dị, a ka ga-atụ anya ka nwunye mbụ ya nọgide na-arụ ọrụ dị ka ọ na-arụ mgbe nile, ruo mgbe ahụ na-agaghị adịcha ya ike ma ọ bụ mgbe ọ nwụrụ.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị inyom Africa na-ebu ibu ọrụ dị arọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya