Inweta Nkasi Obi na “Ndagwurugwu Onyinyo Ọnwụ”
Dị ka Barbara Schweizer si kọọ
N’oge ụfọdụ, mgbe ihe nọworo na-aga nke ọma, ndụ m adịwo ka ‘ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ’ na-enye obi ụtọ. Ma amarawokwa m ihe ọ dị ka ya ije ije na “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” Otú ọ dị, ekwenyesiri m ike na ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye na-azụ anyị dị ka atụrụ, anyị pụrụ ịnagide ọnọdụ ọ bụla pụrụ ibilite.—Abụ Ọma 23:1-4.
NA 1993, mgbe ọ fọrọ obere ka mụ na di m ruo afọ 70, anyị kpebiri ịmalite ihe omume ọhụrụ na-akpali akpali—ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkụzi Bible n’Ecuador. Ọ bụ ezie na a mụrụ anyị n’America, anyị na-asụ Spanish, anyị enweghịkwa ibu ọrụ nke ego. Ebe anyị maara na a “na-akụta mmadụ” nke ọma n’Ecuador, anyị mere atụmatụ ịwụbanye ụgbụ anyị na mmiri ndị ahụ na-enye ihe n’ụba.—Matiu 4:19.
Mgbe ụbọchị ole na ole na-akpali akpali n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị n’Ecuador gasịrị, anyị gara n’ebe a na-aba bọs na Guayaquil, na-enwe oké mmasị ịga Machala—otu n’ime obodo ebe ndị e nwere mkpa pụrụ iche. Otú ọ dị, ka anyị nọ na-eche bọs, na mberede di m, bụ́ Fred, malite ịrịa ọrịa, ya mere anyị kpebiri igbutụ oge tupu na-eme njem anyị. Abanyere m n’ụlọ telifon iji mee ndokwa ịlaghachi n’alaka ahụ ebe Fred nọdụrụ ala n’ebe ibu anyị dị. Mgbe m laghachiri ka minit ole na ole gasịrị, di m anọkwaghị ya!
Ahụkwaghị Fred ná ndụ ọzọ. Kpọmkwem n’ebe ahụ a na-aba bọs, n’obere oge ahụ m na-anọghị ya, o nwewo ajọ nkụchi obi. Ka m ji obi erughị ala na-achọgharị ya, otu onye ọrụ n’ebe ahụ a na-aba bọs bịara wee gwa m na a kpọgawo Fred n’ụlọ ọgwụ. Mgbe m ruru n’ụlọ ọgwụ ahụ, anụrụ m na ọ nwụworị.
Na mberede, achọtara m onwe m dị ka onye nọ nanị ya ná mba m na-amaghị ama, n’enweghị ụlọ, n’enweghịkwa di m ga-adabere na ya. Ana m asị “m ga-adabere na ya” n’ihi na Fred na-ebute ụzọ mgbe nile ma na-ahazi ihe maka anyị abụọ. Abụ m ụdị mmadụ na-esighị ike, enwekwara m obi ụtọ maka ya ime otú ahụ. Ma ugbu a aghaghị m ime mkpebi, ịhazi ndụ m nakwa, n’otu mgbe ahụ, imeri iru újú m. Ọ bụ mmetụta na-egbu mmụọ—dị ka a ga-asị na a tụkpuwo m na “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” Ọ̀ dị mgbe m ga-amụta ịnọtali n’onwe m?
Ịnata Eziokwu na Ime Ka Ndụ Anyị Ka Mfe
Ma mụ ma Fred alụworị di na nwunye ma gbaa alụkwaghị m mgbe mbụ anyị zutere onwe anyị. Ezi ọbụbụenyi dujere n’inwe mmekọrịta chiri anya, anyị wee kpebie ịlụ di na nwunye. Anyị bụ ndị na-aga chọọchị iji mejuo iwu na Seattle, Washington, U.S.A. Ma okpukpe adịghị oké mkpa ná ndụ anyị ruo mgbe Jamie, ọmarịcha ọsụ ụzọ (onye na-ekwusa ozi ọma oge nile) nke na-eto eto, bịara n’ọnụ ụzọ anyị. O nwere nnọọ omume ọma nke na m kwetara mgbe ọ gwara m ka ọ mụọrọ m Bible.
Mgbe Fred gosikwara mmasị, nne na nna Jamie weghaara ọmụmụ ihe ahụ, otu afọ mgbe e mesịkwara, na 1968, e mere anyị abụọ baptism. Site ná mmalite, anyị nwere ịnụ ọkụ n’obi itinye ọdịmma Alaeze Chineke n’ihe mbụ ná ndụ anyị. (Matiu 6:33) Di na nwunye ahụ mụọrọ anyị ihe, bụ́ Lorne na Rudi Knust, setịpụrụ ihe nlereanya na nke a n’ezie. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị anyị baptism, ha kwagara n’otu obodo n’Ụsọ Oké Osimiri Ọwụwa Anyanwụ nke United States ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Nke a kụnyere mkpụrụ n’obi anyị.
Anyị nwere ihe ọzọ mere anyị ji na-eche echiche banyere ịkwagharị. Fred bụ manịja nke otu nnukwu ụlọ ahịa. Ọrụ ya na-adọrọ uche nke ukwuu, ọ ghọtakwara na ịkwaga ebe ọzọ ga-enyere ya aka ime ka ndụ ya ka mfe na ilebakwuru eziokwu na ụmụ anyị abụọ anya. Amụtakwara m otu nwa nwanyị, bụ́ onye lụworo di ugbu a site n’alụmdi mbụ m, ma ya ma di ya anatawokwa eziokwu, ya mere mkpebi anyị ịhapụ Seattle siri ike. Otú ọ dị, ha ghọtara ebumnobi anyị ma kwadoo mkpebi anyị.
Ya mere na 1973 anyị kwagara Spain, bụ́ mba ebe e nwere nnukwu mkpa n’oge ahụ maka ndị na-ekwusa ozi ọma na ụmụnna nwoke ga-ebute ụzọ. Fred chere na ọ bụrụ na anyị ejiri nke nta nke nta na-emefu ego, ego anyị chekwara ga-ezu ịkwụ ụgwọ mmefu anyị na Spain, anyị pụkwara itinye ihe ka ukwuu n’oge anyị n’ozi. Nke ahụ bụkwa ihe anyị mere. N’oge na-adịghị anya, Fred jewere ozi dị ka okenye, ka ọ na-erukwa 1983 anyị abụọ abụrụwo ndị ọsụ ụzọ.
Ruo afọ 20 anyị jere ozi na Spain, na-amụ ịsụ asụsụ ha ma na-enwe ọtụtụ ahụmahụ mara mma. Mgbe mgbe mụ na Fred mekọrọ nkwusa ọnụ, mụọkwara ndị lụrụ di na nwunye ihe, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ Ndịàmà e mere baptism ugbu a. Mgbe ụfọdụ afọ gasịrị na Spain, ụmụ anyị abụọ ndị nta, bụ́ Heidi na Mike, wekwaara ozi ọsụ ụzọ. Ọ bụ ezie na ihe anyị nwere dị nta n’ụzọ ihe onwunwe, nke a bụ oge m kasị nwee obi ụtọ ná ndụ m. Ndụ anyị dị mfe. Anyị pụrụ ịnọkọrịta ọnụ ruo ogologo oge dị ka ezinụlọ, dịkwa ka mmanụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ dị n’ihe ndekọ Bible, ọ dịghị mgbe ego anyị chekwara, nke e ji nlezianya mee atụmatụ mmefu ya, gwụrụ.—1 Ndị Eze 17:14-16.
Ịgbanwegharị Ọzọ Gaa Mba Ọzọ
Ka ọ na-erule 1992 anyị malitere ọzọ iche echiche banyere ịkwagharị. Ụmụ anyị etowo, mkpa e nwekwara na Spain dị obere karịa ka ọ dị na mbụ. Anyị maara otu onye ozi ala ọzọ nke jeworo ozi n’Ecuador, ọ gwakwara anyị banyere oké mkpa e nwere maka ndị ọsụ ụzọ na ndị okenye ná mba ahụ. Ànyị emewo oké agadi iche echiche banyere ịmaliteghachi n’isi ná mba ọhụrụ? Anyị echeghị otú ahụ, ebe ọ bụ na anyị abụọ nwere ezi ahụ ike, nweekwa mmasị n’ọrụ ime nkwusa. Ya mere anyị kpọtụụrụ alaka dị n’Ecuador ma malite ime atụmatụ anyị. N’eziokwu, nwa m nwanyị bụ́ Heidi na di ya, bụ́ Juan Manuel, ndị nọ na-eje ozi n’ebe ugwu Spain, nwekwara oké mmasị isonyere anyị.
N’ikpeazụ, ka ọ na-erule February 1993, anyị edokwawo ihe omume anyị nile ma rute ná mba ọhụrụ anyị. Anyị abụọ nwere obi ụtọ n’olileanya nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’Ecuador, bụ́ ebe ọtụtụ ndị nwere oké mmasị ịmụ Bible. Mgbe a nabatasịrị anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’alaka ahụ, anyị mere atụmatụ ileta ọtụtụ obodo a tụrụ aro na ha bụ ebe ndị e nwere mkpa pụrụ iche. Ma mgbe ahụ di m nwụrụ.
Na “Ndagwurugwu Onyinyo Ọnwụ”
Na mbụ o riri m ọnụ, e mesịa ekwetatụdịghị m. Tupu mgbe ahụ ọ na-esi ike ka Fred rịa ọrịa. Gịnị ka m ga-eme? Olee ebe m ga-aga? Apụghị m nnọọ ichezi echiche.
N’oge ndị ahụ kasị njọ ná ndụ m, e jiri nkwado nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ nwere ọmịiko gọzie m, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-enweghị ọbụna mgbe ha maara m. Ụmụnna nọ n’alaka ahụ nwere nnọọ obiọma ma mee ihe nile, tinyere ndokwa olili ozu. Karịsịa ana m echeta ịhụnanya nke Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Bonno gosiri m. Ha hụrụ na ọ dịghị mgbe m nọ nanị m, ọbụnakwa Edith Bonno soro m hie ụra ruo ọtụtụ abalị ka owu ghara ịma m. N’eziokwu, ezinụlọ Betel ahụ dum gosiri ịhụnanya na nchebara echiche dị ukwuu nke na o yiri ka a ga-asị na ha jiri blanket ịhụnanya nke na-ekpo ọkụ, na-enye nchebe, wee fụchie m.
N’ime ụbọchị ole na ole, ụmụ m atọ bịakwara nọnyere m, nkwado ha bakwara oké uru. Ma, ọ bụ ezie na m nwere ọtụtụ ndị hụrụ m n’anya gbara m gburugburu n’oge ehihie, ịgabiga ogologo abalị siri ike karị. Mgbe ahụ ka Jehova kwagidere m. Mgbe ọ bụla oké owu ọmụma jidere m, ana m echigharịkwuru ya n’ekpere, ọ na-akasikwa m obi.
Mgbe olili ozu ahụ gasịrị ajụjụ biliri, Gịnị ka m ga-eji ndụ m mee? Achọrọ m ịnọ n’Ecuador n’ihi na nke ahụ abụwo mkpebi anyị abụọ, ma echeghị m na m pụrụ ime ya nanị m. Ya mere Heidi na Juan Manuel, bụ́ ndị nọworo na-eme atụmatụ ịkwaga n’Ecuador n’ọdịnihu dị nso, gbanwere atụmatụ ha ka ha nwee ike ịbịa ozugbo ka anyị wee nwee ike ijekọ ozi ọnụ.
N’ime otu ọnwa, anyị chọtara ụlọ na Loja, otu n’ime obodo ndị alaka ahụ tụworo aro ha. N’oge na-adịghị anya amalitere m ọrụ ịhazi ihe, ịmalite ibi n’ebe obibi ọhụrụ, na ịmalite ime nkwusa ná mba ọhụrụ. Ọrụ ahụ dum belatatụrụ iru újú m. Ọzọkwa, apụrụ m isoro nwa m nwanyị, bụ́ onye ya na Fred kpachiworo nnọọ anya, bee ákwá, nke ahụ nyekwaara m aka ime ka mmetụta m dajụọ.
Otú ọ dị, mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, mgbe ihe omume ọhụrụ m mawooro m ahụ, aghọtawanyere m oké ihe funahụrụ m. Achọpụtara m na enweghị m ike iche echiche banyere oge obi ụtọ ndị mụ na Fred nwekọworo, ebe ọ bụ na ọ na-ewute m nke ukwuu. Ewepụrụ m ihe ndị gara aga n’echiche m ma na-adị ndụ ihe ụbọchị fotere, ghara inwe ike iche echiche nke ukwuu banyere ọdịnihu. Ma agbalịrị m iji ihe ndị bara uru mejupụta ụbọchị nke ọ bụla, karịsịa ọrụ ime nkwusa m. Nke ahụ mere ka m nọgide.
Enwere m mmasị mgbe nile n’ime nkwusa na ịkụzi Bible, n’Ecuador kwa ndị mmadụ na-anabata nnọọ ozi a nke na ọrụ a na-enye ọṅụ. Otu n’ime oge mbụ m rụrụ ọrụ ụlọ n’ụlọ n’ebe ahụ, ezutere m otu nwanyị na-emebeghị agadi nọ na di bụ́ onye sịrị: “Ee, aga m achọ ịmụ Bible!” Ọ bụ ya bụ ọmụmụ Bible mbụ m malitere n’Ecuador. Ụdị ahụmahụ ahụ dọọrọ uche m ma gbochie m ichebiga echiche ókè banyere iru újú m. Jehova gọziri ozi ubi m n’ụba. O yiri ka a ga-asị na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe ọ bụla m pụrụ ikwusa ozi ọma, ana m enwe ezi ahụmahụ.
N’enweghị obi abụọ ọ bụla, ịnọgide na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ bụ ngọzi. O mere ka m nwee ibu ọrụ m na-aghaghị ịrụzu ma mee ka m nwee ezi ihe ime kwa ụbọchị. N’ime mkpirikpi oge, anọ m na-eduzi ọmụmụ Bible isii.
Iji gosi afọ ojuju m na-enweta n’ozi m, ka m kwuo banyere otu nwanyị na-akatabeghị ahụ, bụ́ onye gosiworo ezi mmasị maka ozizi Bible n’isi nso a. Mgbe m gosiri ya otu akụkụ akwụkwọ nsọ, ọ na-ebu ụzọ chọọ ịghọta ya nke ọma, e mesịakwa ọ na-adị njikere itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. Ọ bụ ezie na o biri ndụ rụrụ arụ n’oge gara aga, n’isi nso a mgbe otu nwoke nke chọrọ ka ya na ya biri gwara ya okwu mmekọahụ, ọ jụwara isi. Ọ kọọrọ m otú o si nwee obi ụtọ iguzosi ike maka ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, ebe ọ na-enwe udo nke uche ọ na-enwetụbeghị mbụ ugbu a. Ọmụmụ ihe ndị dị otú ahụ na-eme ka obi m kpoo ọkụ, na-emekwa m ka m nwee mmetụta ịbụ onye bara uru.
Ime Ka Ọṅụ M Dịgide
Ọ bụ ezie na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-ewetara m nnukwu ọṅụ, iru újú m akwụsịghị ngwa ngwa. N’ọnọdụ m, mwute bụ ihe na-abịa ma na-ala. Nwa m nwanyị na ọgọ m nwoke enyewo m nkwado magburu onwe ya, ma oge ụfọdụ mgbe m na-ahụ ka ha na-enwekọ oge ndi pụrụ iche ọnụ, ana m enwe oké mmetụta banyere ihe funahụrụ m karị. Ana m enwe nnọọ nnukwu agụụ maka di m, ọ bụghị nanị n’ihi na mụ na ya dịrị ná mma nke ukwuu kamakwa n’ihi na m dabeere na ya maka ọtụtụ ihe. O nwere mgbe ụfọdụ enweghị ike iso ya kwurịta okwu, ịrịọ ya maka ndụmọdụ, ma ọ bụ iso ya kerịta ahụmahụ ozi ubi na-eweta mwute na ịtọgbọ chakoo nke na-adịghị mfe ịnagide ma ọlị.
Gịnị na-enyere m aka n’oge ndị dị otú ahụ? Ana m ekpesi ekpere ike nye Jehova, na-arịọkwa ya ka o nyere m aka iche echiche banyere ihe ọzọ, ezi ihe. (Ndị Filipaị 4:6-8) Ọ na-enyekwara m aka n’ezie. Ka afọ ụfọdụ gafesịrị, ana m enwe ike ikwu okwu banyere ụfọdụ oge mara mma mụ na Fred nwekọrọ ọnụ. Ya mere, ihe àmà na-egosi na usoro ngwọta ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-arụ ọrụ ya. Dị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, ọ na-adị m ka m ejewo ije na “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” Ma Jehova nọ ebe ahụ ịkasi m obi, ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi jikwa obiọma duzie m n’ụzọ ziri ezi.
Ihe Ndị M Mụtaworo
Ebe Fred buteworo ụzọ mgbe nile, ọ dịghị mgbe m chere na ọ dị mgbe m ga-enwe ike ịga n’ihu ma mee ihe n’onwe m. Ma site n’enyemaka Jehova, ezinụlọ m, na ụmụnna, anwawo m. N’ụzọ ụfọdụ esiri m ike karịa n’oge mbụ. Ana m echigharịkwuru Jehova mgbe mgbe karịa ka m na-emebu, ana m amụtakwa ime mkpebi n’onwe m.
Obi dị m nnọọ ụtọ na mụ na Fred nọrọ afọ 20 ahụ na Spain, na-ejekọ ozi ọnụ n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. N’usoro ihe a, anyị amaghị ma ọlị ihe pụrụ ime site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ, ya mere echere m na ọ dị oké mkpa imere Jehova na ezinụlọ anyị ihe nile anyị pụrụ ime mgbe anyị nwere ohere ya. Afọ ndị ahụ mere ka ndụ anyị na alụmdi na nwunye anyị ka nnọọ mma, ekwenyesikwara m ike na ha kwadebere m ịnagide ihe funahụrụ m. Ebe ịsụ ụzọ ghọwororị ụzọ ịdị ndụ tupu ọnwụ Fred, o mere ka m nwee mmetụta nke inwe nzube mgbe m na-agbalị ịgbanwe gaa n’ihe ọnọdụ bụ ugbu a.
Mgbe Fred nwụrụ, o yiri ná mmalite ka a ga-asị na ndụ m agwụsịwokwa. Ma, otú ọ dị, nke a abụghị otú ọ dị. Enwere m ọrụ ịrụ n’ozi Jehova, enwekwara m ndị m ga-enyere aka. N’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ndị gbara m gburugburu ka chọrọ eziokwu ahụ, m̀ ga-esi aṅaa kwụsị? Inyere ndị ọzọ aka dịịrị m mma, dị ka Jisọs kwuru na ọ ga-adị. (Ọrụ 20:35) Ahụmahụ ndị m nwere n’ozi ubi nyere m ihe ndị m ga-elepụ anya maka ha, ihe ndị m ga-eme atụmatụ maka ha.
Ụbọchị ole na ole gara aga, owu ọmụma m na-adị enwe jidekwara m ọzọ. Ma mgbe m hapụrụ ụlọ ije duzie ọmụmụ Bible, ozugbo ahụ enwere m mmetụta nke ịbụ onye a na-ewuli mmụọ ya elu. Mgbe hour abụọ gasịrị, alaghachiri m n’ụlọ nwee afọ ojuju ma bụrụ onye e wuliri elu. Dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru, anyị pụrụ mgbe ụfọdụ ‘iji anya mmiri ghaa mkpụrụ’ ma mgbe e mesịrị Jehova na-agọzi mgbalị anyị, anyị ewee ‘jiri iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.’—Abụ Ọma 126:5, 6.
N’isi nso a, n’ihi ọbara mgbali elu, aghaghị m imegharịtụ ndokwa m, ugbu a kwa abụ m onye ọsụ ụzọ inyeaka nke oge nile. Ana m ebi ndụ na-enye afọ ojuju, ọ bụ ezie na echeghị m na ọ dị mgbe m ga-echezọ ihe funahụrụ m kpam kpam n’usoro ihe a. Ọ na-enye m ọṅụ ịhụ ụmụ m atọ n’ozi oge nile. Karịsịa, ana m ele anya ịhụ Fred ọzọ n’ụwa ọhụrụ. Eji m n’aka na ọ ga-enwe obi ụtọ ịmara banyere ọrụ m nweworo ike ịrụ n’Ecuador—na atụmatụ anyị mịrị mkpụrụ.
Ana m ekpe ekpere ka okwu ọbụ abụ ahụ nwee ike ịnọgide na-abụ eziokwu n’ọnọdụ m. “Nanị ịdị mma na ebere ga-agbaso m ụbọchị nile nke ndụ m; m ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 23:6.
[Foto dị na peeji nke 27]
N’ozi na San Lucas, Loja, Ecuador