Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 11/8 p. 26-27
  • Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka Arụrụala Ji Dị Njọ?
  • Ahụ Efe Nye Ụmụ Anụmanụ
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
  • Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?
    Teta!—1997
Teta!—1998
g98 11/8 p. 26-27

Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?

N’OTU ọgbọ egwuregwu dị n’Ebe Etiti America, anya nile dịkwasịrị n’oké ọkpa abụọ, otu na-acha ọbara ọbara, nke ọzọ na-acha ọcha. Ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu ka oké ọkpa ahụ na-acha ọbara ọbara, e kenyere agụba dị nkọ n’ụkwụ ya, gbara nke ahụ na-acha ọcha ụkwụ. Onye referee nwụlitere ọkụkọ abụọ ahụ. Ugbu a ike agwụla nke ọcha ahụ, ọ nwụọla, ọbara sikwa ya n’ahụ na-atasị. Oké ọkpa ndị ahụ alụchaala ọgụ.

N’ebe ndịda Philippines, a na-arakọta oké ịnyịnya abụọ. Ndị gbakọtaranụ nọ na-ekiri ihe omume ahụ na-atụ ụjọ ka ịnyịnya abụọ ahụ na-ata ibe ha arụ ná ntị, n’olu, n’imi, na n’akụkụ ahụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ha abụọ nwere ike ịdị ndụ si n’ọgbọ egwuregwu ahụ pụọ, ọ dịkarịa ala e nwere ike nye otu n’ime ha nkwarụ ma ọ bụ mee ka o kpuo ìsì ma ọ bụ merụọ ya ahụ nke ga-emesị kpata ọnwụ.

Nkịta abụọ na Russia nọ na-alụ ọgụ. Nwa obere oge, a ghụpụla anya, tapụkwa ntị, ha ji ụkwụ e merụsịrị ahụ na-agagharị, ọbara na-awụsị site n’anụ ahụ a tapusịrị atapusị.

Ruo ọtụtụ narị afọ ụmụ mmadụ arakọtawo anụmanụ na anụmanụ n’aha egwuregwu, nke ịgba chaa chaa na-abụkarị ihe na-akpali ya. Ihe ndị ọzọ bụkwa mmadụ ịlụso oké ehi ọgụ, ịchụ nta nkịta ọhịa, na ọbụna ọgụ ududo. Tụkwasị na nke a, ọtụtụ ụmụ anụmanụ na-ata ahụhụ n’aha sayensị. Ọzọkwa, ọtụtụ ụmụ anụmanụ na-ata ahụhụ n’ihi nleghara anya nke ndị nwe ha, ma hà kpachaara anya ma ọ bụ na ha akpachaghị anya.

N’ala ụfọdụ, e nwere iwu ndị na-achịkwa otú e si emeso ụmụ anụmanụ ihe, na-amachibidokwa arụrụala. Laa nnọọ azụ n’ihe dị ka na 1641, Ógbè Massachusetts Bay tiri “Iwu Nnwere Onwe,” nke kwuru, sị: “Ọ dịghị onye Ga-emegbu ma ọ bụ Rụsa Anụmanụ ọ bụla bụ́ nke a na-edebekarị maka ụmụ mmadụ iji ya eme ihe Arụrụala.” Kemgbe ahụ, e tiwo iwu, e hiwewokwa òtù dị iche iche ka ha chee nche megide ịrụsa anụmanụ arụrụala.

Ma, ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-akwado egwuregwu ịlụ ọgụ ndị ahụ e kwuru okwu ha n’elu adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị na-arụsa anụmanụ arụrụala. Ụfọdụ na-azọrọ na ha hụrụ anụmanụ ndị ha ji obi ọjọọ eme ka ha taa ahụhụ ma ọ bụ nwụọ n’anya. Ndị nwere mmasị n’ikiri ọgụ oké ọkpa na-azọrọ na ọkụkọ ha na-adị ogologo ndụ karịa ọkụkọ nkịtị e debere maka oriri—nkasi obi na-erijughị afọ n’ezie!

N’ihi Gịnị Ka Arụrụala Ji Dị Njọ?

Chineke kwere ka anyị jiri ụmụ anụmanụ na-eme ihe. Ụkpụrụ Bible nyere anyị ohere igbu ụmụ anụmanụ iji nweta nri na uwe ma ọ bụ iji chebe onwe anyị pụọ ná mmerụ ahụ. (Jenesis 3:21; 9:3; Ọpụpụ 21:28) Otú ọ dị, ndụ dị nsọ nye Chineke. A ghaghị iji ikike anyị nwere n’ebe ụmụ anụmanụ dị mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị nke na-egosi nkwanye ùgwù maka ndụ. Bible katọrọ otu nwoke aha ya bụ Nimrọd, onye ọ pụrụ ịbụ na o gburu ụmụ anụmanụ na ikekwe ụmụ mmadụ nanị maka obi ụtọ ime ya.—Jenesis 10:9.

Jisọs kwuru banyere nchebara echiche Chineke na-echebara ụmụ anụmanụ n’okwu ndị a: “À dịghị ere egwele ise na penny abụọ? ma a dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke.” (Luk 12:6) Ọzọkwa, mgbe ọ gbanwere uche ya banyere ibibi otu obodo nke jupụtara ná ndị na-eme ajọ omume bụ́ ndị chegharịworonụ, Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “M̀ gaghị emere Nineve ebere, bụ́ obodo ukwu ahụ; nke ihe [karịrị otu narị puku na iri puku mmadụ abụọ] nọ n’ime ya, . . . na ọtụtụ anụmanụ?” (Jona 4:11) O doro anya na ọ dịghị ele anụmanụ anya dị ka nanị ihe a pụrụ igbufu egbufu, ihe a ga-egbufu ma a chọọ.

Mgbe ọ na-enye ụmụ Israel iwu, Chineke kụziiri ha otú kwesịrị ekwesị e si elekọta anụmanụ. Ọ chọrọ ha n’aka ime ka anụmanụ na-akpafu akpafu laghachikwuru onye nwe ya na inyere anụmanụ na-ata ahụhụ aka. (Ọpụpụ 23:4, 5) Ụmụ anụmanụ ga-erite uru site n’Ụbọchị Izu Ike, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ. (Ọpụpụ 23:12) E nwere iwu ndị na-achịkwa ụzọ kwesịrị ekwesị nke isi mesoo anụmanụ ndị e ji arụ ọrụ ugbo ihe. (Deuterọnọmi 22:10; 25:4) N’ụzọ doro anya, a ga-elekọta ma chebe ụmụ anụmanụ, ọ bụghị imegbu ha.

Ilu 12:10 na-ekwu echiche Chineke n’ụzọ doro anya, sị: “Onye ezi omume maara ndụ anụ ụlọ ya: ma obi ebere nile nke ndị na-emebi iwu bụ enweghị obi ebere.” Otu akwụkwọ na-akọwa Bible sụgharịrị amaokwu a otú a: “Obiọma nke onye ezi omume na-erucha ọbụna n’ebe anụmanụ ndị dara ogbi dị, ma onye ajọ omume nwere obi ọjọọ, ọbụna mgbe ọ na-eche na ya kasị nwee obiọma.”—Believer’s Bible Commentary, nke William MacDonald dere.

Onye ezi omume na-eji obiọma emeso ụmụ anụmanụ ihe ma na-achọ ịmata mkpa ha. Onye ajọ omume pụrụ ikwupụta ịhụnanya maka anụmanụ, ma “ebere” ya, ọ karịsịa, bụ obi ọjọọ n’ezie. Omume ya na-ekpughe ọchịchọ ọdịmma onwe nanị nke o bu n’uche. Lee ka nke a si bụrụ eziokwu banyere ndị ahụ na-arakọta anụmanụ na anụmanụ iji nweta ego!

Ahụ Efe Nye Ụmụ Anụmanụ

N’eziokwu, nzube mbụ nke Chineke bụ ka mmadụ ‘nwee ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.’ (Jenesis 1:28) Ịrụsa anụmanụ arụrụala abataghị ná nzube ahụ. Imeso ụmụ anụmanụ mmeso ọjọọ agaghị aga n’ihu ruo mgbe ebighị ebi. Anyị nwere ihe mere anyị ga-eji kwere na Chineke ga-akwụsị ịta ahụhụ nile na-enweghị isi. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

O kwere nkwa ibibi ndị ajọ mmadụ na ndị nwere obi ọjọọ. (Ilu 2:22) Banyere ụmụ anụmanụ, Hosea 2:18 na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ahụ Mụ na anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ nke ala ga-agbara ha ndụ: . . . mee ka ha dinaa ala ná ntụkwasị obi.” Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ịdị ndụ n’oge ahụ, mgbe ọnọdụ udo ga-abara ọ bụghị nanị ndị ziri ezi uru kamakwa ụmụ anụmanụ!

[Foto dị na peeji nke 26]

“Ịlụso oké ehi ọgụ n’otu Obodo Nta,” nke Francisco Goya sere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya