Ọdọ Mmiri Victoria—Nnukwu Ọdọ Mmiri Dị n’Ime Obodo Africa
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Kenya
N’IME ime Africa, n’afọ 1858, otu onye England ji ụkwụ gafere ime ọhịa na ala ebe mmadụ na-agabeghị mbụ. N’ịbụ onye ya na nanị ndị Africa ole na ole buuru ya ibu so na-eme njem, bụrụkwa onye ọrịa, ike ọgwụgwụ, na obi abụọ nyere nsogbu, ọ gbara ndị ikom ya ume ka ha gaa n’ihu. John Hanning Speke nọ na-achọ ihe a na-achọsi ike nke siri ike nchọta—isi iyi nke Naịl.
N’ịbụ onye akụkọ banyere otu nnukwu ọdọ mmiri dị n’ime obodo, bụ́ nke ndị Arab na-agba ahịa ohu kpọrọ Ukerewe kwaliri, Speke jisiri ike gafere ọhịa ahụ yiri nke na-enweghị njedebe. N’ikpeazụ, mgbe ụbọchị 25 nke ịga ije gasịrị, ndị njem ole na ole ahụ nwetara ụgwọ ọrụ nke ịhụ ihe magburu onwe ya. N’ebe ahụ n’ihu ha, na-agbasapụ ruo n’ebe anya pụrụ iru, ka e nwere nnukwu ọdọ mmiri dị n’ime obodo nke mmiri ya dị ọcha. Speke mesịrị dee, sị: “Enwekwaghị m obi abụọ ọ bụla na ọdọ mmiri ahụ ụkwụ m dị n’ime ya bụ ebe osimiri ahụ na-adọrọ mmasị, nke isi ya bụworo isiokwu nke ọtụtụ ịkọ nkọ, na ihe ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta chọworo, si pụta.” O nyere ihe ọ chọpụtara aha iji kwanyere eze nwanyị na-achị England mgbe ahụ ùgwù—Victoria.
Isi Iyi nke Naịl
Taa ọdọ mmiri ahụ nke ka nwe aha ahụ bụ nke a ma ama dị ka ọdọ mmiri nke abụọ kasị ibu n’ụwa bụ́ nke nwere mmiri dị ọcha—nanị Ọdọ Mmiri Superior, dị n’Ebe Ugwu America, ka ya ibu. Dị ka nnukwu enyo na-egbukepụ egbukepụ n’anwụ na-achasi ike, elu Ọdọ Mmiri Victoria dị larịị, nke dị ka ugegbe kpuchiri ókèala dị square kilomita 69,484. N’ịbụ nke ebe mgbago ya gafere ebe ụwa kere abụọ, dịrịkwa n’agbata akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ nke Oké Ndagwurugwu ahụ, akụkụ ya buru ibu dị na Tanzania na Uganda ma jedebe n’ókèala Kenya.
Ebe bụ́ isi mmiri si asọbata n’ọdọ mmiri ahụ bụ Osimiri Kagera dị na Tanzania, bụ́ nke mmiri ya na-agbakọta site n’ugwu ndị dị na Rwanda. Otú ọ dị, ihe ka ukwuu na mmiri na-asọbata na Victoria bụ mmiri ozuzo na-agbakọta ná nnukwu ebe o si enweta mmiri nke gbara ya gburugburu, bụ́ nke dị ihe karịrị square kilomita 200,000 n’obosara. Nanị ebe mmiri si asọpụ n’ọdọ mmiri ahụ bụ na Jinja, dị na Uganda. N’ebe a, mmiri ahụ na-asọga ebe ugwu wee mụpụta Naịl Ọcha. Ọ bụ ezie na ọ bụghị nanị Ọdọ Mmiri Victoria bụ isi iyi nke Osimiri Naịl, ọ bụ nnukwu ọdọ mmiri nke na-anọgide na-asọpụta mmiri dị ọcha mgbe nile ma na-akwagide ndụ ruo n’Ijipt.
Ndụ n’Ọdọ Mmiri Ahụ
Otu ụgbọ epeepe, nke ákwà ifufe ya dị ọcha gbasaranụ yiri otu nku urukurubụba kwụ ọtọ, na-agbafe n’elu ọdọ mmiri ahụ. N’ịbụ nke ifufe na-efe kwa ụbọchị nke na-esite n’ala gbara ya gburugburu na-ebugharị, a na-ebuba obere ụgbọ epeepe ahụ n’etiti ọdọ mmiri ahụ. N’ehihie ifufe ahụ na-atụgharị ma bughachi ya n’ebe o si bịa. Ndị na-akụ azụ̀ n’ọdọ mmiri ahụ emewo nke a ugboro ugboro ruo ọtụtụ puku afọ.
Obodo nta dị iche iche na ntakịrị ime obodo, ndị nwere elu ụlọ akịrịka na-acha nchara nchara, gbara ọdọ mmiri Victoria gburugburu. Nye ndị bi n’ime obodo ndị ahụ dịdewere Osimiri Naịl, azụ̀ bụ nri bụ́ isi, ha na-adaberekwa n’ebe ọdọ mmiri ahụ dị maka inweta nri ụbọchị ha. Onye ọkụ azụ̀ na-amalite ọrụ ụbọchị ya tupu anwụ apụta. Ndị ikom na-ekupụ mmiri n’ime ụgbọ epeepe ha na-ehi ehi ma malite ịgbafe mmiri ahụ alụlụ juru. N’ịbụkọ abụ ọnụ, ha na-akpara ụgbọ gaa n’ebe mmiri dị omimi karị ma kwụnye nkịrịka ákwà ifufe ha. Ndị inyom na-anọ n’ikperé mmiri na-ekiri ka obere ụgbọ epeepe ndị ahụ gamiri n’ebe anya pụrụ ịhụru. Obere oge ha amalite ịpụwa, n’ihi na e nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ.
Ka ụmụaka na-akwọli mmiri elu ma na-egwuri egwu ná mmiri ahụ na-adịghị omimi, ndị inyom na-asa ákwà ma na-ekuru mmiri ọṅụṅụ n’ọdọ mmiri ahụ. N’ikpeazụ, ọrụ ha na-arụ n’ụsọ mmiri ahụ na-agwụsị. N’ibu ite mmiri n’isi ha n’ụzọ nkà, na-akwọ ụmụaka n’azụ ha, na-ejikwa aka ha abụọ buru nkata ákwà a sara asa, ndị inyom ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ lawa. N’ebe ahụ, ha na-elekọta obere ubi ọka na àgwà, na-akpata nkụ, na-ejikwa ngwakọta nke nsị ehi na ntụ́ edozi ụlọ ájá ha. Ịgakwu n’ihu n’akụkụ ikperé mmiri ahụ, ndị inyom na-eji nkà jiri eriri osisi sisal na-akpa ụdọ siri ike na nkata ndị mara mma. Ụda anyụike na-adasi ike ka ụfọdụ ndị ikom na-akpọwapụta nnukwu ogwe osisi iji rụọ ụgbọ epeepe.
Ka mgbede na-eru, anya ndị inyom ndị ahụ na-agakwa ọzọ n’ebe nnukwu osimiri ahụ nwere mmiri dị ọcha dị. Ịhụchata ákwà ifufe ndị ahụ na-acha ọcha ga-egosi nlọta nke ndị ikom ahụ. Ha na-atụsi anya nke a ike, na-achọsi ike ịhụ di ha na azụ̀ ha ga-eweta.
N’ikperé mmiri ahụ na n’àgwàetiti nile nke ọdọ mmiri ahụ, ntakịrị ógbè ndị a na-enwe ndị ọbịa na-eweta ozi udo. Site n’iji ụkwụ na n’iji ụgbọ epeepe, a na-ejeru obodo nta na ntakịrị ime obodo nile. Ndị ahụ nwere obi umeala, na-achọsikwa ike ịṅa ntị. Ha na-enwe obi ụtọ karịsịa ịgụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible e biri n’asụsụ ha, bụ́ asụsụ ndị bi n’ógbè dịdewere Naịl na Bantu.
Ihe Ndị Bi na Mmiri
Ọdọ Mmiri Victoria nwere ihe karịrị ụdị azụ̀ 400, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị a na-adịghị ahụ n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa. Nke a kasị ahụ bụ ụdị a na-akpọ apụpa. Obere azụ̀ a tụrụ àgwà nwere aha ndị na-akọwa otú ha dị, dị ka azụ̀ nwere ire ọkụ n’azụ, azụ̀ pink, na azụ̀ ọnụ akịrị nke Kisumu. Ụfọdụ apụpa nwere ụzọ pụrụ iche ha si echebe ụmụ ha. Mgbe e nwere ihe ize ndụ, nne azụ̀ ahụ na-emeghe ọnụ ya, ụmụ ya dị ntakịrị ewee gbaba n’ebe nchebe nke oghere ahụ. Mgbe ihe ize ndụ ahụ gafere, nanị ihe ọ na-eme bụ ịgbụpụta ha ọzọ, ha amalitekwa mewe ihe ha na-emebu.
Ọdọ Mmiri Victoria bụ ebe obibi nke nnụnụ mmiri ndị magburu onwe ha, ndị dịgasịkwa iche iche. Nnụnụ grebe, nnụnụ cormorant, na nnụnụ anhinga na-efekpu n’ime mmiri ma n’ụzọ nkà jiri ọnụ ha dị nkọ na-adụrụ azụ̀. Nnụnụ crane, nnụnụ heron, ụgbala, na nnụnụ spoonbill na-aga n’ebe ndị na-adịghị omimi, na-akwụsịtụ n’emegharịghị ahụ ka ha na-azọrubeghị ụkwụ ha ala, jiri ndidi na-echere ka azụ̀ na-amaghị ihe na-aganụ bịa ha nso. N’elu, ìgwè okwolo na-efegharị dị ka ụgbọelu ndị okpuru ha buru ibu. Mgbe ha na-egwu mmiri n’ìgwè, ha na-agba ìgwè azụ̀ ndị gbakọtara ọnụ gburugburu ma jirizie ọnụ ha buru nnọọ ibu, nke yiri nkata na-atụrụ ha. Ugo na-eri azụ̀, bụ́ nke nwere nku siri ike, bụ nke kasị ike n’igwe. N’isi n’elu alaka osisi dị elu felie, ọ na-efedata n’ike, ikuku ana-eme mkpọtụ ka o si na nku ya ndị siri ike na-ekufe, n’etinyeghịkwa mgbalị ọ bụla, ọ na-eburu azụ̀ n’elu ọdọ mmiri ahụ. Asha ndị tụrụ àgwà na-akpa akwụ́ n’alụghụlụ nke osisi papyrus nke gbara ọdọ mmiri ahụ gburugburu, a pụkwara ịnụ ubé apịa ma a gatụkwuo n’ihu n’ikperé mmiri ahụ n’oké ọhịa ahụ osisi acacia juru.
N’ụtụtụ na n’uhuruchi, ubé na-asụ asụ nke enyí mmiri na-adafe ọdọ mmiri ahụ dị jụụ. N’ehihie ha na-ehi ụra n’ikperé mmiri ahụ, na-eyi nnukwute okwute ndị na-akwọ mụrụmụrụ na-acha ntụ ntụ, ndị elu ha pụtara n’ime mmiri na-adịghị omimi. Ndị bi n’akụkụ ọdọ mmiri ahụ na-akpachara anya mgbe nile banyere agụ iyi Naịl ahụ dị ize ndụ. Ole na ole n’ime anụ ndị a na-akpụ akpụ na-atụ egwu ka bi n’akụkụ ndị dị n’ime karị n’Ọdọ Mmiri Victoria, ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ egbuwo ihe ka ọtụtụ n’ime ha.
Mmiri A Na-enye Nsogbu
Ọnụ ọgụgụ ndị bi n’Africa amụbawo nke ukwuu kemgbe ahụ John Speke hụrụ Victoria nke mbụ ya. Ihe karịrị nde mmadụ 30 bi gburugburu ikperé ọdọ mmiri ahụ bụ́ ndị dabeere ugbu a na mmiri ya dị ọcha maka ịdịgide ndụ. N’oge gara aga ndị ọkụ azụ̀ bi n’ebe ahụ dabeere n’ụzọ ọdịnala nke isi egbu azụ̀. N’ibu ọnyà azụ̀ ndị a kpara akpa, ụgbụ ndị e ji osisi papyrus kpaa, nko, na ube, ha na-egbute ihe ndị ha chọrọ. Taa, n’ihi mwebata nke ụgbọ epeepe ndị e ji egbu azụ̀ na ụgbụ nylon ndị pụrụ ịgbatịru ebe dị anya ma kulite ọtụtụ tọn azụ̀ ná mmiri dị omimi karị, igbubiga azụ̀ ókè na-eyi njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ọdọ mmiri ahụ egwu.
Mwebata nke ụdị azụ̀ ndị e si ebe ọzọ weta akpatawo enweghị nguzozi ná njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha bụ́ nke kpaghasịworo igbu azụ̀ n’ebe ahụ. Ihe ọzọ na-akpata nsogbu ọdọ mmiri ahụ bụ ahịhịa water hyacinth, nke na-ese n’elu mmiri nke na-ewepụta okooko osisi mara mma na-acha odo odo. N’ịbụ nke e si n’Ebe Ndịda America webata, ahịhịa ahụ na-eto nnọọ ngwa ngwa nke na o tochiwo ma kpachigide ebe ndị buru ibu n’ikperé mmiri na ebe ndị mmiri si asọbata n’ọdọ mmiri ahụ, na-egbochi iji ụgbọ epeepe ndị na-ebu ibu, ndị na-ebu mmadụ, na nke ndị ọkụ azụ̀ ahụ bi n’ógbè ahụ gaa n’ụsọ mmiri na ebe ndị ụgbọ epeepe na-anọ eburu ibu. Igbukpọsị oké ọhịa nke ebe ọdọ mmiri ahụ si enweta mmiri, ịwụfu mmiri nsị, na inwekwu ụlọ ọrụ mmepụta ihe etinyewo ọdịnihu nke ọdọ mmiri ahụ n’ihe ize ndụ.
Ọdọ Mmiri Victoria ọ̀ ga-alanarị? A na-arụ ụka n’ajụjụ ahụ, ọ dịghịkwa onye ji n’aka kpọmkwem otú a ga-esi dozie ọtụtụ nsogbu ya. Otú ọ dị, Ọdọ Mmiri Victoria bụ ihe si n’okike nke yiri ka ọ ga-adịgide n’ụwa ruo ogologo oge mgbe Alaeze Chineke wepụsịrị ndị ahụ “na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]
Azụ̀ nke Na-elo Ọdọ Mmiri Ahụ
Ahụ ya dị mmanụ mmanụ, ọ na-eri oké nri, na-amụba ngwa ngwa, na-etorukwa mita 1.8 n’ogologo. Gịnị ka ọ bụ? Azụ̀ Lates niloticus! N’ịbụ nke a maara ebe nile dị ka azụ̀ perch nke Naịl, azụ̀ a buru ibu, na-eri oké nri, nke e tinyere n’Ọdọ Mmiri Victoria n’afọ ndị 1950, abụrụwo ọdachi nye njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ebe obibi ha. N’ime afọ 40 o nwewo ike ilo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ụdị azụ̀ 400 a na-enweta n’ọdọ mmiri ahụ. Mkpochapụ nke a n’ìgwè eyiwo ebe ọtụtụ nde ndị bi n’ógbè ahụ si enweta nri egwu bụ́ ndị dabeere n’ebe apụpa nke ka obere, apụpa ndị ka ibu, na azụ̀ ndị ọzọ a na-enweta n’ebe ahụ dị iji zụọ ezinụlọ ha. Ọ bụ obere azụ̀ ndị a na-eme ka ọdọ mmiri ahụ nwee mmiri dị ọcha. Ụfọdụ n’ime ha na-eri obere eju ndị na-akpata ọrịa ahụ ọkụ ejula a na-atụ egwu, si otú a na-enye aka ebelata ọrịa ahụ. Ndị ọzọ na-eri algae na ihe ọkụkụ ndị ọzọ na-adị na mmiri bụ́ ndị na-eto ugbu a n’enweghị nchịkwa. Uto a na-enweghị nchịkwa akpatawo ọnọdụ inwebiga ihe oriri ókè, bụ́ nke ire ure nke ihe ọkụkụ na-anọ akpata mbelata nke ikuku oxygen n’ime mmiri. Ebe e nwere azụ̀ ole na ole a na-enweta n’ebe ahụ ikpochasị unyi a, “ógbè nwụrụ anwụ,” bụ́ akụkụ mmiri ndị na-enweghị ikuku oxygen amụbawo, na-egbu ọbụna ọtụtụ azụ̀ karị. Ebe ha nwere ọnụ ọgụgụ azụ̀ dị ala karị iri, azụ̀ perch nke Naịl ahụ agụụ na-agụ mgbe nile echigharịkwuruwo ebe ọzọ isi nweta nri—ụmụ ya! Azụ̀ ahụ nke na-elo ọdọ mmiri ahụ na-eyizi egwu ilo onwe ya!
[Map dị na peeji 25]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
UGANDA
KENYA
TANZANIA
ỌDỌ MMIRI VICTORIA
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịgba àmà n’ụsọ Ọdọ Mmiri Victoria
[Foto dị na peeji nke 26]
Asha
[Foto dị na peeji nke 26, 27]
Okwolo
[Foto dị na peeji nke 27]
Oso ehi
[Foto dị na peeji nke 26, 27]
Agụ iyi Naịl
[Foto dị na peeji nke 27]
Nnụnụ “Heron” begooro n’azụ enyí mmiri