Echiche nke Bible
Ọdachi Mbara Igwe Ọ̀ Ga-ebibi Ụwa Anyị?
NA March 12, 1998, isiokwu akwụkwọ akụkọ, TV, na Internet gburugburu ụwa gbasara akụkọ ahụ na-enye echiche ihe ọjọọ ga-emenụ: “Mbara ụwa dị nta nke dị kilomita 1.5 n’obosara na-aga n’ụzọ nke ga-afọ nke nta ka ya na Ụwa sọkọta isi.” Ndị ọkà mmụta sayensị na ndị nkịtị gbakeriri ala ịchọpụta ihe ihe ize ndụ ahụ bụ. Ndị na-enyocha mbara igwe kwubiri n’oge na-adịghị anya na e nweghị ohere ọ bụla nke ịsọkọta isi.
Otú ọ dị, a matawo ihe ọhụrụ n’oge ọgba aghara ahụ. “Ihe kasị dị ịrịba ama banyere mgbaàmà ụgha ahụ pụrụ ịbụ na, n’agbanyeghị otú a tụruru ya ụjọ, ọtụtụ ndị weere ya dị ka ihe na-adịghị oké ịtụnanya,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report kwuru. “Echiche ahụ bụ́ na anyị bụ́ ndị nọ n’Ụwa kwesịrị ịdị na-elepụ anya ịhụkwu ihe ndị dị otú ahụ—ma na-eme atụmatụ ime ihe banyere ha—gaara ada ka ihe ọhụrụ n’afọ iri ma ọ bụ karịa gara aga, ma ugbu a ndị ọkà mmụta sayensị na ọbụna ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eche na iyi egwu ahụ, ọ bụ ezie na ọ dị nta, dị adị n’ezie.”
Ụfọdụ ndị na-enyocha mbara igwe kweere na ihe dị ka ihe ndị dị n’eluigwe 2,000 ndị buru nnọọ ibu ịkpata ọdachi zuru ụwa ọnụ na-aga n’ụzọ nke gabichiri ụzọ ụwa si agba anyanwụ okirikiri ma ọ bụ na-aga nso n’ebe ọ dị. Ọ bụrụgodị na otu n’ime ha nke dịtụ obere akụta ụwa, ka ndị nnyocha na-ekwu, mgbawa ya ga-adị ka ikike nke ọtụtụ ngwá agha nuklia gbawara otu ugbo. Ihe ndị ga-esi ná nkụta dị otú ahụ pụta ga-akpatara mbara ụwa anyị na ihe ndị dị n’ime ya, bụ́ ma mmadụ ma anụmanụ ọdachi.
Otu echiche nke a na-elegharakarị anya n’ime ajọ amụma na ngụkọ ndị dị otú ahụ bụ nke Onye Okike nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke. (Abụ Ọma 8:3; Ilu 8:27) N’ime Bible o mewo ka a mata uche na nzube ya maka ụwa na agbụrụ mmadụ n’ụzọ doro anya. Ọ̀ ga-ekwe ka ọdachi mbara igwe bibie ụwa anyị?
Eluigwe na Ala nke Chineke Na-achịkwa
Ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye Okike nke pụrụ ime ihe nile nke eluigwe na ala, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na o nwere ikike ịchịkwa ike nile na-achịkwa ihe ndị dị n’eluigwe. Eze Solomọn nwere amamihe kwuru na Jehova “[edoziwo] eluigwe site ná nghọta.” (Ilu 3:19) Jeremaịa onye amụma kwupụtara na Chineke bụ “Onye jiworo nghọta Ya setịpụ eluigwe.”—Jeremaịa 51:15.
Jehova emewo ka ụkpụrụ na ike ndị na-achịkwa mgbagharị nke ihe ndị dị n’eluigwe, gụnyere kpakpando, mbara ụwa, comet, na mbara ụwa ndị dị nta dịrị. (Aịsaịa 40:26) Otú ọ dị, o yiri ka ọ na-ahapụ ka kpakpando na mbara ụwa gbasoo usoro ha sitere n’okike nke ịmụ ọmụmụ, ịdị ndụ, na ịnwụ anwụ n’ụzọ ihe atụ n’etinyeghị aka mgbe nile. Nke a na-agụnye ụfọdụ nsọkọta isi ndị dị egwu nke ihe ndị dị n’eluigwe. Otu ihe atụ na-adịbeghị anya bụ nsọkọta isi nke mere na July 1994 bụ́ mgbe iberibe comet bụ́ Shoemaker-Levy 9 na mbara ụwa bụ́ Jupiter sọkọtara isi.
E nwere ihe àmà sitere na nkà mmụta ihe banyere ala banyere nnukwu okwute ndị si na mbara igwe na-akụtụrụ ụwa tupu oge e kere mmadụ. Ma ihe dị otú ahụ ọ̀ dị mgbe ọ ga-eme na mbara ụwa anyị mmadụ jupụtara? Dị ka ihe atụ, gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na mbara ụwa dị nta dị kilomita 1.5 n’obosara na ụwa asọkọta isi? Onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Jack Hills na-ebu amụma na nsọkọta isi ha ga-enwe ikike ga-eji ọtụtụ okpukpu nde karịa nke bọmbụ ahụ kpochapụrụ Hiroshima. Ọ bụrụ na ọ daba n’oké osimiri, ebili mmiri ya ga-ekpuchi ikperé mmiri. “Ebe obodo ukwu dịbu,” ka Hills na-ekwu “ga-abụ nanị ala apịtị.” Ihe kasị njọ a sịrị ga-eme bụ mgbuchapụ nke agbụrụ mmadụ. Olee otú amụma a banyere ụbọchị mbibi ji kwekọọ n’uche Onye Okike anyị maka ụwa? Bible na-egosi na mbara ụwa a nwere ọnọdụ pụrụ iche ná nzube Jehova.
Ụwa Anyị—E Nwere Nzube Mere E Ji Mee Ya
Banyere mbara ụwa anyị, ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Aịsaịa na-akọwa Jehova dị ka “Onye kpụworo ụwa, . . . [Onye] mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ụwa bụ ihe nketa nke Jehova nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ọ bụkwa na Onye Okike anyị bu ọdịnihu ebighị ebi maka ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke n’uche, ụwa ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi dị ka ebe obibi ha na-adịgide adịgide. Abụ Ọma 104:5 na-emesi anyị obi ike, sị: “[Jehova atọwo] ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”
N’eziokwu, Chineke ekwewo ka ụfọdụ nnukwu ọdachi mee na mbara ụwa anyị, bụ́ nke kpataara ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ihe a kpọrọ mmadụ ọnwụ. Ụfọdụ n’ime ọdachi ndị a—dị ka agha, ụnwụ nri, na ntiwapụ nke ọrịa—abụwo nke anyaukwu, nzuzu, na obi ọjọọ nke ụmụ mmadụ kpatara n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ụfọdụ. (Eklisiastis 8:9) Ndị ọzọ—dị ka ala ọma jijiji, mgbawa ugwu, idei mmiri, na oké ifufe—abụwo nke ihe na-emere onwe ya bụ́ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-aghọtachabeghị kpatara. N’adịghị ka nzube mbụ nke Chineke, ụmụ mmadụ ezukwaghị okè; ha na-emehie emehie. Dị ka ihe si na ya pụta, dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, n’oge a anyị apụghị ịdabere ná nchebe Chineke pụọ n’ihe a sị na ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha.
Otú ọ dị, ọ dịbeghị mgbe Jehova hapụrụ ka ịdịgide ndụ nke mmadụ n’ụwa bụrụ nke e yiri egwu n’ụzọ dị oké njọ. Kemgbe e kere mmadụ, e nwebeghị ọdachi na-emere onwe ya merenụ nke yiri ịdị adị nke ihe nile a kpọrọ mmadụ egwu n’akụkọ ihe mere eme a nwapụtara anwapụta.a
E Kwee Nkwa Nlanarị nke Agbụrụ Mmadụ
Site ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, nzube Onye Okike anyị abụwo ka mmadụ “jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe [ha].” (Jenesis 1:28; 9:1) O kwewo nkwa na “ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:9, 11, 22, 29) Banyere nkwa ya, Jehova na-emesi ya ike, sị: “Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.”—Aịsaịa 46:10; 55:11; Abụ Ọma 135:6.
Bible adịghị akachapụ kpam kpam ikwe omume nke obere ọdachi ụwa nke ihe omume mbara igwe na-akpata. Otú ọ dị, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova agaghị ekwe ka ọdachi ọ bụla nke mbara igwe mee ka nzube ya nke o kwupụtara maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ kụọ afọ n’ala. N’ịdabere n’ihe ndị Bible kwere ná nkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na a ga-anọgide na-ebi na mbara ụwa anyị ruo mgbe ebighị ebi—ee, ọ ga-abụ ebe obibi nke ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi!—Eklisiastis 1:4; 2 Pita 3:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iju Mmiri nke ụbọchị Noa bụ ihe Chineke ji weta mbibi, ma Jehova hụrụ na ụfọdụ ụmụ mmadụ na anụmanụ lanarịrị.—Jenesis 6:17-21.