Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 12/8 p. 19-21
  • “Ị Pụrụ Ịkwụsị—Anyị Kwụsịrị!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ị Pụrụ Ịkwụsị—Anyị Kwụsịrị!”
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Siga
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị?
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwụsị Ise Siga?
    Teta!—2000
  • Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị Ya
    Teta!—2000
  • Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ịṅụ Sịga Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 12/8 p. 19-21

“Ị Pụrụ Ịkwụsị—Anyị Kwụsịrị!”

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA JAPAN

Dị ka e si kọọ ya, ụgbọ mmiri Europe ndị kwụsịrị n’ebe ụgbọ mmiri na-eburu ibu na Japan ná ngwụsị afọ ndị 1500 bu ndị nleta na-ese siga, bụ́ ndị yiri ka ha “na-afụnwu ọkụ n’ime afọ ha.” Ihe ijuanya mesịrị ghọọ ọchịchọ ịmata ihe, nke na mgbe ọ na-erule n’afọ ndị 1880, àgwà ise sịga aghọwo ihe zuru ebe nile na Japan. Ònye gaara eche na ụmụ ndị Japan ahụ nwere ihe ijuanya ga-eso ná ndị kasị ese siga n’ụwa taa?

“ANYỊ chọrọ ime ka ndị toworo eto, inwe mmetụta uche nke ndị toworo eto na-enwe.”—Akio, Osamu, na Yoko.

“Achọrọ m ifelata.”—Tsuya.

“Ọ bụ n’ihi ọchịchọ ịmata ihe.”—Toshihiro.

“Anyị echeghị na siga ga-emetụta anyị n’ụzọ dị njọ.”—Ryohei, Junichi, na Yasuhiko.

“Achọrọ m ịkwụsị agbọ onunu isi ụtụtụ mgbe m dị ime nke abụọ.”—Chieko.

“M na-ese ya n’oge ihe na-agazichaghị agazi mgbe anyị na-enwe nzukọ achụmnta ego.”—Tatsuhiko.

Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị e kwuru kpatara ya mgbe a jụrụ otu ìgwè nọ ná mba a ihe mere ha ji malite ise siga. Nkọwa ndị dị otú ahụ kwere nnọọ nghọta, n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ụfọdụ na-akpọ Japan paradaịs ndị na-ese siga. Otú ọ dị, n’ụzọ dị ịrịba ama, ndị ahụ a kpọrọ aha n’elu akwụsịchawo àgwà ise siga. Nke a bụ nnọọ ihe chọrọ obi ike ma ị tụlee ihe mgbochi ndị gburugburu ebe obibi ha bụụrụ ha. Ì na-eche otú ha si mee ya? Ka anyị buru ụzọ tụlee ókè ise siga gbasaruru na Japan taa.

Ọnọdụ Siga

Ihe dị ka pasent 56 nke ndị ikom toworo eto bụ́ ndị Japan na-ese siga ma e jiri ya tụnyere nanị pasent 28 nke ndị ikom bụ́ ndị America dị afọ 15 ma ọ bụ karị. Mmadụ 34,000,000 na-ese siga na Japan na-agụnye ihe dị ka pasent 22 nke ndị inyom, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto. Ihe nlereanya nke ndị toworo eto na iji nkà eme mkpọsa ngwá ahịa atụnyewo ụtụ dị ukwuu ná mmụba dị ngwa nke ndị ntorobịa na-ese siga. Ịkpọsa siga na TV na redio, bụ́ nke a machibidoro iwu na United States ihe karịrị iri afọ abụọ gara aga, bụ nke a machibidoro iwu ugbu a na Japan.

Ọzọkwa, a pụrụ inweta siga ngwa ngwa site n’ọtụtụ ígwè ndị e ji ere ihe n’akụkụ okporo ámá na Japan. Ozugbo ha ji mkpọ ya n’aka, ọ bụ ole na ole na-aṅa ntị n’ozi na-adịghị ike, nke na-adịghịkwa emetụ n’ahụ nke e dere na ya. Akwụkwọ a mapawara na ya pụrụ nanị ịgụ, sị: “Ka anyị ghara isebiga siga ókè; ọ pụrụ ịdị na-emerụ ahụ.” Tinyekwara eziokwu ahụ bụ́ na a na-enwekarị amaghị oké ihe ize ndụ ndị dị na siga, ihe nlereanya ọjọọ nke ọtụtụ ndị a ma ama na-akpalikwa ndị Japan ise siga, na-araba ha n’echiche na-ezighị ezi nke anọghị n’ihe ize ndụ.

Ka a sịkwanụ ihe mere ndị na-emegide ise siga ji na-enwe mwute banyere ọdịda Japan dara n’ime ka ọtụtụ ụmụ amaala ya kwụsị ise siga. Ma ndị ọkà nkụzi ahụwala mkpa ọ dị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị na ise siga na-etinye ahụ ike ha na ndụ ha n’ihe ize ndụ. Ee, ndị Japan na-ese siga na-enwe otu mgbaàmà ndị ahụ nke ndị na-ese siga nọ n’ebe ndị ọzọ na-enwe—agbọ onunu, iku ume ọkụ ọkụ, ụkwara na-adịghị ala ala, afọ mgbu, enweghị agụụ iri nri, inwe ike ibute azụ̀zụ̀ ngwa ngwa, na ikekwe, ka oge na-aga, ịnwụchu ọnwụ n’ihi ọrịa cancer akpa ume, ọrịa obi, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ.

Malite n’April 1, 1985, e mere ka ụlọ ọrụ Japan na-emepụta siga ghọọ nke ndị mmadụ nwe, na-eweta ọtụtụ iri afọ nke nanị gọọmenti ịchịkwa ya ná njedebe. Ka o sina dị, ya na gọọmenti ka na-enwe mmekọrịta chiri anya nke na-egbochi ezi ọganihu ọ bụla n’ịkatọ ise siga. Nke a na-eme ka a mata ihe mere òtù ndị na-emegide ise siga ji na-ele Japan anya taa dị ka ebe dị mma nye ndị na-ese siga. Ọ na-akọwakwa ihe mere akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Yomiuri ji kọọ na ndị dọkịta nọ n’ebe a na-enwe mwute n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na Japan bụ “mba na-akwado ise siga.”

Iji hụ otú ụfọdụ siworo nwee ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị, lee igbe bụ́ “Otú Anyị Si Kwụsị.”

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị?

Ndụmọdụ sitere n’aka ndị na-esebu siga, dị ka ndị ahụ e kwuru maka ha n’igbe, bụ nke a: nwee ezigbo ihe mere iji chọọ ịkwụsị ya. Ịhụnanya maka Chineke na ọchịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ bụ nke kasị mma. Ịhụ onye agbata obi gị n’anya bụkwa ihe ọzọ dị mma. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ, gbasookwa ya. Mee ka ọha na eze mara na ị na-akwụsị ya—gwa ndị enyi gị, chọọkwa enyemaka ndị òtù ezinụlọ gị. Kwụsị ya na mberede, ma o kwe mee. Meekwa ihe nile ị pụrụ ime iji zere ebe a na-ese siga.

Ọ bụrụ na ị na-amụ Bible, mee ka mkpakọrịta gị na Ndịàmà Jehova sawanye mbara. N’iso ha nọrọ, n’oge na-adịghị anya ị gaghị enwekwa ọchịchọ ise siga. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke na-amụrụ onye na-ese siga Bible, ike agwụla gị n’ebe ọ nọ. Nyere ya aka ịhụ Jehova n’anya karịa àgwà ya na-emerụ ahụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

“Otú Anyị Si Kwụsị”

Mieko: “Mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, o doro m anya na apụghị m ịkwụsị ise siga. Ihe m bu n’obi na-amụ ihe bụ ime ka ụmụ m, ma ọ dịghị ihe ọzọ, mata ụzọ nke ndụ. Ma n’oge na-adịghị anya aghọtara m na nne ma ọ bụ nna aghaghị isetịpụ ihe nlereanya, n’ihi ya amalitere m ikpesi ekpere ike nye Jehova Chineke maka enyemaka. Ọ chọrọ mgbalị iji rụọ ọrụ banyere ihe m na-ekpe ekpere maka ya, enweghịkwa m obi ụtọ ruo nwa oge. Ma agaghị m echezọ mmetụta dị nnọọ mma nke inwe akọ na uche dị ọcha nke m nwetara mgbe m mesịrị kwụsị àgwà ọjọọ a ruru unyi.”

Masayuki: “Mgbe m bụsịrị onye na-ese mkpọ siga atọ n’otu ụbọchị na mgbe m mesịrị ọtụtụ nnwale, n’ikpeazụ emenyụrụ m siga nke ikpeazụ m sere ma kwụsị ise siga. Ezinụlọ m, Ndịàmà ibe m, na Jehova Chineke nyeere m aka ịkwụsị. Ọ dịghị onye na-arụ n’ụlọ akụ̀ ebe m na-arụ ọrụ nke kwetara na mụ akwụsịwo. Atụrụ m aro na, n’ihi ndị ahịa anyị, ka ndị na-arụ n’ọfịs ndị dị n’ebe ọha na eze na-anọ ghara ịdị na-ese siga n’oge ọrụ. E mere ihe m turu aro ya, n’agbanyeghị na pasent 80 nke ndị ọrụ ahụ na-ese siga. Omume a agbasawo ugbu a ruo alaka 260 nke ụlọ akụ̀ anyị.”

Osamu: “Ka m mụtara eziokwu ahụ site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, amaara m na aghaghị m ịkwụsị ise siga. O were m ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ. Ọbụna mgbe m kwụsịchara, ruo ọnwa isii ọzọ, aghaghị m ịlụso ọchịchọ ise siga ọgụ. Amatara m n’ime obi m na aghaghị m ịchọ ịkwụsị.”

Toshihiro: “Àjà mgbapụta Jisọs masịrị m nke ukwuu nke na echere m na m pụrụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ịchụ àjà nke ịkwụsị ise siga.”

Yasuhiko: “Mkpebi m mere irubere Jehova Chineke isi ma kwụsị ise siga zọpụtara ndụ m. Otu ụbọchị, ọnụ ụlọ ebe m nọ na-arụ ọrụ jupụtara n’ikuku gas bụ́ propane nke si n’otu oghere na-ekupụta. Dị ka m na-emekarị, agaara m amụnyeworị ọkụ na siga m, bụ́ nke gaara akpata mgbawa. Ma ebe ọ bụ na akwụsịwo m ise siga ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, adị m ndụ taa na-ekwu banyere ya.”

Akio: “Mgbe agbọ malitere inu m site n’oge ruo n’oge, enwere m mmetụta na ise siga na-emerụ m ahụ. Ma akwụsịghị m. Ihe ọmụma mbụ bụ́ eziokwu nke m nwetara banyere ihe ize ndụ dị n’ise siga bụ site n’aka nwunye m, bụ́ onye ghọworo otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya amalitere m ịmụ Bible, amụtakwara m site ná mbipụta Watch Tower na onye na-ese siga na-emerụ ọ bụghị nanị onwe ya ahụ kamakwa ndị òtù ezinụlọ ya. Akwụsịrị m ozugbo!”

Ryohei: “Nwunye m bụ ya na-azụtaburu m siga—mkpọ 20 n’otu oge. Ma mgbe o sosịrị Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ọ jụrụ ịzụta ihe ọ maara na ọ ga-emerụ m ahụ. N’ihi ya emepere m ụlọ ahịa siga nke m. Ana m ese mkpọ siga atọ na ọkara n’otu ụbọchị. Mgbe ahụ amalitere m isoro Ndịàmà na-amụ Bible. N’oge na-adịghị anya achọrọ m ịghọ ezigbo onye ọkà okwu n’isiokwu dị iche iche nke Bible. N’ihi ya akwụsịrị m ise siga ka m wee ruo eru maka ọzụzụ a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.”

Junichi: “Obere nwa m nwanyị, onye bụ́ Onyeàmà, nwere nchegbu maka ndụ m. O mere ka m kwe nkwa ịkwụsị ise siga, akwụsịkwara m.”

Tsuya: “Mgbe mbụ m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka m batara ekwuru m ka e nye m ihe e ji etinye ntụ́ siga na mkpa ọkụ. N’ụzọ juru m anya, a gwara m na a dịghị ese siga n’ebe ahụ. Amaara m na aghaghị m ịkwụsị ise siga. Ụbọchị asatọ nke nhụsianya m nọrọ n’ụlọ ọgwụ mere ka m kweta na achọtụdịghị m inwe ihe mgbu nke ịkwụsị ise siga ọzọ.”

Yoko: “Amụrụ m ihe banyere ya na magazin na ná mbipụta ndị ọzọ nke Ndịàmà Jehova, na-atụleghachi otú Jisọs siri jụ ọgwụ e nyere ya mgbe a na-achọ ịkpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ. Ekpegaara m Jehova Chineke ekpere, na-agwa ya na achọrọ m ịbụ onye dị ọcha na-eto aha ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, esetụghị m siga ọzọ. Mgbe ndị nọ m n’akụkụ na-ese siga, ọ na-afọdụ nke nta ka m chọọ ikuru anwụrụ ọkụ ha, ma m na-apụ ngwa ngwa, ebe m na-achọghị ka ọchịchọ m ise siga bịaghachi.”

Ndị a na-esebu siga kpebisichara ike na ha agaghị esekwa siga ọzọ. Ị̀ bụ onye na-ese siga nke chọrọ ịkwụsị àgwà a?

Mieko

Osamu

Yasuhiko

Akio na nwunye ya, bụ́ Sachiko

Junichi na nwa ya nwanyị bụ́ Meri

Yoko

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya