Nkwụ—Osisi E Ji Eme Ọtụtụ Ihe
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Solomon Islands
GUADALCANAL—nye ọtụtụ ndị, aha àgwàetiti ahụ na ụfọdụ n’ime ọgụ ndị kasị njọ nke Agha Ụwa nke Abụọ bụ otu ihe. Otú ọ dị, taa, onye ọ bụla lọghachiri n’ebe a a nọrọ lụọ agha na Solomon Islands ga-ahụ ọnọdụ dị nnọọ iche—ìgwè yiri ka ọnụ ọgụgụ ha adịghị agwụ agwụ, ọ bụghị nke ndị soja, kama nke nkwụ ndị gbara agba.
Ala nkwụ ndị a na-eme nke ọma ma gbaa agba bụbu ebe e liri ọtụtụ tọn bọmbụ na ngwá agha ndị ọzọ dị ize ndụ a na-ejighị lụọ ọgụ. Ma e wepụtawo ngwá agha ndị a ka e wee nwee ike ịdọkwu nkwụ. Olee otú e si malite ịdọ osisi a? N’ihi gịnịkwa ka anyị pụrụ iji kwuo na a na-eji osisi a mara mma, nke toro ogologo eme ọtụtụ ihe?
Akụkọ Bara Ụba
Alvise Ca’da Mosto bụ́ onye Venice nke nyochara ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ Africa bụ ya dekọrọ nkọwa mbụ nke oge a banyere osisi yiri nkwụ n’etiti narị afọ nke 15. Mgbe ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500 gara aga, ndị ohu si Africa jiri mkpụrụ ya gaa mba ndị dị ma a gafee Oké Osimiri Atlantic. N’ụzọ dị otu a, mmanụ nkwụ abụrụwo otu n’ime mmanụ nri ndị a kasị eji eme ihe n’ụwa taa. A na-enweta mmanụ ná nkwụ n’otu hekta karịa ka a na-enweta n’osisi ọ bụla ọzọ na-emepụta mmanụ. Ọzọkwa, nkwụ bụ osisi na-anọte aka nke na-amị mkpụrụ ma na-emepụta mmanụ ruo afọ 25 ma ọ bụ afọ 30.
Otu ihe dị mkpa ná mmepụta nke mmanụ nkwụ, karịsịa n’ala ụfọdụ ndị dị n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ ihe a chọpụtara ná ngwụsị afọ ndị 1970. Na mbụ a na-eche na ikuku bụ ihe bụ́ isi na-eme ka nkwụ mịa mkpụrụ. N’ihi ya, a na-asị na ọ bụ ọnọdụ ihu igwe na-adịghị mma kpatara nkwụ emeghị nke ọma. Otú ọ dị, nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya kpughere na ahụhụ bụ ihe bụ́ isi na-eme ka nkwụ mịa mkpụrụ! N’ihi ya, mwefe nke e si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa wefee ahụhụ ndị pụrụ ime ka osisi ndị ahụ mịa mkpụrụ n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bịara baa uru.
Mkpụrụ nkwụ na-acha ọbara ọbara na-enye ụdị mmanụ abụọ. A na-eji ha abụọ emepụta ihe dị iche iche, ọ pụrụ ịbụ na ị na-eji ụfọdụ n’ime ha eme ihe. Tupu anyị atụlee ha, ka anyị gaa ebe a na-asụ nkwụ ma hụ otú e si apapụta mmanụ ya.
Ịsụpụta Mmanụ Magburu Onwe Ya
Ka anyị na-erute ebe ahụ a na-asụ nkwụ, onye dugharịrị anyị kelere anyị ma kpọrọ anyị banye n’ime. Nnukwu ígwè ọrụ na-arụ ọrụ gburugburu anyị. Ihe mbụ a na-eme n’ịsụ mkpụrụ nkwụ, ka ọ na-akọwa, bụ ịwụnye ha ná nnukwu ite e ji esi ihe. Isi nkwụ nke ọ bụla nwere ihe dị ka ntakịrị mkpụrụ 200, bụ́ ndị sụrụ chịchịchị. Ite ọkụ ahụ na-eme ka mkpụrụ nkwụ ghee eghee ma nye aka mee ka ha ghara isi ike n’isi nkwụ.
Ihe ọzọ a na-eme bụ iji ígwè ọrụ a na-akpọ stripper kụpụta mkpụrụ nkwụ ndi ahụ n’isi nkwụ. A na-ebujezi mkpụrụ nkwụ ndị ahụ a kụpụtara ná nnukwu ígwè na-asụ nkwụ, bụ́ ebe a na-asụ ya ma wepụta uru ya iche site n’akị ya. A na-ejizi nnukwu ígwè na-apa nkwụ paa ya iji papụta mmanụ nkwụ. Mgbe e wepụsịrị unyi dị na ya ma sigharịa ya, mmanụ nkwụ adịla mma maka iji ụgbọ mmiri bupụ ya.
Otú ọ dị, e nwere ụdị mmanụ ọzọ. A na-enweta nke a n’akị ya. A ghaghị ibu ụzọ tie akị iji nweta mkpụrụ akị. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-apa akị ndị ahụ apa ka ha gbapụta mmanụ ha dị oké ọnụ ahịa. A na-akpọ mmanụ a elù akị.
A na-eji achaghịrị akị eme nri na-edozi anụ ụlọ ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe a kụpụtasịrị mkpụrụ nkwụ ndị dị n’isi nkwụ, a na-ebughachi nke fọrọ afọ n’ọhịa iji gbochie ahịhịa. A na-ejikwa avụvụ na nkikere akị eme ihe ọzọ, a na-eji ha akwanye ọkụ n’ite e ji esi ihe n’ebe ahụ. Ọ bụ nnọọ ọrụ dị mma!
Site na Ice Cream Ruo n’Ude Ihu
Mmanụ nkwụ bụ nke abụọ n’ime mmanụ nri ndị a kasị eji eme ihe n’ụwa, ma e wezụga mmanụ soybean. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “N’ime afọ ndị 1700, ndị England jiri mmanụ nkwụ mere ọgwụ na ude aka.” Otú ọ dị, taa a pụrụ ịhụ ya na ice cream, bọta, abụba e ji eghe ihe, na mmanụ nri, nakwa n’ihe ndị na-abụghị ihe oriri dị ka ncha na ihe ntecha.
A na-ejikwa elù akị eme bọta nakwa chocolate na ihe nracha ndị ọzọ. Ma nke ahụ abụghị nanị ihe a na-eji mmanụ ahụ eme. A na-eji ihe ndị e nwetara na mmanụ nkwụ na elù akị eme ọgwụ, ncha, kandụl, na ọbụna ihe ndị na-agbawa agbawa mgbe e sigharịsịrị ya!
N’ezie, nkwụ na-ewu ewu na Solomon Islands. Eziokwu ahụ bụ́ na pasent 13 nke ngwá ahịa mba ahụ na-ebupụ na-esite n’osisi a na-eme ka mmetụta nkwụ na-enwe n’ọnọdụ akụ̀ na ụba ya pụta ìhè.
Mgbe anyị lere anya n’elu nkwụ, ọ na-atọ ọchị ikwere na ihe e ji mkpụrụ osisi a na-acha odo odo eme pụrụ ịdị na-atapụta n’ọnụ nwatakịrị na-achị ọchị n’ụdị ice cream, na ọ pụkwara ịdị n’ihe ntecha nne ya tere n’ihu. Ee, nkwụ bụ osisi e ji eme ọtụtụ ihe, anyị pụkwara inwe obi ekele maka ọtụtụ ihe a na-enweta na ya.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]
Iji Aka Gbute Tọn Abụọ n’Otu Ụbọchị
Gbim . . . gbim. Gbim . . . gbim! Ụda isi nkwụ na-ada n’ala na-ejupụta ebe nile ka ndị ọrụ nọ n’ọhịa na-egbu nkwụ. Olee otú ha na-esi erute n’isi nkwụ mgbe osisi ya toro nnọọ ogologo?
N’iji mma dị nkọ gọrọ agọ e kegidere n’osisi dị ogologo eme ihe, ndị na-egbu nkwụ na-egbu nkwụ ndị ha na ụlọ elu dị okpukpu anọ hà n’ogologo. N’ụbọchị ihe dị mma, otu onye ga-egbute site n’isi nkwụ 80 ruo 100 ma buru ha gaa n’akụkụ ụzọ ebe a ga-eburu ha. Ebe otu isi nkwụ na-adị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilogram 25 n’arọ, nke ahụ na-akpatakwu ibulite ihe dị arọ! Ọ na-ewe tọn mkpụrụ nkwụ anọ na ọkara iji sụpụta otu tọn mmanụ nkwụ.