Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 3/8 p. 26-27
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Echiche Chineke?
  • Iwu nke Atọ
  • Ọ̀ Dị Ihe O Mere?
  • Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 3/8 p. 26-27

Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?

ERI ọtụtụ narị afọ okpukpe ndị Juu akụziwo na aha Chineke, bụ́ Jehova, dịbigara nsọ ókè nke na e kwesịghị ịkpọpụta ya.a (Abụ Ọma 83:18) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe echewo na ọ bụ enweghị nkwanye ùgwù bụ́ ịkpọ Onye Okike dị ebube aha a ma ama otú ahụ ma ọ bụ ọbụna na ọ bụ ịda iwu nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ, bụ́ nke machibidoro ‘iji aha Onyenwe anyị eme ihe efu.’ (Ọpụpụ 20:7, King James Version) Na narị afọ nke atọ O.A., Mishnah kwuru na “onye kpọpụtara Aha Chineke otú ahụ e si asụpe ya” ‘enweghị òkè n’ụwa nke na-abịanụ.’—Sanhedrin 10:1.

Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ndị ọkà mmụta nọ na Krisendọm na-agbaso ụkpụrụ ọdịnala nke a nke ndị Juu mgbe ha na-asụgharị Bible. Dị ka ihe atụ, The New Oxford Annotated Bible na-ekwu n’okwu mbido ya, sị: “Ojiji e ji aha aka ọ bụla mee ihe maka onye nanị ya bụ́ Chineke, dị ka a ga-asị na ọ dị chi ndị ọzọ a na-aghaghị ime ka ezi Chineke ahụ dị iche n’ebe ha nọ, bụ nke a malitere ịkwụsị n’okpukpe ndị Juu tupu oge ndị Kraịst, o kwesịghịkwa ekwesị maka okwukwe zuru ụwa dum nke Chọọchị ndị Kraịst.” N’ihi ya, e ji okwu bụ́ “ONYENWE ANYỊ” dochie aha Chineke ná nsụgharị ahụ.

Gịnị Bụ Echiche Chineke?

Ma echiche nke ndị nsụgharị na ndị ọkà mmụta okpukpe dị otú ahụ hà kwekọrọ n’echiche Chineke? E kwuwerị, Chineke ahọrọghị izochiri ihe a kpọrọ mmadụ aha ya; kama, o kpugheere ha ya. Aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara ihe karịrị ugboro 6,800 n’akụkụ Bible nke e ji Hibru dee, bụ́ nke a na-akpọkarị Agba Ochie. Ihe ndekọ Bible na-egosi na nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, so n’ime ndị maara ma jiri aha Chineke mee ihe. Mgbe ọ mụrụ nwa mbụ ya, Iv kwuru, sị: “Enwetawo m nwoke site n’inyeaka Jehova.”—Jenesis 4:1.

Ọtụtụ narị afọ n’ihu, mgbe Chineke kpọrọ Mosis ka o dupụta mba Israel n’ohu n’Ijipt, Mosis jụrụ Chineke, sị: “Mgbe mụ onwe m na-abịakwute ụmụ Israel, sị ha, Chineke nke nna unu hà ezitewo m n’ebe unu nọ; mgbe ha ga-asịkwa m, Gịnị bụ aha Ya? ọ̀ bụ gịnị ka m ga-asị ha?” Mosis pụrụ nnọọ icheworị ma Chineke ọ̀ ga-eji aha ọhụrụ kpughee onwe ya. Chineke gwara Mosis, sị: “Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, O zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” (Ọpụpụ 3:13, 15) O doro anya na ezi Chineke ahụ echeghị na aha ya dịbigara nsọ ókè nke na ndị ya ekwesịghị ịkpọpụta ya.

N’eziokwu, ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nke ọgbọ nile ejiriwo nnwere onwe na nkwanye ùgwù kpọpụta aha Chineke. Boaz, bụ́ ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ji okwu bụ́, “Jehova nọnyere unu,” ekele ndị ọrụ ya nọ n’ubi mgbe nile. Ndị ọrụ ahụ hà kụjara mgbe e si otú ahụ kelee ha? Ee e, ihe ndekọ ahụ na-akọ, sị: “Ha wee sị ya, Jehova gọzie gị.” (Rut 2:4) Kama ile ekele a anya dị ka ịkparị Chineke, ha lere ya anya dị ka ụzọ isi enye ya otuto na nsọpụrụ n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. N’otu mmụọ a, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.”—Matiu 6:9.

Iwu nke Atọ

Ma gịnị banyere mmachibido iwu ahụ e kwuru okwu ya n’iwu nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ? Ọpụpụ 20:7 na-ekwusi ike, sị: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghị agụ onye na-eburu aha Ya ime ihe efu n’onye ikpe na-amaghị.”

Gịnị ka iji aha Chineke ‘eme ihe efu’ pụtara kpọmkwem? Akwụkwọ bụ́ The JPS Torah Commentary, nke Òtù Ndị Juu Na-ebipụta Akwụkwọ bipụtara, na-akọwa na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị n’elu ịbụ “ime ihe efu” (lash·shaw’ʹ) pụrụ ịpụta “n’ụzọ ụgha” ma ọ bụ “ime ihe na-abụghị ihe.” Otu akwụkwọ ntụaka ahụ gara n’ihu, na-asị: “Mgbagwoju anya [nke okwu Hibru a] na-eme ka e gbochie ndị na-ese okwu ịṅụ iyi ụgha n’ụlọikpe, na iji Aha Chineke eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ eme ihe egwuregwu.”

Nkọwa a nke ndị Juu na-emesi ya ike n’ụzọ ziri ezi na ‘iji aha Chineke eme ihe efu’ na-agụnye iji aha ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ma à pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ịkpọpụta aha Chineke mgbe a na-akụziri ndị ọzọ banyere ya ma ọ bụ mgbe a na-agakwuru Nna anyị nke eluigwe n’ekpere bụ ‘ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ihe egwuregwu’? Jehova na-ekwupụta echiche ya n’okwu nke Abụ Ọma 91:14: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, m ga-emekwa ka ọ gbapụta: M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.”

Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Nsụgharị Bekee nke oge a a na-akpọ The Five Books of Moses, nke Everett Fox sụgharịrị, hapụrụ ihe a na-emekarị. Nsụgharị a ejighị “ONYENWE ANYỊ” a na-ejikarị eme ihe gosi aha Chineke, kama o ji “YHWH” gosi ya, “n’ihi ọchịchọ nke igosi otú onye na-agụ ya na Hibru ga-esi gụọ ya.” Fox mesiri ya ike, sị: “Onye ga-agụ ya ga-achọpụta ozugbo na aha aka Chineke nke Bible pụtara dị ka ‘YHWH’ ná mpịakọta a.” Ọ na-ekweta na ịhụ aha Chineke pụrụ “imetụta” onye na-agụ ya. Ma mgbe o mesịrị ihe ahụ kwesịrị ịja mma nke ezochighị aha Chineke ná nsụgharị, ọ na-agbakwụnye, sị: “M ga-atụ aro ka a na-eji ‘ONYENWE ANYỊ’ eme ihe n’ịgụpụta ihe, ma ndị ọzọ pụrụ ịchọ ịgbaso omenala nke ha.” Otú ọ dị, ọ̀ bụ nanị okwu aka mmadụ, ọdịnala, ma ọ bụ ịgbaso omenala mmadụ?

Ee e. Ọ bụghị nanị na Bible na-agba ume ka a na-eji aha Chineke eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị kama o nyere ya n’iwu! N’Aịsaịa 12:4a, e gosiri ndị Chineke dị ka ndị na-eti mkpu n’ụzọ doro anya, sị: “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọzọkwa, ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ndị kwesịrị inweta amamikpe Chineke, sị: “Wụkwasị mba nile ọnụma Gị, bụ́ ndị na-amaghị Gị, wụkwasịkwa alaeze nile nke na-akpọkughị aha Gị.”—Abụ Ọma 79:6, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; leekwa Ilu 18:10; Zefanaịa 3:9.

Ya mere, ọ bụ ezie na ụfọdụ na-ezere ịkpọpụta aha dị ebube nke Jehova n’ihi ịghọtahie iwu nke atọ, ndị hụrụ Chineke n’anya n’ezie na-achọ ịkpọku aha ya. Ee, n’ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị, ha ‘na-eme ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, na-ehota na e mewo ka aha Ya dị elu’!—Aịsaịa 12:4b.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’akụkụ Bible nke e ji Hibru dee (Agba Ochie), e ji mkpụrụ akwụkwọ anọ ndị a pụrụ idegharị n’asụsụ ọzọ dị ka YHWH na-egosi aha Chineke. Ọ bụ ezie na a maghị kpọmkwem otú e si akpọpụta aha Chineke, a na-akpọkarị ya “Jehova” n’asụsụ Igbo.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Otu akụkụ nke akwụkwọ Abụ Ọma sitere n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Aha Chineke, bụ́ Jehova (YHWH), pụtara n’ụdị mkpụrụ akwụkwọ Hibru ka ochie karịa akụkụ ndị ọzọ nke akwụkwọ mpịakọta ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ike nke Shrine of the Book, Israel Museum, Jerusalem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya