Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere na Mụ Apụghị Inweta Ihe Ndị M Chọrọ?
“E nwere ụfọdụ ihe ndị dị mma n’ezie, ọ ga-amasịkwa m inwe ha; ma ndị mụrụ m apụghị ịzụta ha.”—Mike.
È NWERE ihe ndị ị chọrọ n’ezie ma ị pụghị inweta ha? Ikekwe ị chọsiwo ike inweta ngwá egwú stereo ọhụrụ ahụ, akpụkpọ ụkwụ ndị ahụ ụmụaka ndị ọzọ nile na-eyi, ma ọ bụ nanị ákwà jeans ọhụrụ bu akara onye kwara ya. Ụfọdụ n’ime ndị ọgbọ gị nwere—ma jiri mpako na-egosi—ihe ndị dị otú ahụ. Ya mere ọ bụrụ na a gwawo gị na ndị mụrụ gị apụghị ịzụta ha, ọ pụrụ ịbụrụ gị ndakpọ olileanya.
Ma ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịchọ inweta ihe onwunwe ụfọdụ, nye ọtụtụ ndị ntorobịa ọchịchọ inwe ha na-afọdụ nke nta ka ọ bụrụ ara ọgbụgba. Ihe dị ukwuu n’ime nke a yiri ka ọ bụ ihe si n’echiche gbagọrọ agbagọ nke usoro mgbasa ozi apụta. Mkpọsa ngwá ahịa ndị na-adọrọ mmasị a na-eme na TV, magazin, na nke redio na-egosi na ọ gwụla ma ị na-eyi uwe ụfọdụ ma ọ bụ na-eji ngwá ahịa ndị nwere aha ụfọdụ eme ihe, i soghị biri. Leenụ, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-emefu ihe karịrị 100 ijeri dollar n’otu afọ na United States nanị!
Mgbe ahụ e nwere nrụgide na-esite n’aka ndị ọgbọ. “N’etiti ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị nwere obi ọjọọ,” ka otu isiokwu dị na magazin Marketing Tools na-ekwu, “ọha na eze nke i nwere ọchịchọ n’ebe ha nọ iche na i soghị biri abụghị nanị okwu banyere erughị ihe a chọrọ, ma ọ bụ ọbụna ịbụ onye a jụrụ ajụ: ọ bụ ihe e ji amata Onye Dara Ada.” Gịnị bụ isi ihe e ji amata ‘onye so biri’? N’ọtụtụ òtù ọ bụ inwe ihe onwunwe ndị kasị mma na ndị kasị ọhụrụ. Gịnịkwa ma ọ bụrụ na ị pụghị ịzụta ha? “N’ezie, o siri ike,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst na-ekweta. “I yi uwe na-adịghị ewu ewu na-aga ụlọ akwụkwọ, onye ọ bụla ana-eme gị akaje.” Onye ntorobịa ọzọ na-ekweta, sị: “Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka a jụrụ m ajụ.”
Ndị ntorobịa bi n’ala ndị na-emepe emepe, bụ́ ebe ndị mmadụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ awa iji nweta nnọọ nanị ihe ndị dị mkpa ná ndụ, pụrụ inweta nrụgide yiri nke ahụ. Ọ bụrụ na nke a dị otú ahụ n’ezinụlọ gị, dị ka ọ na-adịkarị ị pụrụ inwe agụụ maka ụzọ ndụ nke ka mma. N’ịbụ onye kiriworo ihe ngosi TV na sinima si n’ala ndị bara ọgaranya karị, ọ pụkwara ịbụ na ị malitewo inwe agụụ maka uwe, ụlọ, na obere ụgbọala ndị dị oké ọnụ ahịa a na-akwalite n’ihe ngosi na ihe nkiri ndị ahụ. Ị pụrụ iwe iwe ma ọ bụ daa mbà n’obi n’ihi na ihe ndị dị otú ahụ pụrụ iyi ihe ndị a na-apụghị nnọọ inweta.
Ma ì bi n’ala dara ogbenye ma ọ bụ na nke bara ọgaranya, iwe iwe ma ọ bụ inwe nkụda mmụọ n’ihi na ị pụghị inweta ihe ụfọdụ pụrụ nanị imerụ gị ahụ. Ọ pụkwara iduga n’isesa ndị mụrụ gị okwu mgbe nile. Ajụjụ bụ, Olee otú ị pụrụ isi nagide ya?
Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Onwunwe
Nke mbụ, ghọta na ọ bụghị ọchịchọ Jehova Chineke ka ndị ya daa ogbenye ma ọ bụ ghara inweta ihe ndị dị ha mkpa n’ezie. E kwuwerị, ọ bụghị n’ebe mkpofu ahịhịa ka Chineke tinyere Adam na Iv, kama n’ogige mara mma jupụtara n’osisi ndị a na-achọsi ike n’ile anya. (Jenesis 2:9) Ka e mesịrị, ụfọdụ ndị ohu Chineke, dị ka Abraham, Job, na Solomọn, nwere ọtụtụ ihe onwunwe. (Jenesis 13:2; Job 1:3) Ọbụna Solomọn nwere ọlaedo buru nnọọ ibu nke na a gụghị ọlaọcha “n’ihe ọ bụla” n’oge ọ na-achị!—1 Ndị Eze 10:21, 23.
Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Chineke n’ozuzu ha abụwo ndị na-abachaghị ọgaranya. Jisọs Kraịst n’onwe ya dara ogbenye; o nweghịdị “ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Matiu 8:20) Otú ọ dị, ị gụtụbeghị banyere Jisọs ka ọ na-eme mkpesa na ya apụghị ịzụta ihe ndị ọ chọrọ. Kama nke ahụ, ọ kụziri, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.
Nke a apụtaghị na Chineke aghaghị igbo agụụ na-agụ mmadụ maka uwe na-ewu ewu ma ọ bụ ngwá electronic. Chineke na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị—ọ bụchaghị ihe ndị anyị chọrọ. Ọ bụ ya mere Bible ji na-agba anyị ume inwe afọ ojuju nanị ‘n’ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ.’ (1 Timoti 6:8) Ma ka anyị kwuo eziokwu, inwe afọ ojuju adịghị mfe. “Ị ga na-alụ ọgụ mgbe nile iji mata ihe ndị ị chọrọ na ihe ndị dị gị mkpa,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Mike na-ekweta. E wezụga ịchọ ọdịmma onwe anyị, anyị aghaghị ịlụso mmetụta nke onye iro bụ́ isi nke Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, ọgụ. (1 Jọn 5:19) Otu n’ime aghụghọ ya ndị kasị ochie bụkwa ime ka ndị mmadụ chee na ihe na-akwa ha. E si otú a ghọgbuo Iv iche na o nwere ihe a napụrụ ya—ọ bụ ezie na o bi na paradaịs zuru okè!—Jenesis 3:2-6.
Olee otú ị pụrụ isi zere ịdaba n’ọnọdụ ọjọọ nke enweghị afọ ojuju? Ọ pụrụ ịda ka okwu nkịtị a na-ekwukarị, ma e nwere ọtụtụ ihe mere ị ga-eji gụkọọ ngọzi gị. Echekasịla onwe gị n’ụzọ na-ezighị ezi banyere ihe ị na-enweghị. Na-eche echiche n’ụzọ ziri ezi, na-echetakwara onwe gị ihe i nwere. (Tụlee Ndị Filipaị 4:8.) Mike na-ekwu ya otú a, sị: “E nwere ọtụtụ ihe ndị m chọrọ n’ezie, ma adịghị m echekarị echiche banyere ha.”
Ọ na-enyekwa aka inwe obi abụọ banyere mkpọsa ngwá ahịa aghụghọ ndị a na-eji enweta mmetụta uche gị.a (Ilu 14:15) Tupu i kwubie ngwa ngwa na ma i nwetaghị akpụkpọ ụkwụ kanvas ọhụrụ ahụ ma ọ bụ ngwá egwú compact disc ahụ, ị “nwụọ,” gbalịa jiri nwayọọ tụlee ihe. Jụọ onwe gị: ‘Ihe a ọ̀ dị m mkpa n’ezie? Ọ̀ bara ezi uru? Ihe m nwewororịị ò zuuru m?’ Nọrọ na nche karịsịa maka mkpọsa ngwá ahịa ndị na-akwalite ùgwù nke inwe ihe. Okwu Jọn onyeozi dị na 1 Jọn 2:16 na-akpali iche echiche: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.”
Mgbe Ihe Dị Gị Mkpa n’Ezie
Gịnị ma ọ bụrụ na o nwere ezi ihe dị gị mkpa? Buru ụzọ tụlee ya tupu ị gwa ndị mụrụ gị banyere ya. Dịrị njikere ịkọwa kpọmkwem ihe mere ihe a ji dị gị mkpa, otú i si mee atụmatụ iji ya mee ihe, na ihe mere i ji chee na ọ ga-abara gị uru. Ma eleghị anya ndị mụrụ gị ga-achọta ụzọ ha ga-esi gụnye ya n’atụmatụ mmefu ego ezinụlọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ha enweghị ike ya, ma ọ dịghị ihe ọzọ ugbu a? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị ihe dị ukwuu ị pụrụ ime karịa inwe ndidi. (Eklisiastis 7:8) Oge a bụ “oge dị oké egwu,” ọtụtụ ndị nne na nna apụghịkwa nnọọ ịzụta ihe nile ụmụ ha pụrụ ịrịọ. (2 Timoti 3:1) Ọ bụrụ na i zere ịchọ ihe ndị ezi uche na-adịghị na ha n’aka ndị mụrụ gị, ị pụrụ n’ezie ime ka ọrụ ha siri ike katụ mfe.
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ị pụrụ ime ihe n’onwe gị. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-enweta ego mmachi akpa? Mgbe ahụ gbalịa ịmụta otú ị ga-esi jiri nlezianya mee atụmatụ mmefu ego gị ka i wee nwee ike ichekwa ụfọdụ n’ime ya kwa ọnwa. Ọbụna ọ pụrụ ikwe gị mee ịmalite itinye ego n’ụlọ akụ̀ dị gị nso. (Tụlee Luk 19:23.) Nke ahụ bụ ihe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Abigail mere. Ọ na-ekwu, sị: “M na-edokọ ego m ebe abụọ—otu bụ maka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ m, nke ọzọ bụkwa maka iji zụrụ ihe.” Ọ bụrụ na i toruola, ị pụrụ ọbụna ịgbalị ịrụ ọrụ mgbe ụfọdụ ma ọ bụ ịrụ ọrụ nwa oge.b Ka o sina dị, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ahụ na ị chọrọ ịzụ ihe n’ezie nakwa na ị na-eme ike gị nile ichekwa ego, a pụrụ ịkpali ha isoro gị kwụọ ụgwọ ya, ma ọ bụrụ na nke ahụ pụrụ nnọọ ikwe mee.
Ime mgbanwe ụfọdụ n’otú i si azụ ihe pụkwara ịbara gị uru. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ịzụ dị oké ọnụ, ọ pụrụ ikwe mee ikwe ya ọnụ dị ala. Ọ bụrụ na ọ dabaghị, chere ma hụ ma à ga-ere ya ọnụ ala. Gaa n’ụlọ ahịa ndị ọzọ iji hụ ma ị ga-ahụ otu ihe ahụ nke dị ọnụ ala. Mụta iji nlezianya na-enyocha ma ihe ị chọrọ ịzụ ọ̀ dị mma; mgbe ụfọdụ a na-azụta ihe ndị nwekọtara otu aha n’ọnụ ala.c
Mụta Inwe Afọ Ojuju
Ilu 27:20 na-adọ aka ná ntị, sị: “Afọ adịghị eju [Sheol, NW] na ebe ịla n’iyi; otú a afọ adịghị eju anya abụọ nke mmadụ.” Ee, dị ka afọ na-adịghị eju ili, ụfọdụ ndị na-achọkwu ihe mgbe nile—n’agbanyeghị ókè ihe ha nweworo ha. Zere ụdị echiche ịchọ ọdịmma onwe onye ahụ. Ka oge na-aga, ọ dịghị ihe ọzọ anyaukwu na-ewetara mmadụ ma ọ bụghị nkụda mmụọ na enweghị obi ụtọ. Otu onye ntorobịa aha ya bụ́ Jonathan, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na obi ụtọ gị na-adabere mgbe nile n’inwe ihe, ọ dịghị mgbe ị ga-enwe obi ụtọ. A ga na-enwe ihe ọhụrụ ị ga-achọ mgbe nile. Ọ dị gị mkpa ịmụta inwe obi ụtọ n’ihe i nwere.”
Ọ bụrụ na i nwere afọ ojuju, ị pụrụ ịnagide nrụgide na-esite n’aka ndị ọgbọ. Vincent na-eto eto na-ekwu, sị: “Nanị n’ihi na ahụrụ m onye yi akpụkpọ ụkwụ kanvas na-ewu ewu apụtaghị na aghaghị m ịga zụrụ nke m.” Otú ọ dị, site n’oge ruo n’oge, ọ ka pụrụ inye gị nsogbu mgbe ị na-apụghị inweta ihe ị chọrọ. Ma ya adịla mgbe ị ga-echezọ na Jehova maara mkpa gị. (Matiu 6:32) N’ọdịnihu dị nnọọ nso, ọ ‘ga-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee usoro isiokwu banyere “Mkpọsa Ngwá Ahịa,” pụtara ná mbipụta September 8, 1998, nke Teta!
b Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Kpatatụ Ego?,” pụtara ná mbipụta anyị nke September 8, 1998.
c Iji nwetakwuo aro ndị na-enye aka, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Nwekwuo Uwe Ndị Ka Mma?,” pụtara ná mbipụta anyị nke February 8, 1995.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]
“I yi uwe na-adịghị ewu ewu na-aga ụlọ akwụkwọ, onye ọ bụla ana-eme gị akaje”
[Foto dị na peeji nke 26]
Ị pụrụ inwe obi ụtọ n’enweghị ihe nile ị chọrọ