‘Ụmụaka ahụ Adịghị Ike’
‘Ụmụ m adịghị ike, ka m na-edu ha nwayọọ nwayọọ, dị ka ijeụkwụ nke ụmụ m si dị.’—Jekọb, nna mụrụ ọtụtụ ụmụ, narị afọ nke 18 T.O.A.
IMEGBU ụmụaka abụghị ihe ọhụrụ. A ma ndị oge ochie ama—dị ka ndị Aztec, ndị Kenean, ndị Inca, na ndị Finisia—maka omume nke iji ụmụaka achụ àjà. Ihe ndị e gwupụtara n’obodo Finisia bụ́ Carthage (nke bụ́ ugbu a ebe mpụga Tunis, Ebe Ugwu Africa) gosiri na n’agbata narị afọ nke ise na nke atọ T.O.A., a chụụrụ chi Beal na chi nwanyị bụ́ Tanit ihe ruru ụmụaka 20,000 n’àjà! Ọnụ ọgụgụ a na-awụ akpata oyi n’ahụ karị mgbe mmadụ chetara na mgbe Carthage nọ n’uju ya, e kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ime ya dị nanị ihe dị ka 250,000.
Otú ọ dị, e nwere otu ndị n’oge ochie ndị dị iche. N’agbanyeghị na ha bi n’etiti ndị agbata obi na-emeso ụmụaka n’ụzọ obi ọjọọ, mba Israel pụrụ iche n’otú o si emeso ụmụaka. Nna mụrụ mba ahụ, bụ́ nna ochie bụ́ Jekọb, setipụụrụ ha ihe nlereanya. Dị ka akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis si kwuo, mgbe ọ na-alaghachi ala nna ya, Jekọb gbanwere ijeụkwụ nke ndị nile so ya na-eme njem ka ọ ghara isiri ụmụaka ike gabiga ókè. “Ụmụ m adịghị ike,” ka o kwuru. N’oge ahụ ụmụ ya nọ n’agbata afọ 5 na afọ 14. (Jenesis 33:13, 14) Ụmụ ya, bụ́ ndị Israel, gosipụtara otu ụdị nkwanye ùgwù ahụ maka mkpa na ùgwù ụmụaka.
N’ezie, ụmụaka nọ n’oge Bible nwere ọtụtụ ihe ha ga-eme. Ka ha na-eto, ndị nna na-enye ụmụ ha ndị nwoke ọzụzụ bara uru n’ịkọ ugbo ma ọ bụ n’otu aka ọrụ, dị ka ịkwa nkà. (Jenesis 37:2; 1 Samuel 16:11) Mgbe ha nọ n’ụlọ, ndị nne na-akụziri ụmụaka ndị nwanyị ọrụ ụlọ ndị ga-abara ha uru mgbe ha mere okenye. Rechel, bụ́ nwunye Jekọb, na-azụ atụrụ mgbe ọ bụ nwa agbọghọ. (Jenesis 29:6-9) Ụmụ agbọghọ rụrụ ọrụ n’ubi n’oge iwe ọkà n’ubi na n’ubi vine. (Rut 2:5-9; Abụ nke Abụ 1:6)a A na-arụkarị ụdị ọrụ ahụ n’okpuru nlekọta ịhụnanya nke nne na nna, a na-ejikọtakwa ya na inye ọzụzụ.
N’otu oge ahụ, ụmụaka nọ n’Israel nwetara ọṅụ site ná ntụrụndụ na ihe ntụsara ahụ. Onye amụma bụ́ Zekaraịa kwuru banyere ‘ámá nile nke obodo ahụ ijupụta n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom na-egwuri egwu.’ (Zekaraịa 8:5) Jisọs Kraịst kwukwara banyere ụmụaka nọ n’ọmà ahịa bụ́ ndị gburu ọjà, teekwa egwú. (Matiu 11:16, 17) Gịnị kpatara ụdị mmeso ahụ e mesoro ụmụaka n’ụzọ ùgwù dị na ya?
Ụkpụrụ Ndị Dị Elu
Ruo ogologo oge nile ndị Israel debere iwu Chineke, ha emetọghị ma ọ bụ jiri ụmụ ha chọọ uru. (Jiri Deuterọnọmi 18:10 tụnyere Jeremaịa 7:31.) Ha weere ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom dị ka “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa,” “ụgwọ ọrụ.” (Abụ Ọma 127:3-5) Onye mụrụ nwa weere ụmụ ya dị ka ‘ome osisi olive gburugburu tebụl ya’—osisi olive dịkwa oké ọnụ ahịa n’ọha mmadụ ahụ bụ́ ndị ọrụ ugbo! (Abụ Ọma 128:3-6) Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alfred Edersheim na-ekwu na e wezụga okwu na-ezo aka na nwa nwoke na nwa nwanyị, Hibru oge ochie nwere okwu itoolu maka ụmụaka, nke ọ bụla maka oge dị iche ná ndụ. Ọ na-ekwubi, sị: “N’ụzọ e ji n’aka, ndị ji nlezianya otú a leruo anya ná ndụ nwatakịrị iji nye aha na-enye echiche nke oge ọ bụla na-esochi n’ịdị adị ya, aghaghị ịbụworị ndị ha na ụmụ ha nwere njikọ ịhụnanya.”
N’oge ndị Kraịst, a dụrụ ndị nne na nna ọdụ ka ha jiri nkwanye ùgwù na nsọpụrụ na-emeso ụmụ ha. Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’imeso ụmụ ndị ọzọ ihe. N’otu oge ka ozi elu ala ya na-abịa ná ngwụsị ya, ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụ ha. Dị ka ihe àmà gosiri, n’ikweta na Jisọs ji ọrụ n’aka gabiga ókè nke na ọ chọghị ka e nye ya nsogbu, ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ndị ahụ. Ma Jisọs baara ndị na-eso ụzọ ya mba: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu egbochila ha.” Jisọs ọbụna “[kuuru] ha n’aka Ya.” Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na o weere ụmụaka dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa na ndị kwesịrị ka e mesoo ha ihe n’obiọma.—Mak 10:14, 16; Luk 18:15-17.
Ka oge na-aga, Pọl onyeozi gwara ndị bụ́ nna, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) N’ikwekọ n’iwu a, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst, n’oge ahụ na taa, agaghị ekwe ma ọlị ka ụmụ ha bụrụ ndị na-arụ ọrụ n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Ha maara na ka ụmụaka wee nwee ike ime nke ọma n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị mkpa ka e nwee ebe ịhụnanya, nchebara echiche, na nchebe dị. Ezi ịhụnanya nke ndị nne na nna kwesịrị ịpụta ìhè. Nke a ga-agụnye ichebe ụmụ ha pụọ n’ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha.
Ihe Ndị Na-eme Eme n’Oge A
N’ezie, anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1-5) N’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba dị njọ, n’ọtụtụ mba ọbụna ezinụlọ dị iche iche bụ́ nke ndị Kraịst pụrụ ịhụ na ọ dị mkpa ikwe ka ụmụ ha na-arụ ọrụ. Dị ka e kwuwororịị, ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịrụ ọrụ dị mma na nke na-ezi ụmụaka ihe. Ụdị ọrụ ahụ pụrụ ịkwalite uto anụ ahụ, nke uche, nke ime mmụọ, nke omume, ma ọ bụ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’egbochighị agụmakwụkwọ dị mkpa, ntụrụndụ ziri ezi, na ezumike dị ha mkpa.
N’enweghị obi abụọ ọ bụla, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst chọrọ ka ụmụ ha na-arụ ọrụ n’okpuru nlekọta ịhụnanya ha, ọ bụghị dị ka ndị fọrọ nke nta ka ha bụrụ ndị ohu nke ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ bụ́ ndị nwere obi ọjọọ, ndị na-enweghị ọmịiko, ma ọ bụ na-enweghị ụkpụrụ. Ndị nne na nna dị otú ahụ kwesịrị ijide n’aka na ụdị ọrụ ọ bụla ụmụ ha na-arụ agaghị ekpughe ha nye iti ihe, mmetọ n’ụzọ mmekọahụ, ma ọ bụ n’ụzọ mmetụta uche. Ọzọkwa, ha kwesịrị ime ka ụmụ ha nọrọ ha nso. N’ụzọ dị otú a ha pụrụ ịrụzu ọrụ ha dabeere na Bible nke ịbụ ndị ozizi n’ụzọ ime mmụọ: “Ị ga-ejisikwa ike izi [ụmụ gị okwu Chineke], ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:6, 7.
Ọzọkwa, a gwara onye Kraịst ka ọ na-egosi mmetụta maka ndị ọzọ, ka ọ na-ahụ n’anya, ma nwee ọmịiko. (1 Pita 3:8) A na-agba ya ume ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Ndị Galetia 6:10) Ọ bụrụ na a ga-egosi mmadụ nile àgwà ndị a nke Chineke, lee otú mmadụ kwesịrị isi gosi ya ụmụ ya karị! N’ikwekọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ—“ihe nile . . . unu na-achọ ka mmadụ [na-emere] unu, [na-emekwaranụ] mmadụ otú a”—ọ dịghị mgbe ndị Kraịst ga-eji ụmụ ndị ọzọ, ma hà bụ ndị Kraịst ibe ha ma ọ bụ na ha abụghị, chọọ uru. (Matiu 7:12) Tụkwasị na nke a, ebe ndị Kraịst bụ ụmụ amaala na-erube isi n’iwu, ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara imebi iwu gọọmenti mgbe a bịara n’afọ ndụ iwu kwuru maka ndị na-arụrụ ha ọrụ.—Ndị Rom 13:1.
Ihe Bụ Ngwọta Ya n’Ezie
Gịnị ga-eme n’ọdịnihu? Ihe ga-adịrị ma ụmụaka ma ndị okenye mma karị n’ọdịnihu. Ezi ndị Kraịst nwere obi ike na ihe ga-agwọta iji ụmụaka akpa ego kpam kpam bụ gọọmenti na-abịanụ ga-achị ụwa nke Bible kpọrọ “alaeze eluigwe.” (Matiu 3:2) Ndị na-atụ egwu Chineke ekpewo ekpere maka nke a ruo ọtụtụ narị afọ mgbe ha na-ekpe, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.
Gụnyere ihe ndị ọzọ, Alaeze a ga-ewepụ ọnọdụ ndị na-akpata iji ụmụaka akpa ego. Ọ ga-ekpochapụ ịda ogbenye. “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.” (Abụ Ọma 67:6) Alaeze Chineke ga-ahụ na mmadụ nile nwetara ọzụzụ kwesịrị ekwesị nke dabeere n’àgwà Chineke. “Mgbe ikpe [Chineke] nile na-adakwasị ụwa, ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.”—Aịsaịa 26:9.
Ọchịchị Chineke ga-ekpochapụ usoro akụ̀ na ụba ndị na-akwalite ahaghị nhata. Ịkpa ókè n’ihi agbụrụ, ọkwá, afọ ndụ, ma ọ bụ ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị agaghị adị mgbe ahụ, ebe iwu ga-adị irè nke ọchịchị ahụ ga-abụ iwu nke ịhụnanya, gụnyere iwu bụ́: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Mgbe ọchịchị ezi omume dị otú ahụ ga na-achị ụwa, a ga-ekpochapụ nsogbu nke iji ụmụaka akpa ego kpam kpam!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke a emeghị ka ụmụ nwanyị bụrụ ndị na-adịchaghị mkpa n’ezinụlọ, ndị ihe ha dị mma ya bụ nanị ịrụ ọrụ n’ụlọ ma ọ bụ n’ubi. Nkọwa nke “nwanyị nke na-ejide onwe ya” dị n’Ilu na-ekpughe na nwanyị a lụrụ alụ abụghị nanị na ọ pụrụ ilekọta ụlọ kamakwa ọ na-ahụ maka ịzụ ala, kọọ ugbo na-emepụta ihe, ma na-elekọta obere azụmahịa.—Ilu 31:10, 16, 18, 24.
[Igbe dị na peeji nke 12]
Otu Nwanyị Ahapụ Ụmụ Agbọghọ Ya Ka Ha Laa
RUO afọ 15, Ceciliab nwere ọtụtụ ụlọ ndị akwụna n’otu àgwàetiti nke Caribbean. N’otu oge ọ zụtara ụmụ agbọghọ 12 ruo 15, ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-erubeghị afọ 18. E ji ụmụ agbọghọ ahụ eji n’ụzọ na-abụghị ọchịchọ ha n’ihi ụgwọ ezinụlọ ha kotere. Cecilia kwụchapụrụ ụgwọ ahụ ma kpọrọ ụmụ agbọghọ ahụ ka ha rụwara ya ọrụ. Site n’ego ha na-enweta, ọ na-akwụ ụgwọ ihe oriri na nke nlekọta ha ma na-edebe ụfọdụ maka ego ahụ o ji zụta ha na mbụ. Ọ na-ewe ọtụtụ afọ tupu ha enwereghachi onwe ha. A dịghị ekwe ka ụmụ agbọghọ ahụ si n’ụlọ pụọ ọ gwụla ma onye nche o so ha.
Cecilia na-echeta otu ihe merenụ nke ọma. Nne otu nwa agbọghọ na-agba akwụna na-abịa kwa izu ịnara igbe ihe oriri—ihe oriri ndị e nwetara site ‘n’ọrụ’ nwa ya nwanyị. Nwa agbọghọ ahụ na-azụ otu nwa nwoke. Ọ pụghị ịkwụcha ụgwọ o ji, o nweghịkwa olileanya nke ibi ndụ nke inwere onwe ya. Otu ụbọchị o gburu onwe ya, ma dee akwụkwọ nke kwuru ka nne ya ukwu lekọta nwa ya nwoke. Cecilia zụlitere nwa okoro ahụ tinyere ụmụ ya anọ.
Otu n’ime ụmụ Cecilia ndị nwanyị malitere iso ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. A gbara Cecilia ume isonye n’ọmụmụ ihe ahụ, ọ jụrụ na mbụ n’ihi na ọ maghị ka e si agụ ma ọ bụ na-ede. Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ, site n’ịnụpere nkwurịta okwu ndị sitere na Bible, ọ bịara ghọta ịhụnanya na ndidi Chineke ma nwee mmasị ná mgbaghara ya. (Aịsaịa 43:25) N’ihi ọchịchọ o nwere ịmụ Bible n’onwe ya, n’oge na-adịghị anya ọ malitere ịmụ ka e si agụ ma na-ede. Ka ọ na-enwekwu ihe ọmụma Bible, ọ hụrụ mkpa ọ dị ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ omume dị elu nke Chineke.
Otu ụbọchị, n’ụzọ juru ụmụ agbọghọ ahụ anya, ọ gwara ha na nweere onwe ha ịla! Ọ kọwara na ihe ha na-eme adịghị Jehova ụtọ ma ọlị. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha kwụchara ụgwọ ha ji ya. Otú ọ dị, abụọ sooro ya biri. Ọzọ mesịrị ghọọ Onyeàmà e mere baptism. Cecilia abụrụwo onye nkụzi Bible oge nile ruo afọ 11 ugbu a, na-enyere ndị ọzọ aka inwere onwe ha pụọ n’omume ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
b Ọ bụghị ezigbo aha ya.