N’ọsụsọ Ụmụaka
“A na-emeso ụmụaka, bụ́ ndị na-ekere òkè ugbu a n’usoro mmepụta ihe, dị ka ngwá ahịa ndị e ji akpa ego kama imeso ha dị ka ndị ga-abụ ọha na eze nke ọdịnihu.”—Chira Hongladarom, onye ntụzi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Iji Nkà Ụmụ Mmadụ Eme Ihe, Thailand.
MGBE ọzọ ị ga-azụrụ nwa gị nwanyị nwa bebi, cheta na o nwere ike ịbụ obere ụmụaka nọ n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia mepụtara ya. Mgbe ọzọ nwa gị nwoke gbara bọl, tụgharịa uche n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ pụrụ ịbụ nwatakịrị nwanyị dị afọ atọ dụkọtara ya, bụ́ onye ya na nne ya na ụmụnne ya ndị nwanyị anọ na-enweta cent 75 kwa ụbọchị. Mgbe ọzọ ị ga-azụ kapet, chee echiche na ọ pụrụ ịbụ ụmụ okoro dị afọ isii aka na-aghọ nkọ́, bụ́ ndị na-arụ ọrụ ruo ogologo oge kwa ụbọchị n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha, kpara ya.
Ruo ókè ha aṅaa ka iji ụmụaka akpa ego gbasaruru? Gịnị bụ mmetụta ọ na-enwe n’ahụ ụmụaka? Gịnị ka a pụrụ ime iji dozie ọnọdụ ahụ?
Otú Nsogbu ahụ Bururu n’Ibu
Dị ka Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ (ILO) si kwuo, a na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ụmụaka nọ n’agbata afọ 5 na 14, bụ́ ndị na-arụ ọrụ ná mba ndị ka na-emepe emepe, bụ nde 250.a E kwenyere na pasent 61 n’ime ha bụ n’Esia, pasent 32 bụ n’Africa, pasent 7 bụkwa na Latin America. Iji ụmụaka akpa ego dịkwa ná mba ndị mepere emepe.
N’ebe ndịda Europe ọnụ ọgụgụ ụmụaka buru ibu na-arụ ọrụ a na-akwụ ụgwọ na ha, karịsịa n’ọrụ ndị nwere oge, dị ka ịkọ ugbo, na n’ụmụ obere ụlọ ọrụ. Na nso nso a, iji ụmụaka akpa ego amụbawo n’Etiti na n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe mgbe ha siri n’usoro Ọchịchị Kọmunist gafere n’usoro akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị. Na United States, ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ nke ụmụaka e ji akpa ego bụ nde 5.5, ma nke ahụ agụnyeghị ọtụtụ ụmụaka na-erubeghị afọ 12, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị n’ụlọ ọrụ ndị ọnọdụ ọrụ ha na-adịghị mma ma ọ bụ dị ka ndị ọrụ ha nwere oge na ndị ọrụ ngagharị n’ubi ndị buru ibu. Olee otú ọtụtụ nde ụmụaka a si ghọọ ndị na-arụ ọrụ?
Ihe Ndị Na-akpata Iji Ụmụaka Akpa Ego
Iji ọnọdụ ịda ogbenye achọ uru. “Ihe kasị eduba ụmụaka n’ịrụ ọrụ ndị dị ize ndụ, nke na-agwụ ike bụ iji ọnọdụ ịda ogbenye achọ uru,” ka The State of the World’s Children 1997 na-ekwu. “Nye ezinụlọ ndị dara ogbenye, ụtụ dị nta nke ego nwatakịrị na-akpata na-atụnye ma ọ bụ aka ọ na-enye n’ụlọ nke na-eme ka ndị nne na nna nwee ohere ịrụ ọrụ pụrụ ime ka a na-enweta nanị ihe na-ezunụ kama ịnọ n’agụụ.” Ndị nne na nna nke ụmụaka na-arụ ọrụ na-abụkarị ndị na-enweghị ọrụ ma ọ bụ ndị na-enweghị ezigbo ọrụ. Ha na-achọsi ego ga-ezunụ ike. Mgbe ahụ gịnị mere e ji enye ụmụ ha ọrụ ndị ahụ kama inye ha? N’ihi na a pụrụ ịkwụ ụmụaka ụgwọ ka ala. N’ihi na ụmụaka na-erube isi ma bụrụ ndị a pụrụ iji mee ihe ndị ọzọ karị—ọtụtụ ga-eme ihe ọ bụla a gwara ha mee, n’ajụkebeghị ndị isi ajụjụ. N’ihi na ụmụaka eyikebeghị ka ha ga-agbakọ aka ọnụ nupụ isi mgbe a na-emegbu ha. N’ihi na ha adịghịkwa etigwara mgbe e tiri ha ihe.
Agụghị akwụkwọ. Sudhir, bụ́ nwa okoro dị afọ 11 si India, bụ otu n’ime ọtụtụ nde ụmụaka kwụsịworo ịga akwụkwọ ma malite ịrụ ọrụ. N’ihi gịnị? “N’ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi adịghị akụzi ihe nke ọma,” ka ọ na-aza. “Ọ bụrụ na anyị gwa ha ka ha kụziere anyị mkpụrụ akwụkwọ, ha na-apịa anyị ihe. Ha na-ehi ụra n’ime klas. . . . Ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe, ha agaghị akụziri ya anyị.” N’ụzọ dị mwute echiche Sudhir nwere banyere ụlọ akwụkwọ ziri ezi. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, mgbubilata nke ego a na-emefu maka ọdịmma ọha na eze akpawo agụmakwụkwọ aka ọjọọ karịsịa. Otu nnyocha nke òtù UN mere na 1994 ná mba 14 n’ime mba ndị kasị bụrụ ndị na-emepeghị emepe n’ụwa kpughere ihe ụfọdụ na-adọrọ mmasị. Dị ka ihe atụ, n’ọkara n’ime mba ndị a, ọnụ ụlọ klas nke ndị nọ n’elementrị nke mbụ nwere oche maka nanị mmadụ 4 n’ime ụmụ akwụkwọ 10 ọ bụla. Ọkara n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ enweghị akwụkwọ ọgụgụ, ọkara n’ime ọnụ ụlọ klas ndị ahụ enweghịkwa bọọdụ e ji ede ihe. N’ụzọ na-adịghị eju anya, ọtụtụ ụmụaka ndị na-aga akwụkwọ n’ụdị ụlọ akwụkwọ ndị ahụ na-emesịa rụwa ọrụ.
Echiche ndị a na-enwekarị. Ruo n’ókè ọrụ ahụ dịruru ize ndụ ma taa akpụ, ruo n’ókè ahụ ka o yiruru ka a ga-ahapụrụ ya agbụrụ ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ, ndị nọ n’ọkwá ka ala, ndị ihe ụwa na-esiri ike, na ndị ogbenye. Banyere otu mba dị n’Esia, Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu na “a nọwo na-enwe echiche bụ́ na a na-amụ ụfọdụ ndị ịchị achị na iji uche ha na-arụ ọrụ, ebe a na-amụ ndị ọzọ, ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ, iji ahụ ha na-arụ ọrụ.” N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, omume e nwere anaghị akacha mma mgbe nile. Ìgwè ka n’ọnụ ọgụgụ nwere ike ha agaghị achọ ka ụmụ ha rụọ ọrụ dị ize ndụ, ma ọ gaghị enye ha nsogbu n’obi ma ọ bụrụ na obere ụmụaka si n’agbụrụ, ebo, ma ọ bụ ọkwá akụ̀ na ụba ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ rụọ ụdị ọrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ebe ugwu Europe, ụmụaka ndị na-arụ ọrụ yiri ka ha ga-abụ ndị Turkey ma ọ bụ ndị Africa; na United States, ha pụrụ ịbụ ndị Esia ma ọ bụ ndị Latin-America. Ihe na-eme ka iji ụmụaka akpa ego ka njọ bụ ọha mmadụ nke oge a nwere oké mmasị n’ịzụ ihe. A na-achọsi ngwá ahịa ndị dị ọnụ ala ike. Mmadụ ole na ole yiri ka ha na-echegbu onwe ha na ọ pụrụ ịbụ ọtụtụ nde ụmụaka a na-amaghị ndị ha bụ, ndị e ji achọ uru, mepụtara ihe ndị a.
Ụdị Dị Iche Iche nke Iji Ụmụaka Akpa Ego
Iji ụmụaka akpa ego na-adị n’ụdị dịgasị aṅaa? Dị ka ọ na-adịkarị, ihe ka ukwuu n’ụmụaka na-arụ ọrụ na-eje ozi n’ụlọ. A kpọwo ụdị ndị ọrụ ahụ “ụmụaka a kasị chefuo n’ụwa.” Ozi ụlọ ekwesịghị ịdị ize ndụ, ma ọtụtụ mgbe ọ na-adị. A na-akwụkarị ụmụaka na-agba odibo ụgwọ dị ala—ma ọ bụ ghara ịkwụ ha akwụ. Ndị nna ha ukwu na-ekwu ihe ga-abụ ọnọdụ ọrụ ha kpam kpam otú o si masị ha. A dịghị egosi ha ịhụnanya, a na-ajụ ikwe ka ha gaa akwụkwọ, gwurie egwu, na ime ihe omume ọha na eze. A pụkwara iti ha ihe ma ọ bụ metọọ ha n’ụzọ mmekọahụ.
Ụmụaka ndị ọzọ na-achọta onwe ha dị ka ndị na-arụ ọrụ mmanye na ndị e ji mere ihe mbe. Na Ndịda Esia, nakwa n’ebe ndị ọzọ, ndị nne na nna na-eji ụmụ ha, ndị na-adịkarị nanị afọ asatọ ma ọ bụ itoolu, gbaziri ntakịrị ego site n’aka ndị nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe ma ọ bụ ndị nnọchiteanya ha. Ụmụaka ahụ ịgba odibo ná ndụ ha nile adịghị eme ọbụna ka a kwụbilata ụgwọ ahụ ma ọlị.
Gịnị banyere iji ụmụaka akpa ego n’ụzọ mmekọahụ? A na-eme atụmatụ na kwa afọ n’ụwa nile a na-arabanye otu nde ụmụaka ndị nwanyị, ma ọ dịkarịa ala, n’ịgba akwụna. Ọtụtụ mgbe a na-ejikwa ụmụ okoro eme ihe maka inwe mmekọahụ. Mmerụ ahụ na mkpaghasị uche nke ụdị mmetọ a na-akpata—ka a ghara ikwuwe banyere ibute nje HIV—na-eme ka ọ bụrụ otu n’ime ụdị kasị ize ndụ nke iji ụmụaka akpa ego. “Anyị na ndị arịrịọ nọ n’otu ọkwá n’anya ọha na eze,” ka otu onye akwụna dị afọ 15 si Senegal na-ekwu. “Ọ dịghị onye chọrọ ịma ndị anyị bụ ma ọ bụ ka a hụ anyị na ya.”b
A na-eji ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụaka na-arụ ọrụ eme ihe n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na n’ubi ndị buru ibu iji chọọ uru. Ụmụaka dị otú ahụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ọrụ igwupụta ihe ndị a ga-asị na ha dị oké ize ndụ nye ndị okenye. Ọtụtụ na-arịa ụkwara nta, ọzịza nke opi akpa ume, na ụkwara asthma. A na-ekpughe ụmụaka ndị na-arụ ọrụ n’ubi ndị buru ibu nye ọgwụ e ji egbu ahụhụ, agwọ ịta ha, na ụmụ ahụhụ ịgba ha. Ụfọdụ enwewo nkwarụ ka ha ji mmà ogè na-egbute okpete. Ọtụtụ nde ụmụaka ndị ọzọ emewo okporo ámá ebe ha na-arụ ọrụ. Were, dị ka ihe atụ, Shireen dị afọ iri, bụ́ onye na-enweta ihe o ji ebi ndụ site n’ịtụtụta ihe n’ebe mkpofu ihe. Ọ gaghị akwụkwọ, ma ọ maara ụzọ e si eji ntakịrị ihe ebi ndụ. Ọ bụrụ na o ree akwụkwọ na akpa waterproof ọnụ ego ya ruru cent 30 ruo 50, o nwetala nri ehihie. Ọ bụrụ na o nwetarughị otú ahụ, ọ na-anọrọ n’erighị nri. Ụmụaka ndị na-ehi n’okporo ámá, ndị na-abụ ọtụtụ mgbe ndị nọ na-agba ọsọ n’ihi mmetọ ma ọ bụ nleghara anya n’ebe obibi, na-abụ ndị e metọkwuru ma jiri mee ihe maka uru onwe onye n’okporo ámá. “Ana m ekpe ekpere kwa ụbọchị ka m ghara ịdaba n’aka ndị ajọ mmadụ,” ka Josie na-ekwu, bụ́ onye dị afọ iri nke na-ere swiiti n’ụzọ awara awara ndị dị n’otu obodo ukwu n’Esia.
E Mebie Oge Ịbụ Nwata
N’ihi ụdị iji ụmụaka akpa ego ndị ahụ, a na-ekpughe ọtụtụ iri nde ụmụaka nye ihe ize ndụ ndị dị njọ. Ndị a pụrụ ịbụ n’ihi ụdị ọrụ ọ bụ ma ọ bụ ajọ ọnọdụ a nọ na-arụ ya. Ụmụaka na ndị ọrụ ndị ọzọ na-eto eto yiri ka ha na-enwe ihe ọghọm ndị ka njọ n’ebe ọrụ karịa ndị okenye. Nke a bụ n’ihi na otú ahụ nwatakịrị dị dị iche na nke onye okenye. Ọrụ siri ike pụrụ inye ọkpụkpụ azụ ya ma ọ bụ nke úkwù ya nkwarụ ngwa ngwa. Ọzọkwa, ọ na-emetụta ụmụaka karịa ndị okenye mgbe e kpughere ha nye ọgwụ ndị dị ize ndụ ma ọ bụ nye ụzarị ọkụ. Tụkwasị na nke a, e meghị ahụ ụmụaka maka iji ya na-arụ otu ụdị ọrụ, nke sikwara ike ruo ogologo oge, nke na-abụkarị ihe ha na-eme. Ha adịghị amakebe banyere ihe ize ndụ ndị dị na ya, nke ha ji amakebe ihe ndị ha kwesịrị ịdị na-eme iji chebe onwe ha.
Mmetụta iji ụmụaka akpa ego na-enwe n’uto uche, mmetụta uche, na ọgụgụ isi nke ndị o metụtara dịkwa oké njọ. A dịghị egosi ụmụaka dị otú ahụ ịhụnanya. Iti ihe, mkparị, ịta ahụhụ site n’enyeghị ha nri, na mmetọ n’ụzọ mmekọahụ bụ ihe a na-ahụkarị. Dị ka otu ihe ọmụmụ gosiri, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ihe dị ka nde ụmụaka 250 na-arụ ọrụ akwụsịwo ịga akwụkwọ. Tụkwasị na nke a, a chọpụtawo na a pụrụ imebi ikike ịmụta ihe nke ụmụaka ndị na-arụ ọrụ ruo ogologo oge.
Gịnị ka ihe a nile pụtara? Na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụaka na-arụ ọrụ ga-ada ogbenye, nwee nhụsianya, ọrịa, bụrụ ndị na-amaghị agụ ma ọ bụ na-ede, na ndị na-ekwekọghị n’ọha mmadụ ná ndụ ha nile. Ma ọ bụ, dị ka odeakụkọ bụ́ Robin Wright si kwuo ya, “n’agbanyeghị ọganihu nile o nweworo na nkà mmụta sayensị na nkà na ụzụ, ná ngwụsị nke Narị Afọ nke 20, ụwa na-ewepụta ọtụtụ nde ụmụaka ndị nwere ntakịrị olileanya ibi ndụ otú o kwesịrị, ya fọdụziekwa iduru ụwa banye na nke 21.” Ihe ndị a na-akpali iche echiche na-ewelite ajụjụ ndị bụ́: Olee otú e kwesịrị isi na-emeso ụmụaka? Ọ̀ dị ngwọta ọ bụla ga-abịa n’isi nso maka nsogbu nke iji ụmụaka akpa ego nke jọgburu onwe ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ozuzu ya, òtù ILO kabiri afọ 15 dị ka afọ ụmụaka ga-erurịrị tupu e kwe ka ha rụwa ọrụ—ma ọ bụrụhaala na afọ 15 adịghị ala karịa afọ a ga-eji gụsịa akwụkwọ iwu kwuru. Nke a abụrụwo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a kasị nakwere mgbe a na-ekwu ụmụaka ole na-arụ ọrụ ugbu a n’ụwa nile.
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere iji ụmụaka eme ihe n’ụzọ mmekọahụ, lee peji nke 11-15 ná mbipụta Teta! nke April 8, 1997.
[[Igbe dị na peeji nke 5]
Gịnị Bụ Iji Ụmụaka Akpa Ego?
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka n’ọha mmadụ nile na-arụ ọrụ n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ. Ụdị ọrụ ha na-arụ na-adịgasị iche n’ọha mmadụ dị iche iche nakwa ka oge na-aga. Ọrụ pụrụ ịbụ akụkụ dị mkpa nke agụmakwụkwọ ụmụaka na ụzọ ndị nne na nna si akụziri ụmụ ha nkà ndị dị mkpa. Ná mba ụfọdụ, ụmụaka na-arụkarị ọrụ n’ụmụ obere ụlọ ọrụ na n’ije ụmụ obere ozi, jiri nwayọọ nwayọọ na-aghọ ndị ọrụ tozuru etozu ka oge na-aga ná ndụ. Ná mba ndị ọzọ, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-arụ ọrụ ruo awa ole n’ole n’otu izu iji nweta ego mmachi akpa. Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwusi ike na ọrụ dị otú ahụ “bara uru, na-akwalite ma ọ bụ na-eme ka uto anụ ahụ, nke uche, nke ime mmụọ, nke omume ma ọ bụ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke nwatakịrị ka mma n’egbochighị ịga akwụkwọ, ntụrụndụ, na ezumike.”
N’aka nke ọzọ, iji ụmụaka akpa ego na-ezo aka n’ụmụaka ndị na-arụ ọrụ ruo ogologo oge ma na-enweta ụgwọ ọrụ dị ala, ọtụtụ mgbe n’ọnọdụ ndị na-ebibi ahụ ike ha. Ụdị ọrụ a “bụ n’ụzọ doro anya nke na-ebibi ihe ma ọ bụ iji ha achọ uru,” ka mbipụta bụ́ The State of the World’s Children 1997 na-ekwu. “Ọ dịghị onye ga-arụ ụka n’ihu ọha na o nwere mgbe ọ dị mma iji ụmụaka mere ndị akwụna maka uru. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ‘ụmụaka ịrụ ọrụ n’ihi ịbụ ndị e ji mere ihe mbe,’ bụ́ okwu e ji eme ihe ebe nile maka iji ụmụaka mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ohu iji kwụọ ụgwọ ndị nne na nna ha ma ọ bụ ndị nne na nna ha ochie ji. Nke a na-emetụtakwa ụlọ ọrụ mmepụta ihe ndị a ma ama maka ihe ize ndụ ahụ ike na nke mmerụ ahụ ha na-eweta . . . Ọrụ dị ize ndụ bụ nnọọ ihe a na-agaghị anabata ma ọlị maka ụmụaka nile.”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8, 9]
“A Ka Nwere Ihe Dị Ukwuu A Ga-eme”
ÒTÙ Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ (ILO) bụ isi sekpụ ntị ná mgbalị a na-eme ikpochapụ ụdị ndị kasị njọ nke iji ụmụaka akpa ego. Òtù ILO na-agba gọọmenti dị iche iche ume iti iwu ga-amachibido ụmụaka na-erubeghị afọ 15 ịrụ ọrụ ego. Ọ na-akwalitekwa nkwekọrịta ọhụrụ n’etiti mba dị iche iche iji machibido ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 12 ịrụ ọrụ na ịmachibido ụdị nrigbu ndị kasị njọ. Iji matakwuo ihe ịga nke ọma ndị e nwere ná mgbalị ndị dị otú ahụ, Teta! sooro Sonia Rosen kwurịta okwu, bụ́ onye ntụzi nke Usoro Ihe Omume Mba Nile Maka Iji Ụmụaka Akpa Ego, ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ nke United States. Ọ rụwo ọrụ dị ukwuu n’usoro ihe omume dị iche iche nke òtù ILO haziri. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwurịtara.
Ajụjụ: Olee ụzọ dị irè karịsịa nke isi kwụsị iji ụmụaka akpa ego?
Azịza: Anyị enweghị otu azịza ziri ezi. Otú ọ dị, n’ụwa nile, ihe ndị anyị kwurịtaworo bụ isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ, ya bụ, itinye iwu n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu tinyere agụmakwụkwọ bụ́ isi maka mmadụ nile, ọ kasị mma ma ọ bụrụ iwu na a ga-agụ ya, nakwa n’efu. N’ezie, ndị nne na nna inwe ezigbo ọrụ dịkwa mkpa.
Ajụjụ: Ì nwere afọ ojuju n’ihe ịga nke ọma e nweworo n’ịkwụsị iji ụmụaka akpa ego?
Azịza: Afọ ejughị m ma ọlị. Anyị na-ekwu na ọ dịghị nwatakịrị kwesịrị ịdị na-arụ ọrụ n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Anyị enwewo oké ihe ịga nke ọma site n’usoro ihe omume dị iche iche nke òtù ILO. Ma a ka nwere ihe dị ukwuu a ga-eme.
Ajụjụ: Olee otú òtù mba ụwa si emeghachi omume ná mgbalị ndị a na-eme iji kpochapụ iji ụmụaka akpa ego?
Azịza: Amakwaghị m otú m ga-esi na-aza ajụjụ ahụ. N’ụwa nile anyị ekwekọrịtawo ugbu a ruo n’ókè ụfọdụ na iji ụmụaka akpa ego bụ ihe a ga-agbaso mgba. Ugbu a echere m na ihe bụ isiokwu bụ: N’ụzọ dị aṅaa, nakwa olee mgbe? Olee ụzọ ndị kasị mma anyị ga-esi gbasoo ụdị ụfọdụ nke iji ụmụaka akpa ego mgba? Echere m na ọ bụ ya bụ ihe ịma aka anyị nwere n’ezie.
Ajụjụ: Gịnị ka ụmụaka na-arụ ọrụ pụrụ ịtụ anya ya?
Azịza: Mba nile nke ụwa na-aga ịlaghachi Geneva n’afọ a iji nwee nkwekọrịta ọhụrụ banyere ụdị kasị njọ nke iji ụmụaka akpa ego. Nke ahụ yiri ka ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu—mba nile, tinyere òtù dị iche iche nke ndị ọrụ nakwa òtù dị iche iche nke ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ. Anyị na-atụ anya na nke ahụ ga-eme ka e nwee usoro ọhụrụ nke nzube ya bụ ikpochapụ ụdị ndị kasị njọ nke iji ụmụaka akpa ego.
Ọ bụghị mmadụ nile nwere ụdị nchekwube Sonia Rosen nwere. Charles MacCormack, bụ́ onyeisi oche nke òtù bụ́ Zọpụta Ụmụaka, na-enwe obi abụọ. “Ndị ọchịchị enweghị ọchịchọ ime ihe banyere ya, ọha na eze amaghịkwa banyere ya iji mee ka o mee,” ka ọ na-ekwu. N’ihi gịnị? Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Iji ụmụaka akpa ego na-abụkarị okwu tara akpụ. Ndị dị ike na-akwado ya, gụnyere ọtụtụ ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ, ìgwè ndị na-erite uru na ya na ndị ọkachamara n’ihe banyere akụ̀ na ụba bụ́ ndị na-ekwu na a ghaghị inwe ahịa ghere oghe nye onye ọ bụla n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu, na ndị jisiri echiche ndị mbụ e nwere ike na-ekwenye na ọkwá a mụnyere ụmụaka ụfọdụ na ha na-anapụ ha ihe ndị ruuru ha.”
[Foto]
Sonia Rosen
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Akụkọ dị mwute banyere iji ụmụaka akpa ego gụnyere ịdọlị ndọlị n’ebe ndị a na-egwupụta ihe na n’ebe ndị a na-eme owu
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. National Archives photos
[Foto dị na peeji nke 7]
Ịtụtụta ihe n’ebe mkpofu ihe
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndọlị iji kpata nkụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148046/ J. P. Laffont - SYGMA
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị e were n’ọrụ n’ebe a na-eme eriri e ji ekwe ákwà
[Ebe E Si Nweta Foto]
CORBIS/Dean Conger
[Foto dị na peeji nke 8]
Ụmụaka na-ere ihe n’okporo ámá na-arụ ọrụ maka nanị cent isii kwa ụbọchị
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148079/ J. P. Laffont - SYGMA
[Foto dị na peeji nke 8]
Ịdọlị ndọlị n’otu ụlọ ọrụ a na-akwa nkà
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148027/Jean Pierre Laffont
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịgbalị inweta ihe e ji ebi ndụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148048/J. P. Laffont - SYGMA