Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 9/8 p. 31
  • Mmịnye Ọbara Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmịnye Ọbara Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
    Teta!—2003
  • Olee Ụdị Ọgwụgwọ Kasị Mma E Nwere?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Teta!—1999
g99 9/8 p. 31

Mmịnye Ọbara Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?

N’ỌNWA November gara aga a jụrụ ajụjụ a n’otu isiokwu akwụkwọ akụkọ nke Dr. Ciril Godec dere, bụ́ onyeisi oche nke nkà mmụta ọwara mamịrị n’Ụlọ Ọgwụ Kọleji nke Long Island, dị na Brooklyn, New York. O dere, sị: “Taa, ikekwe a gaghị anabata ọbara dị ka ihe e ji agwọ ọrịa, ebe ọ na-erughị ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị nchebe nke Ụlọ Ọrụ Nkesa Ihe Oriri na Ọgwụ chọrọ. Ọbara bụ akụkụ ahụ mmadụ, mmịnye ọbara bụ nnọọ iburu akụkụ ahụ mmadụ tinyere onye ọzọ.”

Dr. Godec kwuru, sị: “Iburu akụkụ ahụ mmadụ tinyere onye ọzọ bụ nnọọ usoro ọgwụgwọ ikpeazụ a na-eche ndị ọrịa n’ihu. N’ihi ihe ọjọọ ndị ọ pụrụ ịkpata, a na-eme ka ndị ọrịa mata nke ọma ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ ha pụrụ inweta tupu e tinyere ha akụkụ ahụ onye ọzọ.” N’ihe banyere mmịnye ọbara, o kwubiri, sị: “A na-enyo abamuru ya enyo nke na ọtụtụ ndị dọkịta na-awa ahụ anakwerewo echiche nke ‘izere mmịnye ọbara’ ọ bụghị nanị n’ihi ihe ndị metụtara ahụ ike kamakwa n’ihi ihe ndị metụtara iwu.”

Otu nsogbu bụ́ isi dị ná mmịnye ọbara bụ na ọtụtụ puku ndị mmadụ ebutewo ọrịa ndị na-egbu mmadụ, gụnyere ọrịa AIDS. Ọ bụ ezie na usoro dị iche iche e ji enyocha ọbara akawo mma n’ọtụtụ ebe, Dr. Godec kọwara, sị: “Ihe pụrụ ịdị ize ndụ na-abịa site n’ọbara nke ndị bu ya nyere, bụ́ ndị ahụ ha na-emepụtabeghị ihe ndị ga-alụso ọrịa ọgụ a pụrụ ịhụ site n’ule ime nnyocha.”

N’imechi isiokwu ya, Dr. Godec zara ajụjụ ahụ a jụrụ n’elu, sị: “Ka ndị dibịa bekee na ndị dọkịta na-awa ahụ na-aghọta usoro mbugharị nke ikuku oxygen nke ọma karị ma na-aghọta na ọ dịghị mkpa na ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin ga-adị elu otú e cheburu, ọ fọrọ nke nta ka o kwe ha omume mgbe nile ịchọta ụdị ọgwụgwọ ọzọ a ga-eji dochie mmịnye ọbara. Rute n’afọ ka gara aga, ịwa ahụ n’obi na itinyere mmadụ imeju onye ọzọ, bụ́ ndị na-ata akpụ, kpatara nnọọ oké ọbara ọgbụgba nke na a na-eche mgbe nile na ọ dị mkpa ịchọ ịmịnyeghachi ọbara buru ibu. Ugbu a, a wawo ụdị ahụ abụọ ahụ n’enweghị mmịnye ọbara.

“Ọ pụrụ nnọọ ikwe omume na a ga-akwụsị mmịnye ọbara kpam kpam n’ọdịnihu dị nnọọ nso. . . . Mmịnye ọbara abụghị nanị na ọ na-efu nnukwu ego ma dị ize ndụ; ọ dịghị nnọọ enye nlekọta kasị bụrụ ịgba nke e kwesịrị inye ndị ọrịa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya