Anyị Mụtara Idabere na Chineke Site n’Ihe Ndabara Ọjọọ
DỊ KA ROSIE MAJOR SI KỌỌ
Anọ m n’ọnwa ise nke ime mbụ m mgbe nne di m chọpụtara na ọ dị ka ụkwụ m ọ̀ zara nnọọ aza. N’ụbọchị ahụ na March 1992, mụ na di m, bụ́ Joey, amatụghị na ihe anyị gaje ịhụ ga-etinye ndabere anyị dabeere na Jehova n’ule.
MGBE otu izu gasịrị dọkịta na-ahụ maka ịmụ nwa nke m gara hụ chọpụtara na ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m ji erugharị dị nnọọ elu. Mgbe ọ tụrụ aro ka e nye m àkwà iji lee m ahụ ma leruo m anya, dị ka o kwesịrị, enwere m nchegbu. Ahụ e lere m gosiri na m na-arịa preeclampsia, bụ́ ajọ ọrịa pụrụ ijide onye dị ime.a
Dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ tụrụ nnọọ aro ka e mee ka m mụọ nwa ozugbo iji chebe mụ na nwa ọhụrụ ahụ. O riri mụ na di m ọnụ. “Ma nwa m erubeghị izu 24!” ka m ji ume ọkụ kwuo. “Olee otú nwa anyị pụrụ isi dị ndụ n’ebe na-abụghị akpa nwa?” “M ga-enyetụ ya oge,” ka dọkịta ahụ jiri obiọma zaghachi. “Otú ọ dị, ọ bụrụ na ahụ mesiwe gị ike, m ga-ewepụtarịrị nwa ahụ.” Ụbọchị 13 gara, ọnọdụ m jọwanyewara njọ n’ike n’ike. Dọkịta ahụ kpọrọ di m, anyị mekwara mkpebi ahụ siri ike nke ịga n’ihu n’iwepụta nwa ahụ.
Iwepụta Ya
N’abalị bọtara ụbọchị e wepụtara ya, Dr. McNeil, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ọrịa ụmụaka, sooro anyị nọkọọ iji kọwaa ihe anyị pụrụ iche ihu ma anyị mụọ nwa oge ya na-erubeghị—ọ pụrụ inwe ụbụrụ e mebiri emebi, akpa ume na-akaghị nnọọ aka nke na ọ gaghị arụ ọrụ nke ọma, na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ ọ pụrụ ịrịa. Ekpere m ekpere maka “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile” na maka ume iji were ihe ọ bụla dapụtaranụ na ịnagide ya. (Ndị Filipaị 4:7) N’ụtụtụ echi ya a wara m afọ ma wepụta nwa anyị. Ọ dị nanị gram 700 n’arọ. Anyị gụrụ ya JoAnn Shelley.
Mgbe ụbọchị ise gafere, m gbaara aka lawa. Obere nwa m nwanyị nọ n’ebe pụrụ iche a na-elekọta nanị ụmụ ọhụrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ, na-agbalị ịdị ndụ. Mgbe izu abụọ gasịrị oyi bara JoAnn n’ahụ. Anyị nwere obi ekele mgbe ọ gbakere, ma nanị ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị ọ malitere ịrịa ọrịa eriri afọ, a kpọfekwara ya n’ebe a na-elekọta ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke ebe ahụ. Ka ọ na-erule ụbọchi isii ọzọ, JoAnn gbaketụrụ, ọbụnakwa malite ibutụ ibu. Anyị ṅụrịrị ọṅụ! Ma ọṅụ anyị anọteghị aka. Dr. McNeil gwara anyị na ọbara agwụla JoAnn n’ahụ. Ọ tụrụ aro ka a gbalịa nweta mmiri ọgwụ ahụ nke aka mere bụ́ erythropoietin (EPO) iji kwalite mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie JoAnn. Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bahamas ebe a kpọtụụrụ ndị nnọchiteanya nke Ngalaba Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ dị na Brooklyn, New York. N’egbughị oge ha nyere Dr. McNeil ihe ndekọ kasị ọhụrụ na-egosi otú e si enweta EPO na otú e si eji ya eme ihe, ọ malitekwara iji ya gwọwa ya.
Nsogbu Ndị Ka Dị n’Ihu
Ọtụtụ izu ndị kowere anyị obi n’elu gafere. JoAnn nwere ọrịa o butere nke metụtara eriri afọ ya, ihe ọdụdọ na-eme ka ọ ghara iku ume mgbe ụfọdụ, ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin dị ala, na oyi bara ya n’ọwara akpa ume. Anyị tụrụ egwu na nke ọ bụla n’ime ọrịa ndị a pụrụ ime ka ọ chịsa ọwa. Ma JoAnn jiri nwayọọ nwayọọ na-agbake. Mgbe ọ dị ọnwa atọ, ọ ka nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ ma dị nanị kilogram 1.4 n’arọ. Ma na nke mbụ ya ná ndụ ya, ọ na-eku ume n’onwe ya n’ekurughị ikuku oxygen e ji enyere ya aka. Hemoglobin ya na-agbagoru n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma. Dọkịta ahụ kwuru na anyị pụrụ ikuru ya lawa ma o bukwuo gram 500 n’ibu.
Mgbe izu atọ gasịrị JoAnn rịara ezigbo ọrịa na-eme ka ọ ghara ikutazi ume. Ahụ e legasịrị ya egosighị ihe kpatara ya. Ekutazighị ume ahụ nọgidere, ọ na-emekwa ya mgbe ọ bụla o riri nri. E mesịrị chọpụta na ihe oriri na-agbagote JoAnn n’akpịrị. Okpo akpịrị ya adịghị emechi ma o richaa nri, ọ bụ ya mere ihe ndị dị n’afọ ya ji na-alọghachi n’akpịrị ya. Nke a mee, ọ na-agbagide ya ma mee ka o siere ya ike ikuzi ume.
Ná mmalite October, JoAnn butere nje virus n’ebe a na-elekọta ụmụ ọhụrụ. O gburu ọtụtụ n’ime ụmụ ọhụrụ a mụrụ mgbe oge ha na-erubeghị nọ n’ebe ahụ. N’oge ahụ ike gwụsịrị ya, JoAnn rịara ọrịa ahụ na-eme ka ọ ghara ikuzi ume bụ́ nke yiri ka ọ kasị nọtee aka karịa ka o metụworo ya. Mgbalị nile e mere iji tụtee ya kụrụ afọ n’ala. Ọkachamara n’ihe banyere ọrịa ụmụaka ahụ achọchaala ikwu na ọ nwụọla, a maghị otú o si malitekwa iku ume—ma ihe ọdụdọ malitere ịdọ ya ozugbo. A kwụnyekwaara ya ngwá o ji eku ume ọzọ, o dokwara anyị anya na nke JoAnn agaala. Ma ọ nwụghị, anyị kelekwara Jehova.
Ịmụta Ịtụkwasịkwu Jehova Obi
A pụrụ iji nsogbu ndị anyị chere ihu tupu a mụọ JoAnn tụnyere isi n’ụgbọ mmiri dapụ na nso ọdụ ụgbọ mmiri, bụ́ ebe anyị pụrụ nnọọ igwuru mmiri pụta n’ikperé mmiri. Ugbu a o yiri ka anyị esiwo n’ụgbọ mmiri dapụ n’etiti oké osimiri, n’ebe ala na-adịghị nso. N’ileghachi anya azụ, anyị chọpụtara na tupu a mụọ ya, ọ dị oge ụfọdụ anyị dabeere n’onwe anyị nke ukwuu. Ma site n’ihe anyị hụrụ n’ihi JoAnn, anyị amụtawo ịtụkwasị Jehova obi mgbe anyị nọ n’ọnọdụ mmadụ na-apụghị ịgwọta. Anyị mụtara ime ihe Jisọs dụrụ ọdụ ya—iwere otu ụbọchị otu mgbe. (Matiu 6:34) Anyị mụtara ịdabere na Jehova, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ anyị amaghịdị kpọmkwem ihe anyị ga-ekpe ekpere maka ya. Ugbu a anyị na-ekele Jehova maka amamihe Bible na “ọkịka nke ike ahụ,” bụ́ nke na-eme ka anyị nwee ike ịnagide oké ihe isi ike ndị dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.
M nọrọ ná nsogbu, ọ na-esiri m ike mgbe mgbe ịnọgide na-enwe mmetụta uche ziri ezi. Ihe nile m na-eche bụ JoAnn. Di m, bụ́ Joey, mere ihe dị ukwuu n’inye m nkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ. Ana m ekele ya nke ukwuu maka nke a.
JoAnn Alọta
Ahụ ike JoAnn jiri nwayọọ nwayọọ ka mma. Otu ụbọchị o jiri aka dọpụ ngwá ahụ o ji eku ume n’ọnụ ya. Ugbu a Dr. McNeil hụrụ na JoAnn nwere ike ịlạ. Anyị jupụtara n’ọṅụ! N’ịkwado maka nlọta ya, anyị mụrụ otú anyị ga-esi na-enye ya nri site na tube. Anyị kwadebekwara ite ikuku oxygen, nweta ngwá e ji ele iku ume ya bụ́ nke anyị na-akwụ ụgwọ ya, gaakwa ihe ọmụmụ banyere ịtụte mmadụ. Ka e mesịrị, n’October 30, 1992, JoAnn si ụlọ ọgwụ lọta. Ọ nọrọ ụbọchị 212 n’ebe pụrụ iche a na-elekọta nanị ụmụ ọhụrụ, otú ahụ ka anyị nọkwara.
Site ná mmalite, ndị ezinụlọ anyị na ndị nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè anyị gosipụtara na ha bụ ngọzi sitere n’aka Jehova n’ezie. Ha na-abịa eme ka ụlọ na èzí anyị dị ọcha, na-esi ihe oriri, na-enyere anyị aka ịga ụlọ ọgwụ, na-elekọtakwa JoAnn ka m wee nwee ike ihitụ ụra. Mgbe nke ahụ na-eme anyị bịara hụ àgwà ọma ha anyị na-ahụbeghị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ kọọrọ anyị ihe ime mmụọ ndị nyeere ha aka n’oge ihe isi ike nke ha.
Ndụ Anyị Taa
Anyị agbalịsiwo ike inye JoAnn nlekọta ahụ ike kasị mma e nwere maka ọtụtụ ọrịa ya. Mgbe ọ dị ọnwa 19, anyị chọpụtara na JoAnn na-arịa ọrịa ahụ ịma jijiji—nke mmebi ụbụrụ kpatara. Na September 1994, a waziri ya ahụ dị ize ndụ n’ihi ihe oriri na-agbagote ya n’akpịrị. Na 1997, ajọ ihe ọdụdọ malitere ịdọ JoAnn. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, mgbe anyị gbanwere ihe oriri ya, ihe ọdịdọ ahụ kwụsịrị. Ọrịa JoAnn ebelatawo uto ya. Ma ọ na-aga ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ugbu a, ọ na-emekwa nke ọma. Ọ pụghị ịga ije, ọ dịghịkwa ekwu okwu nke ọma, ma ọ na-eso anyị aga nzukọ ndị Kraịst anyị nile na ozi ụlọ n’ụlọ anyị. Ọ dị ka o nwere obi ụtọ.
Jehova akasiwo anyị nnọọ obi n’oge ọnwụnwa ahụ. Mkpebi anyị bụ ịnọgide na-adabere na Jehova na ‘ịṅụrị ọṅụ n’ime ya’ n’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-atụghị anya ha. (Habakuk 3:17, 18; Eklisiastis 9:11) Anyị na-atụsi anya Paradaịs elu ala Chineke kwere ná nkwa, ike, bụ́ ebe JoAnn anyị hụrụ n’anya ga-enwe ahụ ike zuru okè.—Aịsaịa 33:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọrịa preeclampsia na-akpata mkpachigide nke akwara na-ebugharị ọbara n’ahụ nwanyị dị ime, bụ́ nke na-eme ka ọbara ghara ịbanye n’akụkụ ahụ ya dị iche iche nke ọma, gharakwa ịbanye n’ichi na n’ime ahụ nwa o bu n’afọ. Ọ bụ ezie na a maghị ihe na-akpata ya, e nwere ihe àmà ụfọdụ na-egosi na a na-ebu ọrịa ahụ apụta ụwa.
[Foto dị na peeji nke 28]
JoAnn nwa anyị nwanyị
[Foto dị na peeji nke 30]
N’agbanyeghị nkwarụ o nwere, JoAnn bụ nwatakịrị nwere obi ụtọ