Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 1/8 p. 10-11
  • A Pụrụ Ịzọpụta Mbara Ala Bụ́ Ụwa!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Pụrụ Ịzọpụta Mbara Ala Bụ́ Ụwa!
  • Teta!—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbalị Hiere Ụzọ
  • Ụzọ A Ga-esi Gwọta Nsogbu A
  • Mbara Ụwa Anyị Na-esighị Ike—Gịnị Banyere Ọdịnihu?
    Teta!—1996
  • Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-elekọta Ụwa Anyị A?
    Teta!—2008
  • Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs Dị Nso
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2005
g05 1/8 p. 10-11

A Pụrụ Ịzọpụta Mbara Ala Bụ́ Ụwa!

ISIOKWU ndị bu ụzọ emewo ka o doo anya na ụmụ mmadụ kwesịrị iwetulata aka n’otú ha si eji akụ̀ ndị dị n’ụwa eme ihe taa. N’eziokwu, ndị ndú ụwa emewo mgbalị kwesịrị ịja mma n’ime ka a kwụsịlata mmetọ a na-emetọ mmiri, mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa, na nsogbu ndị ọzọ metụtara gburugburu ebe obibi. Malite ná Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Gburugburu Ebe Obibi Mmadụ bụ́ nke e nwere na 1972, nakwa nzukọ ezumezu ndị ọzọ sochirinụ, ihe ruru mba 163 ezukọwo iji kpebie ihe ndị a ga-eme banyere nsogbu a. Ma, olee ihe siworo na ya pụta? “N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ nkwekọrịta, mkpebi, na ihe ndị ọzọ a bịanyere aka na ha emebeghị ka a kwụsị ibibi gburugburu ebe obibi n’ụwa nile,” ka David Hunter, bụ́ ọga kpata kpata nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Iwu Mba Nile Na-agbaso n’Ilekọta Gburugburu Ebe Obibi na-ekwu. N’ezie, Hunter na-ekwukwa na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile bụ́ isi nke na-egosi ọnọdụ gburugburu ebe obibi nọ na ya, dị njọ taa karịa ka ha dị n’oge e nwere Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu nke afọ 1992.”

N’ihi gịnị ka ọganihu e nwere eri ihe karịrị afọ iri atọ e kwurịtasịrị banyere gburugburu ebe obibi ji pee nnọọ mpe otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ mkpa ọ dị ịhụ na ọnọdụ akụ̀ na ụba na-aga n’ihu. Ọnọdụ akụ̀ na ụba nke mba dị iche iche na-adabere n’ihe ndị mmadụ na-azụ. Ka e wee nwee ihe ndị mmadụ ga-azụ, ụlọ ọrụ dị iche iche ga na-emepụta ihe. Iji mepụta ihe ndị a, ọ dị mkpa inweta ihe ndị a ga-eji mepụta ha. Usoro a bụ ihe na-adịchaghị mma nke gburugburu ebe obibi na-ata ahụhụ ya n’ikpeazụ. Gịnịzi bụ ngwọta ya?

Mgbalị Hiere Ụzọ

Bible kọwara ihe mere mgbalị ụmụ mmadụ na-eme ịchị onwe ha jiworo kụọ nnọọ afọ n’ala. Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) N’ezie, a chọpụtawo na okwu ndị ahụ bụ eziokwu!

Ị̀ gatụla n’ogige ntụrụndụ ma ọ bụ n’ebe a na-azụ fụlawa? Lee ka o si atọ anyị ụtọ ikiri osisi na fụlawa ndị dị na ya bụ́ ndị dị n’usoro ma maa mma n’anya! Otú ọ dị, ogige ntụrụndụ nke osisi na fụlawa ya dị mma n’anya esighị n’elu daa. Ndị ma nke a na-akọ n’ilekọta fụlawa ejiriwo ọtụtụ awa kwachasịa osisi na fụlawa ndị ahụ, ma na-azụ ha nke ọma iji mee ka ha dị mma n’anya. Chegodị echiche ihe ụwa anyị ga-adị ka ya ma e jiri ịhụnanya lekọta ya otú e si elekọta ogige ntụrụndụ.

N’ezie, Onye Okike anyị zubere ka e lekọta ụwa anyị n’ụzọ dị otú ahụ. Dị ka ihe ndekọ banyere okike bụ́ nke a na-ahụ n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee si kwuo, ‘Jehova, bụ́ Chineke, weere mmadụ ahụ mee ka ọ nọdụ n’ubi Iden a gbara ogige ịrụ ọrụ ya na idebe ya.’ (Jenesis 2:15) Ọzọkwa, ọ bụghị nanị ọrụ ilekọta Ogige Iden ka e nyere mmadụ, kamakwa e nyere ya ọrụ ime ka Paradaịs mbụ ahụ gbasaa ruo mgbe ọ ga-ezu ụwa nile.—Jenesis 1:28.

N’ụzọ dị mwute, n’ihi nnupụisi ha, Adam na Iv ghọrọ ndị na-ezughị okè, ohere nke ilekọta Paradaịs ahụ na ịgbasa ya funahụkwara ha. (Jenesis 3:1-6, 23) Ebe anyị bụ ụmụ nke mmadụ abụọ mbụ ahụ, anyị eketawo mmehie na ezughị okè ha. (Ndị Rom 5:12) Mmebi a na-emebi akụ̀ ndị sitere n’okike bụ nanị otu n’ime ihe atụ ndị na-egosi otú mgbalị ụmụ mmadụ na-eme ịchị onwe ha si bụrụ ihe hiere ụzọ. N’ụzọ doro anya, nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ karịrị ike ha. Ọ dị ha mkpa isi ebe ọzọ nweta enyemaka.

Ụzọ A Ga-esi Gwọta Nsogbu A

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Bible na-ekwu na, n’Alaeze eluigwe nke Chineke, a ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. (Abụ Ọma 37:10, 11) N’oge ahụ, osisi na akụ́kụ́ ga-eme nke ọma n’ụwa nke dị ọcha. (Abụ Ọma 72:16) N’okpuru nduzi Chineke, a gaghịkwa emetọ ụwa ọzọ, ụmụ mmadụ ga-amụtakwa otú ha ga-esi jiri ihe ndị dị n’ụwa na-eme ihe n’emebighị ha emebi ma ọlị. Ànyị pụrụ isi aṅaa jide n’aka na nke a ga-eme eme?

Bible na-ekwu na a gaghị ‘ewezụga ụwa n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 104:5) Mgbe oge Chineke ruru, ndị nile dị ndụ ga-enweta ngọzi ebighị ebi, bụ́ nke ga-agụnye ezi ahụ́ ike, nri bara ụba, na ezigbo ụlọ. Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere nzube Chineke? Soro otu n’ime Ndịàmà Jehova kwurịta ya. Obi ga-adị ha ụtọ inyere gị aka ịhụ site na Bible otú a pụrụ isi—na otú a ga-esi—zọpụta mbara ala anyị bụ́ Ụwa!

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

N’okpuru nduzi Chineke, ihe a kpọrọ mmadụ ga-eji ihe ndị dị n’ụwa mee ihe n’emebighị ha emebi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nwatakịrị nwanyị na onye ọrụ ugbo: © Jeremy Horner/Panos Pictures

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya