Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/08 p. 19-21
  • Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?
  • Teta!—2008
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Amụta Okwu Ọjọọ
  • Fọm Ndụmọdụ Gị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2008
g 4/08 p. 19-21

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?

“Achọrọ m ịdị ka ụmụ akwụkwọ ibe m. Echere m na ọ bụ ya mere m ji mụta ịkpọ iyi.”—Melanie.a

“N’oge ahụ, echeghị m na e nwere oké ihe ọjọọ dị n’ịkpọ iyi. M na-anụ ka ndị mmadụ na-akpọ iyi mgbe niile—ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ anyị.”—David.

OLEE ihe mere o ji abụ ndị toro eto kpọọ mmadụ iyi, ma ọ bụ kwuo okwu rere ure, ndị mmadụ anaghị akpọkarị ya ihe ọjọọ, ma, onye na-eto eto mee ya, e lewe ya anya dị ka ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́? Ọ̀ bụ afọ ndụ mmadụ na-ekpebi ma onye ahụ ò kwesịrị ịdị na-akpọ iyi? Ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ na-ekwu okwu rere ure—ebe ọ bụkwa na a na-ele nke ndị toro eto kwuru anya dị ka ihe ọ na-enweghị ihe ọ bụ ma na-akatọ nke ndị na-eto eto kwuru—i nwere nnọọ ike ịjụ, sị, “Olee oké ihe ọjọọ dị n’ịkpọ iyi?”

Otú E Si Amụta Okwu Ọjọọ

O doro anya na ọtụtụ mmadụ na-akpọ iyi. N’ezie, ụfọdụ ndị na-eto eto na-ekwu na a sị na a na-akwụ ha otu naịra maka okwu ọ bụla rere ure ha nụrụ n’ụlọ akwụkwọ, na ọ gaghị adị ha mkpa ịga rụwa ọrụ ego, na ndị mụrụ ha nwekwara ike ịkwụsị ọrụ. Eve, bụ́ nwata nwaanyị dị afọ iri na ise kwuru, sị: “Gị na ụmụ klas m kwurịta okwu ruo nwa oge, ha ga-ekwu okwu rere ure ugboro ugboro n’otu ahịrịokwu. Ọ bụrụ na ị na-anụ ụdị okwu ndị ahụ mgbe ọ bụla, ọ ga-esiri gị ike ịghara iso na-ekwu ya.”

Ndị na-akpọ iyi hà gbara gị gburugburu dị ka ha gbara Eve? Ị̀ mụtala ịkpọ iyi?b Ya bụrụ otú ahụ, chetụgodị echiche banyere ihe na-akpali gị ịkpọ iyi. Ozugbo ị chọpụtara ihe ọ bụ, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịkwụsị ya.

Buru nke a n’obi zaa ajụjụ ndị a.

Olee ihe na-akasị eme ka ị kpọọ iyi?

□ Iji gosi na iwe ji m

□ Iji mee ka ndị mmadụ mara na m nọ

□ Iji dị ka ndị ọgbọ m

□ Iji mee ka a tụwa m ụjọ

□ Iji maa ndị isi aka

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Olee ebe ị na-akpọkarị iyi?

□ N’ụlọ akwụkwọ

□ N’ebe ọrụ

□ N’ozi e-mail, mgbe mụ na ndị ọzọ ji kọmputa na-ezirịta ozi, ma ọ bụ mgbe m ji ekwe ntị m na-edegara mmadụ ihe

□ Mgbe m nọ naanị m

Olee ihe ị na-ekwu iji gọpụrụ onwe gị?

□ Ndị ọgbọ m na-eme ya

□ Ndị mụrụ m na-eme ya

□ Ndị nkụzi m na-eme ya

□ Ndị na-eme egwuregwu na-ekwukarị ya

□ Ọ dịghị oké ihe ọ bụ—ọ bụ okwu nkịtị

□ M na-akpọ iyi naanị mgbe mụ na ndị na-adịghị ele ya anya dị ka ihe ọjọọ nọ

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Oleedị ihe mere mmadụ ga-eji chọwa ịkwụsị ịkpọ iyi? Ịkpọ iyi ọ̀ dị oké njọ? Tụlee ihe ndị a.

Ọ bụghị okwu nkịtị. Jizọs kwuru, sị: “Okwu gị na-egosi ihe dị gị n’obi.” (Luk 6:45, Contemporary English Version) Buru n’uche na okwu anyị anaghị egosi naanị ụdị onye anyị ga-achọ ịbụ—ọ na-egosi ụdị mmadụ anyị bụ ugbu a. Ya bụrụgodị na ị na-ekwu okwu ọjọọ naanị n’ihi na ndị ọzọ na-ekwu ya, iṅomi ha na-egosi na ị ‘na-esonye ìgwè mmadụ,’ nakwa na ị naghị emere onwe gị mkpebi.—Ọpụpụ 23:2.

Ma ọ bụghị naanị nke ahụ. James V. O’Connor, bụ́ onye ọkachamara n’asụsụ, kwuru, sị: “Ndị na-akpọ iyi na-abụkarị ndị na-adịghị ekwe ekwe, ndị nkatọ, ndị ihe ndị ọzọ mere na-anaghị eju afọ, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị na-arụ ụka, ndị obi na-ajọ njọ mgbe niile, na ndị na-eme mkpesa.” Dị ka ihe atụ, ndị na-akpọ iyi mgbe ọ bụla ihe gajọrọ na-egosi na ha chere na ihe ga na-agazi agazi mgbe niile. Ọ dị nnọọ ka hà anatụghịdị achọ ka e nwee ihe e mehiere. O’Connor kwuru na n’aka nke ọzọ, ndị na-adịghị akpọ iyi “na-adịkarị nwayọọ, . . . ha na-abụkarị ndị tozuru okè bụ́ ndị [nwere ike] idi iwe a na-akpasu ha kwa ụbọchị.” Olee ụdị onye ị ga-achọ ịbụ?

Ịkpọ iyi na-emebi aha gị. Dị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto, o nwere ike ịbụ na ị na-achọ ịdị mma n’anya. Ị chọrọ ka ọdịdị gị na-amasị ndị mmadụ. Ma, ị̀ maara na otú i si ekwu okwu nwere ike imetụta ndị ọzọ karịa otú ị dị n’anya? Nke bụ́ eziokwu bụ na okwu ọnụ gị nwere ike ikpebi ihe ndị dị ka

◼ Ndị ga-achọ imete gị enyi.

◼ Ma à ga-ewere gị n’ọrụ ma ọ bụ na a gaghị ewere gị.

◼ Otú a ga na-akwanyeruru gị ùgwù.

N’eziokwu, ihe mbụ ndị mmadụ chere banyere anyị n’ihi ọdịdị anyị na-agbanwekarị mgbe anyị malitere ikwu okwu. O’Connor kwuru, sị: “O nwetụghị otú ị ga-esi amata enyi ndị ọhụrụ ị gaara emete, ma ọ bụ ugboro ole i mere ka mmadụ gbaara gị ọsọ ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ gharazie ịkwanyere gị ùgwù otú ha sibu akwanyere gị n’ihi okwu ọjọọ i kwuru.” Olee ihe nke ahụ kụziiri gị? Na ọ bụrụ na ị na-ekwu okwu rụrụ arụ, ọ bụ onwe gị ka ị na-emebiri ihe.

Ịkpọ iyi na-egosi na ị naghị akwanyere Onye nyere anyị ikike ikwu okwu ùgwù. Ka e were ya na i nyetụrụ enyi gị uwe. Olee otú ọ ga-adị gị ma ị hụ ka enyi gị ji uwe ahụ mere nkịrịka ákwà? Chezienụ echiche otú ọ ga-adị Onye kere anyị mgbe anyị ji ire o nyere anyị na-ekwu okwu ọjọọ. Ka a sịkwa ihe mere Okwu Chineke ji kwuo, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:31.

Ị hụlanụ na e nwere ezi ihe mere i kwesịrị iji kwụsị ịkpọ iyi. Ọ bụrụkwanụ na ọ marala gị ahụ́, olee otú ị pụrụ isi kwụsị ya?

Nke Mbụ: Ghọta na ọ dị gị mkpa ịgbanwe. O yighị ka ị̀ ga-akwụsị ịkpọ iyi ruo mgbe ị ghọtara uru ọ ga-abara gị ime otú ahụ. Olee ihe ndị dị n’okpuru ebe a bụ́ ndị ga-akpali gị ịkwụsị ịkpọ iyi?

□ Ime ka obi tọọ Onye nyere m ikike ikwu okwu ụtọ

□ Ime ka ndị ọzọ kwanyewekwuoro m ùgwù

□ Ịmụta okwu ndị ọhụrụ

□ Ime ka àgwà m ka mma

Nke Abụọ: Chọpụta ihe na-akpali gị ịkpọ iyi. Melanie kwuru, sị: “Ịkpọ iyi mere ka ndị mmadụ na-atụ m ụjọ. Achọghị m mmadụ ịkparị m. Achọrọ m ka ndị ọzọ na-asọpụrụ m, chọọkwa ịdị na-abara ndị mmadụ mba otú ndị enyi m niile na-eme.”

Gịnwakwanụ? Isi ihe ga-enyere gị aka ịkwụsị ịkpọ iyi bụ ịghọta ihe na-eme gị ikwu ụdị okwu ahụ. Dị ka ihe atụ, ya bụrụ na ị na-akpọ iyi n’ihi na onye ọ bụla na-eme ya, i kwesịrị ịmụta ijidesi ezi àgwà ndị i nwere ike. Iji ezi àgwà ndị i nwere anya isi bụ nnọọ ihe dị mkpa na-egosi na ị topụtawala ogo mmadụ—ọ ga-enyekwara gị nnọọ aka ịkwụsị ịkpọ iyi.

Nke Atọ: Chọta ụdị okwu ndị ọzọ ị ga na-ekwu. Ọ bụghị naanị ijisi onwe gị ike ịghara ikwu okwu ọjọọ. Otu n’ime ihe ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ikwu okwu ọjọọ bụ iyiri “mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Efesọs 4:22-24) Nke ahụ ga-enyere gị aka ijidekwu onwe gị, meekwa ka ị na-akwanyere ma onwe gị ma ndị ọzọ ùgwù.

Amaokwu Baịbụl ndị a ga-enyere gị aka iyiri mmadụ ọhụrụ—ma nọgide na-eyi ya.

Ndị Kọlọsi 3:2: “Na-atụkwasịnụ uche n’ihe ndị dị n’elu.”

Ihe ọ pụtara: Zụọ uche gị ịdị na-eche banyere ihe ndị ziri ezi. Ihe ị na-eche n’echiche ga-ekpebi ihe ị ga-ekwu.

Ilu 13:20: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”

Ihe ọ pụtara: I nwere ike ịmụta ikwu okwu dị ka ndị enyi gị.

Abụ Ọma 19:14: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova.”

Ihe ọ pụtara: Jehova na-ahụ ihe anyị ji ire o nyere anyị na-ekwu.

Ị̀ chọkwuru enyemaka? I jirikwanụ chaatị ahụ dị n’elu lee otú ị na-eme site n’idetu ugboro ole i kwuru okwu ọjọọ? O nwere ike iju gị anya otú ị ga-esi kwuwekwuo okwu ndị dị mma n’oge na-adịghị anya!

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

a A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

b E nwere ezi ihe mere Ndị Kraịst ga-eji zere okwu rere ure, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”—Ndị Efesọs 4:29; Ndị Kọlọsi 4:6.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú ịkpọ iyi nwere ike isi metụta

◼ ụdị ndị ga-achọ ịbụ ndị enyi gị?

◼ ma à ga-ewere gị n’ọrụ?

◼ otú ndị ọzọ ga-esi na-ele gị anya?

[Chaatị dị na peeji nke 21]

MATA OTÚ Ị NA-EME

Monday Tuesday Wednesday Thursday Friday Saturday Sunday

Izu nke 1 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․

Izu nke 2 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․

Izu nke 3 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․

Izu nke 4 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․

[Foto dị na peeji nke 20]

Ị gaghị eji onyinye i ji kpọrọ ihe gwurie egwú. Olee ihe mere ị ga-eji jiri onyinye nke ikwu okwu gwurie egwú?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya