Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/09 p. 3
  • E Weere M Ka Onye Na-abaghị Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Weere M Ka Onye Na-abaghị Uru
  • Teta!—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2009
g 10/09 p. 3

E Weere M Ka Onye Na-abaghị Uru

“N’afọ mbụ m banyere ụlọ akwụkwọ praịmarị n’obodo Spain, ụmụ klas anyị malitere ịkọ m ọnụ n’ihi na ha ka m ogologo. Ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla ka m na-ebere ákwá laa.”—Jennifer, onye ndị mụrụ ya si mba Philippines kwabata obodo Spain.

“Mgbe m gafere n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ, ụmụ akwụkwọ ibe m bụ́ ndị ọcha malitere ịkpọ m iyi. Ama m na ha chọrọ ịkpasu m iwe ka mụ na ha lụwa ọgụ. Ọ bụ eziokwu na ejisiri m ike jide onwe m, obi adịghị m mma, ọ dịkwa m ka à jụrụ m ajụ.”—Timothy, onye America bụ́ onye isi ojii.

“Mgbe m dị afọ asaa, ndị Igbo na ndị Hausa nọ n’obodo anyị bụ́ Nigeria lụrụ agha. Esemokwu a meziri ka m jiri nwa klas anyị bụ́ onye Hausa na-eme ihe ọchị n’agbanyeghị na o teela mụ na ya bụ enyi.” —John, onye Igbo.

“Mgbe mụ na onye mụ na ya so ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-ezi ndị agbata obi anyị ozi ọma, otu ụkọchukwu bi n’obodo ahụ dunyere ụmụaka ka ha na-esogharị anyị na-azụ, na-atụ anyị okwute. Ụkọchukwu ahụ chọrọ ka anyị pụọ n’obodo ahụ.”—Olga.

Ò NWETỤLA mgbe mmadụ kparịrị gị ma ọ bụ na-asọ gị asọ n’ihi na ọ kpọrọ gị asị n’enweghị ihe i mere ya? O nwere ike ihe kpatara ya bụ n’ihi otú i si acha, n’ihi okpukpe gị, n’ihi na ị bụ ogbenye ma ọ bụ ọgaranya, nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ọ bụdị n’ihi afọ ndụ gị. Ndị a na-akpọkarị ụdị asị a na-atụkarị ụjọ na a ga-eme ha nke ka njọ. Ha na-achịrị obi n’aka ma ha gafewa ebe ndị mmadụ juru, ma ha banye n’ụlọ ahịa, gafee n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ma ọ bụ gaa ebe e nwere nnọkọ oriri na nkwari.

Ihe ọzọkwa bụ na o nwere ike siere ndị a na-akpaso àgwà a ike inweta ọrụ, ma ọ bụkwanụ, mee ka a ghara ilebara ha anya nke ọma ma ha gaa ụlọ ọgwụ. O nwekwara ike ime ka a ghara iwe ha n’ụlọ akwụkwọ ma nke a na-akọ, nweekwa ike a gaghị na-emere ha ihe niile iwu kwadoro ka a na-emere ndị bụ́ ụmụ amaala. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị esoro na-akpa ókè, o nwere ike ịkpata esemokwu ga-eme ka e gbukpọọ otu agbụrụ. Na Baịbụl, n’akwụkwọ Esta, a kọrọ otú e si chọọ igbukpọ otu agbụrụ. Buru n’obi na ihe kpatara nsogbu ahụ bụ ịkpọasị na iburu mmadụ ihe ọjọọ n’obi.—Esta 3:5, 6.

A magodị iwu n’obodo ka a ghara ịkpa ókè, ndị mmadụ ka nwere ike sie ọnwụ na-eme ya. Otu onye bụ́bu Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ikikere Mmadụ Nwegasịrị kwuru, sị: ‘Iri afọ isii agafeela kemgbe e wepụtara Nkwuwapụta Ụwa Niile Banyere Ikikere Mmadụ Nwegasịrị ma kwuo na mmadụ niile hà otu nakwa na e kwesịghị ịkpa ókè, ọ ka na-esi ike ime ihe ahụ e kpebiri ebe niile.’ Nke a dị mwute, n’ihi na otú ndị mmadụ si esi n’obodo ha akwaga obodo ọzọ ma ọ bụ na-agbaga ọsọ ndụ n’ebe ọzọ emeela ka ndị mmadụ karịa akarị n’ọtụtụ obodo.

N’ihi ya, mmadụ ò kwesịrị ịtụwa anya na mmadụ niile ga-emecha hara otu? Ka à ga-enwe mgbe ịkpọasị na ịkpa ókè ga-akwụsị? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya