Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/13 p. 3
  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Izrel
  • Ọstrelia
  • Gris
  • Amerịka
  • Madagaska
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ị Maara Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Teta!—2013
g 3/13 p. 3

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Izrel

[Foto dị na peeji nke 3]

Otu akwụkwọ akụkọ kwuru na ndị Izrel ndị bu nkwarụ pụta ụwa agaghịzi na-agba ndị dọkịta akwụkwọ maka na ha achọpụtaghị na ha ga-enwe nkwarụ ma a mụọ ha. Ma, ndị nne na nna nwere ike ịgba ha akwụkwọ ka ha nye ha ego ha ga-eji na-azụ nwa ha nwere nkwarụ ma na-elekọta ya.

Ọstrelia

N’Ọstrelia, e kee ndị di na nwunye ụzọ iri, ụzọ asatọ n’ime ha na-ebu ụzọ biri tupu ha agbaa akwụkwọ.

Gris

Na Gris, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike gụkọrọ mmadụ ole ji aka ha gbuo onwe ha malite n’ọnwa Jenụwarị 2010 ruo n’ọnwa Mee 2010. Ha gụkọkwara ndị ji aka ha gbuo onwe ha malite n’ọnwa Jenụwarị 2011 ruo n’ọnwa Mee 2011. Ha chọpụtara na ndị ji aka ha gbuo onwe ha n’ọnwa Jenụwarị 2011 ruo n’ọnwa Mee 2011 ji okpukpu anọ kara ndị nke ji aka ha gbuo onwe ha n’ọnwa Jenụwarị 2010 ruo n’ọnwa Mee 2010. Ihe kpatara ya bụ na ihe na-esiri ọtụtụ mmadụ ike na Gris.

Amerịka

[Foto dị na peeji nke 3]

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri n’Amerịka kwuru na e kee nri a na-enweta n’obodo ahụ ụzọ iri, ụzọ anọ n’ime ya na-ala n’iyi. Dị ka ihe atụ, e kee ihe a kọrọ n’ubi ụzọ iri, a na-ahapụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ya n’ubi ka ọ laa n’iyi. E kee nri ndị mmadụ na-azụ n’ụlọ nri ụzọ iri, ha anaghị eri ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ya, ha na-ahapụ ya pụọ. E keekwa nri ezinụlọ gara zụrụ n’ahịa ụzọ iri, ha na-etufu ụzọ abụọ na ọkara n’ime ya.

Madagaska

[Foto dị na peeji nke 3]

O nwere otu ogwumagala a hụrụ na Madagaska n’oge na-adịbeghị anya. O nweghị nke pere mpe ka ya n’ụwa niile. O nwedịrị ike ịnọ ná mbọ aka. Ma, ndị ọkachamara na-ekwu na ụdị ogwumagala a nwere ike ịnwụcha n’ihi otú e si na-asụkpọ ọhịa na Madagaska.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya