Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/14 p. 12-13
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ege Ntị nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ege Ntị nke Ọma
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ARA AHỤ́
  • Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mgbe Arụmụka Bilitere n’Etiti Di na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Otú Unu Ga-esi Na-edozi Esemokwu
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 1/14 p. 12-13

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ege Ntị nke Ọma

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Nwaanyị nwere ike ịsị dia ya: “Ntị gị adịghị n’ihe m na-ekwu.” Di ya asị ya na ya na-anụ. Ma, ihe ọ nụrụ abụghị ihe o kwuru. Ihe a nwere ike isewere ha okwu.

O nwere ihe ị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ịna-eme. Ka anyị kwugodị ihe nwere ike ime ka ị ghara ịnụ ihe nwunye gị kwuru n’agbanyeghị na i chere na ntị gị dị n’ihe ọ na-ekwu.

IHE NWERE IKE ỊKPATA YA

Ọ bụrụ na ị na-eche ihe ọzọ ma ọ bụ na ike gwụchara gị. Were ya na ụmụaka na-eme ụzụ, tiivi ana-ekwu, ị nọkwa na-eche banyere otú gị na ihe si gaa n’ụlọ ọrụ. Nwunye gị abịa na-agwa gị banyere onye ga-abịa ileta unu n’abalị ahụ. Ya ekwuchaa, gị ekwee n’isi. Ma, o nwere ike ịbụ na ị nụghị ihe o kwuru.

Ya kwuo ihe ọzọ, uche gị agbaga ebe ọzọ. Onye na-eme ụdị ihe a na-eme nwunye ya gwa ya ihe, uche ya agbaga ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwunye gị asị: “Ị naghị alọtazi ọrụ n’oge kemgbe izu a.” I nwere ike iche na ọ na-agwa gị okwu ọjọọ. Gị asị ya: “Ihe mere anaghị m alọtazi n’oge bụ ka m nwetakwuo ego ị ga-eji na-azụ nta na imoroko a ị na-azụ.” O nwere ike iji iwe gwa gị na ọ bụghị okwu ọjọọ ka ya na-agwa gị kama na ya chọrọ ka gị na ya nọrịa na Satọdee nakwa na Sọnde.

Ọ bụrụ na ebe obi gị na-adị bụ n’ihe a ga-eme. Otu nwaanyị kwuru na ọ na-abụ ya na-agwa di ya ihe na-enye ya nsogbu, obi ya adịrị n’ihe a ga-eme ka ihe dị mma. Ọ naghị ebu ụzọ ege ntị ka ọ mara ihe bụ́ nsogbu ya. O kwukwara, sị: “Ihe bụ mkpa m abụghị ihe a ga-eme ka ihe dị mma, kama ọ bụ ka o burugodị ụzọ nụkwanụ ihe na-enye m nsogbu.” Gịnị mere ntị di nwaanyị a anaghị adị n’ihe nwunye ya na-ekwu? Ọ na-abụ nwunye ya na-agwa ya okwu ya anọrọ na-eche ihe ọ ga-eme, n’ebughị ụzọ nụ ihe ọ chọrọ ịgwa ya.

Gịnị ga-enyere gị aka ịna-ege nwunye gị ntị nke ọma ma ọ na-agwa gị okwu?

IHE I NWERE IKE IME

Na-ege ntị nke ọma. Ọ bụrụ na o nwere ihe dị mkpa nwunye gị chọrọ ịgwa gị ya abụrụ na o nwere ebe obi gị dị, emela ka ị̀ na-ege ntị. Ọ ga-aka mma ma ị hapụgodị ihe ahụ gewe ntị n’ihe ọ na-ekwu ma ọ bụkwanụ gị agwa ya na ị ka ji ihe n’aka ka o chere ka i mechaa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 1:19.

Anapụla ya okwu n’ọnụ. Mgbe nwunye gị na-ekwu okwu, gee ya ntị nke ọma. Ya kwuchaa, gị ekwuwezie ihe ị chọrọ ikwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:13.

Jụọ ya ajụjụ. Ọ bụrụ na ihe nwunye gị na-agwa gị edoghị gị anya, jụọ ya ajụjụ ka i wee ghọta ihe ọ na-ekwu. Nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya na mbụ kwuru na obi na-adị ya mma ma di ya na-ajụ ya ajụjụ mgbe ọ na-agwa ya ihe. O kwuru na ime otú ahụ na-egosi na ọ chọrọ ịghọta ihe ọ na-ekwu.

Chọpụta ihe ihe o kwuru pụtara. Cheta na otú mmadụ si emegharị ahụ́ mgbe ọ na-ekwu okwu, otú ihu ya dị na otú olu ya si ada na-egosi otú ihe ọ na-ekwu si dị ya n’obi. Otú mmadụ si kwuo “Ọ dị mma” nwere ike igosi na ihe ọ na-ekwu bụ “Ọ dịghị mma.” Ọ bụrụ na nwunye gị asị gị “Ị naghị enyere m aka,” o nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na ọ dịghị ihe i ji ya kpọrọ. Gbalịa chọpụta ihe ọ chọrọ ikwu. Ọ bụrụ na ị chọpụtaghị ihe ọ chọrọ ikwu, ihe i chere na o kwuru nwere ike isere unu okwu.

Gee ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu. Ọ bụrụgodị na ihe nwunye gị na-agwa gị adịghị gị mma, ahapụla ya pụwa. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwunye gị na-akatọ ihe i mere? Otu nwoke lụrụla nwaanyị ihe karịrị iri afọ isii kwuru, sị “Na-ege ya ntị. Chebara ihe ọ na-ekwu echiche. Ọ naghị adị mfe, ma ọ ga-abara gị uru ma i gee ya ntị nke ọma.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:15.

Nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na ị na-ege ntị mgbe nwunye gị na-agwa gị okwu, ọ ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụkwa na ọ na-amasị gị ịnụ ihe nwunye gị na-ekwu, ọ ga-adịrị gị mfe ige ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịgwa gị ihe. Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ọ ga-egosi na ị na-eme ihe dị ná Ndị Filipaị 2:4. Ebe ahụ sị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”

a Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwaanyị ndị nọ na di.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.’—Jems 1:19.

  • “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.”—Ilu 18:13.

  • ‘Ntị ndị maara ihe na-achọ ihe ọmụma.’—Ilu 18:15.

MGBE Ị CHỌRỌ ỊGWA NWUNYE GỊ OKWU

Ọ bụrụ na nwunye gị nọ n’ime ụlọ ma ọ bụkwanụ na ọ na-eme ihe ọzọ, gị anọrọ ebe ọzọ na-agwa ya okwu, ọ̀ ga-anụ ihe ị na-ekwu? Ọ ga-aka mma ka ị gaa ebe ọ ga-anọ nụ ihe ị na-ekwu ma ọ bụ gị echere mgbe o mechara ihe ọ na-eme.—1 Pita 3:8.

Ì chetara ihe Jizọs mere mgbe ọ chọrọ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi? Ọ gwaghị ha ya mgbe masịrị ya, kama, o cheere ruo mgbe ha ga-aghọta ihe ọ na-ekwu.—Mak 9:33-35; 12:41-44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya