Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/14 p. 2-6
  • Ebe Pụrụ Iche n’Ịntanet

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebe Pụrụ Iche n’Ịntanet
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MAKA NDỊ DI NA NWUNYE
  • MAKA NDỊ NNE NA NNA
  • MAKA NDỊ NA-ETO ETO
  • MAKA NDỊ CHỌRỌ ỊMA IHE BAỊBỤL NA-EKWU
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2016
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Na-enye Ndị Mmadụ Traktị Kwuru Banyere jw.org
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 3/14 p. 2-6
Nwa agbọghọ na-achọ ihe na jw.org

ISIOKWU TETA! A

Ebe Pụrụ Iche n’Ịntanet

  • GỤỌ Baịbụl n’iri asụsụ ise, gụọkwa akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ ise.

  • LEE fim ndị ogbi n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri asụsụ asaa ndị ogbi na-asụ.

  • CHỌỌ ihe n’ọtụtụ asụsụ.

  • GEE ihe nkiri ndị si na Baịbụl.

  • LEE ihe e sere ese e ji akọwa akụkọ ndị dị na Baịbụl.

  • LEE ihe nkiri na fim ndị ga-enyere gị aka idi nsogbu.

  • DANLODUO akwụkwọ, magazin, na ihe ndị a na-egere egere n’akwụghị ụgwọ.

  • Jiri Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET MEE NCHỌNCHỌ. Ị ga-enweta ihe ị na-achọ n’ihe karịrị narị asụsụ.

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

“M chọrọ ka mụ na nwunye m na-ebi n’udo. Anyị na-esekarị okwu. Ihe bịakwara ka njọ mgbe anyị mụtara ụmụ. Anyị chọrọ ihe ga-enyere anyị aka ịna-ebi n’udo”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.”—Ilu 24:3.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Di na nwunye na-achọ ihe na jw.org n’ebe a na-akpọ Ndị Di na Nwunye na Ndị Nne na Nna

Ị gaa n’ebe a na-akpọ “Ndị Di na Nwunye na Ndị Nne na Nna,” ị ga-ahụ ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka. Dị ka:

  • Ịlafere afọ mbụ nke alụmdi na nwunye

  • Gị na ndị ọgọ gị ma ọ bụ nne na nna di gị imekọ ihe

  • Ịdọ ụmụaka aka ná ntị

  • Otú di na nwunye ga-esi kwụsị ịna-esekarị okwu

  • Otú unu ga-esi kwụọ ụgwọ unu ji

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ DI NA NWUNYE NA NDỊ NNE NA NNA)

N’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, e nwere ọtụtụ isiokwu ga-abara di na nwunye uru. Ihe ụfọdụ a tụlere na ya bụ otú mmadụ ga-esi kwadebe maka alụmdi na nwunye na otú ndị lụrụ di na nwunye ga-esi elekọta nne na nna ha ndị merela agadi.

(Akwụkwọ a dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

MAKA NDỊ NNE NA NNA

“Ahụrụ m ụmụ m n’anya. Achọrọ m ka ha bụrụ ndị m ga-eji na-eme ọnụ ma ha too”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Nna na nwa ya na-achọ ihe na jw.org n’ebe a na-akpọ Ụmụaka

Ị gaa n’ebe e dere “Ụmụaka,” ị ga-ahụ ma fim ma ihe ndị e sere ese ma ihe ndị ọzọ ị ga-eji kụziere ụmụ gị ka ha . . .

  • na-erube isi

  • bụrụ ndị obiọma

  • na ụmụaka ibe ha na-adị ná mma

  • mụta otú ha ga-si na-ekele onye meere ha ihe ọma

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere ỤMỤAKA)

N’akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible nakwa akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, e sere ihe ndị ga-enyere gị aka ịkụziri ụmụ gị ihe dị na Baịbụl.

(Akwụkwọ abụọ ahụ dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

MAKA NDỊ NA-ETO ETO

“M ga-achọ aro ndị ga-enyere m aka ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa ịna-erubere mama m na papa m isi. M chọkwara ịma otú m ga-esi mete ezigbo ndị enyi. Abụghịzi m nwata a ga na-agwa ihe ọ bụla ọ ga-eme”

BAỊBỤL SỊRỊ:

‘Ka obi na-atọ gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa.’—Ekliziastis 11:9.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Nwa okorobịa na-achọ ihe na jw.org n’ebe a na-akpọ Ndị Na-eto Eto

N’ebe e dere “Ndị Na-eto Eto,” e nwere fim na ọtụtụ isiokwu ndị ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na . . .

  • owu na-ama gị

  • o nwere ihe na-enye gị nsogbu n’ụlọ akwụkwọ

  • i meela ihe a sị gị emela n’ụlọ unu

  • o nwere ndị na-achọ gị okwu ma ọ bụkwanụ na a na-egwusa gị egwuregwu iberiibe

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO)

Akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nke mbụ na nke abụọ zara iri ajụjụ asaa na asaa dị mkpa ndị na-eto eto na-ajụkarị.

(Akwụkwọ abụọ ahụ dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

MAKA NDỊ CHỌRỌ ỊMA IHE BAỊBỤL NA-EKWU

“M chọrọ ịma ihe Baịbụl na-ekwu. Ebee ka m ga-ebido?”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe.” —2 Timoti 3:16.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

E dere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ otú ọ ga-adịrị onye ọ bụla mfe ọgụgụ.

(Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere BAỊBỤL)

A zara ọtụtụ ajụjụ n’ebe e dere “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” Ụfọdụ n’ime ha bụ “Ọ̀ bụ Chineke na-akpata nsogbu ụwa?” “Jizọs ọ̀ bụ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile?”

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA)

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ mụwa Baịbụl n’anaghị gị ego, gaa n’ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl” ka ị hụ ihe ị ga-eme.

(Gaa n’isimbido pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl”)

Otu nwaanyị aha ya bụ Christina kwuru, sị: “M kwụsịrị ịgụ Baịbụl maka na anaghị m aghọta ya. Ma, mgbe m malitere ịmụ akwụkwọ bụ́ ‘Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?’ m bịara ghọtawa ihe Baịbụl na-ekwu.”

È NWERE IHE NA-EDOGHỊ GỊ ANYA BANYERE NDỊÀMÀ JEHOVA?

Ị gaa n’ebe e dere “Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị,” ị ga-ahụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Ndịàmà Jehova. Ị ga-ahụ ajụjụ ndị dị ka “Gịnị mere unu ji ezi ndị chọọchị ọzọ ozi ọma?” nakwa “Olee otú unu si enweta ego unu ji arụ ọrụ unu?”

(Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ)

Kwa ụbọchị, ihe dị ka narị puku mmadụ asaa na-aga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org. Gbalịa na-aga ebe ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya