Na-enye Ndị Mmadụ Traktị Kwuru Banyere jw.org
Isiokwu traktị ahụ bụ Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra? A jụrụ ajụjụ atọ n’azụ traktị ahụ. Mgbe ọ bụla ọ dabara, jụọ mmadụ ajụjụ nke ọ chọrọ ịmata azịza ya, gwa ya na a zara ajụjụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Ọ gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, ya pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA. Ọ ga-ahụkwa ebe a zara ajụjụ ndị a: Gịnị bụ Alaeze Chineke? Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme?
Ebe ọ bụla ị na-aga, chịrị traktị a ka i nwee ike iji ya nyere ndị mmadụ aka ịmata ihe Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-eme n’ọdịnihu.