Ihe I Nwere Ike Ikwu
Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, nye ya traktị ahụ ka ọ hụ isiokwu ya. Sị ya: “Anyị na-enye ndị mmadụ traktị a zara otu ajụjụ dị anyị niile mkpa. Nke a bụ nke gị.”
Ọ bụrụ na ị ga-edewe traktị a na nke ndị na-anọghị n’ụlọ, dewe ya ebe onye na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya. Apịala ya otú na-adịghị mma.
Ọ bụrụ na onye ị bịara na nke ya chọrọ ịmatakwu ihe dị na traktị ahụ, i nwere ike ịjụ ya ihe o chere banyere ajụjụ ahụ. Sapee traktị ahụ, gosi ya ihe e kwuru n’Abụ Ọma 119:144, 160. Gwa ya na traktị ahụ ga-enyere ya aka ịma ebe ọ ga-aga n’Ịntanet hụ otú e si jiri Baịbụl zaa ajụjụ ndị nwere ike ịna-echu ya ụra. I nwere ike igosi ya vidio ahụ isiokwu ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Tupu ị lawa, gosi ya ajụjụ atọ dị n’azụ traktị ahụ, jụọkwa ya nke ọ ga-achọ ka ị zaa. Gwa ya na ị ga-abịaghachi ka i gosi ya otú e si achọta azịza ndị ahụ na jw.org/ig. Ọ bụrụ na ị gaghachi chọọ igosi ya ebe a zara ajụjụ ahụ, gaa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.
Ọ bụrụ na ọ bụ n’ọnwa Ọgọst ka unu ga-akpọwa ndị mmadụ òkù maka mgbakọ ukwu, nye onye ị gara na nke ya ma traktị ahụ ma akwụkwọ ịkpọ òkù. Gwazie ya, sị, “Anyị na-akpọkwa gị ka ị bịa mgbakọ anyị ga-enwe.”
Ụlọ Nche Ọgọst 1
N’ụbọchị Satọdee ma ọ bụ Sọnde, i nwere ike ikwu ihe a ma ị chọọ inye mmadụ Ụlọ Nche: “Anyị chọkwara inye gị Ụlọ Nche zara ajụjụ bụ́, Chineke ò nwere mmasị n’ebe ị nọ?”
Teta! Julaị–Ọgọst
N’ụbọchị Satọdee ma ọ bụ Sọnde, i nwere ike ikwu ihe a ma ị chọọ inye mmadụ Teta!: “Anyị chọkwara inye gị Teta! a. O kwuru ihe ga-enyere ndị ezinụlọ aka ka ha ghara ịna-emefusị ego ha.”