Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Eprel 1
“Anyị na-enye ndị enyi anyị traktị a. [Nye onye ị bịara na nke ya traktị bụ́ Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?, jụọkwa ya ajụjụ ndị ahụ dị n’ihu ya. Gosi ya ihe Baịbụl kwuru na 2 Timoti 3:16. Gbaakwa ya ume ka ọ gụọ traktị ahụ mgbe o nwere ohere.] Ọtụtụ ndị amaghị na Baịbụl zara ụdị ajụjụ ndị a. [Gosi ya ajụjụ anọ dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?,” nke dị na peeji nke atọ n’Ụlọ Nche Eprel 1.] Ụlọ Nche a kwuru ebe azịza ajụjụ ndị a dị na Baịbụl gị.”
Teta! Mach–Eprel
“Ihe mere anyị ji bịa na nke gị bụ ka anyị na gị kwurịta ihe ụfọdụ gbasara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata n’ihi na ọ na-enye onye ọ bụla nsogbu n’obi. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata si n’aka Chineke. O nwekwara ndị nke na-ekwu na ọ bụrụgodị na ọ bụghị ya na-akpata ya, ahụhụ anyị na-ata anaghị emetụ ya n’obi. Gịnị ka gịnwa chere? Ì chere na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na Chineke anaghị anwa ndị mmadụ ọnwụnwa. [Gụọ Jems 1:13.] Teta! a ga-eme ka ị mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ahụhụ ndị mmadụ na-ata nakwa ihe Chineke ga-eme gbasara ya.”