Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/14 p. 8-9
  • Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È nwere onye na-anụ ekpere anyị?
  • Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?
  • Ònye ka anyị kwesịrị ịna-ekpegara ekpere?
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 11/14 p. 8-9
Nwoke na-ekpe ekpere

IHE BAỊBỤL KWURU

Ekpere

È nwere onye na-anụ ekpere anyị?

“Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.”—Abụ Ọma 65:2.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ dị ka Chineke anaghị anụ ekpere. Ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nwere ike ịna-eche na Chineke anaghị anụ ekpere ha.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike; ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.” (1 Pita 3:12) N’eziokwu, Chineke na-anụ ekpere. Ma, ọ bụ ekpere ndị na-eme ihe ọ na-achọ ka ọ kacha anụ. Amaokwu Baịbụl ọzọ gosikwara na Chineke na-anụ ekpere anyị. Ebe ahụ sịrị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) N’ihi ihe amaokwu Baịbụl a kwuru, onye ọ bụla chọrọ ikpegara Chineke ekpere kwesịrị ịma ma ihe ọ na-arịọ ya ọ̀ dabakwara n’ihe bụ́ uche Chineke.

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

“Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.”—Matiu 6:7.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọ na-abụ ndị Buda, Katọlik, Hindu na ndị Alakụba kpewe ekpere, ha ejiri chaplet na-agụghachi ekpere ha bu n’isi.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe anyị na-ekpe n’ekpere kwesịrị ịbụ ihe si anyị n’ala ala obi, o kwesịghị ịbụ ihe anyị bu n’isi nke anyị ga na-ekwughachi ugboro ugboro. Baịbụl gwara anyị, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Ya mere, unu emela ka ha, n’ihi na Chineke bụ́ Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.”—Matiu 6:7, 8.

IHE O JI GBASA ANYỊ

Onye na-ekpe ekpere otú na-adịghị Chineke mma nwere ike ịbụ oge ka ọ na-egbu ma ọ bụ ya abụrụ na ọ na-akpasu Chineke iwe. Baịbụl kwuru na ekpere ndị na-anaghị eme ihe Chineke chọrọ bụ “ihe arụ” n’anya ya.—Ilu 28:9.

Ònye ka anyị kwesịrị ịna-ekpegara ekpere?

“Chọọnụ Jehova ugbu a a pụrụ ịchọta ya. Kpọkuonụ ya ugbu a ọ nọ nso.”—Aịzaya 55:6.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekpegara Meri ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụkwanụ ndị sent ekpere. Ihe mere ha ji na-ekpegara ha ekpere bụ na ha chere na ha ga-enye aka na-arịọrọ ha Chineke arịrịọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọ bụ “Nna anyị nke bi n’eluigwe” ka ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-ekpegara ekpere. (Matiu 6:9) Baịbụl gbara anyị ume ka anyị ghara ‘ichegbu onwe anyị banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, ka anyị jiri ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe anyị na-arịọ.’—Ndị Filipaị 4:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya